1 Samuel 25 (BOICB)

1 Emesịa Samuel nwụrụ. Izrel niile chịkọtara onwe ha ọnụ zukọta ruo ụjụ nʼihi ọnwụ ya. Ha liri ya nʼụlọ ya dị na Rema. Emesịa, Devid gara nʼọzara Paran biri nʼebe ahụ. 2 Otu nwoke dị, onye obodo Maon, onye ikwu Kaleb, nke nwere akụnụba. O nwere igwe atụrụ dị puku atọ, na otu puku ewu, ndị ọ nọ nʼubi nʼoge a na-akpụchapụ ajị ha nʼobodo Kamel. 3 Aha nwoke a bụ Nebal. Nwunye ya kwa, onye bụ nwanyị mara mma, na onye nwere akọnuche, ka a na-akpọ Abigel. Nwoke a nwere omume ọjọọ; ọ kwara obi nʼazụ, afọ takwara ya mmiri. 4 Mgbe Devid nọ nʼọzara nụ na Nebal na-akpụcha ajị igwe ewu na atụrụ ya, 5 o zipụrụ ndị ikom iri sị ha. “Jekwurunụ Nebal nʼobodo Kamel, jụọ ya otu ihe si aga nʼaha m. 6 Sịnụ ya, ndụ gị, ndụ ogologo, udo na ahụ ike nye gị na ezinaụlọ gị, udo na ahụ ike nye ihe niile i nwere. 7 “ ‘Anụla m na ị na-akpacha ajị igwe ewu na atụrụ gị. Oge ndị ọzụzụ atụrụ gị nọ nʼetiti anyị, anyị emejọghị ha, o nweghị ihe ọbụla funarịrị ha oge ahụ niile ha nọrọ nʼobodo Kamel. 8 Jụọkwa ndị ikom gị, ha ga-agwa gị ma ihe m kwuru ọ bụ eziokwu. Ya mere gosi ụmụ okorobịa ndị a ihuọma, ebe ọ bụ na ha na-abịakwute gị nʼoge mmemme. Biko, nyetụ ndị ohu gị ndị a, na mụ bụ Devid nwa gị, ihe ọbụla aka gị ruru.’ ” 9 Ụmụ okorobịa Devid zipụrụ bịarutere zie Nebal ozi Devid ziri ha. Ha nọgidekwara chere ka onye ha ọsịsa. 10 Ma Nebal jụrụ ha sị, “Onye bụ Devid? Onye bụkwa nwa Jesi a? Ọtụtụ ndị ohu dị taa bụ ndị na-esi nʼaka nna ha ukwu na-agbapụ. 11 M ga-ewere achịcha m, na mmiri m, na anụ m gburu nʼihi ndị na-akpachara m ajị anụ nye ndị m na-amaghị ebe ha sị pụta?” 12 Ndị ikom Devid tụgharịrị azụ laghachi ebe ha si bịa. Mgbe ha bịarutere, ha kọrọ akụkọ banyere okwu niile Nebal kwuru. 13 Devid sịrị ndị ikom ya, “Onye ọbụla nyara mma agha!” Ha mere ihe o kwuru. Devid nʼonwe ya nyanyekwara mma agha nke ya. Ihe dị ka narị ndị ikom anọ sooro Devid pụọ, ebe narị mmadụ abụọ ndị ọzọ nọdụrụ na-eche ụlọ ha nche. 14 Ma otu nʼime ndị ikom Nebal gara kọọrọ Abigel, nwunye Nebal sị ya, “Lee, Devid esitela nʼọzara zite ndị ozi ka ha nye onyenwe anyị ekele ya, ma ọ kparịrị ha, baakwara ha mba. 15 Ma ndị ikom ndị a mesoro anyị mmeso ọma, ha emejọghị anyị. Oge ahụ niile anyị nọ ha nso nʼọhịa ọ dịghị ihe funarịrị anyị. 16 Ehihie na abalị, ha bụụrụ anyị mgbidi, ichebe anyị na atụrụ anyị, mgbe ha na-akpa