2 Chronicles 24 (BOICB)

1 Joash gbara afọ asaa mgbe e mere ya eze, ọ chịrị iri afọ anọ na Jerusalem. Aha nne ya bụ Zibịa onye Bịasheba. 2 Joash mere ihe ziri ezi nʼanya ONYENWE ANYỊ nʼafọ niile nke Jehoiada bụ onye nchụaja, dị ndụ. 3 Jehoiada lụtaara ya ndị inyom abụọ, ndị mụtaara ya ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom. 4 Mgbe ihe ndị a gasịrị, Joash kpebiri ime ka ụlọnsọ ukwu ONYENWE ANYỊ dị ọhụrụ. 5 Ọ kpọkọtara ndị nchụaja na ndị Livayị niile sị ha, “Gaanụ nʼobodo Juda niile nakọta ego ụtụ afọ nʼaka ndị Izrel niile, maka iwuzi ụlọnsọ Chineke unu. Meenụ ya ugbu a.” Ma ndị Livayị emeghị ya ngwangwa. 6 Ya mere, eze kpọrọ Jehoiada bụ onyeisi nchụaja sị ya, “Gịnị mere i mebeghị ka ndị Livayị gaa nakọtaa, site nʼaka ndị bi nʼobodo Juda niile, na nʼobodo Jerusalem, ego ụtụ nke Mosis ohu ONYENWE ANYỊ na ọgbakọ ụmụ Izrel nyere nʼiwu maka ụlọ ikwu nke iwu ọgbụgba ndụ?” 7 Nʼoge a ụmụ ndị ikom Atalaya, nwanyị ọjọọ ahụ tipuru ụlọnsọ Chineke, bukọrọ ihe nsọ niile e ji efe ONYENWE ANYỊ dị nʼime ya maka Baal. 8 Ya mere, eze nyere iwu ka e wuo igbe onyinye, nke a ga-adọba nʼọnụ ụzọ e si abanye ụlọnsọ ukwu ONYENWE ANYỊ. 9 A kpọsara ya na Juda na Jerusalem niile sị ka ha wetara ONYENWE ANYỊ ụtụ nke Mosis ohu Chineke kwagidere ụmụ Izrel nʼọzara na ha ga na-atụ. 10 Ndịisi na ndị mmadụ niile jiri obi ụtọ tụta ụtụ ha. Ha jiri onyinye ha bịa tụnye ha nʼigbe onyinye ahụ, tutu rụọ mgbe o juru nʼọnụ. 11 Mgbe ọbụla ndị Livayị bubataara ndị ozi eze igbe ahụ, ha hụ na-atụjuola ya ego, ode akwụkwọ eze ya na onyeozi nke onyeisi nchụaja ga-awụpụta ihe dị nʼigbe, ma bughachi okpokoro igbe ahụ nʼọnọdụ ya. Otu a ka ha mere ọtụtụ oge ruo mgbe ha nwetara ọtụtụ ego dị ukwuu. 12 Eze na Jehoiada weere ego ahụ niile nyefee ha nʼaka ndị ọrụ ụlọ ONYENWE ANYỊ dị nʼaka, ha chọtara ndị ọka na-edo nkume, na ndị ọkpọ ǹtu. Ha tinyere ọrụ ime ka ụlọnsọ ahụ dị ọhụrụ nʼaka ndị a. Ha gokwara ndị ụzụ bịara kpụọ ihe niile gbasara bronz na igwe e ji rụọ ọrụ ahụ. 13 Ndị e nyefere ọrụ ahụ nʼaka ji obi ha niile rụọ ọrụ nke mere na ọrụ ahụ gara nʼihu nke ọma. Ha rụziri ụlọnsọ ukwu Chineke dịka atụmatụ ya mbụ si dị, meekwa ya ka o sie ike karịa. 