1 Timothy 1 (BOICB)
1 Pọl, onyeozi Kraịst Jisọs site nʼiwu Chineke Onye nzọpụta anyị, na nke Kraịst Jisọs, onye bụ olileanya anyị, 2 Na-edegara gị bụ Timoti ezi nwa m nʼime okwukwe akwụkwọ a. Ka amara, na ebere na udo nke sitere na Chineke bụ Nna, na Kraịst Jisọs Onyenwe anyị dịrị gị. 3 Dị ka m gbara gị ume, mgbe m na-aga Masidonia, nọgide nʼEfesọs ka i nwee ike nye mmadụ ụfọdụ iwu ka ha ghara ịga nʼihu nʼizi ụkpụrụ dị iche. 4 Mee ka ha kwụsị ịkọ ogologo akụkọ, na inyocha ihe gbasara usoro ọmụmụ dị iche iche nke na-adịghị agwụ agwụ. Nʼihi na ihe ndị a na-eweta ajụjụ na ịrụ ụka na-abaghị uru, kama inyere ndị mmadụ aka ịnabata ụzọ ahụ Chineke kwadoro site nʼokwukwe. 5 Ihe anyị bu nʼobi nye iwu a, bụ ka a kwalite ịhụnanya nke sitere nʼobi ọcha na ezi akọnuche, na okwukwe nke aghụghọ na-adịghị. 6 Ụfọdụ e sikwala nʼihe ndị a dapụ, jehie ụzọ, site nʼoke ịrụ ụka na-abaghị uru. 7 Ha chọrọ ịbụ ndị ozizi iwu ma ha amaghị ihe ha na-ekwu maọbụ ihe ha na-akwadosi ike. 8 Ma anyị maara na iwu dị mma, ma ọ bụrụ na onye ọbụla ewere ya mee ihe a chọrọ ka e jiri ya mee. 9 Ma emeghị iwu nʼihi ndị ezi omume. Kama, e mere iwu nʼihi ndị ahụ na-emebi iwu na ndị na-enupu isi, ndị kpọrọ Chineke asị na ndị mmehie, ndị rụrụ arụ, ndị na-egbu nna ha na nne ha, na ndị na-egbu mmadụ ibe ha, 10 na ndị na-akwa iko na ndị ikom na-emerụ onwe ha nʼahụ ndị ikom ibe ha, ndị na-azụ ahịa ndị ohu, na ndị ụgha niile, na ndị na-agba ama ụgha, tinyere ihe ndị ahụ niile megidere ezi ozizi ahụ, 11 nke dabara nʼoziọma ahụ dị ebube, nke Chineke dị ngọzị, nke o nyefere m nʼaka na ntụkwasị obi ichebe. 12 Ana m ekele Kraịst Jisọs Onyenwe anyị ekele, onye na-enye m ike, nʼihi na ọ gụrụ m dị ka onye e kwesiri ịtụkwasị obi mgbe ọ họpụtara m ijere ya ozi. 13 Ọ bụ ezie na nʼoge gara aga, abụ m onye na-ekwujọ Chineke na onye na-akpagbu ndị ya, bụrụkwa onye na-emegide emegide. Ma Chineke meere m ebere nʼihi na m mere ihe ndị ahụ nʼọnọdụ amaghị ihe, na enweghị okwukwe. 14 Ma Onyenwe anyị wụkwasịrị m amara ya, nke babigara ụba oke, ya na okwukwe na ịhụnanya nʼime Kraịst Jisọs. 15 Okwu a kwesiri ntụkwasị obi, kwesikwa ka anabata ya nke ọma: Kraịst Jisọs bịara nʼụwa ịzọpụta ndị mmehie, nke mụ onwe m bụ onyeisi ha. 16 Ọ bụ nʼihi nke a ka e ji gosi m ebere, ka Kraịst Jisọs site nʼime m, bụ onye kachasị dị njọ, gosi enweghị ọgwụgwụ nke ntachiobi ya, ka m bụrụ ihe nlere anya nye ndị ahụ niile ga-ekwere na ya, ma nata ndụ ebighị ebi. 17 Ugbu a, ka enye Eze ahụ na-adị ruo mgbe niile, Onye na-adịghị anwụ anwụ, Onye a na-adịghị ahụ anya, Onye naanị ya bụ Chineke, nsọpụrụ na otuto ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen. 18 Ugbu a, Timoti nwa m, ana m enye gị ndụmọdụ a dị ka amụma ahụ e buru banyere gị nʼoge gara aga si dị. Ka ị site nʼịgbaso ya nwe ike ịlụ ezi ọgụ ahụ. 19 Jidesie okwukwe i nwere ike, ya na ezi akọnuche. Nʼihi na ụfọdụ ajụla ezi akọnuche ma si otu a dapụ nʼokwukwe. 20 Haimeniọs na Alegzanda so na ndị a. Ewerela m ha nyefee Ekwensu nʼaka, ka ọ taa ha ahụhụ tutu ruo mgbe ha mụtara na ha ekwesighị ikwu okwu nkwulu megide Chineke.