nri nʼakụkụ ebe ha nọ. 17 Ọ dị mma ka ị mata ma marakwa ihe ị ga-eme ngwangwa; nʼihi nsogbu dị njọ nke na-aga ịdịrị nna anyị ukwu na ezinaụlọ ya niile. Nʼihi ọ bụ nwoke jọgburu onwe ya, na ọ dịghị onye pụrụ ịgwa ya okwu.” 18 Abigel mere ngwangwa chịkọta narị ogbe achịcha abụọ, karama akpụkpọ mmanya abụọ, atụrụ ise e doziri edozi, otu bushel ọka e ghere eghe, otu narị ụyọkọ mkpụrụ vaịnị a mịkpọrọ amịkpọ na narị achịcha fiig abụọ, bukwasị ihe ndị a niile nʼelu ịnyịnya ibu. 19 Ọ sịrị ụmụ okorobịa na-ejere ya ozi, “Na-aganụ nʼihu, ana m abịa nʼazụ.” Ma ọ gwaghị di ya Nebal ihe ọ na-aga ime. 20 Mgbe ọ nọ nʼelu ịnyịnya ibu na-agbada ụzọ nke ugwu ahụ ọ hụrụ Devid na ndị agha ya ka ha na-abịa. O zutere ha 21 ma Devid nọrịị na-ekwu na-asị, “Ọ bụ nʼefu ka anyị nyeere nwoke a aka. Anyị chebere igwe ewu na atụrụ ya nʼọzara; ọ dịkwaghị otu furu efu, ọ dịkwaghị otu nke e zuru ezu, ma o jirila ajọ omume kwụghachi m ihe ọma m meere ya. 22 Ka Chineke mesoo Devid mmeso, otu ọbụla mmeso ahụ si dị njọ, ma ọ bụrụ na m ahapụ otu mkpụrụ nwoke ndụ nʼetiti ihe niile o nwere na-eku ume, mgbe chi echi bọrọ.” 23 Mgbe Abigel hụrụ Devid, o mere ngwangwa si nʼelu ịnyịnya ibu ya rịda, kpuo ihu nʼala, kpọọ isiala nye Devid. 24 Ọ dara nʼala nʼụkwụ ya, sị, “Ka ajọ omume ahụ dịkwasị nʼisi ohu gị, onyenwe m. Biko, kwere ka ohu gị gwa gị okwu, gekwaa ntị nʼihe ohu gị nwere ikwu. 25 Nebal bụ nwoke nwere obi ọjọọ, biko ka onyenwe m ghara ịgụ ihe ọbụla o kwuru nʼihe. Ọ bụ onye nzuzu, dịka aha ya na-egosi. Aha ya pụtara nzuzu, nzuzu na-esokwa ya. Ma ahụghị m ndị ozi ahụ i zitere, nʼezie ohu gị ahụghị ndị ikom onyenwe m zitere. 26 Ugbu a, onyenwe m, dịka ONYENWE ANYỊ na-adị ndụ ma gị onwe gị na-adịkwa ndụ, ebe ọ bụ na ONYENWE ANYỊ gbochiri gị ka ị ghara ịba nʼikpe ọmụma nke igbu mmadụ, na iji aka gị bọrọ onwe gị ọbọ, ka ndụ ndị iro gị na ndị niile na-achọ ime onyenwe m ihe ọjọọ, dịka Nebal. 27 Ma kwerekwa ka onyinye a, nke ohu gị nwanyị wetaara nna m ukwu, bụrụ nke a ga-enye ndị ikom na-eso gị. 28 “Biko, gbaghara njehie ohu gị nwanyị, nʼihi na ONYENWE ANYỊ Chineke gị aghaghị imere onyenwe m alaeze nke ga-adịgide, nʼihi na ọ bụ agha ONYENWE ANYỊ ka ị na-alụ, agaghị ahụta ajọ omume nʼime gị ogologo ụbọchị ndụ gị niile. 