2 Kings 13 (BOICB)

1 Nʼafọ nke iri abụọ na atọ nke ọchịchị eze Joash nwa Ahazaya na Juda, ka Jehoahaz nwa Jehu malitere ịbụ eze nʼIzrel nʼobodo Sameria. Ọ chịkwara na Sameria afọ iri na asaa. 2 Kama Jehoahaz bụ eze ọjọọ. O mere ihe jọrọ njọ nʼanya ONYENWE ANYỊ. O soro ụzọ ọjọọ niile nke Jeroboam nwa Nebat, onye dubara ndị Izrel na mmehie. 3 Nʼihi nke a, iwe were ONYENWE ANYỊ nke ukwuu megide Izrel. O mere ka ha nọrọ nʼokpuru ọchịchị Hazael eze Aram na Ben-Hadad nwa ya ogologo oge. 4 Ma Jehoahaz kpere ekpere rịọọ ONYENWE ANYỊ nʼoge a ka o nyere ya aka, ONYENWE ANYỊ gere ya ntị, nʼihi na Chineke hụrụ mmegbu nke eze Aram na-emegbu ndị Izrel. 5 ONYENWE ANYỊ họpụtaara Izrel onye nzọpụta, ha sitere nʼaka ike ndị Aram nwere onwe ha. Izrel biri nʼụlọ nke aka ha dịka ha biiri nʼoge gara aga. 6 Ma ha esighị na mmehie niile nke ụlọ Jeroboam wezuga onwe ha, bụ nke o jiri mee ka Izrel mehie, kama ha nọ na-ejegharị nʼime ha. Ọzọkwa, ogidi Ashera ka guzoro na Sameria. 7 Ọ dịghị ihe fọdụrụ na ndị agha Jehoahaz ma ọ bụghị naanị iri ndị agha ise na-agba ịnyịnya, na ụgbọ agha iri, na puku ndị agha iri. Nʼihi na eze Aram alaala ndị nke fọdụrụ nʼiyi, meekwa ka ha dịrị ka uzuzu mgbe a na-azọcha mkpụrụ. 8 Akụkọ gbasara ọchịchị Jehoahaz, na ihe niile o mere, na ihe ọ rụpụtara, e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe ndị eze Izrel mere nʼoge ha? 9 Jehoahaz sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya na Sameria. Nwa ya Jehoash nọchiri anya ya. 10 Nʼafọ iri atọ na asaa nke ịbụ eze Joash na Juda, ka Jehoash nwa Jehoahaz malitere ị bụ eze Izrel na Sameria. Ọ chịrị afọ iri na isii. 11 O mere ihe jọrọ njọ nʼanya ONYENWE ANYỊ. O siteghị na mmehie Jeroboam nwa Nebat wezuga onwe ya, mmehie nke Jeroboam dubara Izrel ime. Jehoash nọgidere nʼime ha. 12 Akụkọ gbasara ọchịchị Jehoash, na ihe niile o mere, na ihe ọ rụpụtara, tinyere agha o buru megide Amazaya eze Juda, e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe ndị eze Izrel mere nʼoge ha? 13 Jehoash soro nna nna ya ha dina nʼọnwụ, Jeroboam anọchie nʼocheeze ya. E liri Jehoash na Sameria, nʼebe e liri ndị eze Izrel ndị ibe ya. 14 Nʼoge a, Ịlaisha nọ nʼọrịa nke ọ ga-esite na ya anwụ. Jehoash, bụ eze Izrel gara ịhụ ya, ọ kwara akwa mgbe ọ hụrụ ya sị, “Nna m, nna m, usuu ụgbọ agha na usuu ndị na-agba ịnyịnya Izrel!” 