Romans 13 (BOICB)

1 Ka onye ọbụla doo onwe ya nʼokpuru ndị na-achị achị, nʼihi na ikike ọchịchị ọbụla agaghị adị ma ọ bụrụ na Chineke akwadoghị ya. Ọ bụkwa Chineke tọrọ ntọala ikike ọchịchị niile e nwere. 2 Ya mere, onye ọbụla na-enupu isi nʼokpuru ọchịchị, na-emegide ihe Chineke hiwere, ndị na-eme nke a ga-ewetara onwe ha ikpe ọmụma. 3 Ndị na-eme ezi ihe anaghị atụ egwu ndị nọ nʼọchịchị, kama ndị na-atụ ha egwu bụ ndị na-eme ihe ọjọọ, ya mere ọ bụrụ na ị chọghị ịtụ ndị na-achị achị egwu, mee ihe dị mma, ha ga-etokwa gị. 4 Nʼihi na ọ bụ onyeozi Chineke maka ọdịmma nke gị, ma ọ bụrụ na unu mere ihe na-adịghị mma, tụọnụ egwu, nʼihi na onye na-achị achị nwere ezi nkwado ịta onye mere ihe ọjọọ ahụhụ. Ọ bụ onyeozi Chineke bụrụkwa onye na-eji ọnụma na-ata ndị mmebi iwu ahụhụ. 5 Ya mere unu kwesiri irubere ndị na-achị achị isi, ọ bụghị naanị maka ahụhụ dịrị ndị nnupu isi, kama nʼihi akọnuche. 6 Ọ bụkwa nke a kpatara unu ji na-atụ ụtụ isi nke taks, nʼihi na ndị na-achị achị na-ejere Chineke ozi mgbe ha na-aga nʼihu nʼezi ọchịchị. 7 Kwụghachinụ onye ọbụla ihe unu ji ha nʼụgwọ, ọ bụrụ na unu ji ụgwọ ụtụ taks, kwụọnụ ya, ọ bụrụkwa ụgwọ ụtụ isi nke akụnụba unu, ka unu ji, kwụọnụ ya. Ọ bụrụ na onye ọbụla kwesiri ka a sọpụrụ ya, sọpụrụnụ onye dị otu a, ọ bụrụkwa na onye ọbụla kwesiri ka a kwanyere ya ugwu kwanyerenụ ya ugwu. 8 Kwụọnụ ụgwọ niile unu ji. Ka ụgwọ unu ga-ejide ndị mmadụ bụrụ ụgwọ ịhụ ha nʼanya. Nʼihi na mgbe ị na-ahụ ndị mmadụ nʼanya, ị na-emezu ihe niile iwu chọrọ. 9 Iwu niile e nyere, “Gị akwala iko,” “Egbula mmadụ,” “Ezula ohi,” “Enwela anya ukwu nʼihe mmadụ ibe gị nwere,” nakwa iwu ndị ọzọ niile e nyere ka a chịkọtara nʼotu nke a sịrị: “Hụ mmadụ ibe gị nʼanya dịka onwe gị.” 10 Ịhụnanya adịghị echere onye agbataobi ya echiche ọjọọ, ya mere ịhụnanya bụ idebezu iwu niile. 11 Ihe ọzọ mere o ji dị mkpa ibi ezi ndụ bụ nke a. Unu maara na oge ahụ anyị na-ele anya ya abịala nso. Ya mere, sitenụ nʼụra bilie, nʼihi na nzọpụta anyị adịla nso ugbu a karịa mgbe ahụ anyị kweere na mbụ. 12 Abalị ekeela abụọ, ọ fọdụrụ ntakịrị ugbu a, ọ bụrụ ụtụtụ. Ka anyị yipụ uwe ọrụ nke ọchịchịrị, ma yikwasị ngwa agha nke ìhè. 13 Bụrụnụ ndị dị ọcha, dịka ndị na-akpagharị nʼehihie. Ọ bụghị nʼịgba egwu ruru unyi, maọbụ nʼịṅụbiga mmanya oke, ọ bụghị nʼịkwa iko, na imefe ihe ụwa oke. Ọ bụghị nʼesemokwu, na ekworo. 14 Kama yirinụ Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịka uwe. Unu enyekwala ahụ unu ohere inweta ihe niile nke na-agụ ya.

