2 Corinthians 12 (BOICB)

1 Aghaghị m ịnya isi, ọ bụ ezie na ọ baghị uru, ugbu a ka m gwa unu ihe banyere ọhụ m hụrụ, na ihe niile Onyenwe anyị kpughere gosi m. 2 Amaara m otu nwoke nọ nʼime Kraịst, onye e duuru gaa nʼeluigwe nke atọ ihe dị ka afọ iri na anọ gara aga, maọbụ nʼanụ ahụ, maọbụ nʼime mmụọ amaghị m, ma Chineke ma. 3 Amatakwara m nwoke dị otu a, maọbụ nʼanụ ahụ, maọbụ nʼime mmụọ amaghị m, ma Chineke maara 4 onye a, nke a kpọọrọ banye na paradaịs, ebe ọ nụrụ ihe ọnụ mmadụ na-apụghị ịkọwa, nke e nyeghịkwa mmadụ ọbụla ike ikwu ihe banyere ya. 5 Ekwesiri m ịnya isi nʼihi nwoke dị otu a ma agaghị m anya isi maka mụ onwe m, ma ọ bụghị maka adịghị ike m. 6 A sị na m chọrọ ịnya isi, agaghị m abụ onye nzuzu, nʼihi na aga m ekwu naanị eziokwu. Otu ọ dị, agaghị m anya isi ka onye ọbụla ghara ịgụ ọnọdụ m karịa ihe ọ hụrụ nʼime m, maọbụ karịa ihe ọ nụrụ nʼọnụ m. 7 Ma nʼihi na ọtụtụ ihe ndị a m ji anya m hụ bụ ihe pụrụ ime ka m bulie onwe m elu karịa ka o si kwesi. E tinyere ihe mgbu nʼanụ ahụ m ka ọ na-adụ m dịka ogwu. Ihe mgbu a dị nʼanụ ahụ m na-eti m aka dịka onyeozi nke ekwensu, na-eme ka m ghara ịfụlị onwe m elu karịa. 8 Ekpeela m ekpere ugboro atọ rịọ Onyenwe anyị ka o wepụrụ m ahụ mgbu a. 9 Ma ọ sịrị m, “Amara m ezuorola gị. Nʼihi na ike m na-ezu oke nʼime adịghị ike.” Ugbu a, obi dị m ụtọ ịnya isi banyere adịghị ike m. Nʼihi na ọ bụ site nʼọnọdụ adịghị ike m ka ike ebube Kraịst ga-esi nọgide nʼahụ m. 10 Ọ bụ nʼihi Kraịst ka m na-anọgide nʼadịghị ike m niile, mkparị ndị mmadụ, ihe isi ike niile, mkpagbu niile na ihe ndakwasị dị iche iche. Nʼihi na mgbe m na-adịghị ike ka m na-enwe ike karịa. 11 Emeela m onwe m onye nzuzu ma unu onwe unu rugidere m ime ya. O kwesiri ka unu bụrụ ndị mbụ ga-eto m. Ọ bụ ezie a na-abụghị m ihe ọbụla, ma o were m anya na ọ dịghị ụzọ ọbụla m si dị ala nʼebe ndị ahụ unu na-eche na ha kachasị elu nʼetiti ndị ozi. 12 Ejiri m ndidi rụọ ọrụ nʼetiti unu, ihe iji gosi na abụ m nwaazụ nʼeziokwu. Egosiri m unu ihe ịrịbama, ọrụ ebube dị iche iche, na ọtụtụ oke ọrụ. 13 Olee ụzọ unu si dị ala nʼebe chọọchị ndị ọzọ dị, ma ọ bụghị na m abụghị ibu arọ nye unu? Gbagharanụ m mmejọ a. 14 Nke a bụ ugboro atọ m na-ejikere ịbịakwute unu. Agaghị m abụrụ unu ibu arọ, ihe dị m mkpa abụghị akụ unu nwere, kama unu onwe unu. Ọ bụghị ụmụntakịrị ka ọ dịrị ịkpadoro nne na nna ha ihe, kama ọ bụ ọrụ dịrị nne na nna ịkpadoro ụmụ ha ihe. 15 Nʼezie, ọ na-atọ m ụtọ iwere onwe m na ihe niile m nwere nye unu, nʼihi na ahụrụ m unu nʼanya. Ma ọ bụrụ na m hụrụ unu nʼanya karịa, ọ ga-adị mma ma unu hụ m nʼanya nke nta? 16 Nʼagbanyeghị na-abụrụ m unu ibu arọ, ụfọdụ nʼime unu na-ekwu, ọ bụ ezie na ọ dịghị anara anyị ihe ọbụla, maọbụ onye aghụghọ. Ma eleghị anya, o nwere ụzọ aghụghọ dị iche iche o si anara anyị ihe. 17 Ọ dị onye ọbụla m ziteere unu, iji si nʼaka ya rigbuo unu? 18 Arịọrọ m Taịtọs ka ọ bịakwute unu, ya na nwanna anyị nwoke ọzọ. Taịtọs o rigburu unu? O nwere ihe dị iche nʼuche na omume mụ na ya? 19 Unu chere na ihe anyị na-eme oge niile ndị a bụ ịgọpụ onwe anyị nʼihu unu? Ọ bụ nʼihu Chineke ka anyị na-ekwu nke a nʼime Kraịst. Ndị m hụrụ nʼanya, ihe ndị a anyị na-ekwu bụ maka ọdịmma unu. 20 Nʼihi na ihe na-atụ m egwu bụ na mgbe m bịara nʼetiti unu, ihe m ga-ahụ agaghị atọ m ụtọ. Mgbe ahụ mmeso m ga-emeso unu agakwaghị atọ unu atọ. Nʼihi na ana m atụ egwu na mgbe m bịakwutere unu ọzọ, aga m ahụ ọtụtụ nʼime unu ka unu na-ese okwu, aga m ahụ ka unu na-ekwosa ibe unu ekworo, aga m ahụ unu ka unu na-akpasu ibe unu iwe. Aga m ahụ ọtụtụ ndị na-afụli onwe ha elu, ndị na-ekwu ọtụtụ ihe ọjọọ dị iche iche megide ndị ọzọ; aga m ahụ ọtụtụ ndị jupụtara nʼaghụghọ na ịkpa iche iche. 21 Ana m atụ egwu na mgbe m ga-abịakwute unu ọzọ, Chineke m ga-eme ka m weda onwe m ala nʼihu unu, mee ka m kwa akwa nʼihi ụfọdụ nʼime unu ndị mehiere na mbụ, ma ha achọghị ichegharị site nʼihe ọjọọ ha mere, na nʼihi ọtụtụ nʼime unu na-adị ndụ rere ure, ndụ na-adịghị ọcha, ndụ ịkwa iko, na ndụ ọjọọ.

