2 Corinthians 2 (BOICB)

1 Ekpebiri m nʼime obi m na-agaghị m abịakwute unu ọzọ, iwetara unu ihe mwute. 2 Nʼihi na ọ bụrụ na m eme ka obi jọọ unu njọ, onye kwanụ ga-akasị m obi ma ọ bụghị unu, unu onwe unu ndị m mere ka obi jọọ njọ? 3 E deere unu akwụkwọ a dịka m kwesiri ime ka m ghara inwe mwute mgbe m bịara, site nʼaka ndị kwesiri ime ka obi dị m mma, nʼihi na o doro m anya na ọṅụ m ga-abụ ọṅụ nke unu niile. 4 Eji m anya mmiri dị ukwuu na oke obi mgbu na obi mgbawa deere unu akwụkwọ, ọ bụghị ka m kpasuo unu iwe kama ka unu nwee ike ịmata oke ịhụnanya m nwere nʼebe unu nọ. 5 Ọ bụrụ na onye ọbụla mere ihe butere obi mgbu, ka a hapụ ikwu ya karịa ka o kwesiri, ọ bụghị naanị m ka o wetaara obi mgbu, o wetakwaara unu niile obi mgbu. 6 Nʼihi na ntaramahụhụ unu niile kpebiri nye ya ezuola. 7 Ugbu a, bikonu ụmụnna m, o kwesiri ka unu gbaghara ya, ma kasịe ya obi, ka ọ hapụ inwe obi ilu maọbụ daa mba na mmụọ ya, rubiga ụjụ oke. 8 Ya mere ana m arịọ unu, bikonu, gosinụ ya na unu hụrụ ya nnọọ nʼanya. 9 Ihe mere m ji dee ihe m dere nʼakwụkwọ nke mbụ bụ ka m chọpụta ma unu jikekwara mgbe niile irube isi nʼihe niile. 10 Ọ bụrụ na unu agbaghara onye ahụ mụ onwe m kwa agbagharala ya. Mgbaghara m, a sịkwa na o nwere ihe m na-agbaghara, ana m eme ya nʼihi unu nʼihu Kraịst. 11 Anyị na-eme nke a ka Ekwensu ghara ịghọgbu anyị. Anyị maara ihe niile ọ na-ezube. 12 Mgbe m bịarutere Troas ikwusa oziọma Kraịst, e megheere m ụzọ nʼime Onyenwe anyị. 13 Ma enweghị m izuike nʼime obi m, nʼihi na ahụghị m Taịtọs ezi nwanna m nʼebe ahụ. Nke a mere m jiri kelee ha hapụ ha gawa Masidonia. 14 Ma ekele dịrị Chineke, onye na-edugharị anyị na-enye anyị mmeri, nʼihi njikọ e jikọtara anyị na Kraịst, onye na-eji anyị arụ ọrụ, ime ka onye ọbụla nụrụ isisi ụtọ nke oziọma ya. 15 Nʼihi na anyị bụ mmanụ isi ụtọ nke Kraịst nye Chineke, nʼetiti ndị ọ na-azọpụta na nʼetiti ndị na-ala nʼiyi. 16 Nʼetiti ndị ahụ na-ala nʼiyi, isisi ụtọ a bụ ihe na-ewetara ha ọnwụ, ma nʼetiti ndị ahụ a na-azọpụta, ọ bụ isisi ụtọ a na-ewetara ha ndụ. Onye zuru ime ihe ndị a? 17 Nʼihi na anyị adịghị ka ọtụtụ mmadụ ndị na-eji okwu Chineke azụ ahịa. Kama, nʼime Kraịst anyị na-ekwu okwu anyị site nʼobi dị ọcha, dịka ndị ahụ Chineke zipụrụ ịrụ ọrụ a.