In Other Versions

Romans 13 in the ANGEFD

Romans 13 in the ANTPNG2D

Romans 13 in the AS21

Romans 13 in the BAGH

Romans 13 in the BBPNG

Romans 13 in the BBT1E

Romans 13 in the BDS

Romans 13 in the BEV

Romans 13 in the BHAD

Romans 13 in the BIB

Romans 13 in the BLPT

Romans 13 in the BNT

Romans 13 in the BNTABOOT

Romans 13 in the BNTLV

Romans 13 in the BOATCB

Romans 13 in the BOATCB2

Romans 13 in the BOBCV

Romans 13 in the BOCNT

Romans 13 in the BOECS

Romans 13 in the BOGWICC

Romans 13 in the BOHCB

Romans 13 in the BOHCV

Romans 13 in the BOHLNT

Romans 13 in the BOHNTLTAL

Romans 13 in the BOILNTAP

Romans 13 in the BOITCV

Romans 13 in the BOKCV

Romans 13 in the BOKCV2

Romans 13 in the BOKHWOG

Romans 13 in the BOKSSV

Romans 13 in the BOLCB

Romans 13 in the BOLCB2

Romans 13 in the BOMCV

Romans 13 in the BONAV

Romans 13 in the BONCB

Romans 13 in the BONLT

Romans 13 in the BONUT2

Romans 13 in the BOPLNT

Romans 13 in the BOSCB

Romans 13 in the BOSNC

Romans 13 in the BOTLNT

Romans 13 in the BOVCB

Romans 13 in the BOYCB

Romans 13 in the BPBB

Romans 13 in the BPH

Romans 13 in the BSB

Romans 13 in the CCB

Romans 13 in the CUV

Romans 13 in the CUVS

Romans 13 in the DBT

Romans 13 in the DGDNT

Romans 13 in the DHNT

Romans 13 in the DNT

Romans 13 in the ELBE

Romans 13 in the EMTV

Romans 13 in the ESV

Romans 13 in the FBV

Romans 13 in the FEB

Romans 13 in the GGMNT

Romans 13 in the GNT

Romans 13 in the HARY

Romans 13 in the HNT

Romans 13 in the IRVA

Romans 13 in the IRVB

Romans 13 in the IRVG

Romans 13 in the IRVH

Romans 13 in the IRVK

Romans 13 in the IRVM

Romans 13 in the IRVM2

Romans 13 in the IRVO

Romans 13 in the IRVP

Romans 13 in the IRVT

Romans 13 in the IRVT2

Romans 13 in the IRVU

Romans 13 in the ISVN

Romans 13 in the JSNT

Romans 13 in the KAPI

Romans 13 in the KBT1ETNIK

Romans 13 in the KBV

Romans 13 in the KJV

Romans 13 in the KNFD

Romans 13 in the LBA

Romans 13 in the LBLA

Romans 13 in the LNT

Romans 13 in the LSV

Romans 13 in the MAAL

Romans 13 in the MBV

Romans 13 in the MBV2

Romans 13 in the MHNT

Romans 13 in the MKNFD

Romans 13 in the MNG

Romans 13 in the MNT

Romans 13 in the MNT2

Romans 13 in the MRS1T

Romans 13 in the NAA

Romans 13 in the NASB

Romans 13 in the NBLA

Romans 13 in the NBS

Romans 13 in the NBVTP

Romans 13 in the NET2

Romans 13 in the NIV11

Romans 13 in the NNT

Romans 13 in the NNT2

Romans 13 in the NNT3

Romans 13 in the PDDPT

Romans 13 in the PFNT

Romans 13 in the RMNT

Romans 13 in the SBIAS

Romans 13 in the SBIBS

Romans 13 in the SBIBS2

Romans 13 in the SBICS

Romans 13 in the SBIDS

Romans 13 in the SBIGS

Romans 13 in the SBIHS

Romans 13 in the SBIIS

Romans 13 in the SBIIS2

Romans 13 in the SBIIS3

Romans 13 in the SBIKS

Romans 13 in the SBIKS2

Romans 13 in the SBIMS

Romans 13 in the SBIOS

Romans 13 in the SBIPS

Romans 13 in the SBISS

Romans 13 in the SBITS

Romans 13 in the SBITS2

Romans 13 in the SBITS3

Romans 13 in the SBITS4

Romans 13 in the SBIUS

Romans 13 in the SBIVS

Romans 13 in the SBT

Romans 13 in the SBT1E

Romans 13 in the SCHL

Romans 13 in the SNT

Romans 13 in the SUSU

Romans 13 in the SUSU2

Romans 13 in the SYNO

Romans 13 in the TBIAOTANT

Romans 13 in the TBT1E

Romans 13 in the TBT1E2

Romans 13 in the TFTIP

Romans 13 in the TFTU

Romans 13 in the TGNTATF3T

Romans 13 in the THAI

Romans 13 in the TNFD

Romans 13 in the TNT

Romans 13 in the TNTIK

Romans 13 in the TNTIL

Romans 13 in the TNTIN

Romans 13 in the TNTIP

Romans 13 in the TNTIZ

Romans 13 in the TOMA

Romans 13 in the TTENT

Romans 13 in the UBG

Romans 13 in the UGV

Romans 13 in the UGV2

Romans 13 in the UGV3

Romans 13 in the VBL

Romans 13 in the VDCC

Romans 13 in the YALU

Romans 13 in the YAPE

Romans 13 in the YBVTP

Romans 13 in the ZBP