1 Kings 14 (BOICB)

1 Nʼoge a, Abija nwa Jeroboam nọ nʼọrịa nke dị ukwuu. 2 Nʼihi ya, Jeroboam sịrị nwunye ya, “Gaa, jikwaa onwe gị nʼụzọ mmadụ na-enweghị ike ịmata na ị bụ nwunye Jeroboam. Ị ga-ejekwa Shaịlo, Ahija onye amụma nọ nʼebe ahụ, bụ nwoke ahụ gwara m okwu na m ga-abụ eze ndị nke a. 3 Chịrịkwa ogbe achịcha iri, na achịcha nta ole na ole, na otu karama mmanụ aṅụ, jekwuru ya. Ọ ga-agwa gị ihe ga-eme banyere nwantakịrị a.” 4 Nwunye Jeroboam mere ihe o kwuru, o biliri jee nʼụlọ Ahija na Shaịlo.Ahija bụ agadi nwoke nʼoge a. Ọ naghị ahụkwa ụzọ nʼihi nka ọ kara. 5 Ma ONYENWE ANYỊ agwalarị Ahija okwu sị ya, “Nwunye Jeroboam na-abịa ịjụta ase nʼaka gị banyere nwa ya nwoke ahụ na-adịghị ike, ọsịsa dị otu a ka i ganye ya. Mgbe ọ ga-abịa ịhụ gị ọ ga-eme onwe ya dịka ọ bụghị nwunye Jeroboam.” 6 Mgbe Ahija nụrụ ụda nzọ ụkwụ ya ka ọ na-abata nʼọnụ ụzọ, ọ kpọrọ ya oku sị ya, “Bata, nwunye Jeroboam. Gịnị mere i ji jie ejiji dịka onye ọzọ? Enwere m akụkọ ọjọọ m ga-akọrọ gị 7 Ga gwa Jeroboam sị ya, Otu a ka ONYENWE ANYỊ, Chineke Izrel kwuru, ‘Esi m nʼetiti ndị m welie gị elu, mee gị ka ị bụrụ onye ga-achị ndị m, bụ Izrel. 8 Adọwapụrụ m alaeze Izrel site nʼụlọ Devid nye gị ya, ma ị geghị ntị nʼiwu m, maọbụ debe ha dịka ohu m Devid debere ihe niile m nyere ya nʼiwu. Onye echiche obi ya na ihe na-atọ obi ya ụtọ mgbe niile bụ idebe iwu m, na ime ihe ziri ezi nʼanya m. 9 Ma ihe ọjọọ i mere adịla ukwuu karịa nke ndị niile bu gị ụzọ bụrụ eze mere. Ị kpụọlara onwe gị chi ndị ọzọ, chi ndị e ji ọla kpụọ, si otu a kpasuo m iwe, gbakụta m azụ gị. 10 “ ‘Nʼihi ihe ndị a, aga m eme ka ihe ọjọọ bịakwasị ezinaụlọ Jeroboam. Aga m ekpochapụkwa ụmụ ndị ikom gị niile, ma ndị ohu, ma ndị nwe onwe ha nọ nʼala Izrel. Aga m ekpochapụkwa ụlọ Jeroboam dịka mmadụ si ekpochapụ nsị anụ, ruo mgbe e kpochapụrụ ha niile. 11 Nkịta ga-eri ozu ndị nke Jeroboam ndị nwụrụ nʼime obodo, ma ndị nwụrụ nʼọhịa ka anụ ufe nke eluigwe ga-eri ozu ha. ONYENWE ANYỊ ekwuola ya.’ 12 “Ma gị onwe gị, Laa nʼụlọ gị. Mgbe ị na-azọbanye ụkwụ gị nʼobodo, nwokorobịa ahụ ga-anwụ. 13 Ndị Izrel niile ga-akwa akwa nʼihi ya lie ya. Ọ bụ naanị ya bụ onye a ga-eli eli, nʼihi na nʼime ezinaụlọ Jeroboam, ọ bụ naanị nʼime nwokorobịa a ka ONYENWE ANYỊ, Chineke Izrel chọtara ihe dị mma. 14 “Ma ONYENWE ANYỊ ga-emekwa ka eze ọzọ bilie nʼIzrel, onye ga-ekpochapụ ezinaụlọ Jeroboam niile. O bidola taa, e, ma ugbu a kwa! 15 ONYENWE ANYỊ ga-eti Izrel ihe, mee ka ọ maa jijiji dịka osisi achara nke ikuku na-ebugharị nʼime mmiri. Ọ ga-ehopu Izrel site nʼezi ala o nyere nna nna ha, fesaa ha nʼofe osimiri Yufretis, nʼihi na ha akpasuola iwe ONYENWE ANYỊ site nʼiguzobe ogidi ofufe Ashera. 