1 Samuel 16 (BOICB)

1 Emesịa ONYENWE ANYỊ sịrị Samuel, “Ruo ole mgbe ka ị ga-anọgide na-eru ụjụ nʼihi Sọl, ebe ọ bụ na m ajụla ya dịka eze ndị Izrel? Ugbu a, gbajuo mmanụ na mpi gị, bilie ije. Ana m eziga gị ka ijekwuru Jesi onye Betlehem, ahọrọla m otu onye ga-abụ eze site nʼetiti ụmụ ya ndị ikom.” 2 Ma Samuel zara sị, “Oleekwanụ otu m ga-esi gaa nʼebe ahụ? Ọ bụrụ na Sọl anụ ya, ọ ga-egbu m.” ONYENWE ANYỊ sịrị, “Were nwaagbọghọ ehi, jiri ya nʼaka, sị, ‘Abịara m ịchụrụ ONYENWE ANYỊ aja.’ 3 Ị ga-akpọ Jesi ka ọ bịa soro nʼọchụchụ aja ahụ. Mgbe ahụ, aga m egosi gị ihe ị ga-eme. Ị ga-etekwara m ya mmanụ, bụ onye m nke ga-egosi gị.” 4 Samuel mere ihe ONYENWE ANYỊ kwuru. Mgbe o rutere na Betlehem, ndị okenye obodo ahụ ji ịma jijiji pụta izute ya. Ha jụrụ ya sị “Ọ dịkwa mma? Udo ọ dịkwa?” 5 Ma Samuel zara ha sị “E, udo dị, Abịara m ịchụrụ ONYENWE ANYỊ aja. Doonụ onwe unu nsọ bịa soro m gaa ịchụ aja ahụ.” O dokwara Jesi na ụmụ ya ndị ikom nsọ, gwakwa ha ka ha soro gaa. 6 Mgbe ha ruru, Samuel hụrụ Eliab kwuo nʼobi ya sị, “Nʼezie, onye nke ONYENWE ANYỊ tere mmanụ na-eguzo nʼihu ONYENWE ANYỊ.” 7 Ma ONYENWE ANYỊ zara Samuel sị ya, “Ejila ihu mmadụ maọbụ ito ogologo ya ekpebi, nʼihi na onye a abụghị ya. ONYENWE ANYỊ adịghị ahụ ihe dịka mmadụ si ahụ. Mmadụ na-ele anya nʼelu ahụ, ma ONYENWE ANYỊ na-ele anya nʼobi.” 8 Jesi kpọrọ Abinadab ka ọ gafee nʼihu Samuel. Ma Samuel sịrị, “ONYENWE ANYỊ ahọrọghị onye a.” 9 Jesi mere ka Shama bịa gafee, ma Samuel sịrị, “Mba ONYENWE ANYỊ ahọrọghị onye a.” 10 Ụmụ ndị ikom Jesi asaa si otu a gafee nʼihu Samuel, ma Samuel sịrị ya, “ONYENWE ANYỊ ahọrọghị ndị a.” 11 Ọ jụrụ Jesi sị, “Ndị a ọ gwụchaala ụmụ ndị ikom ị mụtara?”Jesi zara sị “O fọdụrụ ọdụdụ nwa m, ma ọ nọ nʼọhịa na-azụ atụrụ.”Samuel sịrị, “Ziga ozi kpọlata ya, anyị agaghị anọdụ ala tutu ruo mgbe ọ bịara.” 