2 Chronicles 30 (BOICB)

1 Hezekaya zigaara ndị Izrel na Juda niile ozi, degakwara ndị Ifrem na Manase akwụkwọ ịkpọ oku ka ha bịa nʼụlọnsọ ukwu ONYENWE ANYỊ dị na Jerusalem maka ime Mmemme Ngabiga nye ONYENWE ANYỊ, bụ Chineke Izrel. 2 Eze na ndịisi ya, na ndị nkpọkọta niile na Jerusalem kpebiri na Mmemme Ngabiga a ga-adị nʼọnwa nke abụọ. 3 Ha enweghị ike ime ya nʼoge e kwesiri ime ya nʼihi na ọtụtụ ndị nchụaja enwebeghị ike doo onwe ha nsọ nʼọnwa ahụ. Otu a kwa, ndị Izrel enwebeghịkwa ike zukọtaa na Jerusalem. 4 Eze na Izrel niile nwere otu mkpebi ime ya otu a. 5 Ha kpebiri ka e kwusaa nʼala Izrel niile site na Dan ruo na Bịasheba ka onye ọbụla bịa na Jerusalem maka ime Mmemme Ngabiga nye ONYENWE ANYỊ, Chineke Izrel. Ọtụtụ mmadụ nʼIzrel esobeghị mee mmemme a dịka e nyere ya nʼiwu. 6 Ndị ọgba ọsọ weere akwụkwọ ozi sitere nʼaka eze na ndị ozi ya jegharịa nʼIzrel na Juda niile dịka ihe eze nyere nʼiwu si:“Unu ndị Izrel, lọghachikwutenụ ONYENWE ANYỊ Chineke Ebraham, na Aịzik, na Jekọb, ka ọ laghachikwute unu bụ ndị eze Asịrịa na-emeribeghị. 7 Unu adịkwala ka nna unu ha, na ụmụnne unu ndị Izrel, ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi nye ONYENWE ANYỊ, bụ Chineke nna nna ha, nke a mere o jiri were ha mee ihe iju anya, dịka unu hụrụ ya. 8 Unu abụla ndị isiike dịka ha, kama werenụ onwe unu nye ONYENWE ANYỊ. Bịakwanụ nʼụlọnsọ ya nke o doro nsọ ruo ebighị ebi. Fee ONYENWE ANYỊ Chineke unu ofufe, ime ka iwe ya jụrụ nʼebe unu nọ. 9 Ọ bụrụ na unu alọghachikwute ONYENWE ANYỊ, ọ ga-eme ka e gosi ụmụnna unu na ụmụ unu a dọtara nʼagha obi ebere, meekwa ka ha site nʼebe e bugara ha lọghachikwa. Nʼihi na ONYENWE ANYỊ Chineke unu bụ onye obi ebere, na onye obiọma; ọ gakwaghị agbakụta unu azụ, ma ọ bụrụ na unu echegharịa, lọghachikwute ya.” 10 Ya mere, ndị ọgbọ ọsọ ozi ahụ sitere otu obodo gaa obodo ọzọ nʼIfrem, na Manase, ọ bụladị ruo Zebụlọn. Ma ndị mmadụ chịrị ha ọchị, kwaakwa ha emo. 11 Ma otu ọ dị, ụfọdụ ndị si nʼebo Asha na Manase, na Zebụlọn wedatara onwe ha ala, bịa Jerusalem. 12 Ma aka Chineke dịnyere ndị Juda inye ha otu obi, ime ihe eze na ndịisi ya nyere nʼiwu, site nʼokwu ONYENWE ANYỊ. 13 Ya mere, ọtụtụ mmadụ bịara Jerusalem nʼọnwa nke abụọ nke afọ ahụ, maka mmemme achịcha ekoghị eko. 14 Ha niile jiri otu obi bibie ụlọ arụsị Baal niile dị na Jerusalem, kụtuokwa ebe ịchụ aja na-esi isi ụtọ niile, buru ha niile bufuo ha na Ndagwurugwu Kidrọn. 