2 Samuel 11 (BOICB)

1 Nʼoge ọkọchị, mgbe ndị eze na-apụ ibu agha, Devid zipụrụ Joab ọchịagha ya, na ndị agha Izrel. Ha bibiri ndị Amọn, nọchibidokwa Raba. Ma Devid nọdụrụ na Jerusalem. 2 Nʼotu uhuruchi, Devid sitere nʼihe ndina ya bilie, gagharịa nʼelu ụlọeze ya. Ọ sitere nʼelu ụlọ ahụ hụ otu nwanyị na-asa ahụ. Nwanyị ahụ mara mma nke ukwu nʼile anya. 3 Devid ziri ozi ka a jụta onye nwanyị ahụ bụ, ma a gwara ya na ọ bụ Batsheba, nwa Eliam, nwunye Ụraya onye Het. 4 Devid ziri ka a gaa kpọta ya. Mgbe ọ bịara, ya na Devid dinara. (Ka ọ ghụchasịrị onwe ya site nʼadịghị ọcha ya nke ọnwa ahụ.) Ọ laghachiri nʼụlọ ya. 5 Nwanyị a mechara dị ime, bịa ziga ozi ka agwa Devid. Ọ sịrị, “Adị m ime.” 6 Mgbe Devid nụrụ ya, o zigaara Joab ozi sị ya, “Zitere m Ụraya, onye Het.” 7 Mgbe Ụraya bịakwutere ya, Devid jụrụ ya otu Joab mere, na otu ndị agha Izrel dị na otu agha si aga. 8 Devid sịrị Ụraya, “Laa nʼụlọ gị gaa saa ụkwụ gị.” Ụraya si nʼụlọeze pụọ. E zipụkwara onyinye nke ndị na-ejere eze ozi ji sochie ya azụ. 9 Ma Ụraya agaghị nʼụlọ ya. Kama o so ndị na-ejere eze ozi dinaa nʼọnụ ụzọ e si abata ụlọeze. 10 Mgbe a gwara Devid na Ụraya alaghị nʼụlọ ya, Devid kpọrọ Ụraya, jụọ ya ajụjụ sị, “Ọ bụghị ije dị anya ka i si lọta? Gịnị mere ị larughị nʼụlọ gị?” 11 Ụraya zara Devid, “Lee, igbe ọgbụgba ndụ ONYENWE ANYỊ, na Izrel na Juda niile nọ nʼụlọ ikwu. Nna m ukwu Joab na ndị agha nna m ukwu nọ nʼọhịa. M ga-esi aṅaa laa nʼụlọ m, iri na ịṅụ ihe ọṅụṅụ na isoro nwunye m dinaa? Ana m aṅụ iyi na agaghị m eme ihe dị otu a.” 12 Devid gwara ya sị, “Ọ dị mma, nọdụ nʼebe a taa, echi ị ga-alaghachikwa nʼọgbọ agha.” Ụraya kwenyere nọdụ na Jerusalem ụbọchị ahụ, nakwa ụbọchị na-eso ya. 13 Emesịa, Devid kpọrọ ya oriri, meekwa ya ka ọ ṅụbiga mmanya oke, ma nke a emeghị ka ọ laa nʼụlọ ya nʼabalị ahụ, kama ọ bụkwa nʼọnụ ụzọ e si abata ụlọeze ka o dinara nʼetiti ndị na-ejere eze ozi. 14 Nʼụtụtụ echi ya, Devid degaara Joab akwụkwọ, zighachịkwa ya site nʼaka Ụraya. 15 Ihe ọ dere nʼakwụkwọ ahụ bụ nke a, “Tinye Ụraya nʼihu agha ebe ọgụ siri ike. Mgbe ndị iro na-apụkwute unu, laanụ azụ, ma hapụnụ Ụraya nʼihu ọgụ ka ndị iro gbuo ya.” 16 Ya mere, mgbe Joab gbara obodo ahụ gburugburu, o tinyere Ụraya nʼebe ọ maara na ndị dị ike nʼetiti ndị iro ha nọ. 17 Ndị ikom obodo ahụ pụtara buso Joab agha. Ụfọdụ ndị agha Devid nwụrụ. Ụraya onye Het, so na ndị egburu. 18 Mgbe ahụ, Joab zigara ozi gwa Devid otu agha si na-aga, 19 Ọ gwara onyeozi ahụ sị, “Mgbe ị gwachara eze akụkọ ihe gbasara otu agha si gaa 20 iwe nwere ike iwe eze nke ukwu, na o nwere ike jụọ gị sị, ‘Gịnị mere unu ji gaa mgbidi obodo ahụ nso ịlụ agha? Ọ bụ na unu amaghị na a ga-esi nʼelu mgbidi ahụ gbaa àkụ? 21 Onye gburu Abimelek nwa Jeru-Beshet? Ọ bụghị na mgbidi obodo ka nwanyị nọ tụdaa aka nkume dagburu ya na Tebez? Gịnị mere unu ji jeruo mgbidi ahụ nso?’ Ọ bụrụ na ọ jụọ gị ihe dị otu a, gwa ya, ‘Ohu gị bụ Ụraya, onye Het anwụọkwala.’ ” 22 Onyeozi ahụ biliri ije, mgbe o rutere, ọ gwara Devid ihe niile Joab ziri ya ka o zie. 23 Onyeozi ahụ sịrị Devid, “Ndị ikom ahụ ji ike karịrị anyị, ha pụtara ị buso anyị agha na mbara ma anyị chụghachiri ha azụ. Chụruo ha nʼọnụ ụzọ ama obodo ahụ. 24 Mgbe ahụ, ndị ọgba ụta sitere nʼelu mgbidi malite ịgba ndị ohu gị àkụ, ụfọdụ nʼime ndị ikom eze nwụrụ. Ohu gị Ụraya, onye Het, sokwa na ndị nwụrụ.” 25 Devid sịrị onyeozi ahụ, “Otu a ka ị ga-agwa Joab, ‘Ka ihe a ghara iwute gị nʼobi, nʼihi na mma agha na-egbu otu onye dịka o si egbu onye ọzọ. Lụsie ọgụ ike, lụgbukwaa obodo ahụ.’ Jiri okwu ndị a gbaa ya ume.” 26 Mgbe nwunye Ụraya nụrụ na di ya anwụọla, o ruru ụjụ nʼihi ya. 27 Mgbe oge iru ụjụ ya gabigara, Devid ziri ka a kpọta ya nʼụlọeze. Ọ ghọkwara nwunye ya. Mụọra ya nwa nwoke. Ma ihe Devid mere jọrọ njọ nʼanya ONYENWE ANYỊ.

