1 Kings 11 (BOICB)

1 Ma eze Solomọn hụrụ ọtụtụ ndị inyom mba ọzọ nʼanya, tinyere nwa nwanyị Fero, ha bụ ndị inyom ndị Moab, ndị Amọn, ndị Edọm, ndị Saịdọn na ndị Het. 2 Ha bụ ndị sitere na mba ndị ahụ ONYENWE ANYỊ gwara Izrel sị, “Unu na ha agaghị alụrịtakwa di na nwunye, nʼihi na ha aghaghị ime ka obi unu gbasoo chi niile ha.” Ma, nʼagbanyeghị nke a, Solomọn rapara ha nʼahụ nʼihi ịhụnanya. 3 Ọnụọgụgụ ndị inyom Solomọn lụrụ dị narị asaa, bụ ndị amụrụ nʼobi ndị eze. O nwekwara ndị iko nwanyị, ọnụọgụgụ ha dị narị atọ. Ndị inyom ya duhiere obi ya. 4 Mgbe Solomọn ghọrọ agadi, ndị inyom ndị a duhiere obi ya mee ka ọ gbasoo chi ndị ọzọ, nke mere na o jikwaghị obi ya niile gbasoo ONYENWE ANYỊ Chineke ya, dịka Devid bụ nna ya mere. 5 Ọ gbasoro Ashtọret, bụ chi ndị Saịdọn na Molek, bụ chi rụrụ arụ nke ndị Amọn. 6 Nʼụzọ dị otu a, Solomọn mere ihe ọjọọ nʼanya ONYENWE ANYỊ. O soghị ụzọ ONYENWE ANYỊ dịka nna ya Devid si mee nʼụbọchị niile nke ndụ ya. 7 Nʼelu ugwu dị nʼọwụwa anyanwụ Jerusalem, Solomọn wuru ebe dị elu nye Kemosh, chi rụrụ arụ nke ndị Moab, wuokwara Molek chi rụrụ arụ nke ndị Amọn. 8 O mekwara otu ihe ahụ nye ndị nwunye ya niile si mba ọzọ, bụ ndị na-achụ aja nsure ọkụ ihe na-esi isi ụtọ, na-achụkwa aja nsure ọkụ dị iche iche nye chi niile ha. 9 ONYENWE ANYỊ were iwe dị ukwuu megide Solomọn, nʼihi na obi ya esitela nʼebe ONYENWE ANYỊ Chineke Izrel nọ pụọ, bụ onye mere ka ọ hụ ya anya ugboro abụọ. 10 Ọ bụ ezie na o nyere Solomọn iwu ka ọ ghara ịgbaso chi ndị ọzọ, ma Solomọn erubeghị isi nʼiwu a ONYENWE ANYỊ nyere. 11 Ya mere, ONYENWE ANYỊ gwara Solomọn okwu sị, “Ebe ọ bụ na i mere ihe dị otu a, jụ idebe ọgbụgba ndụ m na ụkpụrụ m, nke m nyere gị idebe, aghaghị m isite nʼaka gị dọkapụ alaeze a, were ya nye otu nʼime ndị na-ejere gị ozi. 12 Ma nʼihi nna gị Devid agaghị m eme ihe ndị a mgbe ị dị ndụ. Aga m anapụ nwa gị nwoke alaeze Izrel. 13 Ma agaghị m anapụcha ya alaeze Izrel niile, kama aga m eme ka ọ bụrụ eze otu ebo Izrel, nʼihi Devid, na nʼihi Jerusalem, obodo m họpụtara nye onwe m.” 14 Mgbe ahụ, ONYENWE ANYỊ mere ka onye iro bilie megide Solomọn. Onye a bụ Hadad onye Edọm, onye sikwa nʼezinaụlọ ndị eze Edọm. 15 Nʼoge gara aga, mgbe Devid na-ebuso ndị Edọm agha, Joab, onyeisi ndị agha, onye gara ili ndị agha e gburu egbu, tigburu ndị ikom niile nọ nʼEdọm. 