1 Samuel 19 (BOICB)
1 Sọl gwara ndị ohu ya na ọkpara ya, Jonatan, ka ha gbuo Devid. Ma nʼihi na ihe banyere Devid masịrị Jonatan, 2 ọ dọrọ ya aka na ntị, “Nna m Sọl na-achọ ohere igbu gị. Lezie anya chee ndụ gị nche, ụtụtụ echi, gaa nʼebe ị ga-ezo onwe gị nọdụ nʼebe ahụ. 3 Mụ na nna m ga-eso bịa nʼakụkụ ọhịa ebe ahụ i zoro onwe gị. Aga m agwa ya okwu banyere gị. Ihe ọbụla m chọpụtara, aga m agwa gị.” 4 Jonatan kwuru okwu ọma banyere Devid nye Sọl nna ya sị ya, “Ka eze ghara ime ihe ọjọọ megide Devid bụ ohu ya. O nwebeghị ihe ọjọọ o mere gị. Nʼezie, ihe niile o mere bụ ihe baara gị uru nke ukwuu. 5 Ọ kpọrọ ndụ ya asị mgbe o gburu onye Filistia ahụ. ONYENWE ANYỊ nyekwara ndị Izrel niile mmeri dị ukwuu. Obi dịkwa gị ụtọ mgbe ị hụrụ nke a. Gịnị mekwaranụ i ga-eji mejọọ nwoke aka ya dị ọcha dịka Devid, site nʼigbu ya ebe ọ bụ na ikpe amaghị ya?” 6 Sọl ṅara Jonatan ntị ṅụọkwa iyi sị, “Dịka ONYENWE ANYỊ na-adị ndụ, agaghị egbu ya.” 7 Emesịa, Jonatan kpọrọ Devid gwa ya ihe mere. Jonatan duuru Devid gaa nʼihu Sọl. Ihe niile dizikwara dịka ọ dị na mbụ. 8 Agha ọzọ dakwara. Nʼoge a, Devid duuru ndị agha ya pụọ ibuso ndị Filistia agha. O gburu ọtụtụ nʼime ha, chụọkwa ndị agha Filistia ọsọ. 9 Ma mmụọ ọjọọ ONYENWE ANYỊ zitere bịakwasịrị Sọl dịka ọ nọ nʼime ụlọ ya, ùbe ya dịkwa ya nʼaka. Mgbe Devid na-akpọ nʼụbọ akwara, 10 Sọl tụrụ ùbe ahụ ka ọ tugbuo Devid nʼahụ aja, ma ọ gbapụrụ site nʼihu Sọl, ma ùbe ahụ manyere nʼaja ụlọ ahụ. Devid gbapụrụ ọsọ zoo onwe ya nʼabalị ahụ. 11 Sọl zipụrụ ndị agha ka ha chee ụlọ Devid nche, gbuo ya mgbe ọ pụtara nʼụtụtụ. Ma Mikal nwunye Devid gwara ya sị, “Ọ bụrụ na ị gbapụghị, zoo onwe gị nʼabalị a, onye nwụrụ anwụ ka ị ga-abụ nʼụtụtụ echi.” 12 Ya mere, Mikal sitere na oghereikuku wetuo Devid, ebe o si gbapụ. 13 Emesịa, Mikal kwagharịrị ihe ndina Devid, were ihe a kpụrụ akpụ tụkwasị nʼelu ya, werekwa akwa kpuchie ya, tinye ihe ajị ewu nʼebe isi ya. 14 Mgbe ndị agha ahụ bịaruru ijide Devid na ịkpụgara ya Sọl, Mikal gwara ha sị, “Ahụ esighị ya ike.” 15 Mgbe ahụ, Sọl zighachiri ndị ahụ azụ nʼebe Devid nọ si ha, “Bute ya na ihe ndina o dina nʼelu ya, ka m gbuo ya.” 16 Mgbe ndị ikom ahụ batara, ha hụrụ ihe a kpụrụ akpụ ka ọ dị nʼelu ihe ndina, hụkwa ajị ewu ka ọ dị nʼakụkụ ebe isi nke ihe ndina ahụ. 17 Sọl jụrụ Mikal sị, “Gịnị mere i ji ghọgbuo m otu a, mee ka onye iro m gbalaga?”Mikal zara, “Ọ bụ ya sịrị m, ‘Hapụ m ka m pụọ, nʼihi gịnị ka m ga-eji gbuo gị?’ ” 18 Mgbe Devid gbara ọsọ gbalaga, ọ gakwuru Samuel na Rema, kọrọ ya ihe niile Sọl mere ya. Ya na Samuel gara biri na Naịọt. 