15 Nʼabalị nke iri na anọ nke ọnwa abụọ ahụ, ndị mmadụ ahụ niile gburu atụrụ Mmemme Ngabiga ha. Nke a mere ka ihere mee ndị nchụaja na ndị Livayị. Ha mekwara ngwangwa doo onwe ha nsọ were aja nsure ọkụ bịa nʼụlọnsọ ukwu ONYENWE ANYỊ. 16 Ha niile guzokwara nʼọnọdụ ha dịka e dere ya nʼiwu Mosis, onye nke Chineke. Ndị nchụaja fesara ọbara nke ndị Livayị bunyere ha nʼaka, nʼelu ebe ịchụ aja. 17 Ebe ọ bụ na ọtụtụ ndị so nʼigwe mmadụ ahụ edobeghị onwe ha nsọ, ndị Livayị gbuuru ha atụrụ Mmemme Ngabiga nʼihi na ha adịghị ọcha, ha apụghịkwa ido atụrụ ha nsọ nye ONYENWE ANYỊ. 18 Ọ bụ ezie na ọtụtụ ndị sitere nʼIfrem, na Manase, na Isaka, na Zebụlọn edoghị onwe ha ọcha, ma ha sokwa rie oriri ngabiga ahụ, si otu a mebie ihe e dere nʼiwu. Ma Hezekaya kpeere ha ekpere sị, “Ka ONYENWE ANYỊ onye dị mma gbaghara onye ọbụla 19 bụ ndị ji obi ha na-achọ ONYENWE ANYỊ Chineke nke nna nna ha, ọ bụladị ma ọ bụrụ na ha adịghị ọcha dịka iwu nke ebe nsọ si dị.” 20 ONYENWE ANYỊ nụrụ ekpere Hezekaya gwọọkwa ha. 21 Ya mere, ndị Izrel ahụ niile ji ọṅụ mee mmemme achịcha ekoghị eko ahụ na Jerusalem ụbọchị asaa. Ma ndị nchụaja na ndị Livayị ji abụ na ngwa egwu ONYENWE ANYỊ too ya otuto ụbọchị ahụ niile. 22 Hezekaya ji okwu dị mma gbaa ndị Livayị ume nʼihi ezi nghọta ha nwere nʼijere ONYENWE ANYỊ ozi. Nʼime ụbọchị asaa ahụ niile, ha chụrụ aja udo, riekwa ihe ha ketara site nʼaja niile a chụrụ. Ha tokwara ONYENWE ANYỊ Chineke nna nna ha otuto. 23 Nʼihi oke ọṅụ ha niile nwere, ha kpebiri ime mmemme ahụ gaa nʼihu ụbọchị asaa ọzọ. 24 Hezekaya eze Juda, nyere nzukọ ahụ otu puku oke ehi, na puku atụrụ asaa. Ndị ozi eze niile nyekwara ha, otu puku oke ehi na puku atụrụ iri. Ọtụtụ ndị nchụaja dooro onwe ha nsọ. 25 Nʼoge ahụ kwa, oke ọṅụ jupụtara nʼobi ndị Juda niile, na nʼobi ndị nchụaja na ndị Livayị, na nʼobi ndị ọbịa, na ndị sitere ala Izrel bịa. 26 Oke ọṅụ jupụtara na Jerusalem nʼihi na site nʼoge Solomọn nwa Devid, eze Izrel ruo nʼoge a, e mebeghị mmemme dị otu a na Jerusalem. 27 Mgbe ahụ, ndị nchụaja na ndị Livayị guzoro gọzie ọha mmadụ ahụ niile. Chineke nụkwara ekpere ha site nʼebe obibi ya dị nsọ nke eluigwe.

