1 Kings 13 (BOICB)

1 Otu onye nke Chineke si Juda bịa Betel, site nʼokwu nke ONYENWE ANYỊ oge Jeroboam guzo nʼebe ịchụ aja ka ọ chụọ aja. 2 O tiri mkpu nʼoke olu megide ebe ịchụ aja ahụ dịka okwu ONYENWE ANYỊ si dị, “Ebe ịchụ aja, ebe ịchụ aja! Otu a ka ONYENWE ANYỊ na-ekwu: ‘A ga-amụ otu nwa nwoke nʼụlọ Devid, aha ya ga-abụ Josaya. Ọ ga-eji ndị nchụaja niile nke ebe dị elu, bụ ndị na-achụ aja nʼelu gị, chụọ aja nʼelu gị. A ga-esurekwa ọkpụkpụ ndị mmadụ ọkụ nʼelu gị.’ ” 3 Nʼụbọchị ahụ, onye nke Chineke ahụ kwuru okwu banyere ihe ịrịbama ga-emezu. O kwuru sị, “Nke a bụ ihe ịrịbama ONYENWE ANYỊ ji emesi okwu ya ike: Ebe ịchụ aja a ga-agbawa ụzọ abụọ. Ntụ dị nʼelu ya ga-awụsasị nʼala.” 4 Mgbe eze Jeroboam nụrụ ihe onye nke Chineke ahụ kwuru megide ebe ịchụ aja Betel, o setịpụrụ aka ya site nʼebe ịchụ aja ahụ sị, “Jidenụ nwoke a!” Ma aka ahụ ọ setịpụrụ tụgide nwoke ahụ kpọnwụrụ na o nwekwaghị ike iweghachi ya azụ ọzọ. 5 Ọzọkwa, ebe ịchụ aja ahụ gbawara abụọ, ntụ dị nʼelu ya wụsịkwara nʼala dịka ihe ịrịbama nke onye amụma Chineke nyere, site nʼokwu ONYENWE ANYỊ. 6 Mgbe ahụ, eze sịrị onye nke Chineke ahụ, “Biko, rịọọ ONYENWE ANYỊ Chineke gị, kpekwara m ekpere ka e nyeghachi m aka m.” Ya mere, onye nke Chineke ahụ rịọrọ ONYENWE ANYỊ site nʼekpere, emekwara ka aka eze dịghachi dịkwa ka ọ dị na mbụ. 7 Emesịa, eze gwara onye nke Chineke ahụ okwu sị, “Soro m gaa nʼụlọ m. Aga m enye gị ihe oriri, nyekwa gị onyinye.” 8 Ma onye nke Chineke ahụ zara eze sị, “Ọ bụrụ na i nye m ọkara ihe niile i nwere, agaghị m eso gị baa nʼime ụlọ gị. Agaghị m erikwa nri gị maọbụ ṅụọ mmiri nʼebe a. 9 Nʼihi na-enyere m iwu site nʼokwu ONYENWE ANYỊ, sị, ‘Erila nri, aṅụkwala mmiri, esitekwala ụzọ i si gaa laghachi.’ ” 10 Ya mere, o sitere nʼụzọ ọzọ lawa, nke na-abụghị ụzọ o si bịa Betel. 11 Ma o nwere otu onye amụma bụ agadi bi na Betel. Onye ụmụ ya bịara kọọrọ ihe niile onye nke Chineke ahụ mere nʼụbọchị ahụ na Betel, ha kọkwaara nna ha ihe niile ọ gwara eze. 12 Nna ha jụrụ ha, “Olee ụzọ ọ gara?” Ụmụ ya ndị ikom ziri ya ụzọ nke onye nke Chineke ahụ si Juda gara. 13 Mgbe ahụ, ọ sịrị ụmụ ya ndị ikom, “Jikekwaranụ m ịnyịnya ibu m.” Ha jikekwaara ya ịnyịnya ibu, ọ nọkwasịrị nʼelu ya. 14 Ọ gbasooro onye nke Chineke nʼazụ, ọ hụrụ ya ka ọ nọ ala nʼokpuru osisi ook, Ọ sịrị ya, “Ọ bụ gị bụ onye nke Chineke ahụ si Juda bịa?”Ọ zara, “E, ọ bụ mụ onwe m.” 15 Onye amụma ahụ sịrị ya, “Soro m ka anyị gaa nʼụlọ m, ka i rie nri.” 16 Ma ọ sịrị, “Apụghị m iso gị laghachi azụ, maọbụ rie nri, ma ọ bụkwa ṅụọ mmiri ọbụla nʼebe a. 17 Nʼihi na a gwara m site nʼokwu ONYENWE ANYỊ sị, ‘Erikwala nri maọbụ ṅụọ mmiri nʼebe ahụ, maọbụ soro ụzọ ị si gaa lọtakwa.’ ” 18 Ma onye nke ọzọ sịrị ya, “Mụ onwe m bụkwa onye amụma dịka gị, mmụọ ozi zikwara m ozi site nʼokwu ONYENWE ANYỊ sị, ‘Kpọrọ ya ka o soro gị laghachi nʼụlọ gị, ka o rie nri, ṅụọkwa mmiri.’ ” (Ma ọ gwara ya okwu ụgha.) 19 Ya mere, nwoke nke Chineke ahụ soro ya laghachi rie nri, ṅụọkwa mmiri. 20 Ma mgbe ha abụọ nọdụ na-eri ihe na tebul, okwu ONYENWE ANYỊ rutere onye amụma agadi ahụ ntị, bụ onye mere ka ọ lọghachi azụ. 21 Ọ kpọrọ onye nke Chineke ahụ si Juda bịa sị ya, “Otu a ka ONYENWE ANYỊ na-ekwu, ‘Nʼihi na ị nupula isi nʼokwu ọnụ ONYENWE ANYỊ, hapụ idebe iwu ONYENWE ANYỊ Chineke gị nyere gị. 22 Ị laghachikwara nʼebe a, rie nri, ṅụọkwa mmiri, bụ ebe ọ gwara gị sị gị, erila nri, aṅụkwala mmiri. Ya mere, agaghị eli ozu gị nʼala ili nna gị ha.’ ” 23 Mgbe onye nke Chineke ahụ risiri nri, ṅụọkwa ihe ọṅụṅụ, ha kwadooro ya ịnyịnya ibu nke onye amụma ahụ kpọghachiri ya azụ. 24 Dịka ọ na-alaghachi, otu ọdụm zutere ya nʼụzọ, dọgbuo ya. Ma ọ hapụrụ ozu ya ka ọ tọgbọrọ nʼokporoụzọ, ma ịnyịnya ibu ya ma ọdụm ahụ dọgburu nwoke ahụ guzokwa nʼakụkụ ozu ya. 25 Ndị mmadụ na-agafe hụrụ ozu ahụ ka ọ tọgbọrọ nʼụzọ, hụkwa ka ọdụm ahụ guzo nʼakụkụ ya. Ndị a gara kọọ akụkọ ihe ha hụrụ nʼụzọ nʼobodo ebe onye amụma agadi ahụ bi. 26 Mgbe onye amụma ahụ mere ka ọ laghachi azụ nụrụ ihe mere, ọ sịrị, “Ọ bụ onye nke Chineke ahụ nupuru isi nʼokwu ONYENWE ANYỊ. ONYENWE ANYỊ enyefeela ya nʼaka ọdụm, nke dọgburu ma gbukwaa ya, dịka okwu ONYENWE ANYỊ dọrọ ya aka na ntị.” 27 Mgbe ahụ, ọ sịrị ụmụ ya ndị ikom, “Jikekwaranụ m ịnyịnya ibu.” Ha mere otu a. 28 Ọ pụrụ gaa chọta ozu nwoke ahụ ka ọ tọgbọrọ nʼụzọ. Ịnyịnya ibu ya na ọdụm ahụ guzokwa nʼakụkụ ozu ahụ. Ọdụm erighị anụ nwoke ahụ, ọ dọgbukwaghị ịnyịnya ibu ahụ. 29 Onye amụma agadi ahụ buliri ozu onye nke Chineke ahụ dọkwasị ya nʼelu ịnyịnya ibu ya, buru ya bughachi ya nʼobodo, nʼihi iruru ya ụjụ, nakwa ili ya. 30 O liri ozu onye nke Chineke ahụ nʼili nke aka ya. Mgbe o liri ya, ọ kwara akwa sị, “Ewoo nwanna m!” 31 Mgbe o lisiri ya, ọ gwara ụmụ ya ndị ikom sị, “Mgbe m nwụrụ, lienụ m nʼotu ili a e liri onye nke Chineke; doonụ ọkpụkpụ m ka ọ dịrị nʼakụkụ ọkpụkpụ ya. 32 Nʼihi na ozi ahụ niile o ziri site nʼokwu ONYENWE ANYỊ megide ebe ịchụ aja dị na Betel, na megidekwa ebe ụlọ arụsị niile dị nʼebe dị elu nʼobodo Sameria aghaghị imezu.” 33 Nʼagbanyeghị ihe ndị a niile, Jeroboam esiteghị nʼụzọ ọjọọ ya tụgharịa. Kama ọ gara nʼihu họpụta ndị nchụaja maka ebe niile dị elu site nʼetiti ndị mmadụ efu. Onye ọbụla chọrọ ị bụ onye nchụaja ka o doro nsọ maka ije ozi nʼebe niile dị elu. 34 Nke a bụ mmehie ezinaụlọ Jeroboam. Ọ bụ ya mere alaeze Jeroboam ji daa, meekwa ka e kpochapụ ya nʼelu ụwa.