12 Ọ zigara ozi ka akpọọ ya, mee ka ọ bịa. O nwere ụcha ahụ pụrụ iche, nwee anya mara mma, dịkwa mma ile anya.Mgbe ahụ, ONYENWE ANYỊ gwara Samuel okwu sị ya, “Ọ bụ onye a, bilie tee ya mmanụ.” 13 Ya mere, Samuel weere mpi ahụ mmanụ dị tee ya nʼihu ụmụnne ya. Site nʼụbọchị ahụ Mmụọ ONYENWE ANYỊ bịakwasịrị Devid nʼebe ọ dị ukwuu. Emesịa, Samuel laghachiri na Rema. 14 Ugbu a, Mmụọ ONYENWE ANYỊ esitela nʼime Sọl pụọ, ONYENWE ANYỊ zitekwara mmụọ ọjọọ nke bịara na-esogbu Sọl. 15 Ndị na-ejere Sọl ozi gwara ya okwu sị, “Lee, mmụọ ọjọọ si nʼebe Chineke nọ bịa na-enye gị nsogbu. 16 Biko, ka onyenwe anyị nye ndị ohu ya nọ nʼebe a ike, ka ha gaa chọta onye maara akpọ ụbọ akwara nke ọma. Ọ ga-akpọ ụbọ akwara mgbe ọbụla mmụọ ọjọọ si nʼebe Chineke nọ bịa bịakwasịrị gị, ime ka ahụ dị gị mma.” 17 Sọl kwenyere sị ha, “Ọ dị mma, gaanụ chọta ma kpọtara m nwoke na-akpọ ụbọ akwara nke ọma.” 18 Otu onye nʼime ndị na-eje ozi kwuru sị, “Lee, ahụla m otu nʼime ụmụ ndị ikom Jesi, onye Betlehem, onye maara akpọ ụbọ akwara nke ọma. Ọ bụ dike na ọka nʼagha. Ọ bụ onye na-ekwu okwu nke ọma, na nwoke mara mma ile anya. ONYENWE ANYỊ nọnyekwara ya.” 19 Sọl zipụrụ ndị ozi ka ha jekwuru Jesi sị ya, “Zitere m nwa gị nwoke Devid, onye na-azụrụ gị atụrụ.” 20 Ya mere Jesi zipụrụ Devid ka o jekwuru Sọl. O mekwara ka Devid duru otu ịnyịnya ibu nke o bukwasịrị achịcha, na otu karama akpụkpọ mmanya, na otu nwa ewu, onyinye a na-enye Sọl. 21 Devid bịakwutere Sọl, banye nʼọrụ ijere ya ozi. Sọl hụrụ ya nʼanya nke ukwuu, nʼihi ya, Devid ghọrọ otu nʼime ndị na-ebu ihe agha Sọl. 22 Mgbe ahụ, Sọl ziri Jesi ozi sị ya, “Biko, kwere ka Devid bụrụ otu nʼime ndị agha m, nʼihi na ihe ya na-atọ m ụtọ.” 23 Mgbe ọbụla mmụọ ọjọọ ahụ si nʼebe Chineke nọ bịa malitere inye Sọl nsogbu, Devid na-akpọ ụbọ akwara ya. Ahụ Sọl na-adajụkwa, mmụọ ọjọọ ahụ na-esitekwa nʼebe ọ nọ wezuga onwe ya.