16 Ọ ga-agbakụta Izrel azụ nʼihi mmehie Jeroboam mere, ma meekwa ka Izrel niile soro ya mehie.” 17 Mgbe ahụ, nwunye Jeroboam biliri laghachi Tịaza. Ma nwokorobịa ahụ nwụrụ mgbe ọ na-azọbata ụkwụ ya nʼọnụ ụzọ ụlọ ha. 18 Ha liri ya, ndị Izrel niile rukwara ụjụ nʼihi ya, dịka okwu ONYENWE ANYỊ si dị, nke o kwuru site nʼọnụ Ahija, onye amụma. 19 Ihe niile ọzọ Jeroboam mere, na ihe niile banyere ibu agha ya niile, na ọtụtụ ihe ọzọ dị iche iche banyere ọchịchị ya, ka e dere nʼakwụkwọ akụkọ ihe ndị eze Izrel mere. 20 Jeroboam chịrị Izrel iri afọ abụọ na abụọ. O sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ, nwa ya Nadab ghọrọ eze nʼọnọdụ ya. 21 Nʼoge a, Rehoboam nwa Solomọn, bụ eze Juda. Ọ gbara iri afọ anọ na otu mgbe ọ malitere ịbụ eze. Ọ chịrị afọ iri na asaa na Jerusalem, bụ obodo ahụ ONYENWE ANYỊ họọrọ site nʼetiti ebo niile nke Izrel, bụ ebe ọ ga-akpọkwasị Aha ya. Aha nne ya bụ Naama, onye Amọn. 22 Mgbe ahụ, ndị Juda mehiekwara megide ONYENWE ANYỊ. Ha sitere nʼọtụtụ mmehie ha mere, nke karịrị mmehie nke ndị nna nna ha ochie mere, kpasuo ekworo ya. 23 Ha wukwara nye onwe ha ebe ịchụ aja na ogidi arụsị nʼelu ugwu niile, na ogidi chi Ashera, na nʼokpuru osisi ọbụla akwụkwọ ndụ dị nʼelu ya. 24 E nwere ndị ikom akwụna nʼala ahụ, ndị nọ nʼụlọ arụsị ha dị iche iche. Ndị mmadụ mere ụdị ihe arụ ahụ nke ndị mba niile ndị ahụ na-eme, bụ mba ndị ahụ ONYENWE ANYỊ sitere nʼihu ndị Izrel chụpụ. 25 Nʼafọ nke ise, nke ọchịchị eze Rehoboam, Shishak, eze Ijipt, busoro Jerusalem agha. 26 O bukọrọ akụ niile dị nʼime ụlọ ONYENWE ANYỊ, na akụ niile dịkwa nʼụlọeze. Ọ kwakọọrọ ihe niile, werekwa ọta ọlaedo niile ndị ahụ Solomọn kpụrụ. 27 Ma eze Rehoboam kpụrụ ọta bronz i ji dochie ndị ahụ, nyefee ha nʼaka ndịisi ndị nche, bụ ndị na-eche nʼọnụ ụzọ ụlọeze nche ka a lekọta ha anya. 28 Mgbe ọbụla eze na-aga nʼụlọnsọ ukwu ONYENWE ANYỊ, ndị nche na-ebu ọta ndị ahụ, emesịa, ha na-ebughachikwa ha nʼime ụlọ ndị nche. 29 Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Rehoboam, na ihe niile o mere, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ndị eze Juda? 30 Agha dịgidere nʼetiti Rehoboam na Jeroboam ụbọchị niile nke ndụ ha. 31 Rehoboam sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya nʼebe e liri ha nʼobodo Devid. Aha nne ya bụ Naama, onye Amọn. Abija nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.