14 Mgbe ha rụsịrị ọrụ niile, ha weghachitere ego fọdụrụ, nye ya eze na Jehoiada, ha were ya rụta ngwa ije ozi maka ụlọnsọ ONYENWE ANYỊ, ngwa ije ozi na ihe isure aja nsure ọkụ, na ngaji, ya na efere dị iche iche, na ihe ọlaọcha na ọlaedo. A na-achụ aja nsure ọkụ nʼụlọnsọ nye ONYENWE ANYỊ ụbọchị niile Jehoiada dị ndụ. 15 Ma Jehoiada mere nnọọ agadi, jupụtakwa nʼọtụtụ afọ, ọ nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ na iri afọ atọ. 16 E liri ya nʼebe a na-eli ndị eze nʼobodo Devid nʼihi ihe ọma niile o meere Izrel na Chineke na ụlọnsọ ya. 17 Mgbe Jehoiada nwụsịrị, ndịisi Juda bịara ịkwanyere eze Joash ugwu. O gekwara ha ntị. 18 Ha hapụrụ ụlọnsọ ukwu ONYENWE ANYỊ Chineke nna nna ha, fee ogidi Ashera na arụsị ndị ọzọ. Nʼihi ikpe ọmụma ha wetaara onwe ha, iwe Chineke dakwasịrị Juda na Jerusalem. 19 ONYENWE ANYỊ zitere ọtụtụ ndị amụma, ndị bịara buo amụma maka ịkpọghachi ha azụ, ma ha mesiri obi ha ike, jụ ige ntị. 20 Mgbe ahụ, Mmụọ nke Chineke bịakwasịrị Zekaraya nwa Jehoiada onye nchụaja. O guzoro nʼihu ọha na eze gwa ha okwu sị; “Otu a ka Chineke sịrị, ‘Gịnị mere unu ji enupu isi nʼiwu ONYENWE ANYỊ? Ihe agaghị agara unu nke ọma. Unu agbakụtala ONYENWE ANYỊ azụ, ugbu a, ya onwe ya agbakụtakwala unu azụ.’ ” 21 Ma ndịisi Juda niile gbara izu megide ya, sitekwa nʼiwu eze nyere ha ji nkume tugbuo ya nʼogige ụlọnsọ ukwu ONYENWE ANYỊ. 22 Eze Joash echetaghị ebere nke nna Zekaraya bụ Jehoiada meere ya kama o gburu nwa ya. Ma mgbe ọ na-anwụ, ọ sịrị, “Ka ONYENWE ANYỊ hụkwa mmeso ọjọọ a ma kwụọkwa unu ụgwọ ajọ omume unu niile.” 23 O ruo ka ọ gbara otu afọ, ndị agha Aram bịara imegide Joash, ha wakporo Juda na Jerusalem gbuo ndị ndu niile site nʼetiti ndị mmadụ. Ha zigaara eze ha nọ na Damaskọs ihe niile ha kwatara nʼike. 24 Nʼagbanyeghị na ndị Aram kpọọ naanị ndị ikom ole na ole bịa, ONYENWE ANYỊ raara igwe ndị agha dị ukwuu ranye ha nʼaka. Nʼihi na Juda gbakụtara ONYENWE ANYỊ azụ, bụ Chineke nke nna nna ha, e mezuru ihe niile e kpere nʼikpe nʼahụ Joash. 25 Mgbe ndị agha Aram lara, hapụ Joash nʼọnọdụ mmerụ ahụ dị ukwuu, ndịisi ozi ya gbara izu gbuo ya, nʼihi ogbugbu o gburu nwa Jehoiada, onye nchụaja. Ha gburu ya mgbe o dina nʼihe ndina ya. Emesịa, ha liri ya nʼobodo Devid, ma ọ bụghị nʼebe a na-eli ndị eze. 26 Ndị gbara izu gbuo ya bụ Zabad, onye nne ya bụ Shimeat onye Amọn, na Jehozabad, onye nne ya bụ Shimrit onye Moab. 27 Ihe niile gbasara Joash na ụmụ ya, na amụma niile e buru banyere ya, na otu e si wuzie ụlọnsọ ukwu Chineke, ka e dere nʼakwụkwọ akụkọ ndị eze Izrel niile. Mgbe Joash nwụrụ, Amazaya nwa ya ghọrọ eze Juda.

