Ruth 2 (BOICB)

1 Ma Naomi nwere otu nwanne di ya, onye bara ụba, bụrụkwa onye a maara nke ọma, onye si nʼagbụrụ Elimelek. Aha nwoke a bụ Boaz. 2 Rut onye Moab, gwara Naomi okwu sị ya, “Kwere ka m gaa nʼubi ebe a na-aghọ ọka, ka m lee ma m ga-achọta ihuọma nʼihu ndị na-aghọ ọka, ndị ga-ekwere ka m tụtụkọta ọka ndị ha hapụrụ.”Naomi zara sị ya, “Ọ dị mma nwa m, gaa.” 3 Ya mere, Rut pụrụ gaa na-atụtụ ọka nʼazụ ndị na-ewe ihe ubi. Ma dịka ihe si dị, Rut chọpụtara na ubi ọ na-atụtụ ọka bụ ubi Boaz, onye si nʼagbụrụ Elimelek. 4 Nʼoge ahụ, Boaz nʼonwe ya si na Betlehem bịarute nʼubi ahụ, kelee ndị ahụ na-aghọ mkpụrụ nʼubi sị ha, “ONYENWE ANYỊ nọnyere unu.”Ha niile zakwara sị ya, “ONYENWE ANYỊ gọzie gị.” 5 Mgbe Boaz hụrụ Rut, ọ jụrụ onyeisi ndị ọrụ ubi ya sị, “Onye ka nwanyị a bụ?” 6 Onye nlekọta ọrụ ubi ahụ zaghachiri, “Ọ bụ onye Moab ahụ so Naomi lọta. 7 Ọ sịrị, ‘Biko kwere ka m soro ndị ọrụ nʼazụ tụtụkọtaa ukwu ọka ha hapụrụ.’ Kemgbe ụtụtụ ọ bịara, ọ kwụsịbeghị ọrụ ya karịakwa naanị nwa mgbe nta o zuru ike nʼokpuru ndo.” 8 Ya mere, Boaz gwara Rut okwu sị ya, “Nwa m nwanyị, gee m ntị. Agakwala ịtụtụ ọka nʼubi ọzọ, esitekwala nʼebe a pụọ. Soro ụmụ agbọghọ na-ejere m ozi nọdụ nʼebe a. 9 Lezie anya nʼubi ebe ndị ikom na-ewe ihe ubi, ma soro ụmụ agbọghọ ndị a. Enyela m ndị ikom ndị a iwu ka ha ghara ịmetụ gị aka. Mgbe ọbụla agụụ mmiri gụrụ gị, gaa nʼite mmiri ndị ahụ ndị ikom gbanyere mmiri kuru mmiri ṅụọ.” 10 Mgbe Boaz na-agwa ya okwu, Rut hulatara isi ya ala. Emesịa o kwuru sị, “Gịnị mere m ji chọta ụdị amara dị otu a nʼebe ị nọ, na ị hụtara m, ebe ị maara na m bụ naanị onye mba ọzọ?” 11 Boaz zara sị ya, “Anụla m ihe niile i meere nne di gị site nʼoge di gị nwụrụ, na otu i si hapụ nne gị na nna gị, na ala ebe amụrụ gị, bịa nʼebe a ibi nʼetiti ndị ị na-amaghị na mbụ. 12 Ka ONYENWE ANYỊ kwụghachi gị ụgwọ ihe ọma ndị a i mere. Ka ONYENWE ANYỊ onye bụ Chineke Izrel, onye ị gbabara nʼokpuru nku ya izere ndụ kwụghachi gị nkwụghachi dị ukwu nʼihi ezi ọrụ gị niile.” 