1 Samuel 15 (BOICB)

1 Samuel sịrị Sọl, “Mụ ka ONYENWE ANYỊ zitere ite gị mmanụ ka ị bụrụ eze ndị ya, bụ Izrel. Ya mere, gee ntị nʼozi sitere nʼaka ONYENWE ANYỊ bịa. 2 Ihe a ka ONYENWE ANYỊ, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru. ‘Aga m ata ndị Amalek ahụhụ nʼihi ihe ọjọọ niile ha mere Izrel, mgbe ha nọchiri ha nʼụzọ oge ha si Ijipt pụta. 3 Ugbu a, gaa buso ndị Amalek agha. Gbuchapụ ihe niile ha nwere. Enwekwala ọmịiko nʼahụ ha. Gbuo ndị ikom niile, ndị inyom niile, ụmụntakịrị niile na ụmụ na-aṅụ ara, igwe ehi na atụrụ, ịnyịnya kamel na ịnyịnya ibu ha niile.’ ” 4 Ya mere, Sọl chịkọtara ndị agha ya mee ka ha zukọtaa nʼobodo Telaim. Ọnụọgụgụ ha dị narị puku abụọ, ndị agha ji ụkwụ, tinyere puku ndị ikom iri si na Juda. 5 Sọl duuru ndị agha ya gaa zoo nʼakụkụ iyi tara ata dị nso nʼobodo ndị Amalek. 6 Sọl zigaara ndị Ken ozi sị ha, “Sitenụ nʼetiti ndị Amalek wezuga onwe unu ka m ghara ibibikọta unu na ha. Nʼihi na unu gosiri ndị Izrel obiọma mgbe ha si nʼIjipt pụta.” Ya mere, ndị Ken sitere nʼetiti ndị Amalek wezuga onwe ha. 7 Sọl busoro ndị Amalek agha site na Havila ruo Shua, nke dị nʼọwụwa anyanwụ Ijipt. 8 O jidere Agag, eze ndị Amalek na ndụ, ma jiri mma agha gbuchapụ ndị ya niile. 9 Ma Sọl na ndị agha ya debere Agag ndụ, debekwa atụrụ na ehi kachasị mma, na ụmụ ebule na atụrụ gbara abụba, na ihe ndị ọzọ niile mara mma. Nʼezie, ihe ọbụla dị mma nʼanya ka ha jụrụ ibibi. Ma ihe ndị ọzọ niile nke na-amasịghị ha, na nke na-abaghị uru, ka ha bibiri. 10 Mgbe ahụ, okwu ONYENWE ANYỊ rutere Samuel ntị, 11 “Ọ na-ewute m na m mere Sọl ka ọ bụrụ eze, nʼihi na o nupuru isi site nʼokwu m, jụ ime ihe m nyere ya nʼiwu.” O wutere Samuel nke ukwuu mgbe ọ nụrụ ihe ONYENWE ANYỊ kwuru. Ya mere, o tikuru ONYENWE ANYỊ mkpu akwa abalị ahụ niile. 12 Nʼisi ụtụtụ echi ya, Samuel pụrụ gawa ịchọ Sọl. Otu onye gwara ya sị, “Sọl agaala nʼugwu Kamel iwuru onwe ya ihe ncheta. Ọ ga-esitekwa ebe ahụ gaa Gilgal.” 13 Nʼikpeazụ, mgbe Samuel hụrụ ya, Sọl ji oke ọṅụ kelee Samuel sị, “Onye ONYENWE ANYỊ gọziri agọzi ka ị bụ. Lee, emeela m ihe niile ONYENWE ANYỊ kwuru!” 14 Ma Samuel jụrụ ya sị, “Gịnị bụ ube atụrụ ndị a m na-anụ? Ebee ka ube igwe ehi ndị a si na-ada?” 15 Sọl zara sị, “Ndị agha m si nʼetiti ndị Amalek chịta ụfọdụ nʼime atụrụ na ehi ndị mara mma nke ha chọrọ iji chụọrọ ONYENWE ANYỊ Chineke gị aja. Ma anyị bibiri ihe ndị ọzọ fọdụrụnụ.” 16 Mgbe ahụ Samuel gwara Sọl sị, “Ekwukwala ọzọ! Gee ntị nụrụ ihe ONYENWE ANYỊ gwara m nʼabalị!”Sọl zara ya sị, “Kwuo, gịnị ka ọ gwara gị?” 17 Samuel gwara ya sị, “Ọ bụghị ezie nʼagbanyeghị na ị dịrịị ntakịrị nʼanya gị onwe gị, ma ị bụụrụ onyeisi ndị ebo Izrel niile? ONYENWE ANYỊ tere gị mmanụ ibu eze ndị Izrel. 