2 Chronicles 25 (BOICB)

1 Amazaya gbara iri afọ abụọ na ise mgbe e mere ya eze, ọ chịrị dịka eze iri afọ abụọ na itoolu na Jerusalem. Nne ya bụ Jehoadin onye Jerusalem. 2 O mere ihe ziri ezi nʼanya ONYENWE ANYỊ, ma o jighị obi ya niile mee nke a. 3 Mgbe alaeze guzosiri ike nʼokpuru ọchịchị ya, o gburu ndị ozi ahụ gburu eze, bụ nna ya. 4 Ma o meghị ka ụmụ ha nwụọ, kama ọ gbasoro usoro ihe e dere nʼakwụkwọ iwu Mosis, ebe ONYENWE ANYỊ nyere iwu sị: “Ndị mụrụ ụmụ agaghị anwụ nʼihi ihe ụmụ ha metara, maọbụ mee ka ụmụ nwụọ nʼihi ihe ndị mụrụ ha metara, onye ọbụla ga-anwụ nʼihi mmehie nke aka ya.” 5 Amazaya kpọkọtara ndị Juda, guzo ha dịka ezinaụlọ ha si dị, kenye ha nʼokpuru ndị ọchịagha na-achị ọtụtụ puku ndị agha, na ndị na-achị ọtụtụ narị ndị agha, bụ ndị Juda na ndị Benjamin niile. Mgbe ọ gụrụ ndị dị afọ iri abụọ maọbụ karịa ọnụ, ọ chọpụtara na ha dị narị puku ndị ikom atọ ndị tozuru iji ùbe na ọta buo agha. 6 O ji narị talenti ọlaọcha gota narị puku ndị agha site nʼala Izrel. 7 Ma otu onye nke Chineke bịakwutere ya, sị ya; “Eze, ka ndị agha a si Izrel ghara isonyere gị, nʼihi na ONYENWE ANYỊ anọnyereghị ndị Izrel, ọ nọnyereghị onye ọbụla sitere nʼIfrem. 8 A sịkwarị na i jiri obi dimkpa ga agha a, Chineke ga-eme ka ndị iro gị merie gị, nʼihi na Chineke bụ onye nwere ike inyere mmadụ aka maọbụ ime ka ọ sụọ ngọngọ.” 9 Amazaya sịrị onye nke Chineke ahụ, “Gịnị kwanụ ka anyị ga-eme banyere narị ego talenti m kwụrụ maka ndị agha Izrel?”Onye nke Chineke ahụ zara, “ONYENWE ANYỊ pụrụ inye gị karịa nke ahụ.” 10 Amazaya zighachiri ndị agha Izrel ahụ azụ ka ha laa, bụ ndị a si nʼIfrem bịakwute ya. Ha were iwe nke ukwuu megide Juda, jirikwa oke iwe laghachi nʼụlọ ha. 11 Amazaya duuru ndị agha ya gaa na Ndagwurugwu Nnu, ebe o gburu ndị ikom Sia dị puku iri. 12 Ndị agha Juda nwudoro puku ndị ikom iri ọzọ na ndụ, duru ha gaa nʼelu nkume dị elu, si nʼebe ahụ tụda ha niile, nke mere na ha niile kụpịasịrị. 13 Ma ndị agha ahụ Amazaya zilagara, ka ha ghara iso ya gaa agha, wakporo ọtụtụ obodo ndị Juda site na Sameria ruo Bet-Horon. Ha gburu puku mmadụ atọ nʼime ha, bukọrọkwa ọtụtụ ihe nkwata nʼagha, buru ha laa. 14 Mgbe Amazaya sitere nʼagha ebe o gburu ọtụtụ ndị Edọm lọta, o bulatara chi nke ndị Sia. O guzobere ha dịka chi ndị nke aka ya, kpọọ isiala nye ha ma surekwa aja nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye ha. 15 Iwe ONYENWE ANYỊ dị