13 Rut zara sị ya, “Ka m gaa nʼihu na-achọta amara nʼebe ị nọ, onyenwe m. Nʼihi na ị kasịela m obi, gwakwa m, odibo nwanyị gị, okwu dị nro. Ọ bụ ezie na m abụghị otu nʼime ndị odibo nwanyị gị.” 14 Mgbe oge iri nri ruru, Boaz sịrị ya, “Bịa nso nʼebe a, were ụfọdụ nri rie, sunyekwa achịcha gị nʼime mmanya viniga.”Mgbe o soro ndị ahụ na-ewe ihe ubi nọdụ ala iri ihe, o nyere ya ụfọdụ ọka a hụrụ nʼọkụ. O riri, rijuo afọ ma nri e nyere ya fọdụrụ. 15 Mgbe o biliri ịchịkọtakwa ọka, Boaz nyere ụmụ okorobịa ya iwu, “Hapụnụ ya ka ọ chịkọta ọka ọ bụladị nʼetiti ukwu ọka ndị guzo eguzo, unu agwala ya okwu ihere ọbụla. 16 Unu sitekwa nʼukwu ọka mịpụtara ya ụfọdụ tụsara ya nʼala ka ọ tụtụrụ. Unu abarala ya mba.” 17 Ya mere, Rut tụtụrụ ọka nʼubi ahụ ruo oge anyasị. Mgbe ọ fuchasịrị ọka balị niile ọ tụtụtara, o nwetara ihe nwere ike iru otu bushel. 18 O buuru ya baa nʼime obodo, bunye ya nne di ya, nyekwa ya nri o rifọrọ mgbe o rijuchara afọ. 19 Nne di ya jụrụ ya, “Ebee ka ị tụtụrụ ọka taa? Ebee ka ị rụrụ ọrụ? Ka nwoke ahụ hụtara gị bụrụ onye a gọziri agọzi.”Rut kọọrọ nne di ya banyere onye ahụ ọ rụrụ ọrụ na nke ya. Ọ sịrị, “Aha nwoke mụ na ya rụrụ ọrụ bụ Boaz.” 20 Mgbe ahụ Naomi zara nwunye nwa ya sị, “Onye ONYENWE ANYỊ gọziri ka ọ bụ, onye na-ahapụbeghị igosi ebere ya nye ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ. Nwoke a bụ otu nʼime ndị agbụrụ anyị, otu onye nʼime ndị onye mgbapụta anyị.” 21 Mgbe ahụ Rut, onye Moab sịrị, “Ihe ọ sịkwara m bụ, ‘Nọnyere ndị ọrụ m tutu ruo mgbe ha ghọchara ọka niile dị nʼubi m.’ ” 22 Naomi sịrị Rut, nwunye nwa ya, “Nwa m nwanyị, ọ kaara gị mma ime dịka o kwuru. Soro ụmụ agbọghọ nọ nʼubi ya nʼazụ tụtụọ ọka ị na-atụtụ, nʼihi na nʼubi onye ọzọ, e nwere ike imerụ gị ahụ.” 23 Ya mere, Rut sogidere ụmụ agbọghọ Boaz na-atụtụ ọka, tutu ruo ọgwụgwụ ịghọ ọka balị na wiiti. Ya na nne di ya bigidekwara.

