2 Chronicles 10 (BOICB)

1 Rehoboam gara Shekem nʼihi na Izrel niile zukọrọ ebe ahụ ime ya eze. 2 Mgbe Jeroboam nwa Nebat nụrụ nke a (ọ nọ nʼIjipt ebe ọ gbagara ọsọ ndụ site nʼaka eze Solomọn) o sitere Ijipt lọta. 3 Ya mere, ha ziri ozi kpọọ Jeroboam, ya na ndị Izrel niile jekwuru Rehoboam sị ya: 4 “Nna gị boro anyị ibu arọ, ma ugbu a mee ka ibu arọ na ịyagba arọ a nke o bokwasịrị anyị dị mfe, anyị ga-ejere gị ozi.” 5 Rehoboam zara ha sị, “Bịaghachikwutenụ m mgbe ụbọchị atọ gasịrị.” Nʼihi ya ndị ahụ lara. 6 Mgbe ahụ, eze Rehoboam gara ịnata ndụmọdụ nʼaka ndị okenye, bụ ndị jeere nna ya Solomọn ozi nʼoge ọ dị ndụ ya, sị ha, “Olee ndụmọdụ unu ga-enye m maka mụ inye ndị a ọsịsa?” 7 Ha zara ya, “Ọ bụrụ na ị ga-emere ha ihe ọma, mee ihe ga-atọ ha ụtọ, nyekwa ha ọsịsa dị mma, ha ga-anọgide bụrụ ndị ohu gị mgbe niile.” 8 Ma ọ nabataghị ndụmọdụ ndị okenye nyere ya, ọ gakwuru ụmụ okorobịa ndị ya na ha tokọrọ, bụkwa ndị na-ejere ya ozi, ka ha nye ya ndụmọdụ. 9 Rehoboam jụrụ ha sị, “Gịnị bụ ndụmọdụ unu? Gịnị bụ ọsịsa anyị ga-enye ndị a na-asị, ‘Mee ka ibu arọ nna gị bokwasịrị anyị dị mfe’? ” 10 Ụmụ okorobịa ahụ, bụ ndị ya na ha tokọrọ, zaghachiri sị, “Gwa ndị ahụ sịrị gị, ‘Nna gị bokwasịrị anyị ibu arọ, ma mee ka ibu anyị dị mfe,’ ị ga-agwa ha, sị, ‘Mkpịsịaka nta dị nʼaka m gbara okpotokpo karịa ukwu nna m. 11 Nna m boro unu ibu arọ; aga m atụkwasị ihe nʼibu ahụ mee ka ọ dị arọ karịa. Nna m ji apịpịa dọọ unu aka na ntị, maọbụ akpị ka m ga-eji mekpaa unu ahụ.’ ” 12 Mgbe ụbọchị atọ gasịrị, Jeroboam na ndị Izrel niile bịaghachiri ịnụrụ ọsịsa Rehoboam, dịka eze kwuru, sị, “Laghachitenụ nʼụbọchị nke atọ.” 13 Eze sara ha okwu nʼolu dị ike. Ọ jụrụ ndụmọdụ ndị okenye 14 ma gbasoro ndụmọdụ nke ụmụ okorobịa nyere, ọ sịrị, “Nna m mere ka ibu unu dị arọ, aga m eme ka ibu unu dị arọ karịa. Nna m ji apịpịa dọọ unu aka na ntị, aga m eji akpị mekpaa unu ahụ.” 15 Ya mere, eze aṅaghị ndị ahụ ntị, nʼihi mgbanwe nke ọnọdụ niile a sitere nʼebe Chineke nọ, ka e mezuo okwu ahụ ONYENWE ANYỊ gwara Jeroboam nwa Nebat site nʼọnụ Ahija onye Shilo. 16 Mgbe Izrel niile hụrụ na eze jụrụ ige ha ntị, ha zaghachiri ya sị,“Olee oke anyị nwere nʼime Devid?Olee ihe nketa anyị nwere nʼime nwa Jesi?Ndị Izrel, laanụ nʼụlọ ikwu unu!Gị Devid lekọtakwa ụlọ nke gị.”Nke a mere, ka ndị Izrel niile laa nʼụlọ ha. 17 Ma banyere ndị Izrel bi nʼobodo niile nke Juda, Rehoboam gara nʼihu bụrụ eze ha. 18 Eze Rehoboam zipụrụ Adoniram onyeisi na-elekọta ndị ọrụ mmanye ma ndị Izrel ji nkume tugbuo ya. Ma eze Rehoboam jisiri ike gbaba nʼime ụgbọ agha ya, gbalaga laa Jerusalem. 19 Ya mere, Izrel nọ na nnupu isi megide ụlọ Devid ruo taa.

