2 Chronicles 33 (BOICB)

1 Manase gbara afọ iri na abụọ mgbe ọ malitere ịbụ eze. Ọ chịrị iri afọ ise na ise na Jerusalem. 2 O mere ihe dị njọ nʼanya ONYENWE ANYỊ, site nʼịgbaso ihe arụ niile nke ndị mba ọzọ bi nʼala ahụ na mbụ mere, bụ ndị ONYENWE ANYỊ chụpụrụ nʼihu ndị Izrel. 3 O wugharịrị ebe dị elu niile nke nna ya Hezekaya kwadara, o wukwara ebe ịchụ aja dị iche iche nke Baal, pịakwa ogidi Ashera dị iche iche. Ọ kpọrọ isiala nye usuu ihe niile nke dị na mbara eluigwe feekwa ha ofufe. 4 O wuru ebe ịchụ aja dị iche iche, nʼime ụlọnsọ ONYENWE ANYỊ, nke ONYENWE ANYỊ, kwuru okwu banyere ya, sị, “Aha m ga-adịgide na Jerusalem ruo mgbe ebighị ebi.” 5 O wuru ebe ịchụ aja nye usuu ihe niile dị na mbara eluigwe nʼogige abụọ dị nʼụlọnsọ ONYENWE ANYỊ. 6 O jikwa ụmụ ya chụọ aja nʼime ọkụ na Ndagwurugwu nke Ben Hinom. Ọ gbara aja, taa amụsụ, chọọ ọsịsa nʼaka ndị mgbaasị, jụta ase nʼaka ndị na-ajụ mmụọ ọjọọ ase, ya na ndị dibịa afa mekọkwara ihe. O mere ihe dị njọ nʼebe ọ dị ukwuu nʼanya ONYENWE ANYỊ si otu a kpasuo iwe ya. 7 O were oyiyi apịrị apị nke o mere debe nʼime ụlọnsọ Chineke, nke Chineke gwara Devid na nwa ya Solomọn okwu sị, “Nʼụlọnsọ a na nʼime Jerusalem, nke mụ onwe m họpụtara site nʼebo niile nke Izrel, ka m ga-akpọkwasị Aha m ruo mgbe ebighị ebi. 8 Ma agaghị emekwa ka ụkwụ ndị Izrel hapụ ala ahụ nke m kenyere nna nna unu, naanị ma ọ bụrụ na ha elezie anya debe ihe niile m nyere ha nʼiwu banyere iwu niile, ụkpụrụ niile na ntụziaka niile m nyere site nʼaka Mosis.” 9 Ma Manase duhiere Juda na ndị Jerusalem, mee ka ha mee ihe dị njọ karịa nke ndị mba niile ndị ONYENWE ANYỊ lara nʼiyi site nʼihu ndị Izrel. 10 ONYENWE ANYỊ gwara Manase na ndị ya okwu, ma ha egeghị ntị. 11 Nʼihi ya, ONYENWE ANYỊ mere ka ndị ọchịagha nke eze ndị Asịrịa bịa buso ha agha, bụ ndị jidere Manase, gbanye ya nko igwe nʼimi, were ụdọ bronz kee ya agbụ, kpọrọ ya laa Babilọn. 12 Nʼoge ahụ ka anya doro Manase. O wedara onwe ya ala nke ukwuu, rịọọ amara site nʼaka ONYENWE ANYỊ Chineke nna nna ya. 13 ONYENWE ANYỊ nụrụ arịrịọ ya mee ya ka ọ lọtakwa nʼalaeze ya na Jerusalem. Mgbe ahụ, Manase matara na ONYENWE ANYỊ bụ Chineke nʼezie. 14 Ọ bụ nʼoge a ka o wughachiri mgbidi nke abụọ gburugburu obodo Devid, na mgbidi dị nʼọdịda anyanwụ iyi Gaihọn na ndagwurugwu Kidrọn. Site nʼebe ahụ, o wuru ya ruo nʼọnụ ụzọ ama Azụ, na gburugburu ugwu Ofel ebe o wuliri ya elu. O dokwara ndịisi agha ya nʼobodo niile e wusiri ike dị na Juda. 15 O wezugara chi ndị mba ọzọ niile, wepụkwa oyiyi ahụ o tinyere nʼụlọnsọ ukwu ONYENWE ANYỊ, kụtuokwa ụlọ arụsị o wuru nʼugwu ụlọnsọ, na ndị nke o wuru na Jerusalem. O sitere nʼobodo bufuo ha. 16 Emesịa, o wugharịrị ebe ịchụ aja ONYENWE ANYỊ dị nʼụlọnsọ ukwu Chineke, chụọ aja udo na aja ekele nʼelu ya. O nyekwara ndị Juda niile iwu sị ha fee ONYENWE ANYỊ Chineke nke Izrel ofufe. 17 Ma ụfọdụ ndị Juda nọgidekwara na-achụ aja nʼugwu, maọbụ naanị ONYENWE ANYỊ Chineke ha ka ha na-achụrụ aja ndị a. 18 Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Manase na ekpere nke o kpeere Chineke ya, na okwu niile ndị ọhụ gwara ya nʼaha ONYENWE ANYỊ, bụ Chineke nke Izrel, ka e dere nʼakwụkwọ akụkọ ihe e mere nʼoge ndị eze Izrel niile. 19 Ekpere ya, na ọsịsa Chineke zara ya, na mmehie ya niile, na-ekwesighị ntụkwasị obi ya, na ebe niile o wuru ụlọ arụsị nʼelu ugwu, na ebe ọ manyere ogidi arụsị Ashera, na arụsị ndị ọzọ, tupu o weda onwe ya ala, ka e dere nʼakwụkwọ akụkọ ndị amụma. 20 Manase sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya nʼụlọeze ya. Amọn, ọkpara ya, nọchiri ya. 21 Amọn gbara iri afọ abụọ na abụọ mgbe ọ malitere ịbụ eze. Ọ chịrị afọ abụọ na Jerusalem. 22 O mere ihe dị njọ nʼanya ONYENWE ANYỊ dịka nna ya Manase mere. Amọn kpọrọ isiala, chụọkwa aja nye arụsị niile, nke Manase mere. 23 Ma o wedaghị onwe ya ala nʼihu ONYENWE ANYỊ dịka Manase nna ya mere. Kama Amọn gara nʼihu mee ka ikpe ọmụma ya mụbaa. 24 Ndị na-ejere Amọn ozi gbara izu megide ya, ha gburu ya nʼime ụlọeze ya. 25 Mgbe ahụ, ndị ala ahụ gburu ndị niile ahụ gbara izu megide eze Amọn. Ha mere Josaya nwa ya nwoke eze nʼọnọdụ ya.