29 Ọ bụ ezie na mmadụ pụrụ ị na-achụ gị ịnapụ gị ndụ gị, ma ndụ onyenwe m ga-abụ ihe ONYENWE ANYỊ Chineke gị ga-ekechi na ngwungwu ndị dị ndụ. Ma ndụ ndị iro gị ka ọ ga-atụfu dịka nkume esi nʼakpa e ji efe ebe. 30 Mgbe ONYENWE ANYỊ mezuru nye onyenwe m ihe ọma niile nke o kwere na nkwa, meekwa ya onyendu ndị Izrel, 31 onyenwe m agaghị enwe akọnuche nke ga na-esogbu ya nʼihi na o ji aka ya bọọrọ onwe ya ọbọ, maọbụ nke iwufu ọbara. Mgbe ONYENWE ANYỊ Chineke gị mere ka ihe gaara onyenwe m nke ọma, chetakwa ohu gị nwanyị.” 32 Devid zara Abigel sị ya, “Otuto dịrị ONYENWE ANYỊ, Chineke nke Izrel onye zitere gị taa ka ị bịa zute m. 33 Ka ngọzị dịrị gị nʼihi ezi uche gị, na nʼihi na i gbochiri m iwufu ọbara taa, gbochiekwa m iji aka m bọrọ onwe m ọbọ. 34 Ma ọ bụghị otu a, dịka ONYENWE ANYỊ Chineke nke Izrel na-adị ndụ, bụ onye jidere m site nʼimerụ gị ahụ, ọ bụrụ na ị pụtaghị ngwa izute m, ọ dịghị otu nwoke gaara adị ndụ nʼụlọ Nebal nʼìhè ụtụtụ echi.” 35 Devid naara ya ihe ndị ahụ niile o wetara sị ya, “Laghachi nʼụlọ gị nʼudo. Anụla m ihe i kwuru ma meekwa ihe ị rịọrọ.” 36 Mgbe Abigel batara nʼụlọ, o jekwuru Nebal ebe ọ nọ nʼoriri ọ kpọrọ, oriri dịka oriri a na-enwe nʼụlọeze. Ọ ṅụọkwala mmanya ṅụbigakwa ya oke; nʼihi ya ọ gwaghị ya ihe ọbụla tutu ruo nʼụtụtụ. 37 Nʼụtụtụ, mgbe mmanya pụrụ Nebal nʼanya, nwunye ya gwara ya ihe ndị a niile. Nke a mere ka obi ya nwụọ, ka ọ tọgbọrọ dịka nkume. 38 Mgbe abalị iri gafere, ONYENWE ANYỊ tiri Nebal ihe otiti, nke mere ka ọ nwụọ. 39 Mgbe Devid nụrụ na Nebal anwụọla, ọ sịrị, “Otuto dịrị ONYENWE ANYỊ, onye kpechitere m okwu m megide Nebal nʼihi nlelị anya o leliri m. O gbochiela ohu ya site nʼime ihe ezighị ezi, ma kwụghachi Nebal ụgwọ mmehie ya.”Mgbe ahụ Devid zigara ndị ozi ka ha gaa jụọ Abigel ma ọ ga-ekwe ị ghọọ nwunye ya. 40 Ndị ozi Devid bịakwutere Abigel na Kamel zie ya ozi sị, “Devid zitere anyị bịakwute gị ịlụta gị ka ị ghọọ nwunye ya.” 41 Abigel kpuru ihu nʼala sị ya, “Lee ohu gị nwanyị, ejikeere m ijere gị ozi, na ịsacha ụkwụ ndị na-ejere onyenwe m ozi.” 42 Abigel mere ngwangwa jikere, kpọrọ ụmụ agbọghọ ise na-ejere ya ozi, nọkwasị nʼelu ịnyịnya ibu, soro ndị ahụ Devid zitere lakwuru Devid. Otu a ka Abigel sị ghọọ nwunye Devid. 43 Devid lụkwara nwanyị ọzọ aha ya bụ Ahinoam, onye Jezril. Ha abụọ bụkwa ndị nwunye ya. 44 Nʼoge a, Sọl ewerela nwa ya nwanyị Mikal, onye bụ nwunye Devid kpọnye Palti, nwa Laish, onye obodo Galim, dịka nwunye.