16 Joab na ndị agha Izrel niile nọgidere nʼebe ahụ ọnwa isii, tutu ruo mgbe ha gbuchapụrụ ndị ikom niile nọ nʼEdọm. 17 Ma Hadad, onye bụ nwantakịrị nʼoge ahụ, gbapụrụ ọsọ gbaga Ijipt, ya na ụfọdụ ndịisi ọchịchị Edọm, ndị jeere nna ya ozi. 18 Ha sitere nʼala Midia gaa Paran. Site na Paran, ha duuru ụfọdụ ndị mmadụ, ndị sooro ha gaa Ijipt, jekwuru Fero eze Ijipt, onye nyere Hadad ụlọ obibi na ala, nyekwa ya ihe oriri. 19 Hadad hụtara amara nʼihu Fero, nke mere na ọ kpọnyere ya nwanne nwanyị Tapenes bụ nwunye eze ka ọ bụrụ nwunye ya. 20 Nwanne Tapenes mụtara ya nwa nwoke aha ya bụ Genubat, onye Tapenes zụlitere nʼụlọeze. Genubat biri nʼetiti ụmụ Fero. 21 Mgbe Hadad nọ nʼIjipt, ọ nụrụ na Devid sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ na Joab ọchịagha ndị agha anwụọkwala, ọ rịọrọ Fero arịrịọ ka o kwenye ka ọ laghachi nʼEdọm. 22 Fero jụrụ ya ajụjụ sị ya, “Gịnị mere i ji chọọ ịla? O nwere ihe ị chọrọ nke ị na-adịghị enweta nʼebe a?”Hadad zara sị ya, “O nweghị ihe kọrọ m, kama kwere ka m laghachi.” 23 Nwoke ọzọ Chineke mere ka ọ bụrụ onye iro Solomọn bụ Rezon nwa Eliada, onye gbapụrụ site nʼaka nna ya ukwu bụ Hadadeza, eze Zoba. 24 Devid lara ndị agha Zoba nʼiyi, Rezon chịkọtara ndị ikom gbara ya gburugburu, ghọọ onyendu ha, ndị nnupu isi a gara Damaskọs biri nʼebe ahụ, na-achịkwa nʼebe ahụ. 25 Ogologo ụbọchị niile nke ndụ Solomọn, Rezon bụ onye iro Izrel, tinyekwara nsogbu nke Hadad wetaara Izrel. Rezon bụ eze ndị Aram, bụrụkwa onye na-emegide Izrel. 26 Jeroboam nwa Nebat, onye Ifrem nke Zereda, otu nʼime ndị ozi Solomọn, biliri megide eze. Nne ya bụ Zerua, nwanyị di ya nwụrụ anwụ. 27 Nke a bụ akụkọ banyere otu o siri bilie imegide eze: Solomọn wugharịrị Milo, wuziekwa ntipu dị na mgbidi obodo Devid bụ nna ya. 28 Ugbu a Jeroboam, nʼonwe ya, bụ dimkpa. Mgbe Solomọn hụrụ otu nwokorobịa a si arụzi ọrụ ya nke ọma, o mere ya onye nlekọta ndị ọrụ niile si nʼezinaụlọ Josef. 