19 Ozi ruru Sọl ntị, “Devid nọ na Naịọt nʼime Rema,” 20 ya mere, o zipụrụ ndị ikom ka ha gaa jide ya. Ma mgbe ha rutere, ha hụrụ otu ndị amụma ka ha na-ebu amụma, hụkwa Samuel ka ọ na-eguzo nʼebe ahụ dịka onyeisi ha. Mmụọ nke Chineke bịakwasịrị ndị ozi Sọl ahụ, mee ka ha malitekwa ibu amụma. 21 Mgbe Sọl nụrụ ihe mere, o zipụkwara ndị agha ọzọ, ma ha onwe ha bukwara amụma! Otu ihe ahụ mekwara ndị o zipụrụ nke ugboro atọ. 22 Nʼikpeazụ ya onwe ya pụrụ gaa Rema, ruo nʼolulu mmiri Seku. Ọ jụrụ, “Ebee ka Samuel na Devid nọ?”Ha sịrị, “Ha nọ na Naịọt nke Rema.” 23 Ya mere, Sọl gara Naịọt nke dị na Rema. Ma Mmụọ nke Chineke bịakwasịrị ya, dịka ọ na-aga nʼụzọ ọ malitere ibu amụma tutu ruo mgbe ọ bịaruru Naịọt. 24 O yipụrụ uwe ya buo amụma nʼihu Samuel. Ọ gba ọtọ dinara ala nʼebe ahụ ehihie ahụ, na abalị ahụ niile. Ọ bụ nke a mere ndị mmadụ ji sị, “Sọl ọ ghọọla otu nʼime ndị amụma?”
In Other Versions
1 Samuel 19 in the ANGEFD
1 Samuel 19 in the ANTPNG2D
1 Samuel 19 in the AS21
1 Samuel 19 in the BAGH
1 Samuel 19 in the BBPNG
1 Samuel 19 in the BBT1E
1 Samuel 19 in the BDS
1 Samuel 19 in the BEV
1 Samuel 19 in the BHAD
1 Samuel 19 in the BIB
1 Samuel 19 in the BLPT
1 Samuel 19 in the BNT
1 Samuel 19 in the BNTABOOT
1 Samuel 19 in the BNTLV
1 Samuel 19 in the BOATCB
1 Samuel 19 in the BOATCB2
1 Samuel 19 in the BOBCV
1 Samuel 19 in the BOCNT
1 Samuel 19 in the BOECS
1 Samuel 19 in the BOGWICC
1 Samuel 19 in the BOHCB
1 Samuel 19 in the BOHCV
1 Samuel 19 in the BOHLNT
1 Samuel 19 in the BOHNTLTAL
1 Samuel 19 in the BOILNTAP
1 Samuel 19 in the BOITCV
1 Samuel 19 in the BOKCV
1 Samuel 19 in the BOKCV2
1 Samuel 19 in the BOKHWOG
1 Samuel 19 in the BOKSSV
1 Samuel 19 in the BOLCB
1 Samuel 19 in the BOLCB2
1 Samuel 19 in the BOMCV
1 Samuel 19 in the BONAV
1 Samuel 19 in the BONCB
1 Samuel 19 in the BONLT
1 Samuel 19 in the BONUT2
1 Samuel 19 in the BOPLNT
1 Samuel 19 in the BOSCB
1 Samuel 19 in the BOSNC
1 Samuel 19 in the BOTLNT
1 Samuel 19 in the BOVCB
1 Samuel 19 in the BOYCB
1 Samuel 19 in the BPBB
1 Samuel 19 in the BPH
1 Samuel 19 in the BSB
1 Samuel 19 in the CCB
1 Samuel 19 in the CUV
1 Samuel 19 in the CUVS
1 Samuel 19 in the DBT
1 Samuel 19 in the DGDNT
1 Samuel 19 in the DHNT
1 Samuel 19 in the DNT
1 Samuel 19 in the ELBE
1 Samuel 19 in the EMTV
1 Samuel 19 in the ESV
1 Samuel 19 in the FBV
1 Samuel 19 in the FEB
1 Samuel 19 in the GGMNT
1 Samuel 19 in the GNT
1 Samuel 19 in the HARY