18 ONYENWE ANYỊ ziri gị ijere ya ozi, gwa gị sị, ‘Gaa, laa ndị ajọ omume ahụ, bụ ndị Amalek nʼiyi; buso ha agha ruo mgbe ị kpochapụrụ ha niile.’ 19 Gịnị mere i geghị ntị nʼokwu ONYENWE ANYỊ ime ihe o kwuru? Gịnị mere i ji chụrụ ihe nkwata gaa, si otu a mee ihe dị njọ nʼanya ONYENWE ANYỊ?” 20 Ma Sọl sịrị ya, “Ma erubeere m ONYENWE ANYỊ isi. Ejere m ozi ahụ ONYENWE ANYỊ zigara m. Anwụtara m Agag eze Amalek na ndụ, ma gbuchapụ ndị Amalek niile. 21 Ndị agha sitere nʼihe a kwatara nʼagha were ụfọdụ atụrụ na ehi, bụ ndị kachasị mma nʼetiti ihe ndị ahụ e debere iche maka ịla ha nʼiyi, iji ha chụọrọ ONYENWE ANYỊ Chineke gị aja na Gilgal.” 22 Ma Samuel sịrị,“Ihe na-atọ ONYENWE ANYỊ ụtọ ọ bụ onyinye na aja nsure ọkụdịka nrube isi nye ihe si nʼọnụ ONYENWE ANYỊ pụta?Nrube isi dị mma karịa ịchụ ajaịṅa ntị dị mma karịa abụba ebule. 23 Nʼihi na nnupu isi dịka mmehie ịgba afa,mpako dịkwa njọ dịka ikpere arụsị.Nʼihi na ị jụla okwu ONYENWE ANYỊya onwe ya ajụkwala gị dịka eze.” 24 Sọl zara Samuel sị ya, “Emehiela m. Nʼezie, enupula m isi na ndụmọdụ gị na nʼiwu ONYENWE ANYỊ. Ọ bụ nʼihi na m tụrụ egwu ndị Izrel ka m ji mee ihe ha chọrọ. 25 Biko, gbaghara m mmehie m ugbu a, bịakwa soro m ka m gaa fee ONYENWE ANYỊ ofufe.” 26 Ma Samuel sịrị ya, “Agaghị m eso gị laghachi azụ. Ebe ị jụrụ okwu ONYENWE ANYỊ, ONYENWE ANYỊ ajụkwala gị dịka eze ndị Izrel!” 27 Mgbe Samuel tụgharịrị ka o si nʼebe ahụ pụọ, Sọl jidere ya nʼọnụ ọnụ uwe ya ime ka ọ lọghachi azụ, ma uwe ahụ dọwara. 28 Mgbe ahụ, Samuel zara sị ya, “Taa ONYENWE ANYỊ adọwapụla alaeze Izrel site nʼaka gị were ya nyefee otu nʼime ndị agbataobi gị, onye ka gị mma. 29 Chineke, onye bụ Ebube Izrel, anaghị agha ụgha; ọ nakwaghị agbanwe obi ya, nʼihi na ọ bụghị mmadụ efu!” 30 Ma Sọl malitekwara ịrịọ arịrịọ ọzọ sị, “Emehiela m. Ma, sọpụrụ m ugbu a nʼihu ndị okenye ndị m, na nʼihu ndị Izrel. Lọghachi soro m ka m gaa fee ONYENWE ANYỊ Chineke gị ofufe.” 31 Ya mere, Samuel kwenyere soro Sọl laghachi, Sọl kpọkwara isiala nye ONYENWE ANYỊ. 32 Mgbe ahụ, Samuel gwara ya okwu sị ya, “Kpọpụtara m Agag, eze ndị Amalek.”Agag ji ihu ọchị bịakwute ya, nʼihi na o chere sị, “Nʼezie oge ọnwụ agaala.” 33 Ma Samuel kwuru sị,“Dịka mma agha gị sị gbawa ndị inyom aka ụmụotu a ka nne gị ga-esi bụrụ onye na-enweghị nwa nʼetiti ndị inyom.”Samuel gburu Agag nʼihu ONYENWE ANYỊ na Gilgal. 34 Emesịa, Samuel lara nʼụlọ ya na Rema. Ma Sọl laghachikwara na Gibea, obodo nke aka ya. 35 Site nʼoge ahụ ruo mgbe Samuel nwụrụ, ọ hụkwaghị Sọl anya ọzọ. Ma o rugidere ụjụ nʼihi Sọl oge ndị a niile. O wutekwara ONYENWE ANYỊ na o mere Sọl eze ndị Izrel.