In Other Versions

2 Chronicles 30 in the ANGEFD

2 Chronicles 30 in the ANTPNG2D

2 Chronicles 30 in the AS21

2 Chronicles 30 in the BAGH

2 Chronicles 30 in the BBPNG

2 Chronicles 30 in the BBT1E

2 Chronicles 30 in the BDS

2 Chronicles 30 in the BEV

2 Chronicles 30 in the BHAD

2 Chronicles 30 in the BIB

2 Chronicles 30 in the BLPT

2 Chronicles 30 in the BNT

2 Chronicles 30 in the BNTABOOT

2 Chronicles 30 in the BNTLV

2 Chronicles 30 in the BOATCB

2 Chronicles 30 in the BOATCB2

2 Chronicles 30 in the BOBCV

2 Chronicles 30 in the BOCNT

2 Chronicles 30 in the BOECS

2 Chronicles 30 in the BOGWICC

2 Chronicles 30 in the BOHCB

2 Chronicles 30 in the BOHCV

2 Chronicles 30 in the BOHLNT

2 Chronicles 30 in the BOHNTLTAL

2 Chronicles 30 in the BOILNTAP

2 Chronicles 30 in the BOITCV

2 Chronicles 30 in the BOKCV

2 Chronicles 30 in the BOKCV2

2 Chronicles 30 in the BOKHWOG

2 Chronicles 30 in the BOKSSV

2 Chronicles 30 in the BOLCB

2 Chronicles 30 in the BOLCB2

2 Chronicles 30 in the BOMCV

2 Chronicles 30 in the BONAV

2 Chronicles 30 in the BONCB

2 Chronicles 30 in the BONLT

2 Chronicles 30 in the BONUT2

2 Chronicles 30 in the BOPLNT

2 Chronicles 30 in the BOSCB

2 Chronicles 30 in the BOSNC

2 Chronicles 30 in the BOTLNT

2 Chronicles 30 in the BOVCB

2 Chronicles 30 in the BOYCB

2 Chronicles 30 in the BPBB

2 Chronicles 30 in the BPH

2 Chronicles 30 in the BSB

2 Chronicles 30 in the CCB

2 Chronicles 30 in the CUV

2 Chronicles 30 in the CUVS

2 Chronicles 30 in the DBT

2 Chronicles 30 in the DGDNT

2 Chronicles 30 in the DHNT

2 Chronicles 30 in the DNT

2 Chronicles 30 in the ELBE

2 Chronicles 30 in the EMTV

2 Chronicles 30 in the ESV

2 Chronicles 30 in the FBV

2 Chronicles 30 in the FEB

2 Chronicles 30 in the GGMNT

2 Chronicles 30 in the GNT

2 Chronicles 30 in the HARY

2 Chronicles 30 in the HNT

2 Chronicles 30 in the IRVA

2 Chronicles 30 in the IRVB

2 Chronicles 30 in the IRVG

2 Chronicles 30 in the IRVH

2 Chronicles 30 in the IRVK

2 Chronicles 30 in the IRVM

2 Chronicles 30 in the IRVM2

2 Chronicles 30 in the IRVO

2 Chronicles 30 in the IRVP

2 Chronicles 30 in the IRVT

2 Chronicles 30 in the IRVT2

2 Chronicles 30 in the IRVU

2 Chronicles 30 in the ISVN

2 Chronicles 30 in the JSNT

2 Chronicles 30 in the KAPI

2 Chronicles 30 in the KBT1ETNIK

2 Chronicles 30 in the KBV

2 Chronicles 30 in the KJV

2 Chronicles 30 in the KNFD

2 Chronicles 30 in the LBA

2 Chronicles 30 in the LBLA

2 Chronicles 30 in the LNT

2 Chronicles 30 in the LSV

2 Chronicles 30 in the MAAL

2 Chronicles 30 in the MBV

2 Chronicles 30 in the MBV2

2 Chronicles 30 in the MHNT

2 Chronicles 30 in the MKNFD

2 Chronicles 30 in the MNG

2 Chronicles 30 in the MNT

2 Chronicles 30 in the MNT2

2 Chronicles 30 in the MRS1T

2 Chronicles 30 in the NAA

2 Chronicles 30 in the NASB

2 Chronicles 30 in the NBLA

2 Chronicles 30 in the NBS

2 Chronicles 30 in the NBVTP

2 Chronicles 30 in the NET2

2 Chronicles 30 in the NIV11

2 Chronicles 30 in the NNT

2 Chronicles 30 in the NNT2

2 Chronicles 30 in the NNT3

2 Chronicles 30 in the PDDPT

2 Chronicles 30 in the PFNT

2 Chronicles 30 in the RMNT

2 Chronicles 30 in the SBIAS

2 Chronicles 30 in the SBIBS

2 Chronicles 30 in the SBIBS2

2 Chronicles 30 in the SBICS

2 Chronicles 30 in the SBIDS

2 Chronicles 30 in the SBIGS

2 Chronicles 30 in the SBIHS

2 Chronicles 30 in the SBIIS

2 Chronicles 30 in the SBIIS2

2 Chronicles 30 in the SBIIS3

2 Chronicles 30 in the SBIKS

2 Chronicles 30 in the SBIKS2

2 Chronicles 30 in the SBIMS

2 Chronicles 30 in the SBIOS

2 Chronicles 30 in the SBIPS

2 Chronicles 30 in the SBISS

2 Chronicles 30 in the SBITS

2 Chronicles 30 in the SBITS2

2 Chronicles 30 in the SBITS3

2 Chronicles 30 in the SBITS4

2 Chronicles 30 in the SBIUS

2 Chronicles 30 in the SBIVS

2 Chronicles 30 in the SBT

2 Chronicles 30 in the SBT1E

2 Chronicles 30 in the SCHL

2 Chronicles 30 in the SNT

2 Chronicles 30 in the SUSU

2 Chronicles 30 in the SUSU2

2 Chronicles 30 in the SYNO

2 Chronicles 30 in the TBIAOTANT

2 Chronicles 30 in the TBT1E

2 Chronicles 30 in the TBT1E2

2 Chronicles 30 in the TFTIP

2 Chronicles 30 in the TFTU

2 Chronicles 30 in the TGNTATF3T

2 Chronicles 30 in the THAI

2 Chronicles 30 in the TNFD

2 Chronicles 30 in the TNT

2 Chronicles 30 in the TNTIK

2 Chronicles 30 in the TNTIL

2 Chronicles 30 in the TNTIN

2 Chronicles 30 in the TNTIP

2 Chronicles 30 in the TNTIZ

2 Chronicles 30 in the TOMA

2 Chronicles 30 in the TTENT

2 Chronicles 30 in the UBG

2 Chronicles 30 in the UGV

2 Chronicles 30 in the UGV2

2 Chronicles 30 in the UGV3

2 Chronicles 30 in the VBL

2 Chronicles 30 in the VDCC

2 Chronicles 30 in the YALU

2 Chronicles 30 in the YAPE

2 Chronicles 30 in the YBVTP

2 Chronicles 30 in the ZBP