In Other Versions

2 Corinthians 2 in the ANGEFD

2 Corinthians 2 in the ANTPNG2D

2 Corinthians 2 in the AS21

2 Corinthians 2 in the BAGH

2 Corinthians 2 in the BBPNG

2 Corinthians 2 in the BBT1E

2 Corinthians 2 in the BDS

2 Corinthians 2 in the BEV

2 Corinthians 2 in the BHAD

2 Corinthians 2 in the BIB

2 Corinthians 2 in the BLPT

2 Corinthians 2 in the BNT

2 Corinthians 2 in the BNTABOOT

2 Corinthians 2 in the BNTLV

2 Corinthians 2 in the BOATCB

2 Corinthians 2 in the BOATCB2

2 Corinthians 2 in the BOBCV

2 Corinthians 2 in the BOCNT

2 Corinthians 2 in the BOECS

2 Corinthians 2 in the BOGWICC

2 Corinthians 2 in the BOHCB

2 Corinthians 2 in the BOHCV

2 Corinthians 2 in the BOHLNT

2 Corinthians 2 in the BOHNTLTAL

2 Corinthians 2 in the BOILNTAP

2 Corinthians 2 in the BOITCV

2 Corinthians 2 in the BOKCV

2 Corinthians 2 in the BOKCV2

2 Corinthians 2 in the BOKHWOG

2 Corinthians 2 in the BOKSSV

2 Corinthians 2 in the BOLCB

2 Corinthians 2 in the BOLCB2

2 Corinthians 2 in the BOMCV

2 Corinthians 2 in the BONAV

2 Corinthians 2 in the BONCB

2 Corinthians 2 in the BONLT

2 Corinthians 2 in the BONUT2

2 Corinthians 2 in the BOPLNT

2 Corinthians 2 in the BOSCB

2 Corinthians 2 in the BOSNC

2 Corinthians 2 in the BOTLNT

2 Corinthians 2 in the BOVCB

2 Corinthians 2 in the BOYCB

2 Corinthians 2 in the BPBB

2 Corinthians 2 in the BPH

2 Corinthians 2 in the BSB

2 Corinthians 2 in the CCB

2 Corinthians 2 in the CUV

2 Corinthians 2 in the CUVS

2 Corinthians 2 in the DBT

2 Corinthians 2 in the DGDNT

2 Corinthians 2 in the DHNT

2 Corinthians 2 in the DNT

2 Corinthians 2 in the ELBE

2 Corinthians 2 in the EMTV

2 Corinthians 2 in the ESV

2 Corinthians 2 in the FBV

2 Corinthians 2 in the FEB

2 Corinthians 2 in the GGMNT

2 Corinthians 2 in the GNT

2 Corinthians 2 in the HARY

2 Corinthians 2 in the HNT

2 Corinthians 2 in the IRVA

2 Corinthians 2 in the IRVB

2 Corinthians 2 in the IRVG

2 Corinthians 2 in the IRVH

2 Corinthians 2 in the IRVK

2 Corinthians 2 in the IRVM

2 Corinthians 2 in the IRVM2

2 Corinthians 2 in the IRVO

2 Corinthians 2 in the IRVP

2 Corinthians 2 in the IRVT

2 Corinthians 2 in the IRVT2

2 Corinthians 2 in the IRVU

2 Corinthians 2 in the ISVN

2 Corinthians 2 in the JSNT

2 Corinthians 2 in the KAPI

2 Corinthians 2 in the KBT1ETNIK

2 Corinthians 2 in the KBV

2 Corinthians 2 in the KJV

2 Corinthians 2 in the KNFD

2 Corinthians 2 in the LBA

2 Corinthians 2 in the LBLA

2 Corinthians 2 in the LNT

2 Corinthians 2 in the LSV

2 Corinthians 2 in the MAAL

2 Corinthians 2 in the MBV

2 Corinthians 2 in the MBV2

2 Corinthians 2 in the MHNT

2 Corinthians 2 in the MKNFD

2 Corinthians 2 in the MNG

2 Corinthians 2 in the MNT

2 Corinthians 2 in the MNT2

2 Corinthians 2 in the MRS1T

2 Corinthians 2 in the NAA

2 Corinthians 2 in the NASB

2 Corinthians 2 in the NBLA

2 Corinthians 2 in the NBS

2 Corinthians 2 in the NBVTP

2 Corinthians 2 in the NET2

2 Corinthians 2 in the NIV11

2 Corinthians 2 in the NNT

2 Corinthians 2 in the NNT2

2 Corinthians 2 in the NNT3

2 Corinthians 2 in the PDDPT

2 Corinthians 2 in the PFNT

2 Corinthians 2 in the RMNT

2 Corinthians 2 in the SBIAS

2 Corinthians 2 in the SBIBS

2 Corinthians 2 in the SBIBS2

2 Corinthians 2 in the SBICS

2 Corinthians 2 in the SBIDS

2 Corinthians 2 in the SBIGS

2 Corinthians 2 in the SBIHS

2 Corinthians 2 in the SBIIS

2 Corinthians 2 in the SBIIS2

2 Corinthians 2 in the SBIIS3

2 Corinthians 2 in the SBIKS

2 Corinthians 2 in the SBIKS2

2 Corinthians 2 in the SBIMS

2 Corinthians 2 in the SBIOS

2 Corinthians 2 in the SBIPS

2 Corinthians 2 in the SBISS

2 Corinthians 2 in the SBITS

2 Corinthians 2 in the SBITS2

2 Corinthians 2 in the SBITS3

2 Corinthians 2 in the SBITS4

2 Corinthians 2 in the SBIUS

2 Corinthians 2 in the SBIVS

2 Corinthians 2 in the SBT

2 Corinthians 2 in the SBT1E

2 Corinthians 2 in the SCHL

2 Corinthians 2 in the SNT

2 Corinthians 2 in the SUSU

2 Corinthians 2 in the SUSU2

2 Corinthians 2 in the SYNO

2 Corinthians 2 in the TBIAOTANT

2 Corinthians 2 in the TBT1E

2 Corinthians 2 in the TBT1E2

2 Corinthians 2 in the TFTIP

2 Corinthians 2 in the TFTU

2 Corinthians 2 in the TGNTATF3T

2 Corinthians 2 in the THAI

2 Corinthians 2 in the TNFD

2 Corinthians 2 in the TNT

2 Corinthians 2 in the TNTIK

2 Corinthians 2 in the TNTIL

2 Corinthians 2 in the TNTIN

2 Corinthians 2 in the TNTIP

2 Corinthians 2 in the TNTIZ

2 Corinthians 2 in the TOMA

2 Corinthians 2 in the TTENT

2 Corinthians 2 in the UBG

2 Corinthians 2 in the UGV

2 Corinthians 2 in the UGV2

2 Corinthians 2 in the UGV3

2 Corinthians 2 in the VBL

2 Corinthians 2 in the VDCC

2 Corinthians 2 in the YALU

2 Corinthians 2 in the YAPE

2 Corinthians 2 in the YBVTP

2 Corinthians 2 in the ZBP