In Other Versions
1 Timothy 1 in the ANGEFD
1 Timothy 1 in the ANTPNG2D
1 Timothy 1 in the AS21
1 Timothy 1 in the BAGH
1 Timothy 1 in the BBPNG
1 Timothy 1 in the BBT1E
1 Timothy 1 in the BDS
1 Timothy 1 in the BEV
1 Timothy 1 in the BHAD
1 Timothy 1 in the BIB
1 Timothy 1 in the BLPT
1 Timothy 1 in the BNT
1 Timothy 1 in the BNTABOOT
1 Timothy 1 in the BNTLV
1 Timothy 1 in the BOATCB
1 Timothy 1 in the BOATCB2
1 Timothy 1 in the BOBCV
1 Timothy 1 in the BOCNT
1 Timothy 1 in the BOECS
1 Timothy 1 in the BOGWICC
1 Timothy 1 in the BOHCB
1 Timothy 1 in the BOHCV
1 Timothy 1 in the BOHLNT
1 Timothy 1 in the BOHNTLTAL
1 Timothy 1 in the BOILNTAP
1 Timothy 1 in the BOITCV
1 Timothy 1 in the BOKCV
1 Timothy 1 in the BOKCV2
1 Timothy 1 in the BOKHWOG
1 Timothy 1 in the BOKSSV
1 Timothy 1 in the BOLCB
1 Timothy 1 in the BOLCB2
1 Timothy 1 in the BOMCV
1 Timothy 1 in the BONAV
1 Timothy 1 in the BONCB
1 Timothy 1 in the BONLT
1 Timothy 1 in the BONUT2
1 Timothy 1 in the BOPLNT
1 Timothy 1 in the BOSCB
1 Timothy 1 in the BOSNC
1 Timothy 1 in the BOTLNT
1 Timothy 1 in the BOVCB
1 Timothy 1 in the BOYCB
1 Timothy 1 in the BPBB
1 Timothy 1 in the BPH
1 Timothy 1 in the BSB
1 Timothy 1 in the CCB
1 Timothy 1 in the CUV
1 Timothy 1 in the CUVS
1 Timothy 1 in the DBT
1 Timothy 1 in the DGDNT
1 Timothy 1 in the DHNT
1 Timothy 1 in the DNT
1 Timothy 1 in the ELBE
1 Timothy 1 in the EMTV
1 Timothy 1 in the ESV
1 Timothy 1 in the FBV
1 Timothy 1 in the FEB
1 Timothy 1 in the GGMNT
1 Timothy 1 in the GNT
1 Timothy 1 in the HARY
1 Timothy 1 in the HNT
1 Timothy 1 in the IRVA
1 Timothy 1 in the IRVB
1 Timothy 1 in the IRVG
1 Timothy 1 in the IRVH
1 Timothy 1 in the IRVK
1 Timothy 1 in the IRVM
1 Timothy 1 in the IRVM2
1 Timothy 1 in the IRVO
1 Timothy 1 in the IRVP
1 Timothy 1 in the IRVT
1 Timothy 1 in the IRVT2
1 Timothy 1 in the IRVU
1 Timothy 1 in the ISVN
1 Timothy 1 in the JSNT
1 Timothy 1 in the KAPI
1 Timothy 1 in the KBT1ETNIK
1 Timothy 1 in the KBV
1 Timothy 1 in the KJV