In Other Versions

2 Chronicles 10 in the ANGEFD

2 Chronicles 10 in the ANTPNG2D

2 Chronicles 10 in the AS21

2 Chronicles 10 in the BAGH

2 Chronicles 10 in the BBPNG

2 Chronicles 10 in the BBT1E

2 Chronicles 10 in the BDS

2 Chronicles 10 in the BEV

2 Chronicles 10 in the BHAD

2 Chronicles 10 in the BIB

2 Chronicles 10 in the BLPT

2 Chronicles 10 in the BNT

2 Chronicles 10 in the BNTABOOT

2 Chronicles 10 in the BNTLV

2 Chronicles 10 in the BOATCB

2 Chronicles 10 in the BOATCB2

2 Chronicles 10 in the BOBCV

2 Chronicles 10 in the BOCNT

2 Chronicles 10 in the BOECS

2 Chronicles 10 in the BOGWICC

2 Chronicles 10 in the BOHCB

2 Chronicles 10 in the BOHCV

2 Chronicles 10 in the BOHLNT

2 Chronicles 10 in the BOHNTLTAL

2 Chronicles 10 in the BOILNTAP

2 Chronicles 10 in the BOITCV

2 Chronicles 10 in the BOKCV

2 Chronicles 10 in the BOKCV2

2 Chronicles 10 in the BOKHWOG

2 Chronicles 10 in the BOKSSV

2 Chronicles 10 in the BOLCB

2 Chronicles 10 in the BOLCB2

2 Chronicles 10 in the BOMCV

2 Chronicles 10 in the BONAV

2 Chronicles 10 in the BONCB

2 Chronicles 10 in the BONLT

2 Chronicles 10 in the BONUT2

2 Chronicles 10 in the BOPLNT

2 Chronicles 10 in the BOSCB

2 Chronicles 10 in the BOSNC

2 Chronicles 10 in the BOTLNT

2 Chronicles 10 in the BOVCB

2 Chronicles 10 in the BOYCB

2 Chronicles 10 in the BPBB

2 Chronicles 10 in the BPH

2 Chronicles 10 in the BSB

2 Chronicles 10 in the CCB

2 Chronicles 10 in the CUV

2 Chronicles 10 in the CUVS

2 Chronicles 10 in the DBT

2 Chronicles 10 in the DGDNT

2 Chronicles 10 in the DHNT

2 Chronicles 10 in the DNT

2 Chronicles 10 in the ELBE

2 Chronicles 10 in the EMTV

2 Chronicles 10 in the ESV

2 Chronicles 10 in the FBV

2 Chronicles 10 in the FEB

2 Chronicles 10 in the GGMNT

2 Chronicles 10 in the GNT

2 Chronicles 10 in the HARY

2 Chronicles 10 in the HNT

2 Chronicles 10 in the IRVA

2 Chronicles 10 in the IRVB

2 Chronicles 10 in the IRVG

2 Chronicles 10 in the IRVH

2 Chronicles 10 in the IRVK

2 Chronicles 10 in the IRVM

2 Chronicles 10 in the IRVM2

2 Chronicles 10 in the IRVO

2 Chronicles 10 in the IRVP

2 Chronicles 10 in the IRVT

2 Chronicles 10 in the IRVT2

2 Chronicles 10 in the IRVU

2 Chronicles 10 in the ISVN

2 Chronicles 10 in the JSNT

2 Chronicles 10 in the KAPI

2 Chronicles 10 in the KBT1ETNIK

2 Chronicles 10 in the KBV

2 Chronicles 10 in the KJV