In Other Versions

2 Chronicles 33 in the ANGEFD

2 Chronicles 33 in the ANTPNG2D

2 Chronicles 33 in the AS21

2 Chronicles 33 in the BAGH

2 Chronicles 33 in the BBPNG

2 Chronicles 33 in the BBT1E

2 Chronicles 33 in the BDS

2 Chronicles 33 in the BEV

2 Chronicles 33 in the BHAD

2 Chronicles 33 in the BIB

2 Chronicles 33 in the BLPT

2 Chronicles 33 in the BNT

2 Chronicles 33 in the BNTABOOT

2 Chronicles 33 in the BNTLV

2 Chronicles 33 in the BOATCB

2 Chronicles 33 in the BOATCB2

2 Chronicles 33 in the BOBCV

2 Chronicles 33 in the BOCNT

2 Chronicles 33 in the BOECS

2 Chronicles 33 in the BOGWICC

2 Chronicles 33 in the BOHCB

2 Chronicles 33 in the BOHCV

2 Chronicles 33 in the BOHLNT

2 Chronicles 33 in the BOHNTLTAL

2 Chronicles 33 in the BOILNTAP

2 Chronicles 33 in the BOITCV

2 Chronicles 33 in the BOKCV

2 Chronicles 33 in the BOKCV2

2 Chronicles 33 in the BOKHWOG

2 Chronicles 33 in the BOKSSV

2 Chronicles 33 in the BOLCB

2 Chronicles 33 in the BOLCB2

2 Chronicles 33 in the BOMCV

2 Chronicles 33 in the BONAV

2 Chronicles 33 in the BONCB

2 Chronicles 33 in the BONLT

2 Chronicles 33 in the BONUT2

2 Chronicles 33 in the BOPLNT

2 Chronicles 33 in the BOSCB

2 Chronicles 33 in the BOSNC

2 Chronicles 33 in the BOTLNT

2 Chronicles 33 in the BOVCB

2 Chronicles 33 in the BOYCB

2 Chronicles 33 in the BPBB

2 Chronicles 33 in the BPH

2 Chronicles 33 in the BSB

2 Chronicles 33 in the CCB

2 Chronicles 33 in the CUV

2 Chronicles 33 in the CUVS

2 Chronicles 33 in the DBT

2 Chronicles 33 in the DGDNT

2 Chronicles 33 in the DHNT

2 Chronicles 33 in the DNT

2 Chronicles 33 in the ELBE

2 Chronicles 33 in the EMTV

2 Chronicles 33 in the ESV

2 Chronicles 33 in the FBV

2 Chronicles 33 in the FEB

2 Chronicles 33 in the GGMNT

2 Chronicles 33 in the GNT

2 Chronicles 33 in the HARY

2 Chronicles 33 in the HNT

2 Chronicles 33 in the IRVA

2 Chronicles 33 in the IRVB

2 Chronicles 33 in the IRVG

2 Chronicles 33 in the IRVH

2 Chronicles 33 in the IRVK

2 Chronicles 33 in the IRVM

2 Chronicles 33 in the IRVM2

2 Chronicles 33 in the IRVO

2 Chronicles 33 in the IRVP

2 Chronicles 33 in the IRVT

2 Chronicles 33 in the IRVT2

2 Chronicles 33 in the IRVU

2 Chronicles 33 in the ISVN

2 Chronicles 33 in the JSNT

2 Chronicles 33 in the KAPI

2 Chronicles 33 in the KBT1ETNIK

2 Chronicles 33 in the KBV

2 Chronicles 33 in the KJV