15 Ịlaisha gwara ya okwu sị, “Wepụta ụta na àkụ ụfọdụ.” O mere dịka Ịlaisha gwara ya. 16 Ịlaisha gwakwara eze Izrel okwu sị ya, “Jide ụta ahụ nʼaka gị abụọ.” Mgbe o jidere ụta ahụ Ịlaisha tụkwasịrị aka nke ya nʼaka eze. 17 Ịlaisha gwara ya sị, “Meghee oghereikuku ahụ chere ihu nʼọwụwa anyanwụ.” O meghere ya. Mgbe ahụ Ịlaisha gwara ya sị, “Gbapụ àkụ.” Eze gbapụrụ àkụ. Ịlaisha kwuru sị, “Àkụ mmeri ONYENWE ANYỊ, àkụ mmeri megide Aram. Ị ga-ebibi ndị Aram kpamkpam nʼAfek.” 18 Ọ sịrị, “Chilite àkụ ndị ahụ,” ọ chilitere ha. Ịlaisha gwara eze Izrel, “Gbaa ha nʼala.” Ọ gbara ha nʼala ugboro atọ, ma kwụsị. 19 Ma onye nke Chineke ahụ were iwe sị ya, “Ị gaara apịa ya nʼala ugboro ise maọbụ isii. Mgbe ahụ, ị gaara enwe ike merie ndị Aram bibie ha kpamkpam. Ma ugbu a, ọ bụ naanị ugbo atọ ka ị ga-emeri ha.” 20 Ya mere, Ịlaisha nwụrụ. E likwara ya.Nʼoge ahụ, ọtụtụ ndị na-apụnara mmadụ ihe nʼike na-esi nʼala ndị Moab na-abịa nʼala Izrel izu ohi site nʼọnwa nke atọ nʼafọ ọhụrụ ọbụla. 21 Otu ụbọchị, mgbe ụfọdụ ndị ikom na-eli otu nwoke nwụrụ anwụ, ha hụrụ ndị a na-apụnara mmadụ ihe nʼike. Nʼihi nke a, ha mere ngwangwa site nʼụjọ tụbanye nwoke ahụ nʼili Ịlaisha. Mgbe ozu nwoke ahụ dara metụ ọkpụkpụ Ịlaisha ahụ, nwoke ahụ nwụrụ anwụ megharịrị ahụ bilie, guzo nʼụkwụ ya abụọ. 22 Hazael, eze Aram, busoro Izrel agha ụbọchị niile nke ndụ Jehoahaz eze Izrel. 23 Ma ONYENWE ANYỊ meere ha amara, nwee ọmịiko nʼebe ha nọ, ma gosikwa ha na ihe banyere ha na-emetụ ya nʼobi nʼihi ọgbụgba ndụ ya na Ebraham na Aịzik na Jekọb. Ruo taa, o kweghị ka e bibie ha, maọbụ ka e site nʼihu ya chụpụ ha. 24 Emesịa, Hazael eze Aram nwụrụ, Ben-Hadad nwa ya nọchikwara nʼọnọdụ ya. 25 Jehoash nwa Jehoahaz, weghachitere obodo niile nke ọ naara nʼaka nna ya Jehoahaz site nʼaka Ben-Hadad nwa Hazael. Ugboro atọ ka Jehoash meriri ya, site otu a weghachi obodo niile nke Izrel.