2 Chronicles 10 in the KNFD

2 Chronicles 10 in the LBA

2 Chronicles 10 in the LBLA

2 Chronicles 10 in the LNT

2 Chronicles 10 in the LSV

2 Chronicles 10 in the MAAL

2 Chronicles 10 in the MBV

2 Chronicles 10 in the MBV2

2 Chronicles 10 in the MHNT

2 Chronicles 10 in the MKNFD

2 Chronicles 10 in the MNG

2 Chronicles 10 in the MNT

2 Chronicles 10 in the MNT2

2 Chronicles 10 in the MRS1T

2 Chronicles 10 in the NAA

2 Chronicles 10 in the NASB

2 Chronicles 10 in the NBLA

2 Chronicles 10 in the NBS

2 Chronicles 10 in the NBVTP

2 Chronicles 10 in the NET2

2 Chronicles 10 in the NIV11

2 Chronicles 10 in the NNT

2 Chronicles 10 in the NNT2

2 Chronicles 10 in the NNT3

2 Chronicles 10 in the PDDPT

2 Chronicles 10 in the PFNT

2 Chronicles 10 in the RMNT

2 Chronicles 10 in the SBIAS

2 Chronicles 10 in the SBIBS

2 Chronicles 10 in the SBIBS2

2 Chronicles 10 in the SBICS

2 Chronicles 10 in the SBIDS

2 Chronicles 10 in the SBIGS

2 Chronicles 10 in the SBIHS

2 Chronicles 10 in the SBIIS

2 Chronicles 10 in the SBIIS2

2 Chronicles 10 in the SBIIS3

2 Chronicles 10 in the SBIKS

2 Chronicles 10 in the SBIKS2

2 Chronicles 10 in the SBIMS

2 Chronicles 10 in the SBIOS

2 Chronicles 10 in the SBIPS

2 Chronicles 10 in the SBISS

2 Chronicles 10 in the SBITS

2 Chronicles 10 in the SBITS2

2 Chronicles 10 in the SBITS3

2 Chronicles 10 in the SBITS4

2 Chronicles 10 in the SBIUS

2 Chronicles 10 in the SBIVS

2 Chronicles 10 in the SBT

2 Chronicles 10 in the SBT1E

2 Chronicles 10 in the SCHL

2 Chronicles 10 in the SNT

2 Chronicles 10 in the SUSU

2 Chronicles 10 in the SUSU2

2 Chronicles 10 in the SYNO

2 Chronicles 10 in the TBIAOTANT

2 Chronicles 10 in the TBT1E

2 Chronicles 10 in the TBT1E2

2 Chronicles 10 in the TFTIP

2 Chronicles 10 in the TFTU

2 Chronicles 10 in the TGNTATF3T

2 Chronicles 10 in the THAI

2 Chronicles 10 in the TNFD

2 Chronicles 10 in the TNT

2 Chronicles 10 in the TNTIK

2 Chronicles 10 in the TNTIL

2 Chronicles 10 in the TNTIN

2 Chronicles 10 in the TNTIP

2 Chronicles 10 in the TNTIZ

2 Chronicles 10 in the TOMA

2 Chronicles 10 in the TTENT

2 Chronicles 10 in the UBG

2 Chronicles 10 in the UGV

2 Chronicles 10 in the UGV2

2 Chronicles 10 in the UGV3

2 Chronicles 10 in the VBL

2 Chronicles 10 in the VDCC

2 Chronicles 10 in the YALU

2 Chronicles 10 in the YAPE

2 Chronicles 10 in the YBVTP

2 Chronicles 10 in the ZBP