In Other Versions

2 Chronicles 24 in the ANGEFD

2 Chronicles 24 in the ANTPNG2D

2 Chronicles 24 in the AS21

2 Chronicles 24 in the BAGH

2 Chronicles 24 in the BBPNG

2 Chronicles 24 in the BBT1E

2 Chronicles 24 in the BDS

2 Chronicles 24 in the BEV

2 Chronicles 24 in the BHAD

2 Chronicles 24 in the BIB

2 Chronicles 24 in the BLPT

2 Chronicles 24 in the BNT

2 Chronicles 24 in the BNTABOOT

2 Chronicles 24 in the BNTLV

2 Chronicles 24 in the BOATCB

2 Chronicles 24 in the BOATCB2

2 Chronicles 24 in the BOBCV

2 Chronicles 24 in the BOCNT

2 Chronicles 24 in the BOECS

2 Chronicles 24 in the BOGWICC

2 Chronicles 24 in the BOHCB

2 Chronicles 24 in the BOHCV

2 Chronicles 24 in the BOHLNT

2 Chronicles 24 in the BOHNTLTAL

2 Chronicles 24 in the BOILNTAP

2 Chronicles 24 in the BOITCV

2 Chronicles 24 in the BOKCV

2 Chronicles 24 in the BOKCV2

2 Chronicles 24 in the BOKHWOG

2 Chronicles 24 in the BOKSSV

2 Chronicles 24 in the BOLCB

2 Chronicles 24 in the BOLCB2

2 Chronicles 24 in the BOMCV

2 Chronicles 24 in the BONAV

2 Chronicles 24 in the BONCB

2 Chronicles 24 in the BONLT

2 Chronicles 24 in the BONUT2

2 Chronicles 24 in the BOPLNT

2 Chronicles 24 in the BOSCB

2 Chronicles 24 in the BOSNC

2 Chronicles 24 in the BOTLNT

2 Chronicles 24 in the BOVCB

2 Chronicles 24 in the BOYCB

2 Chronicles 24 in the BPBB

2 Chronicles 24 in the BPH

2 Chronicles 24 in the BSB

2 Chronicles 24 in the CCB

2 Chronicles 24 in the CUV

2 Chronicles 24 in the CUVS

2 Chronicles 24 in the DBT

2 Chronicles 24 in the DGDNT

2 Chronicles 24 in the DHNT

2 Chronicles 24 in the DNT

2 Chronicles 24 in the ELBE

2 Chronicles 24 in the EMTV

2 Chronicles 24 in the ESV

2 Chronicles 24 in the FBV

2 Chronicles 24 in the FEB

2 Chronicles 24 in the GGMNT

2 Chronicles 24 in the GNT

2 Chronicles 24 in the HARY

2 Chronicles 24 in the HNT

2 Chronicles 24 in the IRVA

2 Chronicles 24 in the IRVB

2 Chronicles 24 in the IRVG

2 Chronicles 24 in the IRVH

2 Chronicles 24 in the IRVK

2 Chronicles 24 in the IRVM

2 Chronicles 24 in the IRVM2

2 Chronicles 24 in the IRVO

2 Chronicles 24 in the IRVP

2 Chronicles 24 in the IRVT

2 Chronicles 24 in the IRVT2

2 Chronicles 24 in the IRVU

2 Chronicles 24 in the ISVN

2 Chronicles 24 in the JSNT

2 Chronicles 24 in the KAPI

2 Chronicles 24 in the KBT1ETNIK

2 Chronicles 24 in the KBV

2 Chronicles 24 in the KJV

2 Chronicles 24 in the KNFD

2 Chronicles 24 in the LBA

2 Chronicles 24 in the LBLA

2 Chronicles 24 in the LNT

2 Chronicles 24 in the LSV

2 Chronicles 24 in the MAAL

2 Chronicles 24 in the MBV

2 Chronicles 24 in the MBV2

2 Chronicles 24 in the MHNT

2 Chronicles 24 in the MKNFD

2 Chronicles 24 in the MNG

2 Chronicles 24 in the MNT

2 Chronicles 24 in the MNT2

2 Chronicles 24 in the MRS1T

2 Chronicles 24 in the NAA

2 Chronicles 24 in the NASB

2 Chronicles 24 in the NBLA

2 Chronicles 24 in the NBS

2 Chronicles 24 in the NBVTP

2 Chronicles 24 in the NET2

2 Chronicles 24 in the NIV11

2 Chronicles 24 in the NNT

2 Chronicles 24 in the NNT2

2 Chronicles 24 in the NNT3

2 Chronicles 24 in the PDDPT

2 Chronicles 24 in the PFNT

2 Chronicles 24 in the RMNT

2 Chronicles 24 in the SBIAS

2 Chronicles 24 in the SBIBS

2 Chronicles 24 in the SBIBS2

2 Chronicles 24 in the SBICS

2 Chronicles 24 in the SBIDS

2 Chronicles 24 in the SBIGS

2 Chronicles 24 in the SBIHS

2 Chronicles 24 in the SBIIS

2 Chronicles 24 in the SBIIS2

2 Chronicles 24 in the SBIIS3

2 Chronicles 24 in the SBIKS

2 Chronicles 24 in the SBIKS2

2 Chronicles 24 in the SBIMS

2 Chronicles 24 in the SBIOS

2 Chronicles 24 in the SBIPS

2 Chronicles 24 in the SBISS

2 Chronicles 24 in the SBITS

2 Chronicles 24 in the SBITS2

2 Chronicles 24 in the SBITS3

2 Chronicles 24 in the SBITS4

2 Chronicles 24 in the SBIUS

2 Chronicles 24 in the SBIVS

2 Chronicles 24 in the SBT

2 Chronicles 24 in the SBT1E

2 Chronicles 24 in the SCHL

2 Chronicles 24 in the SNT

2 Chronicles 24 in the SUSU

2 Chronicles 24 in the SUSU2

2 Chronicles 24 in the SYNO

2 Chronicles 24 in the TBIAOTANT

2 Chronicles 24 in the TBT1E

2 Chronicles 24 in the TBT1E2

2 Chronicles 24 in the TFTIP

2 Chronicles 24 in the TFTU

2 Chronicles 24 in the TGNTATF3T

2 Chronicles 24 in the THAI

2 Chronicles 24 in the TNFD

2 Chronicles 24 in the TNT

2 Chronicles 24 in the TNTIK

2 Chronicles 24 in the TNTIL

2 Chronicles 24 in the TNTIN

2 Chronicles 24 in the TNTIP

2 Chronicles 24 in the TNTIZ

2 Chronicles 24 in the TOMA

2 Chronicles 24 in the TTENT

2 Chronicles 24 in the UBG

2 Chronicles 24 in the UGV

2 Chronicles 24 in the UGV2

2 Chronicles 24 in the UGV3

2 Chronicles 24 in the VBL

2 Chronicles 24 in the VDCC

2 Chronicles 24 in the YALU

2 Chronicles 24 in the YAPE

2 Chronicles 24 in the YBVTP

2 Chronicles 24 in the ZBP