In Other Versions

2 Kings 13 in the ANGEFD

2 Kings 13 in the ANTPNG2D

2 Kings 13 in the AS21

2 Kings 13 in the BAGH

2 Kings 13 in the BBPNG

2 Kings 13 in the BBT1E

2 Kings 13 in the BDS

2 Kings 13 in the BEV

2 Kings 13 in the BHAD

2 Kings 13 in the BIB

2 Kings 13 in the BLPT

2 Kings 13 in the BNT

2 Kings 13 in the BNTABOOT

2 Kings 13 in the BNTLV

2 Kings 13 in the BOATCB

2 Kings 13 in the BOATCB2

2 Kings 13 in the BOBCV

2 Kings 13 in the BOCNT

2 Kings 13 in the BOECS

2 Kings 13 in the BOGWICC

2 Kings 13 in the BOHCB

2 Kings 13 in the BOHCV

2 Kings 13 in the BOHLNT

2 Kings 13 in the BOHNTLTAL

2 Kings 13 in the BOILNTAP

2 Kings 13 in the BOITCV

2 Kings 13 in the BOKCV

2 Kings 13 in the BOKCV2

2 Kings 13 in the BOKHWOG

2 Kings 13 in the BOKSSV

2 Kings 13 in the BOLCB

2 Kings 13 in the BOLCB2

2 Kings 13 in the BOMCV

2 Kings 13 in the BONAV

2 Kings 13 in the BONCB

2 Kings 13 in the BONLT

2 Kings 13 in the BONUT2

2 Kings 13 in the BOPLNT

2 Kings 13 in the BOSCB

2 Kings 13 in the BOSNC

2 Kings 13 in the BOTLNT

2 Kings 13 in the BOVCB

2 Kings 13 in the BOYCB

2 Kings 13 in the BPBB

2 Kings 13 in the BPH

2 Kings 13 in the BSB

2 Kings 13 in the CCB

2 Kings 13 in the CUV

2 Kings 13 in the CUVS

2 Kings 13 in the DBT

2 Kings 13 in the DGDNT

2 Kings 13 in the DHNT

2 Kings 13 in the DNT

2 Kings 13 in the ELBE

2 Kings 13 in the EMTV

2 Kings 13 in the ESV

2 Kings 13 in the FBV

2 Kings 13 in the FEB

2 Kings 13 in the GGMNT

2 Kings 13 in the GNT

2 Kings 13 in the HARY

2 Kings 13 in the HNT

2 Kings 13 in the IRVA

2 Kings 13 in the IRVB

2 Kings 13 in the IRVG

2 Kings 13 in the IRVH

2 Kings 13 in the IRVK

2 Kings 13 in the IRVM

2 Kings 13 in the IRVM2

2 Kings 13 in the IRVO

2 Kings 13 in the IRVP

2 Kings 13 in the IRVT

2 Kings 13 in the IRVT2

2 Kings 13 in the IRVU

2 Kings 13 in the ISVN

2 Kings 13 in the JSNT

2 Kings 13 in the KAPI

2 Kings 13 in the KBT1ETNIK

2 Kings 13 in the KBV

2 Kings 13 in the KJV

2 Kings 13 in the KNFD

2 Kings 13 in the LBA

2 Kings 13 in the LBLA

2 Kings 13 in the LNT

2 Kings 13 in the LSV

2 Kings 13 in the MAAL

2 Kings 13 in the MBV

2 Kings 13 in the MBV2

2 Kings 13 in the MHNT

2 Kings 13 in the MKNFD

2 Kings 13 in the MNG

2 Kings 13 in the MNT

2 Kings 13 in the MNT2

2 Kings 13 in the MRS1T

2 Kings 13 in the NAA

2 Kings 13 in the NASB

2 Kings 13 in the NBLA

2 Kings 13 in the NBS

2 Kings 13 in the NBVTP

2 Kings 13 in the NET2

2 Kings 13 in the NIV11

2 Kings 13 in the NNT

2 Kings 13 in the NNT2

2 Kings 13 in the NNT3

2 Kings 13 in the PDDPT

2 Kings 13 in the PFNT

2 Kings 13 in the RMNT

2 Kings 13 in the SBIAS

2 Kings 13 in the SBIBS

2 Kings 13 in the SBIBS2

2 Kings 13 in the SBICS

2 Kings 13 in the SBIDS

2 Kings 13 in the SBIGS

2 Kings 13 in the SBIHS

2 Kings 13 in the SBIIS

2 Kings 13 in the SBIIS2

2 Kings 13 in the SBIIS3

2 Kings 13 in the SBIKS

2 Kings 13 in the SBIKS2

2 Kings 13 in the SBIMS

2 Kings 13 in the SBIOS

2 Kings 13 in the SBIPS

2 Kings 13 in the SBISS

2 Kings 13 in the SBITS

2 Kings 13 in the SBITS2

2 Kings 13 in the SBITS3

2 Kings 13 in the SBITS4

2 Kings 13 in the SBIUS

2 Kings 13 in the SBIVS

2 Kings 13 in the SBT

2 Kings 13 in the SBT1E

2 Kings 13 in the SCHL

2 Kings 13 in the SNT

2 Kings 13 in the SUSU

2 Kings 13 in the SUSU2

2 Kings 13 in the SYNO

2 Kings 13 in the TBIAOTANT

2 Kings 13 in the TBT1E

2 Kings 13 in the TBT1E2

2 Kings 13 in the TFTIP

2 Kings 13 in the TFTU

2 Kings 13 in the TGNTATF3T

2 Kings 13 in the THAI

2 Kings 13 in the TNFD

2 Kings 13 in the TNT

2 Kings 13 in the TNTIK

2 Kings 13 in the TNTIL

2 Kings 13 in the TNTIN

2 Kings 13 in the TNTIP

2 Kings 13 in the TNTIZ

2 Kings 13 in the TOMA

2 Kings 13 in the TTENT

2 Kings 13 in the UBG

2 Kings 13 in the UGV

2 Kings 13 in the UGV2

2 Kings 13 in the UGV3

2 Kings 13 in the VBL

2 Kings 13 in the VDCC

2 Kings 13 in the YALU

2 Kings 13 in the YAPE

2 Kings 13 in the YBVTP

2 Kings 13 in the ZBP