29 Ma otu ụbọchị, mgbe Jeroboam si Jerusalem na-apụ, o zutere Ahija onye amụma, onye Shilo, nʼụzọ, ebe o yi uwe ọhụrụ. Ọ bụkwa naanị ha abụọ nọ nʼọhịa mgbe ahụ. 30 Mgbe ahụ, Ahija yipụrụ uwe ọhụrụ nke o yi nʼahụ dọwasịa ya ụzọ iri na abụọ. 31 Mgbe ahụ, ọ gwara Jeroboam sị, “Chịrị iberibe iri nye onwe gị, nʼihi na otu a ka ONYENWE ANYỊ, Chineke Izrel sịrị, ‘Lee, aga m anapụ Solomọn alaeze a, ma aga m enyekwa gị ebo iri nʼime ha. 32 Ma aga m ahapụrụ ya otu ebo, nʼihi ohu m Devid na nʼihi Jerusalem obodo m họpụtara site nʼebo niile nke Izrel. 33 Nʼihi na ha ahapụla m malite ịkpọ isiala nye Ashtọret, chi nwanyị ndị Saịdọn; na nyekwa Kemosh, chi ndị Moab; na nye Molek, chi ụmụ Amọn. Ha agbasoghị ụzọ m, ha emekwaghị ihe ndị ahụ m gụrụ dịka ezi ihe. Ha edebeghị iwu m na ụkpụrụ m niile dịka Devid nna Solomọn mere. 34 “ ‘Ma agaghị m anapụ alaeze ya ugbu a, nʼihi ohu m Devid, onye m họpụtara, na onye mere ihe tọrọ m ụtọ. Aga m ahapụ Solomọn ka ọ nọgide dịka eze ụbọchị ndụ ya niile. 35 Ma aga m anapụ alaeze ya site nʼaka nwa ya, nye gị ebo iri. 36 Nwa ya ka m ga-enye otu ebo, nʼihi na achọrọ m ka Devid ohu m nọgide ịbụ eze Jerusalem, obodo m họpụtara nye onwe m, ebe m mere ka Aha m dịrị. 37 Ma otu ọ dị, gị ka m ga-ewere. Ị ga-abụkwa onye ga-achị ebe ahụ niile obi gị chọrọ; i ga-abụ eze Izrel. 38 Ọ bụrụ na i gee ntị mee ihe niile m ga-enye gị nʼiwu, jekwa ije nʼirubere m isi, mee ihe ziri ezi nʼanya m, site nʼidebe ụkpụrụ niile na iwu niile, dịka ohu m Devid mere, aga m anọnyere gị. Aga m ewuru gị ụlọ ga-adịgide dịka m siri wuoro Devid. Aga m enyekwa gị Izrel. 39 Aga m eweda agbụrụ Devid nʼihi ihe a, ma ha agaghị abụ ndị e wedara nʼala ruo ebighị ebi.’ ” 40 Solomọn gbalịrị igbu Jeroboam, ma Jeroboam gbaara ọsọ gbakwuru eze Shishak nke Ijipt. Ọ nọkwara nʼIjipt ruo mgbe Solomọn nwụrụ. 41 Ma banyere ihe ndị ọzọ mere nʼoge ọchịchị Solomọn, nke bụ, ihe niile o mere na amamihe o gosipụtara, ọ bụ na-edeghị ha nʼakwụkwọ akụkọ nke Solomọn? 42 Solomọn chịrị Izrel niile iri afọ anọ na Jerusalem. 43 O sooro nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya nʼobodo Devid bụ nna ya. Rehoboam nwa ya, ghọkwara eze nʼọnọdụ nna ya.