In Other Versions

1 Kings 13 in the ANGEFD

1 Kings 13 in the ANTPNG2D

1 Kings 13 in the AS21

1 Kings 13 in the BAGH

1 Kings 13 in the BBPNG

1 Kings 13 in the BBT1E

1 Kings 13 in the BDS

1 Kings 13 in the BEV

1 Kings 13 in the BHAD

1 Kings 13 in the BIB

1 Kings 13 in the BLPT

1 Kings 13 in the BNT

1 Kings 13 in the BNTABOOT

1 Kings 13 in the BNTLV

1 Kings 13 in the BOATCB

1 Kings 13 in the BOATCB2

1 Kings 13 in the BOBCV

1 Kings 13 in the BOCNT

1 Kings 13 in the BOECS

1 Kings 13 in the BOGWICC

1 Kings 13 in the BOHCB

1 Kings 13 in the BOHCV

1 Kings 13 in the BOHLNT

1 Kings 13 in the BOHNTLTAL

1 Kings 13 in the BOILNTAP

1 Kings 13 in the BOITCV

1 Kings 13 in the BOKCV

1 Kings 13 in the BOKCV2

1 Kings 13 in the BOKHWOG

1 Kings 13 in the BOKSSV

1 Kings 13 in the BOLCB

1 Kings 13 in the BOLCB2

1 Kings 13 in the BOMCV

1 Kings 13 in the BONAV

1 Kings 13 in the BONCB

1 Kings 13 in the BONLT

1 Kings 13 in the BONUT2

1 Kings 13 in the BOPLNT

1 Kings 13 in the BOSCB

1 Kings 13 in the BOSNC

1 Kings 13 in the BOTLNT

1 Kings 13 in the BOVCB

1 Kings 13 in the BOYCB

1 Kings 13 in the BPBB

1 Kings 13 in the BPH

1 Kings 13 in the BSB

1 Kings 13 in the CCB

1 Kings 13 in the CUV

1 Kings 13 in the CUVS

1 Kings 13 in the DBT

1 Kings 13 in the DGDNT

1 Kings 13 in the DHNT

1 Kings 13 in the DNT

1 Kings 13 in the ELBE

1 Kings 13 in the EMTV

1 Kings 13 in the ESV

1 Kings 13 in the FBV

1 Kings 13 in the FEB

1 Kings 13 in the GGMNT

1 Kings 13 in the GNT

1 Kings 13 in the HARY

1 Kings 13 in the HNT

1 Kings 13 in the IRVA

1 Kings 13 in the IRVB

1 Kings 13 in the IRVG

1 Kings 13 in the IRVH

1 Kings 13 in the IRVK

1 Kings 13 in the IRVM

1 Kings 13 in the IRVM2

1 Kings 13 in the IRVO

1 Kings 13 in the IRVP

1 Kings 13 in the IRVT

1 Kings 13 in the IRVT2

1 Kings 13 in the IRVU

1 Kings 13 in the ISVN

1 Kings 13 in the JSNT

1 Kings 13 in the KAPI

1 Kings 13 in the KBT1ETNIK

1 Kings 13 in the KBV

1 Kings 13 in the KJV