In Other Versions

2 Corinthians 12 in the ANGEFD

2 Corinthians 12 in the ANTPNG2D

2 Corinthians 12 in the AS21

2 Corinthians 12 in the BAGH

2 Corinthians 12 in the BBPNG

2 Corinthians 12 in the BBT1E

2 Corinthians 12 in the BDS

2 Corinthians 12 in the BEV

2 Corinthians 12 in the BHAD

2 Corinthians 12 in the BIB

2 Corinthians 12 in the BLPT

2 Corinthians 12 in the BNT

2 Corinthians 12 in the BNTABOOT

2 Corinthians 12 in the BNTLV

2 Corinthians 12 in the BOATCB

2 Corinthians 12 in the BOATCB2

2 Corinthians 12 in the BOBCV

2 Corinthians 12 in the BOCNT

2 Corinthians 12 in the BOECS

2 Corinthians 12 in the BOGWICC

2 Corinthians 12 in the BOHCB

2 Corinthians 12 in the BOHCV

2 Corinthians 12 in the BOHLNT

2 Corinthians 12 in the BOHNTLTAL

2 Corinthians 12 in the BOILNTAP

2 Corinthians 12 in the BOITCV

2 Corinthians 12 in the BOKCV

2 Corinthians 12 in the BOKCV2

2 Corinthians 12 in the BOKHWOG

2 Corinthians 12 in the BOKSSV

2 Corinthians 12 in the BOLCB

2 Corinthians 12 in the BOLCB2

2 Corinthians 12 in the BOMCV

2 Corinthians 12 in the BONAV

2 Corinthians 12 in the BONCB

2 Corinthians 12 in the BONLT

2 Corinthians 12 in the BONUT2

2 Corinthians 12 in the BOPLNT

2 Corinthians 12 in the BOSCB

2 Corinthians 12 in the BOSNC

2 Corinthians 12 in the BOTLNT

2 Corinthians 12 in the BOVCB

2 Corinthians 12 in the BOYCB

2 Corinthians 12 in the BPBB

2 Corinthians 12 in the BPH

2 Corinthians 12 in the BSB

2 Corinthians 12 in the CCB

2 Corinthians 12 in the CUV

2 Corinthians 12 in the CUVS

2 Corinthians 12 in the DBT

2 Corinthians 12 in the DGDNT

2 Corinthians 12 in the DHNT

2 Corinthians 12 in the DNT

2 Corinthians 12 in the ELBE

2 Corinthians 12 in the EMTV

2 Corinthians 12 in the ESV

2 Corinthians 12 in the FBV

2 Corinthians 12 in the FEB

2 Corinthians 12 in the GGMNT

2 Corinthians 12 in the GNT

2 Corinthians 12 in the HARY

2 Corinthians 12 in the HNT

2 Corinthians 12 in the IRVA

2 Corinthians 12 in the IRVB

2 Corinthians 12 in the IRVG

2 Corinthians 12 in the IRVH

2 Corinthians 12 in the IRVK

2 Corinthians 12 in the IRVM

2 Corinthians 12 in the IRVM2

2 Corinthians 12 in the IRVO

2 Corinthians 12 in the IRVP

2 Corinthians 12 in the IRVT

2 Corinthians 12 in the IRVT2

2 Corinthians 12 in the IRVU

2 Corinthians 12 in the ISVN

2 Corinthians 12 in the JSNT

2 Corinthians 12 in the KAPI

2 Corinthians 12 in the KBT1ETNIK

2 Corinthians 12 in the KBV

2 Corinthians 12 in the KJV