In Other Versions

1 Samuel 15 in the ANGEFD

1 Samuel 15 in the ANTPNG2D

1 Samuel 15 in the AS21

1 Samuel 15 in the BAGH

1 Samuel 15 in the BBPNG

1 Samuel 15 in the BBT1E

1 Samuel 15 in the BDS

1 Samuel 15 in the BEV

1 Samuel 15 in the BHAD

1 Samuel 15 in the BIB

1 Samuel 15 in the BLPT

1 Samuel 15 in the BNT

1 Samuel 15 in the BNTABOOT

1 Samuel 15 in the BNTLV

1 Samuel 15 in the BOATCB

1 Samuel 15 in the BOATCB2

1 Samuel 15 in the BOBCV

1 Samuel 15 in the BOCNT

1 Samuel 15 in the BOECS

1 Samuel 15 in the BOGWICC

1 Samuel 15 in the BOHCB

1 Samuel 15 in the BOHCV

1 Samuel 15 in the BOHLNT

1 Samuel 15 in the BOHNTLTAL

1 Samuel 15 in the BOILNTAP

1 Samuel 15 in the BOITCV

1 Samuel 15 in the BOKCV

1 Samuel 15 in the BOKCV2

1 Samuel 15 in the BOKHWOG

1 Samuel 15 in the BOKSSV

1 Samuel 15 in the BOLCB

1 Samuel 15 in the BOLCB2

1 Samuel 15 in the BOMCV

1 Samuel 15 in the BONAV

1 Samuel 15 in the BONCB

1 Samuel 15 in the BONLT

1 Samuel 15 in the BONUT2

1 Samuel 15 in the BOPLNT

1 Samuel 15 in the BOSCB

1 Samuel 15 in the BOSNC

1 Samuel 15 in the BOTLNT

1 Samuel 15 in the BOVCB

1 Samuel 15 in the BOYCB

1 Samuel 15 in the BPBB

1 Samuel 15 in the BPH

1 Samuel 15 in the BSB

1 Samuel 15 in the CCB

1 Samuel 15 in the CUV

1 Samuel 15 in the CUVS

1 Samuel 15 in the DBT

1 Samuel 15 in the DGDNT

1 Samuel 15 in the DHNT

1 Samuel 15 in the DNT

1 Samuel 15 in the ELBE

1 Samuel 15 in the EMTV

1 Samuel 15 in the ESV

1 Samuel 15 in the FBV

1 Samuel 15 in the FEB

1 Samuel 15 in the GGMNT

1 Samuel 15 in the GNT

1 Samuel 15 in the HARY

1 Samuel 15 in the HNT

1 Samuel 15 in the IRVA

1 Samuel 15 in the IRVB

1 Samuel 15 in the IRVG

1 Samuel 15 in the IRVH

1 Samuel 15 in the IRVK

1 Samuel 15 in the IRVM

1 Samuel 15 in the IRVM2

1 Samuel 15 in the IRVO

1 Samuel 15 in the IRVP

1 Samuel 15 in the IRVT

1 Samuel 15 in the IRVT2

1 Samuel 15 in the IRVU

1 Samuel 15 in the ISVN

1 Samuel 15 in the JSNT

1 Samuel 15 in the KAPI

1 Samuel 15 in the KBT1ETNIK

1 Samuel 15 in the KBV

1 Samuel 15 in the KJV