1 Kings 13 in the KNFD

1 Kings 13 in the LBA

1 Kings 13 in the LBLA

1 Kings 13 in the LNT

1 Kings 13 in the LSV

1 Kings 13 in the MAAL

1 Kings 13 in the MBV

1 Kings 13 in the MBV2

1 Kings 13 in the MHNT

1 Kings 13 in the MKNFD

1 Kings 13 in the MNG

1 Kings 13 in the MNT

1 Kings 13 in the MNT2

1 Kings 13 in the MRS1T

1 Kings 13 in the NAA

1 Kings 13 in the NASB

1 Kings 13 in the NBLA

1 Kings 13 in the NBS

1 Kings 13 in the NBVTP

1 Kings 13 in the NET2

1 Kings 13 in the NIV11

1 Kings 13 in the NNT

1 Kings 13 in the NNT2

1 Kings 13 in the NNT3

1 Kings 13 in the PDDPT

1 Kings 13 in the PFNT

1 Kings 13 in the RMNT

1 Kings 13 in the SBIAS

1 Kings 13 in the SBIBS

1 Kings 13 in the SBIBS2

1 Kings 13 in the SBICS

1 Kings 13 in the SBIDS

1 Kings 13 in the SBIGS

1 Kings 13 in the SBIHS

1 Kings 13 in the SBIIS

1 Kings 13 in the SBIIS2

1 Kings 13 in the SBIIS3

1 Kings 13 in the SBIKS

1 Kings 13 in the SBIKS2

1 Kings 13 in the SBIMS

1 Kings 13 in the SBIOS

1 Kings 13 in the SBIPS

1 Kings 13 in the SBISS

1 Kings 13 in the SBITS

1 Kings 13 in the SBITS2

1 Kings 13 in the SBITS3

1 Kings 13 in the SBITS4

1 Kings 13 in the SBIUS

1 Kings 13 in the SBIVS

1 Kings 13 in the SBT

1 Kings 13 in the SBT1E

1 Kings 13 in the SCHL

1 Kings 13 in the SNT

1 Kings 13 in the SUSU

1 Kings 13 in the SUSU2

1 Kings 13 in the SYNO

1 Kings 13 in the TBIAOTANT

1 Kings 13 in the TBT1E

1 Kings 13 in the TBT1E2

1 Kings 13 in the TFTIP

1 Kings 13 in the TFTU

1 Kings 13 in the TGNTATF3T

1 Kings 13 in the THAI

1 Kings 13 in the TNFD

1 Kings 13 in the TNT

1 Kings 13 in the TNTIK

1 Kings 13 in the TNTIL

1 Kings 13 in the TNTIN

1 Kings 13 in the TNTIP

1 Kings 13 in the TNTIZ

1 Kings 13 in the TOMA

1 Kings 13 in the TTENT

1 Kings 13 in the UBG

1 Kings 13 in the UGV

1 Kings 13 in the UGV2

1 Kings 13 in the UGV3

1 Kings 13 in the VBL

1 Kings 13 in the VDCC

1 Kings 13 in the YALU

1 Kings 13 in the YAPE

1 Kings 13 in the YBVTP

1 Kings 13 in the ZBP