ukwuu megide Amazaya. O zigaara ya onye amụma, onye sịrị, “Nʼihi gịnị ka iji ajụ ase site nʼaka chi nke ndị ahụ, bụ ndị na-enweghị ike ịzọpụta ndị ha site nʼaka gị?” 16 Mgbe ọ ka kpụ okwu nʼọnụ ya, eze sịrị ya; “Mechie ọnụ! Ị chọrọ ịnwụ? Ole mgbe ka anyị mere gị onye na-adụ eze ọdụ?”Ya mere, onye amụma ahụ kwụsịrị, ma sị, “Amaara m na Chineke ekpebiela ịla gị nʼiyi, nʼihi na i mere nke a ma jụkwa ige ntị na ndụmọdụ m.” 17 Emesịa, mgbe Amazaya, eze Juda gbachara izu ya na ndị ndụmọdụ ya, o zigara Jehoash nwa Jehoahaz, nwa Jehu, eze Izrel ozi ịma aka, sị, “Bịa ka dimkpa na ibe ya zute ihu na ihu nʼagha.” 18 Ma Jehoash eze Izrel, zighachiri ozi nye Amazaya eze Juda, sị; “Uke dị na Lebanọn zigaara osisi sida nke dị na Lebanọn ozi sị ya, ‘Nye nwa m nwoke nwa gị nwanyị ka ọ bụrụ nwunye ya.’ Mgbe ahụ, anụ ọhịa nke dị na Lebanọn gafetere ebe ahụ zọpịa uke ahụ. 19 Ị na-asị onwe gị, na i meriela Edọm, ugbu a, mpako abatala, isi a na-ebu gị. Ma nọdụ nʼụlọ gị. Nʼihi gịnị ka ị ga-eji kpaliere onwe gị nsogbu, si otu a wetara onwe gị na Juda ọdịda?” 20 Ma Amazaya egeghị ntị, nʼihi na Chineke na-akwado inyefe ya nʼaka Jehoash onye iro ha, nʼihi na ha chọrọ chi ndị Edọm gawa. 21 Ya mere, Jehoash bụ eze Izrel buliri agha. Ya na Amazaya eze Juda zutere ihu na ihu nʼagha na Bet-Shemesh, dị nʼala Juda. 22 Ndị Izrel meriri ndị Juda, mee ka ha gbalaga, nwoke ọbụla nʼụlọ ya. 23 Jehoash, bụ eze Izrel nwudere Amazaya eze Juda, nwa Joash, nwa Ahazaya na Bet-Shemesh. Mgbe ahụ, Jehoash duuru ya bịa na Jerusalem, kwada mgbidi Jerusalem, site nʼỌnụ ụzọ ama Ifrem ruo nʼọnụ ụzọ ama Nkuku, nke ogologo ya ruru narị nzọ ụkwụ isii. 24 Ọ chịkọrọ ọlaedo na ọlaọcha niile na ngwongwo niile ahụtara nʼụlọnsọ ukwu Chineke, nke e tinyere nʼaka Obed-Edọm ilekọta, tinyekwara akụ niile dị nʼụlọeze. Ọ dọọrọ ọtụtụ ndị mmadụ nʼagha, kpọrọ laghachi na Sameria. 25 Amazaya nwa Joash, eze Juda nọrọ ndụ afọ iri na ise, mgbe Jehoash nwa Jehoahaz, eze Izrel nwụsịrị. 26 Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Amazaya, site na mmalite ruo ọgwụgwụ, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ndị eze Juda na Izrel? 27 Site nʼoge Amazaya gbakụtara ONYENWE ANYỊ azụ, ha gbara izuzu imegide ya nʼime Jerusalem. Ọ gbapụrụ gbalaga Lakish, ma ha zipụrụ ndị ikom chụụrụ ya gaa Lakish, gbuo ya nʼebe ahụ. 28 Ha bulatara ozu ya nʼelu ịnyịnya, e lie ya nʼebe e liri nna nna ya ha nʼobodo Juda.

