1 Kings 15 (BOICB)

1 Abija malitere ịbụ eze Juda, nʼafọ iri na asatọ nke ọchịchị eze Jeroboam nwa Nebat. 2 Ọ chịrị afọ atọ na Jerusalem. Aha nne ya bụ Maaka, nwa nwanyị Abishalom. 3 O mere mmehie niile nna ya mere nʼihu ya; o jighị obi zuruoke gbasoo ONYENWE ANYỊ Chineke ya, dịka obi nna nna ya Devid dị. 4 Ma nʼihi Devid, ONYENWE ANYỊ Chineke ya nyere ya oriọna na Jerusalem, site na-ime ka nwa ya nwoke nọchie ọnọdụ ya nakwa ime ka Jerusalem guzosie ike. 5 Nʼihi na Devid mere ihe ziri ezi nʼanya ONYENWE ANYỊ, ọ dịghịkwa iwu ONYENWE ANYỊ ọbụla nke ọ na-edebeghị nʼụbọchị ndụ ya niile, ma ọ bụghị naanị ihe banyere okwu Ụraya, onye Het. 6 Agha dị nʼetiti Abija na Jeroboam nʼụbọchị niile nke ndụ Abija. 7 Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Abija, o bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ndị eze Juda? Agha dịgidere nʼetiti Abija na Jeroboam. 8 Abija sooro nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya nʼobodo Devid. Asa, nwa ya nwoke ghọrọ eze nʼọnọdụ ya. 9 Nʼafọ nke iri abụọ nke ọchịchị Jeroboam eze Izrel, ka Asa ghọrọ eze Juda. 10 Ọ chịrị iri afọ anọ na otu na Jerusalem. Aha nne nne ya bụ Maaka, nwa nwanyị Abishalom. 11 Asa mere ihe ziri ezi nʼanya ONYENWE ANYỊ dịka Devid nna ya mere. 12 O sitere nʼala ahụ niile chụpụ ndị ikom akwụna ụlọ arụsị niile, wezugakwa arụsị niile nke ndị nna nna ya ha mere. 13 Ọ chụdakwara ọbụladị nne nne ya bụ Maaka, site nʼọnọdụ ya dịka nne eze, nʼihi na ọ kpụrụ ihe arụ, ogidi Ashera maka iji fee ya ofufe. Asa gbuturu ya kpọọ ya ọkụ na ndagwurugwu iyi Kidrọn. 14 Ọ bụ ezie na o wezugaghị ugwu niile dị elu, ma Asa ji obi zuruoke jere ONYENWE ANYỊ ozi nʼoge ndụ ya niile. 15 O webatara nʼime ụlọnsọ ONYENWE ANYỊ ọlaọcha na ọlaedo na ihe niile nke nna ya na ya onwe ya doro nsọ. 16 Ma agha dịgidere nʼetiti Asa na Baasha, eze Izrel ụbọchị ọchịchị ha niile. 17 Baasha eze Izrel, busoro Juda agha, wuchie Rema igbochi onye ọbụla na-apụ apụ maọbụ onye na-abata abata nʼoke ala Asa, eze Juda. 18 Mgbe ahụ, Asa chịịrị ọlaọcha na ọlaedo niile dị nʼụlọakụ ụlọnsọ ONYENWE ANYỊ, na ndị dị nʼụlọeze ya, nyefee ya nʼaka ndị ozi ya ka ha chịrị ha zigara Ben-Hadad, nwa Tabrimọm, nwa Hezion, bụ eze Aram, onye na-achị na Damaskọs, sị, 19 “Biko, ka anyị gbaa ndụ dịka nna m na nna gị mere. Lee, ana m ezitere gị onyinye ọlaọcha na ọlaedo. Ugbu a, mebie ọgbụgba ndụ dị nʼetiti gị na Baasha, bụ eze Izrel, ka o si nʼebe m nọ wezuga onwe ya.” 20 Ben-Hadad kwenyere eze Asa, zipụ ndị ọchịagha ndị agha ya ka ha gaa buso obodo Izrel niile agha. Ọ lụgburu Ijon, Dan, Ebel-Bet-Maaka na ala Kineret niile, tinyere ala niile nke ndị Naftalị. 