In Other Versions

1 Kings 14 in the ANGEFD

1 Kings 14 in the ANTPNG2D

1 Kings 14 in the AS21

1 Kings 14 in the BAGH

1 Kings 14 in the BBPNG

1 Kings 14 in the BBT1E

1 Kings 14 in the BDS

1 Kings 14 in the BEV

1 Kings 14 in the BHAD

1 Kings 14 in the BIB

1 Kings 14 in the BLPT

1 Kings 14 in the BNT

1 Kings 14 in the BNTABOOT

1 Kings 14 in the BNTLV

1 Kings 14 in the BOATCB

1 Kings 14 in the BOATCB2

1 Kings 14 in the BOBCV

1 Kings 14 in the BOCNT

1 Kings 14 in the BOECS

1 Kings 14 in the BOGWICC

1 Kings 14 in the BOHCB

1 Kings 14 in the BOHCV

1 Kings 14 in the BOHLNT

1 Kings 14 in the BOHNTLTAL

1 Kings 14 in the BOILNTAP

1 Kings 14 in the BOITCV

1 Kings 14 in the BOKCV

1 Kings 14 in the BOKCV2

1 Kings 14 in the BOKHWOG

1 Kings 14 in the BOKSSV

1 Kings 14 in the BOLCB

1 Kings 14 in the BOLCB2

1 Kings 14 in the BOMCV

1 Kings 14 in the BONAV

1 Kings 14 in the BONCB

1 Kings 14 in the BONLT

1 Kings 14 in the BONUT2

1 Kings 14 in the BOPLNT

1 Kings 14 in the BOSCB

1 Kings 14 in the BOSNC

1 Kings 14 in the BOTLNT

1 Kings 14 in the BOVCB

1 Kings 14 in the BOYCB

1 Kings 14 in the BPBB

1 Kings 14 in the BPH

1 Kings 14 in the BSB

1 Kings 14 in the CCB

1 Kings 14 in the CUV

1 Kings 14 in the CUVS

1 Kings 14 in the DBT

1 Kings 14 in the DGDNT

1 Kings 14 in the DHNT

1 Kings 14 in the DNT

1 Kings 14 in the ELBE

1 Kings 14 in the EMTV

1 Kings 14 in the ESV

1 Kings 14 in the FBV

1 Kings 14 in the FEB

1 Kings 14 in the GGMNT

1 Kings 14 in the GNT

1 Kings 14 in the HARY

1 Kings 14 in the HNT

1 Kings 14 in the IRVA

1 Kings 14 in the IRVB

1 Kings 14 in the IRVG

1 Kings 14 in the IRVH

1 Kings 14 in the IRVK

1 Kings 14 in the IRVM

1 Kings 14 in the IRVM2

1 Kings 14 in the IRVO

1 Kings 14 in the IRVP

1 Kings 14 in the IRVT

1 Kings 14 in the IRVT2

1 Kings 14 in the IRVU

1 Kings 14 in the ISVN

1 Kings 14 in the JSNT

1 Kings 14 in the KAPI

1 Kings 14 in the KBT1ETNIK

1 Kings 14 in the KBV

1 Kings 14 in the KJV

1 Kings 14 in the KNFD

1 Kings 14 in the LBA

1 Kings 14 in the LBLA

1 Kings 14 in the LNT

1 Kings 14 in the LSV

1 Kings 14 in the MAAL

1 Kings 14 in the MBV

1 Kings 14 in the MBV2

1 Kings 14 in the MHNT

1 Kings 14 in the MKNFD

1 Kings 14 in the MNG

1 Kings 14 in the MNT

1 Kings 14 in the MNT2

1 Kings 14 in the MRS1T

1 Kings 14 in the NAA

1 Kings 14 in the NASB

1 Kings 14 in the NBLA

1 Kings 14 in the NBS

1 Kings 14 in the NBVTP

1 Kings 14 in the NET2

1 Kings 14 in the NIV11

1 Kings 14 in the NNT

1 Kings 14 in the NNT2

1 Kings 14 in the NNT3

1 Kings 14 in the PDDPT

1 Kings 14 in the PFNT

1 Kings 14 in the RMNT

1 Kings 14 in the SBIAS

1 Kings 14 in the SBIBS

1 Kings 14 in the SBIBS2

1 Kings 14 in the SBICS

1 Kings 14 in the SBIDS

1 Kings 14 in the SBIGS

1 Kings 14 in the SBIHS

1 Kings 14 in the SBIIS

1 Kings 14 in the SBIIS2

1 Kings 14 in the SBIIS3

1 Kings 14 in the SBIKS

1 Kings 14 in the SBIKS2

1 Kings 14 in the SBIMS

1 Kings 14 in the SBIOS

1 Kings 14 in the SBIPS

1 Kings 14 in the SBISS

1 Kings 14 in the SBITS

1 Kings 14 in the SBITS2

1 Kings 14 in the SBITS3

1 Kings 14 in the SBITS4

1 Kings 14 in the SBIUS

1 Kings 14 in the SBIVS

1 Kings 14 in the SBT

1 Kings 14 in the SBT1E

1 Kings 14 in the SCHL

1 Kings 14 in the SNT

1 Kings 14 in the SUSU

1 Kings 14 in the SUSU2

1 Kings 14 in the SYNO

1 Kings 14 in the TBIAOTANT

1 Kings 14 in the TBT1E

1 Kings 14 in the TBT1E2

1 Kings 14 in the TFTIP

1 Kings 14 in the TFTU

1 Kings 14 in the TGNTATF3T

1 Kings 14 in the THAI

1 Kings 14 in the TNFD

1 Kings 14 in the TNT

1 Kings 14 in the TNTIK

1 Kings 14 in the TNTIL

1 Kings 14 in the TNTIN

1 Kings 14 in the TNTIP

1 Kings 14 in the TNTIZ

1 Kings 14 in the TOMA

1 Kings 14 in the TTENT

1 Kings 14 in the UBG

1 Kings 14 in the UGV

1 Kings 14 in the UGV2

1 Kings 14 in the UGV3

1 Kings 14 in the VBL

1 Kings 14 in the VDCC

1 Kings 14 in the YALU

1 Kings 14 in the YAPE

1 Kings 14 in the YBVTP

1 Kings 14 in the ZBP