Proverbs 7 (BOICB)
1 Na-agbaso okwu m nwa m, nọgide na ya,dokwaa iwu m niile nʼime obi gị. 2 Debe iwu m ka ị dị ndụ,chee ozizi m nche dịka ọ bụ mkpụrụ anya gị. 3 Kee ha na mkpịsịaka gị,deekwa ha nʼelu mbadamba nkume, bụ obi gị. 4 Hụ amamihe nʼanya dịka nwaagbọghọ ị hụrụ nʼanya;hụkwa inwe nghọta nʼanya dịka a ga-asị na ọ bụ nwanne gị. 5 Kwee ka ha debe gị, ka ị ghara ijekwuru nwanyị na-akwa iko,ka ị gharakwa ịṅa ntị nʼokwu ire ụtọ ya. 6 Nʼihi na otu ụbọchị,esi m na oghereikuku dị nʼụlọ m lepụ anya, 7 hụ nʼetiti ndị na-enweghị uche,ahụtara m otu nwokorobịa nʼetiti ha,onye amamihe kọrọ, 8 ka ọ na-aga nʼụzọ dị nso ebe nkuku ụlọnʼakụkụ ụlọ nwanyị ihere na-adịghị eme, 9 nʼoge anyasị, dịka chi na-eji,mgbe ọchịchịrị na-agbachi. 10 Mgbe ahụ, nwanyị ahụ pụtara zute ya.O yi uwe dịka nwanyị akwụna, jiri aghụghọ na-abịakwute ya. 11 (Ọ na-eme ụzụ na-aṅaghị ntị ịnụ ihe ọbụla.Ụkwụ ya anaghị anọgide nʼụlọ ya. 12 Ọ na-akwụgharị ma nʼokporoụzọ ma nʼama;na-amịgharị nʼebe nzuzo niile.) 13 O weere aka ya abụọ jikụọ nwokorobịa ahụ nʼolu, sutu ya ọnụ,were ihu nke ihere na-adịghị, sị: 14 “Emezuru m nkwa niile m kwere taa,enwekwara m nri nke sitere nʼihe aja udo m chụrụ nʼụlọ m, 15 Ọ bụ gị ka m na-achọkwute,lee gị ka ị na-abịa. 16 Agbasaala m akwa mara mma nʼelu ihe ndina m,bụ akwa ọcha mara mma tụrụ ọtụtụ agwa nke e ji ogho ndị Ijipt kpaa. 17 Efesakwala m mmanụ isi ọma nke máá, aloos na sinamọnnʼelu nʼihe ndina m. 18 Bịa, ka anyị were ịhụnanya ṅụjụbiga afọ anyị;ka anyị mee onwe anyị obi ụtọ site ugbu a ruo ụtụtụ echi. 19 Nʼihi na di m anọghị nʼụlọo jeela njem dị anya. 20 O ji akpa ego juru gaa njem,abalị ole na ole ga-agafekwa tupu ọ lọta.” 21 Otu a ka o si jiri okwu ire ụtọ ya megharịa nwokorobịa ahụ isi tutu o kwenyere ya.O nwekwaghị ike ịnapụta onwe ya site nʼokwu nrafu nke nwanyị ahụ. 22 O sooro nwanyị ahụ dịka ehia na-adọkpụ na-aga ebe a ga-egbu ya,dịka ele nke na-aba nʼọnya, 23 nke na-eche ka e were àkụ gbata ya nʼobi.Nwoke ahụ dịka nnụnụ nke na-efeba nʼọnyana-amaghị ihe na-eche ya pụrụ iwepụ ndu ya. 24 Geenụ ntị, ụmụ m, ma ọ bụghị naanị ige ntị,kama meekwanụ ihe m na-ekwu. 25 Ekwela ka agụụ nke obi gị chịa gị;ejela nwanyị dị otu a nso; gbaara ya ọsọ, ka ọ ghara ịnwa gị nwetakwa gị. 26 Nʼihi na o mebiela ndụ ọtụtụ mmadụ,ọtụtụ mmadụ amaala nʼọnya ya. 27 Ụlọ ya bụ okporoụzọ nke na-eduba nʼili,nke na-edubakwa nʼala ọnwụ.