2 Corinthians 12 in the KNFD

2 Corinthians 12 in the LBA

2 Corinthians 12 in the LBLA

2 Corinthians 12 in the LNT

2 Corinthians 12 in the LSV

2 Corinthians 12 in the MAAL

2 Corinthians 12 in the MBV

2 Corinthians 12 in the MBV2

2 Corinthians 12 in the MHNT

2 Corinthians 12 in the MKNFD

2 Corinthians 12 in the MNG

2 Corinthians 12 in the MNT

2 Corinthians 12 in the MNT2

2 Corinthians 12 in the MRS1T

2 Corinthians 12 in the NAA

2 Corinthians 12 in the NASB

2 Corinthians 12 in the NBLA

2 Corinthians 12 in the NBS

2 Corinthians 12 in the NBVTP

2 Corinthians 12 in the NET2

2 Corinthians 12 in the NIV11

2 Corinthians 12 in the NNT

2 Corinthians 12 in the NNT2

2 Corinthians 12 in the NNT3

2 Corinthians 12 in the PDDPT

2 Corinthians 12 in the PFNT

2 Corinthians 12 in the RMNT

2 Corinthians 12 in the SBIAS

2 Corinthians 12 in the SBIBS

2 Corinthians 12 in the SBIBS2

2 Corinthians 12 in the SBICS

2 Corinthians 12 in the SBIDS

2 Corinthians 12 in the SBIGS

2 Corinthians 12 in the SBIHS

2 Corinthians 12 in the SBIIS

2 Corinthians 12 in the SBIIS2

2 Corinthians 12 in the SBIIS3

2 Corinthians 12 in the SBIKS

2 Corinthians 12 in the SBIKS2

2 Corinthians 12 in the SBIMS

2 Corinthians 12 in the SBIOS

2 Corinthians 12 in the SBIPS

2 Corinthians 12 in the SBISS

2 Corinthians 12 in the SBITS

2 Corinthians 12 in the SBITS2

2 Corinthians 12 in the SBITS3

2 Corinthians 12 in the SBITS4

2 Corinthians 12 in the SBIUS

2 Corinthians 12 in the SBIVS

2 Corinthians 12 in the SBT

2 Corinthians 12 in the SBT1E

2 Corinthians 12 in the SCHL

2 Corinthians 12 in the SNT

2 Corinthians 12 in the SUSU

2 Corinthians 12 in the SUSU2

2 Corinthians 12 in the SYNO

2 Corinthians 12 in the TBIAOTANT

2 Corinthians 12 in the TBT1E

2 Corinthians 12 in the TBT1E2

2 Corinthians 12 in the TFTIP

2 Corinthians 12 in the TFTU

2 Corinthians 12 in the TGNTATF3T

2 Corinthians 12 in the THAI

2 Corinthians 12 in the TNFD

2 Corinthians 12 in the TNT

2 Corinthians 12 in the TNTIK

2 Corinthians 12 in the TNTIL

2 Corinthians 12 in the TNTIN

2 Corinthians 12 in the TNTIP

2 Corinthians 12 in the TNTIZ

2 Corinthians 12 in the TOMA

2 Corinthians 12 in the TTENT

2 Corinthians 12 in the UBG

2 Corinthians 12 in the UGV

2 Corinthians 12 in the UGV2

2 Corinthians 12 in the UGV3

2 Corinthians 12 in the VBL

2 Corinthians 12 in the VDCC

2 Corinthians 12 in the YALU

2 Corinthians 12 in the YAPE

2 Corinthians 12 in the YBVTP

2 Corinthians 12 in the ZBP