Psalms 102 (BOICB)

undefined Ekpere nke onye nọ na mmekpa ahụ na ọnọdụ ịda mba, na-ekwupụta otu o si dịrị ya nʼihu ONYENWE ANYỊ. 1 Nụrụ ekpere m, O ONYENWE ANYỊ;ka ịkwa akwa m maka inyeaka ruo gị ntị. 2 Ezonarịla m ihu gịnʼụbọchị nsogbu m.Gee ntị nʼekpere m,zakwaa m ngwangwa. 3 Nʼihi na ụbọchị m niile na-agabiga, dịka anwụrụ ọkụ;ọkpụkpụ m niile dịkwa ka ọlọkọ ọkụ. 4 Mkpụrụobi m etiwaala abụọ na-achanwụkwa dịka ahịhịa;ana m echefu iri nri m. 5 Nʼihi oke ịsụ ude m na-asụ,enwekwaghị m anụ ahụ ọbụla nʼahụ m. Abụ m naanị ọkpụkpụ. 6 Adị m ka ikwighịkwighị nke ọzara,a dị m ka ikwighịkwighị nʼetiti ebe dakpọsịrị adakpọsị. 7 Ana m amụ anya abalị niile;adị m ka nwa nnụnụ naanị ya bekwasịrị nʼelu ụlọ. 8 Ụbọchị niile, ndị iro m na-eji m eme ihe ọchị;ndị na-akwa m emo na-eji aha m mere ihe ịbụ ọnụ. 9 Nʼihi na ejirila m ntụ mere ihe oriri m,anya mmiri m na-agwakọta nʼiko ihe ọṅụṅụ m 10 nʼihi oke iwe gị,i bulitela m, ma tụpụ m nʼakụkụ. 11 Ụbọchị m niile dịka onyinyo nke a na-ahụ anya mgbe anwụ na-ada.Ana m akpọnwụ akpọnwụ, dịka ahịhịa. 12 Ma gị ONYENWE ANYỊ, na-anọgide nʼocheeze gị ruo mgbe ebighị ebi;aha gị ga-adịgide site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ. 13 Ị ga-ebili nwee ọmịiko nʼebe Zayọn nọ,nʼihi na oge izi ya ihuọma eruola;oge ahụ a kara aka eruola. 14 Nʼihi na nkume ya niile dị oke ọnụahịa nye ndị ohu gị;mgbe ha hụrụ uzuzu ya, ha na-emere ya ebere. 15 Mba niile ga-atụ egwu aha ONYENWE ANYỊ,ndị eze niile nke ụwa ga-asọpụrụkwa ebube gị. 16 Nʼihi na ONYENWE ANYỊ ga-ewugharị Zayọn,ọ ga-apụta ihe nʼebube ya. 17 Ọ ga-aza ekpere ndị nọ na mkpa;ọ gaghị eleda arịrịọ ha anya. 18 Ka e depụta ihe ndị a maka ọgbọ nke dị nʼihu,ka ndị a na-amụbeghị nwee ike too ONYENWE ANYỊ: 19 “ONYENWE ANYỊ sitere nʼebe nsọ ya dị elu ledata anya,o sitere nʼeluigwe ledata anya ya nʼụwa, 20 ịnụ ịsụ ude nke ndị a tụrụ mkpọrọna ịgbapụta ndị a mara ikpe ọnwụ.” 21 Nʼihi nke a, a ga-ekwuwapụta aha ONYENWE ANYỊ na Zayọn;a ga-eto ya na Jerusalem, 22 mgbe mba niile na alaeze niile,ga-ezukọta nʼotu ebe, ife Onyenwe anyị ofufe. 23 O meela ka ike gwụ m nʼoge ndụ m;o meela ka ndụ m dịrị mkpụmkpụ. 24 Nʼihi ya, ekwuru m sị,“Anapụla m ndụ m, o Chineke m, ugbu a m ka dị ndụ;ị na-adịgide ndụ site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ. 25 Na mmalite, ị tọrọ ntọala ụwa,eluigwe bụkwa ọrụ aka gị. 26 Ha ga-ala nʼiyi, ma ị ga-adịgide;ha ga-erichasị dịka akwa ochie.Ị ga-agbanwe ha dịka mmadụ si agbanwe uwe ya,ha ga-abụ ndị ewezugara ewezuga. 27 Ma gị onwe gị enweghị mgbanwe,ọnụọgụgụ afọ gị adịghị agwụkwa agwụ. 28 Ụmụ ndị ohu gị ga-ebigide;ụmụ ụmụ ha ga-eguzosie ike nʼihu gị.”