1 Samuel 15 in the KNFD

1 Samuel 15 in the LBA

1 Samuel 15 in the LBLA

1 Samuel 15 in the LNT

1 Samuel 15 in the LSV

1 Samuel 15 in the MAAL

1 Samuel 15 in the MBV

1 Samuel 15 in the MBV2

1 Samuel 15 in the MHNT

1 Samuel 15 in the MKNFD

1 Samuel 15 in the MNG

1 Samuel 15 in the MNT

1 Samuel 15 in the MNT2

1 Samuel 15 in the MRS1T

1 Samuel 15 in the NAA

1 Samuel 15 in the NASB

1 Samuel 15 in the NBLA

1 Samuel 15 in the NBS

1 Samuel 15 in the NBVTP

1 Samuel 15 in the NET2

1 Samuel 15 in the NIV11

1 Samuel 15 in the NNT

1 Samuel 15 in the NNT2

1 Samuel 15 in the NNT3

1 Samuel 15 in the PDDPT

1 Samuel 15 in the PFNT

1 Samuel 15 in the RMNT

1 Samuel 15 in the SBIAS

1 Samuel 15 in the SBIBS

1 Samuel 15 in the SBIBS2

1 Samuel 15 in the SBICS

1 Samuel 15 in the SBIDS

1 Samuel 15 in the SBIGS

1 Samuel 15 in the SBIHS

1 Samuel 15 in the SBIIS

1 Samuel 15 in the SBIIS2

1 Samuel 15 in the SBIIS3

1 Samuel 15 in the SBIKS

1 Samuel 15 in the SBIKS2

1 Samuel 15 in the SBIMS

1 Samuel 15 in the SBIOS

1 Samuel 15 in the SBIPS

1 Samuel 15 in the SBISS

1 Samuel 15 in the SBITS

1 Samuel 15 in the SBITS2

1 Samuel 15 in the SBITS3

1 Samuel 15 in the SBITS4

1 Samuel 15 in the SBIUS

1 Samuel 15 in the SBIVS

1 Samuel 15 in the SBT

1 Samuel 15 in the SBT1E

1 Samuel 15 in the SCHL

1 Samuel 15 in the SNT

1 Samuel 15 in the SUSU

1 Samuel 15 in the SUSU2

1 Samuel 15 in the SYNO

1 Samuel 15 in the TBIAOTANT

1 Samuel 15 in the TBT1E

1 Samuel 15 in the TBT1E2

1 Samuel 15 in the TFTIP

1 Samuel 15 in the TFTU

1 Samuel 15 in the TGNTATF3T

1 Samuel 15 in the THAI

1 Samuel 15 in the TNFD

1 Samuel 15 in the TNT

1 Samuel 15 in the TNTIK

1 Samuel 15 in the TNTIL

1 Samuel 15 in the TNTIN

1 Samuel 15 in the TNTIP

1 Samuel 15 in the TNTIZ

1 Samuel 15 in the TOMA

1 Samuel 15 in the TTENT

1 Samuel 15 in the UBG

1 Samuel 15 in the UGV

1 Samuel 15 in the UGV2

1 Samuel 15 in the UGV3

1 Samuel 15 in the VBL

1 Samuel 15 in the VDCC

1 Samuel 15 in the YALU

1 Samuel 15 in the YAPE

1 Samuel 15 in the YBVTP

1 Samuel 15 in the ZBP