21 Mgbe Baasha nụrụ nke a, ọ kwụsịrị iwu Rema, laghachi biri na Tịaza. 22 Mgbe ahụ, eze Asa nyere iwu zigara ndị Juda niile, na ọ dịghị onye iwu ahụ hapụrụ, ha bịara bupusịa nkume na osisi niile dị na Rema, nke Baasha ji na-ewu ihe nʼebe ahụ. Eze Asa ji ihe ndị a wulie Geba nke Benjamin, wuokwa Mizpa. 23 Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Asa, na ihe niile ọ rụpụtara na obodo niile ndị o wuru, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe e mere nʼoge ndị eze Juda? Ma ọ rịara ọrịa nke metụtara ụkwụ ya abụọ, mgbe o mere agadi. 24 Asa sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya nʼebe e liri ha, nʼobodo Devid, bụ nna ya. Jehoshafat nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya. 25 Nadab, nwa Jeroboam, malitere ịbụ eze Izrel, nʼafọ nke abụọ nke Asa, eze Juda. Ọ chịrị Izrel afọ abụọ. 26 O mere ihe dị njọ nʼanya ONYENWE ANYỊ. Ọ gbasoro ụzọ niile nke nna ya ma na-emekwa otu mmehie ahụ nke nna ya ji duba Izrel nʼime mmehie. 27 Baasha nwa Ahija, onye si nʼebo Isaka gbara izu ọjọọ megide ya. O tidara ya na Gibeton, nʼotu obodo ndị Filistia, mgbe Nadab na ndị Izrel niile nọchibidoro ya. 28 Baasha gburu Nadab, nọchie ọnọdụ ya dịka eze, nʼafọ nke atọ nke ọchịchị Asa, eze Juda. 29 Ngwangwa, mgbe ọ malitere ọchịchị ya, o gburu ndị ezinaụlọ Jeroboam niile. O kweghị ka onye ọbụla na-eku ume fọdụ, kama ọ lara ha niile nʼiyi, dịka okwu ONYENWE ANYỊ kwuru site nʼọnụ onyeozi ya, bụ Ahija onye Shilo. 30 Ihe ndị a mere nʼihi mmehie niile Jeroboam mere, nke o mere ka Izrel mee, nakwa nʼihi na ọ kpasuru ONYENWE ANYỊ, bụ Chineke Izrel iwe. 31 Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Nadab, o bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe mere nʼoge ndị eze Izrel? 32 Ma agha dịgidere nʼetiti Asa na Baasha, eze Izrel, ụbọchị ọchịchị ha niile. 33 Nʼafọ nke atọ nke Asa, eze Juda, Baasha nwa Ahija ghọrọ eze ndị Izrel niile na Tịaza. Ọ chịrị iri afọ abụọ na abụọ. 34 O mere ọtụtụ ihe dị njọ nʼanya ONYENWE ANYỊ. Ọ gbasoro ụzọ ọjọọ niile nke Jeroboam, jeekwa ije nʼime otu mmehie ahụ nke Jeroboam dubara ndị Izrel ime.

