1 Kings 16 (BOICB)

1 Mgbe ahụ, ozi ONYENWE ANYỊ sitere nʼọnụ Jehu, nwa Hanani banyere Baasha, eze Izrel sị ya, 2 “Esi m nʼaja welie gị elu, mee gị onye ọchịchị ndị m Izrel. Ma i jeela ije nʼụzọ ọjọọ niile nke Jeroboam. I meela ka ndị m bụ Izrel mmehie, si otu a kpasuo m iwe site na mmehie ha. 3 Ya mere, aga m ekpochapụ Baasha na ezinaụlọ ya, m ga-emekwa ụlọ gị ka ọ dịka ụlọ Jeroboam, nwa Nebat. 4 Onye ọbụla nke metụtara Baasha nke nwụrụ nʼime obodo ka nkịta ga-eri ozu ya, ma ndị nwụrụ nʼọhịa ka anụ ufe nke eluigwe ga-eri ozu ha.” 5 Akụkọ niile banyere ọrụ Baasha rụrụ, na ibu agha ya niile, e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ọrụ ndị eze Izrel? 6 Baasha sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya na Tịaza. Ela, nwa ya nwoke, nọchiri ọnọdụ ya dịka eze. 7 Ma ozi ONYENWE ANYỊ si nʼọnụ Jehu onye amụma, nwa Hanani bịara Baasha na ndị ezinaụlọ ya nʼihi ihe ọjọọ niile o mere, si otu a kpasuo ONYENWE ANYỊ iwe. Ọ bụ ezie na ọ maara na Onyenwe anyị kpochapụrụ ezinaụlọ Jeroboam nʼihi ihe ọjọọ o mere, ma Baasha gara nʼihu mee ihe ọjọọ. 8 Ela, nwa Baasha, malitere ịbụ eze Izrel nʼiri afọ abụọ na isii nke ịbụ eze Asa, eze Juda. Ma naanị afọ abụọ ka ọ chịrị dịka eze na Tịaza. 9 Mgbe ahụ, Zimri, ọchịagha na-achị ọkara ụgbọala agha eze, gbara izuzu megide ya. Nʼoge a, Ela nọ na-aṅụ mmanya na Tịaza, nʼụlọ Aza, onye na-elekọta ụlọeze dị nʼobodo ahụ. Ọ ṅụkwara mmanya ahụ ṅụbiga ya oke. 10 Zimri batara kụdaa ma gbukwaa ya. Ọ bụ nʼiri afọ abụọ na asaa nke ọchịchị Asa, eze Juda. Ọ bụụrụ eze nʼọnọdụ ya. 11 Ngwangwa ọ ghọrọ eze, nọkwasị nʼocheeze ya, o gburu mmadụ niile nọ nʼezinaụlọ Baasha. Ọ hapụghị ọ bụladị otu nwoke. O gburu ikwu na ibe Baasha, na ndị enyi ya niile. 12 Ya mere, Zimri kpochapụrụ ndị ezinaụlọ niile Baasha, nʼusoro okwu ONYENWE ANYỊ kwuru megide Baasha site nʼọnụ onye amụma ya bụ Jehu. 13 Nʼihi mmehie niile nke Baasha na nwa ya Ela mere, na nke ha ji mee ka Izrel mehie, bịakwa kpasuo iwe ONYENWE ANYỊ bụ Chineke Izrel, site nʼarụsị ha niile na-abaghị uru. 14 Akụkọ banyere ọchịchị Ela, na ihe niile o mere e deghị ha nʼakwụkwọ ọchịchị ndị eze Izrel? 15 Nʼafọ nke iri abụọ na asaa nke ọchịchị Asa, eze Juda, ka Zimri chịrị ụbọchị asaa na Tịaza. Nʼoge a, ndị agha Izrel mara ụlọ ikwu na Gibeton, obodo ndị Filistia na-ebu agha. 16 Mgbe ha nụrụ na Zimri egbuola eze ha, ha niile kwekọtara mee Omri eze ọhụrụ ha. Omri bụ onyeisi agha ndị agha Izrel niile. 