In Other Versions

1 Samuel 25 in the ANGEFD

1 Samuel 25 in the ANTPNG2D

1 Samuel 25 in the AS21

1 Samuel 25 in the BAGH

1 Samuel 25 in the BBPNG

1 Samuel 25 in the BBT1E

1 Samuel 25 in the BDS

1 Samuel 25 in the BEV

1 Samuel 25 in the BHAD

1 Samuel 25 in the BIB

1 Samuel 25 in the BLPT

1 Samuel 25 in the BNT

1 Samuel 25 in the BNTABOOT

1 Samuel 25 in the BNTLV

1 Samuel 25 in the BOATCB

1 Samuel 25 in the BOATCB2

1 Samuel 25 in the BOBCV

1 Samuel 25 in the BOCNT

1 Samuel 25 in the BOECS

1 Samuel 25 in the BOGWICC

1 Samuel 25 in the BOHCB

1 Samuel 25 in the BOHCV

1 Samuel 25 in the BOHLNT

1 Samuel 25 in the BOHNTLTAL

1 Samuel 25 in the BOILNTAP

1 Samuel 25 in the BOITCV

1 Samuel 25 in the BOKCV

1 Samuel 25 in the BOKCV2

1 Samuel 25 in the BOKHWOG

1 Samuel 25 in the BOKSSV

1 Samuel 25 in the BOLCB

1 Samuel 25 in the BOLCB2

1 Samuel 25 in the BOMCV

1 Samuel 25 in the BONAV

1 Samuel 25 in the BONCB

1 Samuel 25 in the BONLT

1 Samuel 25 in the BONUT2

1 Samuel 25 in the BOPLNT

1 Samuel 25 in the BOSCB

1 Samuel 25 in the BOSNC

1 Samuel 25 in the BOTLNT

1 Samuel 25 in the BOVCB

1 Samuel 25 in the BOYCB

1 Samuel 25 in the BPBB

1 Samuel 25 in the BPH

1 Samuel 25 in the BSB

1 Samuel 25 in the CCB

1 Samuel 25 in the CUV

1 Samuel 25 in the CUVS

1 Samuel 25 in the DBT

1 Samuel 25 in the DGDNT

1 Samuel 25 in the DHNT

1 Samuel 25 in the DNT

1 Samuel 25 in the ELBE

1 Samuel 25 in the EMTV

1 Samuel 25 in the ESV

1 Samuel 25 in the FBV

1 Samuel 25 in the FEB

1 Samuel 25 in the GGMNT

1 Samuel 25 in the GNT

1 Samuel 25 in the HARY

1 Samuel 25 in the HNT

1 Samuel 25 in the IRVA

1 Samuel 25 in the IRVB

1 Samuel 25 in the IRVG

1 Samuel 25 in the IRVH

1 Samuel 25 in the IRVK

1 Samuel 25 in the IRVM

1 Samuel 25 in the IRVM2

1 Samuel 25 in the IRVO

1 Samuel 25 in the IRVP

1 Samuel 25 in the IRVT

1 Samuel 25 in the IRVT2

1 Samuel 25 in the IRVU

1 Samuel 25 in the ISVN

1 Samuel 25 in the JSNT

1 Samuel 25 in the KAPI

1 Samuel 25 in the KBT1ETNIK

1 Samuel 25 in the KBV

1 Samuel 25 in the KJV

1 Samuel 25 in the KNFD

1 Samuel 25 in the LBA

1 Samuel 25 in the LBLA

1 Samuel 25 in the LNT

1 Samuel 25 in the LSV

1 Samuel 25 in the MAAL

1 Samuel 25 in the MBV

1 Samuel 25 in the MBV2

1 Samuel 25 in the MHNT

1 Samuel 25 in the MKNFD

1 Samuel 25 in the MNG

1 Samuel 25 in the MNT

1 Samuel 25 in the MNT2

1 Samuel 25 in the MRS1T

1 Samuel 25 in the NAA

1 Samuel 25 in the NASB

1 Samuel 25 in the NBLA

1 Samuel 25 in the NBS

1 Samuel 25 in the NBVTP

1 Samuel 25 in the NET2

1 Samuel 25 in the NIV11

1 Samuel 25 in the NNT

1 Samuel 25 in the NNT2

1 Samuel 25 in the NNT3

1 Samuel 25 in the PDDPT

1 Samuel 25 in the PFNT

1 Samuel 25 in the RMNT

1 Samuel 25 in the SBIAS

1 Samuel 25 in the SBIBS

1 Samuel 25 in the SBIBS2

1 Samuel 25 in the SBICS

1 Samuel 25 in the SBIDS

1 Samuel 25 in the SBIGS

1 Samuel 25 in the SBIHS

1 Samuel 25 in the SBIIS

1 Samuel 25 in the SBIIS2

1 Samuel 25 in the SBIIS3

1 Samuel 25 in the SBIKS

1 Samuel 25 in the SBIKS2

1 Samuel 25 in the SBIMS

1 Samuel 25 in the SBIOS

1 Samuel 25 in the SBIPS

1 Samuel 25 in the SBISS

1 Samuel 25 in the SBITS

1 Samuel 25 in the SBITS2

1 Samuel 25 in the SBITS3

1 Samuel 25 in the SBITS4

1 Samuel 25 in the SBIUS

1 Samuel 25 in the SBIVS

1 Samuel 25 in the SBT

1 Samuel 25 in the SBT1E

1 Samuel 25 in the SCHL

1 Samuel 25 in the SNT

1 Samuel 25 in the SUSU

1 Samuel 25 in the SUSU2

1 Samuel 25 in the SYNO

1 Samuel 25 in the TBIAOTANT

1 Samuel 25 in the TBT1E

1 Samuel 25 in the TBT1E2

1 Samuel 25 in the TFTIP

1 Samuel 25 in the TFTU

1 Samuel 25 in the TGNTATF3T

1 Samuel 25 in the THAI

1 Samuel 25 in the TNFD

1 Samuel 25 in the TNT

1 Samuel 25 in the TNTIK

1 Samuel 25 in the TNTIL

1 Samuel 25 in the TNTIN

1 Samuel 25 in the TNTIP

1 Samuel 25 in the TNTIZ

1 Samuel 25 in the TOMA

1 Samuel 25 in the TTENT

1 Samuel 25 in the UBG

1 Samuel 25 in the UGV

1 Samuel 25 in the UGV2

1 Samuel 25 in the UGV3

1 Samuel 25 in the VBL

1 Samuel 25 in the VDCC

1 Samuel 25 in the YALU

1 Samuel 25 in the YAPE

1 Samuel 25 in the YBVTP

1 Samuel 25 in the ZBP