2 Chronicles 33 in the KNFD

2 Chronicles 33 in the LBA

2 Chronicles 33 in the LBLA

2 Chronicles 33 in the LNT

2 Chronicles 33 in the LSV

2 Chronicles 33 in the MAAL

2 Chronicles 33 in the MBV

2 Chronicles 33 in the MBV2

2 Chronicles 33 in the MHNT

2 Chronicles 33 in the MKNFD

2 Chronicles 33 in the MNG

2 Chronicles 33 in the MNT

2 Chronicles 33 in the MNT2

2 Chronicles 33 in the MRS1T

2 Chronicles 33 in the NAA

2 Chronicles 33 in the NASB

2 Chronicles 33 in the NBLA

2 Chronicles 33 in the NBS

2 Chronicles 33 in the NBVTP

2 Chronicles 33 in the NET2

2 Chronicles 33 in the NIV11

2 Chronicles 33 in the NNT

2 Chronicles 33 in the NNT2

2 Chronicles 33 in the NNT3

2 Chronicles 33 in the PDDPT

2 Chronicles 33 in the PFNT

2 Chronicles 33 in the RMNT

2 Chronicles 33 in the SBIAS

2 Chronicles 33 in the SBIBS

2 Chronicles 33 in the SBIBS2

2 Chronicles 33 in the SBICS

2 Chronicles 33 in the SBIDS

2 Chronicles 33 in the SBIGS

2 Chronicles 33 in the SBIHS

2 Chronicles 33 in the SBIIS

2 Chronicles 33 in the SBIIS2

2 Chronicles 33 in the SBIIS3

2 Chronicles 33 in the SBIKS

2 Chronicles 33 in the SBIKS2

2 Chronicles 33 in the SBIMS

2 Chronicles 33 in the SBIOS

2 Chronicles 33 in the SBIPS

2 Chronicles 33 in the SBISS

2 Chronicles 33 in the SBITS

2 Chronicles 33 in the SBITS2

2 Chronicles 33 in the SBITS3

2 Chronicles 33 in the SBITS4

2 Chronicles 33 in the SBIUS

2 Chronicles 33 in the SBIVS

2 Chronicles 33 in the SBT

2 Chronicles 33 in the SBT1E

2 Chronicles 33 in the SCHL

2 Chronicles 33 in the SNT

2 Chronicles 33 in the SUSU

2 Chronicles 33 in the SUSU2

2 Chronicles 33 in the SYNO

2 Chronicles 33 in the TBIAOTANT

2 Chronicles 33 in the TBT1E

2 Chronicles 33 in the TBT1E2

2 Chronicles 33 in the TFTIP

2 Chronicles 33 in the TFTU

2 Chronicles 33 in the TGNTATF3T

2 Chronicles 33 in the THAI

2 Chronicles 33 in the TNFD

2 Chronicles 33 in the TNT

2 Chronicles 33 in the TNTIK

2 Chronicles 33 in the TNTIL

2 Chronicles 33 in the TNTIN

2 Chronicles 33 in the TNTIP

2 Chronicles 33 in the TNTIZ

2 Chronicles 33 in the TOMA

2 Chronicles 33 in the TTENT

2 Chronicles 33 in the UBG

2 Chronicles 33 in the UGV

2 Chronicles 33 in the UGV2

2 Chronicles 33 in the UGV3

2 Chronicles 33 in the VBL

2 Chronicles 33 in the VDCC

2 Chronicles 33 in the YALU

2 Chronicles 33 in the YAPE

2 Chronicles 33 in the YBVTP

2 Chronicles 33 in the ZBP