17 Nʼihi nke a, Omri duuru ndị agha ahụ nọ na Gibeton bịa ibuso Tịaza, isi obodo Izrel agha. 18 Mgbe Zimri hụrụ na-adọtala obodo ahụ nʼagha, ọ banyere nʼụlọ elu dị nʼụlọeze, sunye onwe ya na ụlọeze ahụ ọkụ. O si otu a nwụọ, 19 nʼihi na Zimri nʼonwe ya mere ihe ọjọọ nʼanya ONYENWE ANYỊ dịka Jeroboam. Ọ kpọrọ isiala nye arụsị, dubakwa ụmụ Izrel nʼime mmehie. 20 Akụkọ banyere Zimri na ihe ọjọọ niile o mere e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ọchịchị ndị eze Izrel? 21 Ma nʼoge a, ndị Izrel kere onwe ha ụzọ abụọ maka onye ga-abụ eze ha. Otu ụzọ dịnyeere Omri, ndị nke ọzọ dịnyeere Tibni, nwa Ginat. 22 Ma ndị dịnyeere Omri dị ike karịa ndị dịnyeere Tibni, nwa Ginat. Ya mere, Tibni nwụrụ. Omri ghọkwara eze Izrel. 23 Asa, eze Juda anọọla iri afọ atọ na otu dịka eze mgbe Omri malitere ịbụ eze Izrel. Omri chịrị Izrel afọ iri na abụọ, afọ isii nʼime afọ ndị a na Tịaza. 24 Omri zụrụ ala ugwu ugwu a na-akpọ Sameria site nʼaka Shema, kwụọ ya talenti ọlaọcha abụọ. O wuru obodo ọhụrụ nʼugwu ahụ gụọ aha ya Sameria, nʼihi na aha onyenwe ala ahụ na mbụ bụ Shema. 25 Ma Omri mere ihe ọjọọ nʼanya ONYENWE ANYỊ karịa ndị eze Izrel niile buru ya ụzọ. 26 Ọ kpọrọ isiala nye arụsị, dịka Jeroboam nwa Nebat mere. O dubakwara ndị Izrel nʼime mmehie. Nʼihi nke a o mere ka iwe wee ONYENWE ANYỊ, Chineke Izrel, nʼihi arụsị nzuzu ha. 27 Akụkọ ihe niile Omri mere, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ọchịchị ndị eze Izrel? 28 Omri sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya na Sameria. Ehab, nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya. 29 Nʼafọ nke iri atọ na asatọ nke ọchịchị eze Asa na Juda, ka Ehab, nwa Omri, malitere ịchị dịka eze nʼIzrel. Ọ chịrị ndị Izrel iri afọ abụọ na abụọ na Sameria. 30 Ehab nwa Omri mere ihe ọjọọ nʼanya ONYENWE ANYỊ karịa ndị eze niile buru ya ụzọ. 31 Ọ bụghị naanị na ọ gụrụ mmehie niile Jeroboam nwa Nebat mere dị ka ihe dị nta, kama ọ gara nʼihu lụọ Jezebel, nwa nwanyị Etbaal, eze ndị Saịdọn. O bidokwara ịkpọ isiala nye arụsị Baal, na ife ya ofufe. 32 O guzobere ebe ịchụ aja nye Baal, nʼụlọ arụsị Baal nke o wuru na Sameria. 33 Ehab manyere ogidi chi Ashera, si otu a kpasuo ONYENWE ANYỊ bụ Chineke nke Izrel iwe karịa otu ndị eze Izrel niile bu ya ụzọ chịa si mee. 34 Mgbe Ehab na-achị, ka Hiel, onye Betel, wughachiri obodo Jeriko. Ọkpara ya bụ Abiram nwụrụ, mgbe ọ tọrọ ntọala obodo ahụ, ka ọ guzobere ọnụ ụzọ ama ya ọtọ, nwa ya nwoke nke nta aha ya bụ Segub nwụrụ, imezu okwu ONYENWE ANYỊ kwuru site nʼọnụ Joshua nwa Nun.