1 Samuel 19 in the HNT
1 Samuel 19 in the IRVA
1 Samuel 19 in the IRVB
1 Samuel 19 in the IRVG
1 Samuel 19 in the IRVH
1 Samuel 19 in the IRVK
1 Samuel 19 in the IRVM
1 Samuel 19 in the IRVM2
1 Samuel 19 in the IRVO
1 Samuel 19 in the IRVP
1 Samuel 19 in the IRVT
1 Samuel 19 in the IRVT2
1 Samuel 19 in the IRVU
1 Samuel 19 in the ISVN
1 Samuel 19 in the JSNT
1 Samuel 19 in the KAPI
1 Samuel 19 in the KBT1ETNIK
1 Samuel 19 in the KBV
1 Samuel 19 in the KJV
1 Samuel 19 in the KNFD
1 Samuel 19 in the LBA
1 Samuel 19 in the LBLA
1 Samuel 19 in the LNT
1 Samuel 19 in the LSV
1 Samuel 19 in the MAAL
1 Samuel 19 in the MBV
1 Samuel 19 in the MBV2
1 Samuel 19 in the MHNT
1 Samuel 19 in the MKNFD
1 Samuel 19 in the MNG
1 Samuel 19 in the MNT
1 Samuel 19 in the MNT2
1 Samuel 19 in the MRS1T
1 Samuel 19 in the NAA
1 Samuel 19 in the NASB
1 Samuel 19 in the NBLA
1 Samuel 19 in the NBS
1 Samuel 19 in the NBVTP
1 Samuel 19 in the NET2
1 Samuel 19 in the NIV11
1 Samuel 19 in the NNT
1 Samuel 19 in the NNT2
1 Samuel 19 in the NNT3
1 Samuel 19 in the PDDPT
1 Samuel 19 in the PFNT
1 Samuel 19 in the RMNT
1 Samuel 19 in the SBIAS
1 Samuel 19 in the SBIBS
1 Samuel 19 in the SBIBS2
1 Samuel 19 in the SBICS
1 Samuel 19 in the SBIDS
1 Samuel 19 in the SBIGS
1 Samuel 19 in the SBIHS
1 Samuel 19 in the SBIIS
1 Samuel 19 in the SBIIS2
1 Samuel 19 in the SBIIS3
1 Samuel 19 in the SBIKS
1 Samuel 19 in the SBIKS2
1 Samuel 19 in the SBIMS
1 Samuel 19 in the SBIOS
1 Samuel 19 in the SBIPS
1 Samuel 19 in the SBISS
1 Samuel 19 in the SBITS
1 Samuel 19 in the SBITS2
1 Samuel 19 in the SBITS3
1 Samuel 19 in the SBITS4
1 Samuel 19 in the SBIUS
1 Samuel 19 in the SBIVS
1 Samuel 19 in the SBT
1 Samuel 19 in the SBT1E
1 Samuel 19 in the SCHL
1 Samuel 19 in the SNT
1 Samuel 19 in the SUSU
1 Samuel 19 in the SUSU2
1 Samuel 19 in the SYNO
1 Samuel 19 in the TBIAOTANT
1 Samuel 19 in the TBT1E
1 Samuel 19 in the TBT1E2
1 Samuel 19 in the TFTIP
1 Samuel 19 in the TFTU
1 Samuel 19 in the TGNTATF3T
1 Samuel 19 in the THAI
1 Samuel 19 in the TNFD
1 Samuel 19 in the TNT
1 Samuel 19 in the TNTIK
1 Samuel 19 in the TNTIL
1 Samuel 19 in the TNTIN
1 Samuel 19 in the TNTIP
1 Samuel 19 in the TNTIZ
1 Samuel 19 in the TOMA
1 Samuel 19 in the TTENT
1 Samuel 19 in the UBG
1 Samuel 19 in the UGV
1 Samuel 19 in the UGV2
1 Samuel 19 in the UGV3
1 Samuel 19 in the VBL
1 Samuel 19 in the VDCC
1 Samuel 19 in the YALU
1 Samuel 19 in the YAPE
1 Samuel 19 in the YBVTP
1 Samuel 19 in the ZBP