In Other Versions

2 Chronicles 25 in the ANGEFD

2 Chronicles 25 in the ANTPNG2D

2 Chronicles 25 in the AS21

2 Chronicles 25 in the BAGH

2 Chronicles 25 in the BBPNG

2 Chronicles 25 in the BBT1E

2 Chronicles 25 in the BDS

2 Chronicles 25 in the BEV

2 Chronicles 25 in the BHAD

2 Chronicles 25 in the BIB

2 Chronicles 25 in the BLPT

2 Chronicles 25 in the BNT

2 Chronicles 25 in the BNTABOOT

2 Chronicles 25 in the BNTLV

2 Chronicles 25 in the BOATCB

2 Chronicles 25 in the BOATCB2

2 Chronicles 25 in the BOBCV

2 Chronicles 25 in the BOCNT

2 Chronicles 25 in the BOECS

2 Chronicles 25 in the BOGWICC

2 Chronicles 25 in the BOHCB

2 Chronicles 25 in the BOHCV

2 Chronicles 25 in the BOHLNT

2 Chronicles 25 in the BOHNTLTAL

2 Chronicles 25 in the BOILNTAP

2 Chronicles 25 in the BOITCV

2 Chronicles 25 in the BOKCV

2 Chronicles 25 in the BOKCV2

2 Chronicles 25 in the BOKHWOG

2 Chronicles 25 in the BOKSSV

2 Chronicles 25 in the BOLCB

2 Chronicles 25 in the BOLCB2

2 Chronicles 25 in the BOMCV

2 Chronicles 25 in the BONAV

2 Chronicles 25 in the BONCB

2 Chronicles 25 in the BONLT

2 Chronicles 25 in the BONUT2

2 Chronicles 25 in the BOPLNT

2 Chronicles 25 in the BOSCB

2 Chronicles 25 in the BOSNC

2 Chronicles 25 in the BOTLNT

2 Chronicles 25 in the BOVCB

2 Chronicles 25 in the BOYCB

2 Chronicles 25 in the BPBB

2 Chronicles 25 in the BPH

2 Chronicles 25 in the BSB

2 Chronicles 25 in the CCB

2 Chronicles 25 in the CUV

2 Chronicles 25 in the CUVS

2 Chronicles 25 in the DBT

2 Chronicles 25 in the DGDNT

2 Chronicles 25 in the DHNT

2 Chronicles 25 in the DNT

2 Chronicles 25 in the ELBE

2 Chronicles 25 in the EMTV

2 Chronicles 25 in the ESV

2 Chronicles 25 in the FBV

2 Chronicles 25 in the FEB

2 Chronicles 25 in the GGMNT

2 Chronicles 25 in the GNT

2 Chronicles 25 in the HARY

2 Chronicles 25 in the HNT

2 Chronicles 25 in the IRVA

2 Chronicles 25 in the IRVB

2 Chronicles 25 in the IRVG

2 Chronicles 25 in the IRVH

2 Chronicles 25 in the IRVK

2 Chronicles 25 in the IRVM

2 Chronicles 25 in the IRVM2

2 Chronicles 25 in the IRVO

2 Chronicles 25 in the IRVP

2 Chronicles 25 in the IRVT

2 Chronicles 25 in the IRVT2

2 Chronicles 25 in the IRVU

2 Chronicles 25 in the ISVN

2 Chronicles 25 in the JSNT

2 Chronicles 25 in the KAPI

2 Chronicles 25 in the KBT1ETNIK

2 Chronicles 25 in the KBV

2 Chronicles 25 in the KJV

2 Chronicles 25 in the KNFD

2 Chronicles 25 in the LBA

2 Chronicles 25 in the LBLA

2 Chronicles 25 in the LNT

2 Chronicles 25 in the LSV

2 Chronicles 25 in the MAAL

2 Chronicles 25 in the MBV

2 Chronicles 25 in the MBV2

2 Chronicles 25 in the MHNT

2 Chronicles 25 in the MKNFD

2 Chronicles 25 in the MNG

2 Chronicles 25 in the MNT

2 Chronicles 25 in the MNT2

2 Chronicles 25 in the MRS1T

2 Chronicles 25 in the NAA

2 Chronicles 25 in the NASB

2 Chronicles 25 in the NBLA

2 Chronicles 25 in the NBS

2 Chronicles 25 in the NBVTP

2 Chronicles 25 in the NET2

2 Chronicles 25 in the NIV11

2 Chronicles 25 in the NNT

2 Chronicles 25 in the NNT2

2 Chronicles 25 in the NNT3

2 Chronicles 25 in the PDDPT

2 Chronicles 25 in the PFNT

2 Chronicles 25 in the RMNT

2 Chronicles 25 in the SBIAS

2 Chronicles 25 in the SBIBS

2 Chronicles 25 in the SBIBS2

2 Chronicles 25 in the SBICS

2 Chronicles 25 in the SBIDS

2 Chronicles 25 in the SBIGS

2 Chronicles 25 in the SBIHS

2 Chronicles 25 in the SBIIS

2 Chronicles 25 in the SBIIS2

2 Chronicles 25 in the SBIIS3

2 Chronicles 25 in the SBIKS

2 Chronicles 25 in the SBIKS2

2 Chronicles 25 in the SBIMS

2 Chronicles 25 in the SBIOS

2 Chronicles 25 in the SBIPS

2 Chronicles 25 in the SBISS

2 Chronicles 25 in the SBITS

2 Chronicles 25 in the SBITS2

2 Chronicles 25 in the SBITS3

2 Chronicles 25 in the SBITS4

2 Chronicles 25 in the SBIUS

2 Chronicles 25 in the SBIVS

2 Chronicles 25 in the SBT

2 Chronicles 25 in the SBT1E

2 Chronicles 25 in the SCHL

2 Chronicles 25 in the SNT

2 Chronicles 25 in the SUSU

2 Chronicles 25 in the SUSU2

2 Chronicles 25 in the SYNO

2 Chronicles 25 in the TBIAOTANT

2 Chronicles 25 in the TBT1E

2 Chronicles 25 in the TBT1E2

2 Chronicles 25 in the TFTIP

2 Chronicles 25 in the TFTU

2 Chronicles 25 in the TGNTATF3T

2 Chronicles 25 in the THAI

2 Chronicles 25 in the TNFD

2 Chronicles 25 in the TNT

2 Chronicles 25 in the TNTIK

2 Chronicles 25 in the TNTIL

2 Chronicles 25 in the TNTIN

2 Chronicles 25 in the TNTIP

2 Chronicles 25 in the TNTIZ

2 Chronicles 25 in the TOMA

2 Chronicles 25 in the TTENT

2 Chronicles 25 in the UBG

2 Chronicles 25 in the UGV

2 Chronicles 25 in the UGV2

2 Chronicles 25 in the UGV3

2 Chronicles 25 in the VBL

2 Chronicles 25 in the VDCC

2 Chronicles 25 in the YALU

2 Chronicles 25 in the YAPE

2 Chronicles 25 in the YBVTP

2 Chronicles 25 in the ZBP