In Other Versions

Psalms 102 in the ANGEFD

Psalms 102 in the ANTPNG2D

Psalms 102 in the AS21

Psalms 102 in the BAGH

Psalms 102 in the BBPNG

Psalms 102 in the BBT1E

Psalms 102 in the BDS

Psalms 102 in the BEV

Psalms 102 in the BHAD

Psalms 102 in the BIB

Psalms 102 in the BLPT

Psalms 102 in the BNT

Psalms 102 in the BNTABOOT

Psalms 102 in the BNTLV

Psalms 102 in the BOATCB

Psalms 102 in the BOATCB2

Psalms 102 in the BOBCV

Psalms 102 in the BOCNT

Psalms 102 in the BOECS

Psalms 102 in the BOGWICC

Psalms 102 in the BOHCB

Psalms 102 in the BOHCV

Psalms 102 in the BOHLNT

Psalms 102 in the BOHNTLTAL

Psalms 102 in the BOILNTAP

Psalms 102 in the BOITCV

Psalms 102 in the BOKCV

Psalms 102 in the BOKCV2

Psalms 102 in the BOKHWOG

Psalms 102 in the BOKSSV

Psalms 102 in the BOLCB

Psalms 102 in the BOLCB2

Psalms 102 in the BOMCV

Psalms 102 in the BONAV

Psalms 102 in the BONCB

Psalms 102 in the BONLT

Psalms 102 in the BONUT2

Psalms 102 in the BOPLNT

Psalms 102 in the BOSCB

Psalms 102 in the BOSNC

Psalms 102 in the BOTLNT

Psalms 102 in the BOVCB

Psalms 102 in the BOYCB

Psalms 102 in the BPBB

Psalms 102 in the BPH

Psalms 102 in the BSB

Psalms 102 in the CCB

Psalms 102 in the CUV

Psalms 102 in the CUVS

Psalms 102 in the DBT

Psalms 102 in the DGDNT

Psalms 102 in the DHNT

Psalms 102 in the DNT

Psalms 102 in the ELBE

Psalms 102 in the EMTV

Psalms 102 in the ESV

Psalms 102 in the FBV

Psalms 102 in the FEB

Psalms 102 in the GGMNT

Psalms 102 in the GNT

Psalms 102 in the HARY

Psalms 102 in the HNT

Psalms 102 in the IRVA

Psalms 102 in the IRVB

Psalms 102 in the IRVG

Psalms 102 in the IRVH

Psalms 102 in the IRVK

Psalms 102 in the IRVM

Psalms 102 in the IRVM2

Psalms 102 in the IRVO

Psalms 102 in the IRVP

Psalms 102 in the IRVT

Psalms 102 in the IRVT2

Psalms 102 in the IRVU

Psalms 102 in the ISVN

Psalms 102 in the JSNT

Psalms 102 in the KAPI

Psalms 102 in the KBT1ETNIK

Psalms 102 in the KBV

Psalms 102 in the KJV

Psalms 102 in the KNFD

Psalms 102 in the LBA

Psalms 102 in the LBLA

Psalms 102 in the LNT

Psalms 102 in the LSV

Psalms 102 in the MAAL

Psalms 102 in the MBV

Psalms 102 in the MBV2

Psalms 102 in the MHNT

Psalms 102 in the MKNFD

Psalms 102 in the MNG

Psalms 102 in the MNT

Psalms 102 in the MNT2

Psalms 102 in the MRS1T

Psalms 102 in the NAA

Psalms 102 in the NASB

Psalms 102 in the NBLA

Psalms 102 in the NBS

Psalms 102 in the NBVTP

Psalms 102 in the NET2

Psalms 102 in the NIV11

Psalms 102 in the NNT

Psalms 102 in the NNT2

Psalms 102 in the NNT3

Psalms 102 in the PDDPT

Psalms 102 in the PFNT

Psalms 102 in the RMNT

Psalms 102 in the SBIAS

Psalms 102 in the SBIBS

Psalms 102 in the SBIBS2

Psalms 102 in the SBICS

Psalms 102 in the SBIDS

Psalms 102 in the SBIGS

Psalms 102 in the SBIHS

Psalms 102 in the SBIIS

Psalms 102 in the SBIIS2

Psalms 102 in the SBIIS3

Psalms 102 in the SBIKS

Psalms 102 in the SBIKS2

Psalms 102 in the SBIMS

Psalms 102 in the SBIOS

Psalms 102 in the SBIPS

Psalms 102 in the SBISS

Psalms 102 in the SBITS

Psalms 102 in the SBITS2

Psalms 102 in the SBITS3

Psalms 102 in the SBITS4

Psalms 102 in the SBIUS

Psalms 102 in the SBIVS

Psalms 102 in the SBT

Psalms 102 in the SBT1E

Psalms 102 in the SCHL

Psalms 102 in the SNT

Psalms 102 in the SUSU

Psalms 102 in the SUSU2

Psalms 102 in the SYNO

Psalms 102 in the TBIAOTANT

Psalms 102 in the TBT1E

Psalms 102 in the TBT1E2

Psalms 102 in the TFTIP

Psalms 102 in the TFTU

Psalms 102 in the TGNTATF3T

Psalms 102 in the THAI

Psalms 102 in the TNFD

Psalms 102 in the TNT

Psalms 102 in the TNTIK

Psalms 102 in the TNTIL

Psalms 102 in the TNTIN

Psalms 102 in the TNTIP

Psalms 102 in the TNTIZ

Psalms 102 in the TOMA

Psalms 102 in the TTENT

Psalms 102 in the UBG

Psalms 102 in the UGV

Psalms 102 in the UGV2

Psalms 102 in the UGV3

Psalms 102 in the VBL

Psalms 102 in the VDCC

Psalms 102 in the YALU

Psalms 102 in the YAPE

Psalms 102 in the YBVTP

Psalms 102 in the ZBP