In Other Versions
Proverbs 7 in the ANGEFD
Proverbs 7 in the ANTPNG2D
Proverbs 7 in the AS21
Proverbs 7 in the BAGH
Proverbs 7 in the BBPNG
Proverbs 7 in the BBT1E
Proverbs 7 in the BDS
Proverbs 7 in the BEV
Proverbs 7 in the BHAD
Proverbs 7 in the BIB
Proverbs 7 in the BLPT
Proverbs 7 in the BNT
Proverbs 7 in the BNTABOOT
Proverbs 7 in the BNTLV
Proverbs 7 in the BOATCB
Proverbs 7 in the BOATCB2
Proverbs 7 in the BOBCV
Proverbs 7 in the BOCNT
Proverbs 7 in the BOECS
Proverbs 7 in the BOGWICC
Proverbs 7 in the BOHCB
Proverbs 7 in the BOHCV
Proverbs 7 in the BOHLNT
Proverbs 7 in the BOHNTLTAL
Proverbs 7 in the BOILNTAP
Proverbs 7 in the BOITCV
Proverbs 7 in the BOKCV
Proverbs 7 in the BOKCV2
Proverbs 7 in the BOKHWOG
Proverbs 7 in the BOKSSV
Proverbs 7 in the BOLCB
Proverbs 7 in the BOLCB2
Proverbs 7 in the BOMCV
Proverbs 7 in the BONAV
Proverbs 7 in the BONCB
Proverbs 7 in the BONLT
Proverbs 7 in the BONUT2
Proverbs 7 in the BOPLNT
Proverbs 7 in the BOSCB
Proverbs 7 in the BOSNC
Proverbs 7 in the BOTLNT
Proverbs 7 in the BOVCB
Proverbs 7 in the BOYCB
Proverbs 7 in the BPBB
Proverbs 7 in the BPH
Proverbs 7 in the BSB
Proverbs 7 in the CCB
Proverbs 7 in the CUV
Proverbs 7 in the CUVS
Proverbs 7 in the DBT
Proverbs 7 in the DGDNT
Proverbs 7 in the DHNT
Proverbs 7 in the DNT
Proverbs 7 in the ELBE
Proverbs 7 in the EMTV
Proverbs 7 in the ESV
Proverbs 7 in the FBV
Proverbs 7 in the FEB
Proverbs 7 in the GGMNT
Proverbs 7 in the GNT
Proverbs 7 in the HARY
Proverbs 7 in the HNT
Proverbs 7 in the IRVA
Proverbs 7 in the IRVB
Proverbs 7 in the IRVG
Proverbs 7 in the IRVH
Proverbs 7 in the IRVK
Proverbs 7 in the IRVM
Proverbs 7 in the IRVM2
Proverbs 7 in the IRVO
Proverbs 7 in the IRVP
Proverbs 7 in the IRVT
Proverbs 7 in the IRVT2
Proverbs 7 in the IRVU
Proverbs 7 in the ISVN
Proverbs 7 in the JSNT
Proverbs 7 in the KAPI
Proverbs 7 in the KBT1ETNIK
Proverbs 7 in the KBV
Proverbs 7 in the KJV
Proverbs 7 in the KNFD
Proverbs 7 in the LBA
Proverbs 7 in the LBLA
Proverbs 7 in the LNT
Proverbs 7 in the LSV
Proverbs 7 in the MAAL
Proverbs 7 in the MBV
Proverbs 7 in the MBV2
Proverbs 7 in the MHNT
Proverbs 7 in the MKNFD
Proverbs 7 in the MNG
Proverbs 7 in the MNT
Proverbs 7 in the MNT2
Proverbs 7 in the MRS1T
Proverbs 7 in the NAA
Proverbs 7 in the NASB
Proverbs 7 in the NBLA
Proverbs 7 in the NBS
Proverbs 7 in the NBVTP
Proverbs 7 in the NET2
Proverbs 7 in the NIV11
Proverbs 7 in the NNT
Proverbs 7 in the NNT2
Proverbs 7 in the NNT3
Proverbs 7 in the PDDPT
Proverbs 7 in the PFNT
Proverbs 7 in the RMNT
Proverbs 7 in the SBIAS
Proverbs 7 in the SBIBS
Proverbs 7 in the SBIBS2
Proverbs 7 in the SBICS
Proverbs 7 in the SBIDS
Proverbs 7 in the SBIGS
Proverbs 7 in the SBIHS
Proverbs 7 in the SBIIS
Proverbs 7 in the SBIIS2
Proverbs 7 in the SBIIS3
Proverbs 7 in the SBIKS
Proverbs 7 in the SBIKS2
Proverbs 7 in the SBIMS
Proverbs 7 in the SBIOS
Proverbs 7 in the SBIPS
Proverbs 7 in the SBISS
Proverbs 7 in the SBITS
Proverbs 7 in the SBITS2
Proverbs 7 in the SBITS3
Proverbs 7 in the SBITS4
Proverbs 7 in the SBIUS
Proverbs 7 in the SBIVS
Proverbs 7 in the SBT
Proverbs 7 in the SBT1E
Proverbs 7 in the SCHL
Proverbs 7 in the SNT
Proverbs 7 in the SUSU
Proverbs 7 in the SUSU2
Proverbs 7 in the SYNO
Proverbs 7 in the TBIAOTANT
Proverbs 7 in the TBT1E
Proverbs 7 in the TBT1E2
Proverbs 7 in the TFTIP
Proverbs 7 in the TFTU
Proverbs 7 in the TGNTATF3T
Proverbs 7 in the THAI
Proverbs 7 in the TNFD
Proverbs 7 in the TNT
Proverbs 7 in the TNTIK
Proverbs 7 in the TNTIL
Proverbs 7 in the TNTIN
Proverbs 7 in the TNTIP
Proverbs 7 in the TNTIZ
Proverbs 7 in the TOMA
Proverbs 7 in the TTENT
Proverbs 7 in the UBG
Proverbs 7 in the UGV
Proverbs 7 in the UGV2
Proverbs 7 in the UGV3
Proverbs 7 in the VBL
Proverbs 7 in the VDCC
Proverbs 7 in the YALU
Proverbs 7 in the YAPE
Proverbs 7 in the YBVTP
Proverbs 7 in the ZBP