1 Timothy 1 in the KNFD
1 Timothy 1 in the LBA
1 Timothy 1 in the LBLA
1 Timothy 1 in the LNT
1 Timothy 1 in the LSV
1 Timothy 1 in the MAAL
1 Timothy 1 in the MBV
1 Timothy 1 in the MBV2
1 Timothy 1 in the MHNT
1 Timothy 1 in the MKNFD
1 Timothy 1 in the MNG
1 Timothy 1 in the MNT
1 Timothy 1 in the MNT2
1 Timothy 1 in the MRS1T
1 Timothy 1 in the NAA
1 Timothy 1 in the NASB
1 Timothy 1 in the NBLA
1 Timothy 1 in the NBS
1 Timothy 1 in the NBVTP
1 Timothy 1 in the NET2
1 Timothy 1 in the NIV11
1 Timothy 1 in the NNT
1 Timothy 1 in the NNT2
1 Timothy 1 in the NNT3
1 Timothy 1 in the PDDPT
1 Timothy 1 in the PFNT
1 Timothy 1 in the RMNT
1 Timothy 1 in the SBIAS
1 Timothy 1 in the SBIBS
1 Timothy 1 in the SBIBS2
1 Timothy 1 in the SBICS
1 Timothy 1 in the SBIDS
1 Timothy 1 in the SBIGS
1 Timothy 1 in the SBIHS
1 Timothy 1 in the SBIIS
1 Timothy 1 in the SBIIS2
1 Timothy 1 in the SBIIS3
1 Timothy 1 in the SBIKS
1 Timothy 1 in the SBIKS2
1 Timothy 1 in the SBIMS
1 Timothy 1 in the SBIOS
1 Timothy 1 in the SBIPS
1 Timothy 1 in the SBISS
1 Timothy 1 in the SBITS
1 Timothy 1 in the SBITS2
1 Timothy 1 in the SBITS3
1 Timothy 1 in the SBITS4
1 Timothy 1 in the SBIUS
1 Timothy 1 in the SBIVS
1 Timothy 1 in the SBT
1 Timothy 1 in the SBT1E
1 Timothy 1 in the SCHL
1 Timothy 1 in the SNT
1 Timothy 1 in the SUSU
1 Timothy 1 in the SUSU2
1 Timothy 1 in the SYNO
1 Timothy 1 in the TBIAOTANT
1 Timothy 1 in the TBT1E
1 Timothy 1 in the TBT1E2
1 Timothy 1 in the TFTIP
1 Timothy 1 in the TFTU
1 Timothy 1 in the TGNTATF3T
1 Timothy 1 in the THAI
1 Timothy 1 in the TNFD
1 Timothy 1 in the TNT
1 Timothy 1 in the TNTIK
1 Timothy 1 in the TNTIL
1 Timothy 1 in the TNTIN
1 Timothy 1 in the TNTIP
1 Timothy 1 in the TNTIZ
1 Timothy 1 in the TOMA
1 Timothy 1 in the TTENT
1 Timothy 1 in the UBG
1 Timothy 1 in the UGV
1 Timothy 1 in the UGV2
1 Timothy 1 in the UGV3
1 Timothy 1 in the VBL
1 Timothy 1 in the VDCC
1 Timothy 1 in the YALU
1 Timothy 1 in the YAPE
1 Timothy 1 in the YBVTP
1 Timothy 1 in the ZBP