Psalms 113 (BOICB)
1 Toonu ONYENWE ANYỊ! Toonu ONYENWE ANYỊ unu ndị ohu ya.Toonu aha ONYENWE ANYỊ. 2 Ka aha ONYENWE ANYỊ bụrụ ihe a gọziri agọzisite ugbu a ruo mgbe ebighị ebi. 3 Site nʼọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda ya,aha ONYENWE ANYỊ ga-abụ ihe a na-eto eto. 4 ONYENWE ANYỊ dị elu karịa mba niile,ebube ya dị elu karịa eluigwe. 5 Onye dị ka ONYENWE ANYỊ Chineke anyị,onye nọkwasịrị ocheeze nʼebe dị elu, 6 onye na-eme onwe ya ka ọ dị ala ilekwasịeluigwe na ụwa anya? 7 Ọ na-esi nʼuzuzu bulie ogbenye elusitekwa nʼebe ikpofu ahịhịa bulie onye nọ na mkpa elu; 8 ọ na-eme ka ya na ụmụ eze ndị ikom nọkọọ,ọ na-eme ka o soro ndị a maara aha ha nʼetiti ụmụ mmadụ nọkọọ. 9 Ọ na-eme ka nwanyị aga biri nʼụlọ nke yadịka nne mụrụ ọtụtụ ụmụ ọṅụ juru obi. Toonu ONYENWE ANYỊ.