In Other Versions

1 Kings 16 in the ANGEFD

1 Kings 16 in the ANTPNG2D

1 Kings 16 in the AS21

1 Kings 16 in the BAGH

1 Kings 16 in the BBPNG

1 Kings 16 in the BBT1E

1 Kings 16 in the BDS

1 Kings 16 in the BEV

1 Kings 16 in the BHAD

1 Kings 16 in the BIB

1 Kings 16 in the BLPT

1 Kings 16 in the BNT

1 Kings 16 in the BNTABOOT

1 Kings 16 in the BNTLV

1 Kings 16 in the BOATCB

1 Kings 16 in the BOATCB2

1 Kings 16 in the BOBCV

1 Kings 16 in the BOCNT

1 Kings 16 in the BOECS

1 Kings 16 in the BOGWICC

1 Kings 16 in the BOHCB

1 Kings 16 in the BOHCV

1 Kings 16 in the BOHLNT

1 Kings 16 in the BOHNTLTAL

1 Kings 16 in the BOILNTAP

1 Kings 16 in the BOITCV

1 Kings 16 in the BOKCV

1 Kings 16 in the BOKCV2

1 Kings 16 in the BOKHWOG

1 Kings 16 in the BOKSSV

1 Kings 16 in the BOLCB

1 Kings 16 in the BOLCB2

1 Kings 16 in the BOMCV

1 Kings 16 in the BONAV

1 Kings 16 in the BONCB

1 Kings 16 in the BONLT

1 Kings 16 in the BONUT2

1 Kings 16 in the BOPLNT

1 Kings 16 in the BOSCB

1 Kings 16 in the BOSNC

1 Kings 16 in the BOTLNT

1 Kings 16 in the BOVCB

1 Kings 16 in the BOYCB

1 Kings 16 in the BPBB

1 Kings 16 in the BPH

1 Kings 16 in the BSB

1 Kings 16 in the CCB

1 Kings 16 in the CUV

1 Kings 16 in the CUVS

1 Kings 16 in the DBT

1 Kings 16 in the DGDNT

1 Kings 16 in the DHNT

1 Kings 16 in the DNT

1 Kings 16 in the ELBE

1 Kings 16 in the EMTV

1 Kings 16 in the ESV

1 Kings 16 in the FBV

1 Kings 16 in the FEB

1 Kings 16 in the GGMNT

1 Kings 16 in the GNT

1 Kings 16 in the HARY

1 Kings 16 in the HNT

1 Kings 16 in the IRVA

1 Kings 16 in the IRVB

1 Kings 16 in the IRVG

1 Kings 16 in the IRVH

1 Kings 16 in the IRVK

1 Kings 16 in the IRVM

1 Kings 16 in the IRVM2

1 Kings 16 in the IRVO

1 Kings 16 in the IRVP

1 Kings 16 in the IRVT

1 Kings 16 in the IRVT2

1 Kings 16 in the IRVU

1 Kings 16 in the ISVN

1 Kings 16 in the JSNT

1 Kings 16 in the KAPI

1 Kings 16 in the KBT1ETNIK

1 Kings 16 in the KBV

1 Kings 16 in the KJV

1 Kings 16 in the KNFD

1 Kings 16 in the LBA

1 Kings 16 in the LBLA

1 Kings 16 in the LNT

1 Kings 16 in the LSV

1 Kings 16 in the MAAL

1 Kings 16 in the MBV

1 Kings 16 in the MBV2

1 Kings 16 in the MHNT

1 Kings 16 in the MKNFD

1 Kings 16 in the MNG

1 Kings 16 in the MNT

1 Kings 16 in the MNT2

1 Kings 16 in the MRS1T

1 Kings 16 in the NAA

1 Kings 16 in the NASB

1 Kings 16 in the NBLA

1 Kings 16 in the NBS

1 Kings 16 in the NBVTP

1 Kings 16 in the NET2

1 Kings 16 in the NIV11

1 Kings 16 in the NNT

1 Kings 16 in the NNT2

1 Kings 16 in the NNT3

1 Kings 16 in the PDDPT

1 Kings 16 in the PFNT

1 Kings 16 in the RMNT

1 Kings 16 in the SBIAS

1 Kings 16 in the SBIBS

1 Kings 16 in the SBIBS2

1 Kings 16 in the SBICS

1 Kings 16 in the SBIDS

1 Kings 16 in the SBIGS

1 Kings 16 in the SBIHS

1 Kings 16 in the SBIIS

1 Kings 16 in the SBIIS2

1 Kings 16 in the SBIIS3

1 Kings 16 in the SBIKS

1 Kings 16 in the SBIKS2

1 Kings 16 in the SBIMS

1 Kings 16 in the SBIOS

1 Kings 16 in the SBIPS

1 Kings 16 in the SBISS

1 Kings 16 in the SBITS

1 Kings 16 in the SBITS2

1 Kings 16 in the SBITS3

1 Kings 16 in the SBITS4

1 Kings 16 in the SBIUS

1 Kings 16 in the SBIVS

1 Kings 16 in the SBT

1 Kings 16 in the SBT1E

1 Kings 16 in the SCHL

1 Kings 16 in the SNT

1 Kings 16 in the SUSU

1 Kings 16 in the SUSU2

1 Kings 16 in the SYNO

1 Kings 16 in the TBIAOTANT

1 Kings 16 in the TBT1E

1 Kings 16 in the TBT1E2

1 Kings 16 in the TFTIP

1 Kings 16 in the TFTU

1 Kings 16 in the TGNTATF3T

1 Kings 16 in the THAI

1 Kings 16 in the TNFD

1 Kings 16 in the TNT

1 Kings 16 in the TNTIK

1 Kings 16 in the TNTIL

1 Kings 16 in the TNTIN

1 Kings 16 in the TNTIP

1 Kings 16 in the TNTIZ

1 Kings 16 in the TOMA

1 Kings 16 in the TTENT

1 Kings 16 in the UBG

1 Kings 16 in the UGV

1 Kings 16 in the UGV2

1 Kings 16 in the UGV3

1 Kings 16 in the VBL

1 Kings 16 in the VDCC

1 Kings 16 in the YALU

1 Kings 16 in the YAPE

1 Kings 16 in the YBVTP

1 Kings 16 in the ZBP