In Other Versions

1 Samuel 16 in the ANGEFD

1 Samuel 16 in the ANTPNG2D

1 Samuel 16 in the AS21

1 Samuel 16 in the BAGH

1 Samuel 16 in the BBPNG

1 Samuel 16 in the BBT1E

1 Samuel 16 in the BDS

1 Samuel 16 in the BEV

1 Samuel 16 in the BHAD

1 Samuel 16 in the BIB

1 Samuel 16 in the BLPT

1 Samuel 16 in the BNT

1 Samuel 16 in the BNTABOOT

1 Samuel 16 in the BNTLV

1 Samuel 16 in the BOATCB

1 Samuel 16 in the BOATCB2

1 Samuel 16 in the BOBCV

1 Samuel 16 in the BOCNT

1 Samuel 16 in the BOECS

1 Samuel 16 in the BOGWICC

1 Samuel 16 in the BOHCB

1 Samuel 16 in the BOHCV

1 Samuel 16 in the BOHLNT

1 Samuel 16 in the BOHNTLTAL

1 Samuel 16 in the BOILNTAP

1 Samuel 16 in the BOITCV

1 Samuel 16 in the BOKCV

1 Samuel 16 in the BOKCV2

1 Samuel 16 in the BOKHWOG

1 Samuel 16 in the BOKSSV

1 Samuel 16 in the BOLCB

1 Samuel 16 in the BOLCB2

1 Samuel 16 in the BOMCV

1 Samuel 16 in the BONAV

1 Samuel 16 in the BONCB

1 Samuel 16 in the BONLT

1 Samuel 16 in the BONUT2

1 Samuel 16 in the BOPLNT

1 Samuel 16 in the BOSCB

1 Samuel 16 in the BOSNC

1 Samuel 16 in the BOTLNT

1 Samuel 16 in the BOVCB

1 Samuel 16 in the BOYCB

1 Samuel 16 in the BPBB

1 Samuel 16 in the BPH

1 Samuel 16 in the BSB

1 Samuel 16 in the CCB

1 Samuel 16 in the CUV

1 Samuel 16 in the CUVS

1 Samuel 16 in the DBT

1 Samuel 16 in the DGDNT

1 Samuel 16 in the DHNT

1 Samuel 16 in the DNT

1 Samuel 16 in the ELBE

1 Samuel 16 in the EMTV

1 Samuel 16 in the ESV

1 Samuel 16 in the FBV

1 Samuel 16 in the FEB

1 Samuel 16 in the GGMNT

1 Samuel 16 in the GNT

1 Samuel 16 in the HARY

1 Samuel 16 in the HNT

1 Samuel 16 in the IRVA

1 Samuel 16 in the IRVB

1 Samuel 16 in the IRVG

1 Samuel 16 in the IRVH

1 Samuel 16 in the IRVK

1 Samuel 16 in the IRVM

1 Samuel 16 in the IRVM2

1 Samuel 16 in the IRVO

1 Samuel 16 in the IRVP

1 Samuel 16 in the IRVT

1 Samuel 16 in the IRVT2

1 Samuel 16 in the IRVU

1 Samuel 16 in the ISVN

1 Samuel 16 in the JSNT

1 Samuel 16 in the KAPI

1 Samuel 16 in the KBT1ETNIK

1 Samuel 16 in the KBV

1 Samuel 16 in the KJV

1 Samuel 16 in the KNFD

1 Samuel 16 in the LBA

1 Samuel 16 in the LBLA

1 Samuel 16 in the LNT

1 Samuel 16 in the LSV

1 Samuel 16 in the MAAL

1 Samuel 16 in the MBV

1 Samuel 16 in the MBV2

1 Samuel 16 in the MHNT

1 Samuel 16 in the MKNFD

1 Samuel 16 in the MNG

1 Samuel 16 in the MNT

1 Samuel 16 in the MNT2

1 Samuel 16 in the MRS1T

1 Samuel 16 in the NAA

1 Samuel 16 in the NASB

1 Samuel 16 in the NBLA

1 Samuel 16 in the NBS

1 Samuel 16 in the NBVTP

1 Samuel 16 in the NET2

1 Samuel 16 in the NIV11

1 Samuel 16 in the NNT

1 Samuel 16 in the NNT2

1 Samuel 16 in the NNT3

1 Samuel 16 in the PDDPT

1 Samuel 16 in the PFNT

1 Samuel 16 in the RMNT

1 Samuel 16 in the SBIAS

1 Samuel 16 in the SBIBS

1 Samuel 16 in the SBIBS2

1 Samuel 16 in the SBICS

1 Samuel 16 in the SBIDS

1 Samuel 16 in the SBIGS

1 Samuel 16 in the SBIHS

1 Samuel 16 in the SBIIS

1 Samuel 16 in the SBIIS2

1 Samuel 16 in the SBIIS3

1 Samuel 16 in the SBIKS

1 Samuel 16 in the SBIKS2

1 Samuel 16 in the SBIMS

1 Samuel 16 in the SBIOS

1 Samuel 16 in the SBIPS

1 Samuel 16 in the SBISS

1 Samuel 16 in the SBITS

1 Samuel 16 in the SBITS2

1 Samuel 16 in the SBITS3

1 Samuel 16 in the SBITS4

1 Samuel 16 in the SBIUS

1 Samuel 16 in the SBIVS

1 Samuel 16 in the SBT

1 Samuel 16 in the SBT1E

1 Samuel 16 in the SCHL

1 Samuel 16 in the SNT

1 Samuel 16 in the SUSU

1 Samuel 16 in the SUSU2

1 Samuel 16 in the SYNO

1 Samuel 16 in the TBIAOTANT

1 Samuel 16 in the TBT1E

1 Samuel 16 in the TBT1E2

1 Samuel 16 in the TFTIP

1 Samuel 16 in the TFTU

1 Samuel 16 in the TGNTATF3T

1 Samuel 16 in the THAI

1 Samuel 16 in the TNFD

1 Samuel 16 in the TNT

1 Samuel 16 in the TNTIK

1 Samuel 16 in the TNTIL

1 Samuel 16 in the TNTIN

1 Samuel 16 in the TNTIP

1 Samuel 16 in the TNTIZ

1 Samuel 16 in the TOMA

1 Samuel 16 in the TTENT

1 Samuel 16 in the UBG

1 Samuel 16 in the UGV

1 Samuel 16 in the UGV2

1 Samuel 16 in the UGV3

1 Samuel 16 in the VBL

1 Samuel 16 in the VDCC

1 Samuel 16 in the YALU

1 Samuel 16 in the YAPE

1 Samuel 16 in the YBVTP

1 Samuel 16 in the ZBP