In Other Versions

1 Kings 11 in the ANGEFD

1 Kings 11 in the ANTPNG2D

1 Kings 11 in the AS21

1 Kings 11 in the BAGH

1 Kings 11 in the BBPNG

1 Kings 11 in the BBT1E

1 Kings 11 in the BDS

1 Kings 11 in the BEV

1 Kings 11 in the BHAD

1 Kings 11 in the BIB

1 Kings 11 in the BLPT

1 Kings 11 in the BNT

1 Kings 11 in the BNTABOOT

1 Kings 11 in the BNTLV

1 Kings 11 in the BOATCB

1 Kings 11 in the BOATCB2

1 Kings 11 in the BOBCV

1 Kings 11 in the BOCNT

1 Kings 11 in the BOECS

1 Kings 11 in the BOGWICC

1 Kings 11 in the BOHCB

1 Kings 11 in the BOHCV

1 Kings 11 in the BOHLNT

1 Kings 11 in the BOHNTLTAL

1 Kings 11 in the BOILNTAP

1 Kings 11 in the BOITCV

1 Kings 11 in the BOKCV

1 Kings 11 in the BOKCV2

1 Kings 11 in the BOKHWOG

1 Kings 11 in the BOKSSV

1 Kings 11 in the BOLCB

1 Kings 11 in the BOLCB2

1 Kings 11 in the BOMCV

1 Kings 11 in the BONAV

1 Kings 11 in the BONCB

1 Kings 11 in the BONLT

1 Kings 11 in the BONUT2

1 Kings 11 in the BOPLNT

1 Kings 11 in the BOSCB

1 Kings 11 in the BOSNC

1 Kings 11 in the BOTLNT

1 Kings 11 in the BOVCB

1 Kings 11 in the BOYCB

1 Kings 11 in the BPBB

1 Kings 11 in the BPH

1 Kings 11 in the BSB

1 Kings 11 in the CCB

1 Kings 11 in the CUV

1 Kings 11 in the CUVS

1 Kings 11 in the DBT

1 Kings 11 in the DGDNT

1 Kings 11 in the DHNT

1 Kings 11 in the DNT

1 Kings 11 in the ELBE

1 Kings 11 in the EMTV

1 Kings 11 in the ESV

1 Kings 11 in the FBV

1 Kings 11 in the FEB

1 Kings 11 in the GGMNT

1 Kings 11 in the GNT

1 Kings 11 in the HARY

1 Kings 11 in the HNT

1 Kings 11 in the IRVA

1 Kings 11 in the IRVB

1 Kings 11 in the IRVG

1 Kings 11 in the IRVH

1 Kings 11 in the IRVK

1 Kings 11 in the IRVM

1 Kings 11 in the IRVM2

1 Kings 11 in the IRVO

1 Kings 11 in the IRVP

1 Kings 11 in the IRVT

1 Kings 11 in the IRVT2

1 Kings 11 in the IRVU

1 Kings 11 in the ISVN

1 Kings 11 in the JSNT

1 Kings 11 in the KAPI

1 Kings 11 in the KBT1ETNIK

1 Kings 11 in the KBV

1 Kings 11 in the KJV

1 Kings 11 in the KNFD

1 Kings 11 in the LBA

1 Kings 11 in the LBLA

1 Kings 11 in the LNT

1 Kings 11 in the LSV

1 Kings 11 in the MAAL

1 Kings 11 in the MBV

1 Kings 11 in the MBV2

1 Kings 11 in the MHNT

1 Kings 11 in the MKNFD

1 Kings 11 in the MNG

1 Kings 11 in the MNT

1 Kings 11 in the MNT2

1 Kings 11 in the MRS1T

1 Kings 11 in the NAA

1 Kings 11 in the NASB

1 Kings 11 in the NBLA

1 Kings 11 in the NBS

1 Kings 11 in the NBVTP

1 Kings 11 in the NET2

1 Kings 11 in the NIV11

1 Kings 11 in the NNT

1 Kings 11 in the NNT2

1 Kings 11 in the NNT3

1 Kings 11 in the PDDPT

1 Kings 11 in the PFNT

1 Kings 11 in the RMNT

1 Kings 11 in the SBIAS

1 Kings 11 in the SBIBS

1 Kings 11 in the SBIBS2

1 Kings 11 in the SBICS

1 Kings 11 in the SBIDS

1 Kings 11 in the SBIGS

1 Kings 11 in the SBIHS

1 Kings 11 in the SBIIS

1 Kings 11 in the SBIIS2

1 Kings 11 in the SBIIS3

1 Kings 11 in the SBIKS

1 Kings 11 in the SBIKS2

1 Kings 11 in the SBIMS

1 Kings 11 in the SBIOS

1 Kings 11 in the SBIPS

1 Kings 11 in the SBISS

1 Kings 11 in the SBITS

1 Kings 11 in the SBITS2

1 Kings 11 in the SBITS3

1 Kings 11 in the SBITS4

1 Kings 11 in the SBIUS

1 Kings 11 in the SBIVS

1 Kings 11 in the SBT

1 Kings 11 in the SBT1E

1 Kings 11 in the SCHL

1 Kings 11 in the SNT

1 Kings 11 in the SUSU

1 Kings 11 in the SUSU2

1 Kings 11 in the SYNO

1 Kings 11 in the TBIAOTANT

1 Kings 11 in the TBT1E

1 Kings 11 in the TBT1E2

1 Kings 11 in the TFTIP

1 Kings 11 in the TFTU

1 Kings 11 in the TGNTATF3T

1 Kings 11 in the THAI

1 Kings 11 in the TNFD

1 Kings 11 in the TNT

1 Kings 11 in the TNTIK

1 Kings 11 in the TNTIL

1 Kings 11 in the TNTIN

1 Kings 11 in the TNTIP

1 Kings 11 in the TNTIZ

1 Kings 11 in the TOMA

1 Kings 11 in the TTENT

1 Kings 11 in the UBG

1 Kings 11 in the UGV

1 Kings 11 in the UGV2

1 Kings 11 in the UGV3

1 Kings 11 in the VBL

1 Kings 11 in the VDCC

1 Kings 11 in the YALU

1 Kings 11 in the YAPE

1 Kings 11 in the YBVTP

1 Kings 11 in the ZBP