In Other Versions

1 Kings 15 in the ANGEFD

1 Kings 15 in the ANTPNG2D

1 Kings 15 in the AS21

1 Kings 15 in the BAGH

1 Kings 15 in the BBPNG

1 Kings 15 in the BBT1E

1 Kings 15 in the BDS

1 Kings 15 in the BEV

1 Kings 15 in the BHAD

1 Kings 15 in the BIB

1 Kings 15 in the BLPT

1 Kings 15 in the BNT

1 Kings 15 in the BNTABOOT

1 Kings 15 in the BNTLV

1 Kings 15 in the BOATCB

1 Kings 15 in the BOATCB2

1 Kings 15 in the BOBCV

1 Kings 15 in the BOCNT

1 Kings 15 in the BOECS

1 Kings 15 in the BOGWICC

1 Kings 15 in the BOHCB

1 Kings 15 in the BOHCV

1 Kings 15 in the BOHLNT

1 Kings 15 in the BOHNTLTAL

1 Kings 15 in the BOILNTAP

1 Kings 15 in the BOITCV

1 Kings 15 in the BOKCV

1 Kings 15 in the BOKCV2

1 Kings 15 in the BOKHWOG

1 Kings 15 in the BOKSSV

1 Kings 15 in the BOLCB

1 Kings 15 in the BOLCB2

1 Kings 15 in the BOMCV

1 Kings 15 in the BONAV

1 Kings 15 in the BONCB

1 Kings 15 in the BONLT

1 Kings 15 in the BONUT2

1 Kings 15 in the BOPLNT

1 Kings 15 in the BOSCB

1 Kings 15 in the BOSNC

1 Kings 15 in the BOTLNT

1 Kings 15 in the BOVCB

1 Kings 15 in the BOYCB

1 Kings 15 in the BPBB

1 Kings 15 in the BPH

1 Kings 15 in the BSB

1 Kings 15 in the CCB

1 Kings 15 in the CUV

1 Kings 15 in the CUVS

1 Kings 15 in the DBT

1 Kings 15 in the DGDNT

1 Kings 15 in the DHNT

1 Kings 15 in the DNT

1 Kings 15 in the ELBE

1 Kings 15 in the EMTV

1 Kings 15 in the ESV

1 Kings 15 in the FBV

1 Kings 15 in the FEB

1 Kings 15 in the GGMNT

1 Kings 15 in the GNT

1 Kings 15 in the HARY

1 Kings 15 in the HNT

1 Kings 15 in the IRVA

1 Kings 15 in the IRVB

1 Kings 15 in the IRVG

1 Kings 15 in the IRVH

1 Kings 15 in the IRVK

1 Kings 15 in the IRVM

1 Kings 15 in the IRVM2

1 Kings 15 in the IRVO

1 Kings 15 in the IRVP

1 Kings 15 in the IRVT

1 Kings 15 in the IRVT2

1 Kings 15 in the IRVU

1 Kings 15 in the ISVN

1 Kings 15 in the JSNT

1 Kings 15 in the KAPI

1 Kings 15 in the KBT1ETNIK

1 Kings 15 in the KBV

1 Kings 15 in the KJV

1 Kings 15 in the KNFD

1 Kings 15 in the LBA

1 Kings 15 in the LBLA

1 Kings 15 in the LNT

1 Kings 15 in the LSV

1 Kings 15 in the MAAL

1 Kings 15 in the MBV

1 Kings 15 in the MBV2

1 Kings 15 in the MHNT

1 Kings 15 in the MKNFD

1 Kings 15 in the MNG

1 Kings 15 in the MNT

1 Kings 15 in the MNT2

1 Kings 15 in the MRS1T

1 Kings 15 in the NAA

1 Kings 15 in the NASB

1 Kings 15 in the NBLA

1 Kings 15 in the NBS

1 Kings 15 in the NBVTP

1 Kings 15 in the NET2

1 Kings 15 in the NIV11

1 Kings 15 in the NNT

1 Kings 15 in the NNT2

1 Kings 15 in the NNT3

1 Kings 15 in the PDDPT

1 Kings 15 in the PFNT

1 Kings 15 in the RMNT

1 Kings 15 in the SBIAS

1 Kings 15 in the SBIBS

1 Kings 15 in the SBIBS2

1 Kings 15 in the SBICS

1 Kings 15 in the SBIDS

1 Kings 15 in the SBIGS

1 Kings 15 in the SBIHS

1 Kings 15 in the SBIIS

1 Kings 15 in the SBIIS2

1 Kings 15 in the SBIIS3

1 Kings 15 in the SBIKS

1 Kings 15 in the SBIKS2

1 Kings 15 in the SBIMS

1 Kings 15 in the SBIOS

1 Kings 15 in the SBIPS

1 Kings 15 in the SBISS

1 Kings 15 in the SBITS

1 Kings 15 in the SBITS2

1 Kings 15 in the SBITS3

1 Kings 15 in the SBITS4

1 Kings 15 in the SBIUS

1 Kings 15 in the SBIVS

1 Kings 15 in the SBT

1 Kings 15 in the SBT1E

1 Kings 15 in the SCHL

1 Kings 15 in the SNT

1 Kings 15 in the SUSU

1 Kings 15 in the SUSU2

1 Kings 15 in the SYNO

1 Kings 15 in the TBIAOTANT

1 Kings 15 in the TBT1E

1 Kings 15 in the TBT1E2

1 Kings 15 in the TFTIP

1 Kings 15 in the TFTU

1 Kings 15 in the TGNTATF3T

1 Kings 15 in the THAI

1 Kings 15 in the TNFD

1 Kings 15 in the TNT

1 Kings 15 in the TNTIK

1 Kings 15 in the TNTIL

1 Kings 15 in the TNTIN

1 Kings 15 in the TNTIP

1 Kings 15 in the TNTIZ

1 Kings 15 in the TOMA

1 Kings 15 in the TTENT

1 Kings 15 in the UBG

1 Kings 15 in the UGV

1 Kings 15 in the UGV2

1 Kings 15 in the UGV3

1 Kings 15 in the VBL

1 Kings 15 in the VDCC

1 Kings 15 in the YALU

1 Kings 15 in the YAPE

1 Kings 15 in the YBVTP

1 Kings 15 in the ZBP