In Other Versions

Ruth 2 in the ANGEFD

Ruth 2 in the ANTPNG2D

Ruth 2 in the AS21

Ruth 2 in the BAGH

Ruth 2 in the BBPNG

Ruth 2 in the BBT1E

Ruth 2 in the BDS

Ruth 2 in the BEV

Ruth 2 in the BHAD

Ruth 2 in the BIB

Ruth 2 in the BLPT

Ruth 2 in the BNT

Ruth 2 in the BNTABOOT

Ruth 2 in the BNTLV

Ruth 2 in the BOATCB

Ruth 2 in the BOATCB2

Ruth 2 in the BOBCV

Ruth 2 in the BOCNT

Ruth 2 in the BOECS

Ruth 2 in the BOGWICC

Ruth 2 in the BOHCB

Ruth 2 in the BOHCV

Ruth 2 in the BOHLNT

Ruth 2 in the BOHNTLTAL

Ruth 2 in the BOILNTAP

Ruth 2 in the BOITCV

Ruth 2 in the BOKCV

Ruth 2 in the BOKCV2

Ruth 2 in the BOKHWOG

Ruth 2 in the BOKSSV

Ruth 2 in the BOLCB

Ruth 2 in the BOLCB2

Ruth 2 in the BOMCV

Ruth 2 in the BONAV

Ruth 2 in the BONCB

Ruth 2 in the BONLT

Ruth 2 in the BONUT2

Ruth 2 in the BOPLNT

Ruth 2 in the BOSCB

Ruth 2 in the BOSNC

Ruth 2 in the BOTLNT

Ruth 2 in the BOVCB

Ruth 2 in the BOYCB

Ruth 2 in the BPBB

Ruth 2 in the BPH

Ruth 2 in the BSB

Ruth 2 in the CCB

Ruth 2 in the CUV

Ruth 2 in the CUVS

Ruth 2 in the DBT

Ruth 2 in the DGDNT

Ruth 2 in the DHNT

Ruth 2 in the DNT

Ruth 2 in the ELBE

Ruth 2 in the EMTV

Ruth 2 in the ESV

Ruth 2 in the FBV

Ruth 2 in the FEB

Ruth 2 in the GGMNT

Ruth 2 in the GNT

Ruth 2 in the HARY

Ruth 2 in the HNT

Ruth 2 in the IRVA

Ruth 2 in the IRVB

Ruth 2 in the IRVG

Ruth 2 in the IRVH

Ruth 2 in the IRVK

Ruth 2 in the IRVM

Ruth 2 in the IRVM2

Ruth 2 in the IRVO

Ruth 2 in the IRVP

Ruth 2 in the IRVT

Ruth 2 in the IRVT2

Ruth 2 in the IRVU

Ruth 2 in the ISVN

Ruth 2 in the JSNT

Ruth 2 in the KAPI

Ruth 2 in the KBT1ETNIK

Ruth 2 in the KBV

Ruth 2 in the KJV

Ruth 2 in the KNFD

Ruth 2 in the LBA

Ruth 2 in the LBLA

Ruth 2 in the LNT

Ruth 2 in the LSV

Ruth 2 in the MAAL

Ruth 2 in the MBV

Ruth 2 in the MBV2

Ruth 2 in the MHNT

Ruth 2 in the MKNFD

Ruth 2 in the MNG

Ruth 2 in the MNT

Ruth 2 in the MNT2

Ruth 2 in the MRS1T

Ruth 2 in the NAA

Ruth 2 in the NASB

Ruth 2 in the NBLA

Ruth 2 in the NBS

Ruth 2 in the NBVTP

Ruth 2 in the NET2

Ruth 2 in the NIV11

Ruth 2 in the NNT

Ruth 2 in the NNT2

Ruth 2 in the NNT3

Ruth 2 in the PDDPT

Ruth 2 in the PFNT

Ruth 2 in the RMNT

Ruth 2 in the SBIAS

Ruth 2 in the SBIBS

Ruth 2 in the SBIBS2

Ruth 2 in the SBICS

Ruth 2 in the SBIDS

Ruth 2 in the SBIGS

Ruth 2 in the SBIHS

Ruth 2 in the SBIIS

Ruth 2 in the SBIIS2

Ruth 2 in the SBIIS3

Ruth 2 in the SBIKS

Ruth 2 in the SBIKS2

Ruth 2 in the SBIMS

Ruth 2 in the SBIOS

Ruth 2 in the SBIPS

Ruth 2 in the SBISS

Ruth 2 in the SBITS

Ruth 2 in the SBITS2

Ruth 2 in the SBITS3

Ruth 2 in the SBITS4

Ruth 2 in the SBIUS

Ruth 2 in the SBIVS

Ruth 2 in the SBT

Ruth 2 in the SBT1E

Ruth 2 in the SCHL

Ruth 2 in the SNT

Ruth 2 in the SUSU

Ruth 2 in the SUSU2

Ruth 2 in the SYNO

Ruth 2 in the TBIAOTANT

Ruth 2 in the TBT1E

Ruth 2 in the TBT1E2

Ruth 2 in the TFTIP

Ruth 2 in the TFTU

Ruth 2 in the TGNTATF3T

Ruth 2 in the THAI

Ruth 2 in the TNFD

Ruth 2 in the TNT

Ruth 2 in the TNTIK

Ruth 2 in the TNTIL

Ruth 2 in the TNTIN

Ruth 2 in the TNTIP

Ruth 2 in the TNTIZ

Ruth 2 in the TOMA

Ruth 2 in the TTENT

Ruth 2 in the UBG

Ruth 2 in the UGV

Ruth 2 in the UGV2

Ruth 2 in the UGV3

Ruth 2 in the VBL

Ruth 2 in the VDCC

Ruth 2 in the YALU

Ruth 2 in the YAPE

Ruth 2 in the YBVTP

Ruth 2 in the ZBP