In Other Versions

2 Samuel 11 in the ANGEFD

2 Samuel 11 in the ANTPNG2D

2 Samuel 11 in the AS21

2 Samuel 11 in the BAGH

2 Samuel 11 in the BBPNG

2 Samuel 11 in the BBT1E

2 Samuel 11 in the BDS

2 Samuel 11 in the BEV

2 Samuel 11 in the BHAD

2 Samuel 11 in the BIB

2 Samuel 11 in the BLPT

2 Samuel 11 in the BNT

2 Samuel 11 in the BNTABOOT

2 Samuel 11 in the BNTLV

2 Samuel 11 in the BOATCB

2 Samuel 11 in the BOATCB2

2 Samuel 11 in the BOBCV

2 Samuel 11 in the BOCNT

2 Samuel 11 in the BOECS

2 Samuel 11 in the BOGWICC

2 Samuel 11 in the BOHCB

2 Samuel 11 in the BOHCV

2 Samuel 11 in the BOHLNT

2 Samuel 11 in the BOHNTLTAL

2 Samuel 11 in the BOILNTAP

2 Samuel 11 in the BOITCV

2 Samuel 11 in the BOKCV

2 Samuel 11 in the BOKCV2

2 Samuel 11 in the BOKHWOG

2 Samuel 11 in the BOKSSV

2 Samuel 11 in the BOLCB

2 Samuel 11 in the BOLCB2

2 Samuel 11 in the BOMCV

2 Samuel 11 in the BONAV

2 Samuel 11 in the BONCB

2 Samuel 11 in the BONLT

2 Samuel 11 in the BONUT2

2 Samuel 11 in the BOPLNT

2 Samuel 11 in the BOSCB

2 Samuel 11 in the BOSNC

2 Samuel 11 in the BOTLNT

2 Samuel 11 in the BOVCB

2 Samuel 11 in the BOYCB

2 Samuel 11 in the BPBB

2 Samuel 11 in the BPH

2 Samuel 11 in the BSB

2 Samuel 11 in the CCB

2 Samuel 11 in the CUV

2 Samuel 11 in the CUVS

2 Samuel 11 in the DBT

2 Samuel 11 in the DGDNT

2 Samuel 11 in the DHNT

2 Samuel 11 in the DNT

2 Samuel 11 in the ELBE

2 Samuel 11 in the EMTV

2 Samuel 11 in the ESV

2 Samuel 11 in the FBV

2 Samuel 11 in the FEB

2 Samuel 11 in the GGMNT

2 Samuel 11 in the GNT

2 Samuel 11 in the HARY

2 Samuel 11 in the HNT

2 Samuel 11 in the IRVA

2 Samuel 11 in the IRVB

2 Samuel 11 in the IRVG

2 Samuel 11 in the IRVH

2 Samuel 11 in the IRVK

2 Samuel 11 in the IRVM

2 Samuel 11 in the IRVM2

2 Samuel 11 in the IRVO

2 Samuel 11 in the IRVP

2 Samuel 11 in the IRVT

2 Samuel 11 in the IRVT2

2 Samuel 11 in the IRVU

2 Samuel 11 in the ISVN

2 Samuel 11 in the JSNT

2 Samuel 11 in the KAPI

2 Samuel 11 in the KBT1ETNIK

2 Samuel 11 in the KBV

2 Samuel 11 in the KJV

2 Samuel 11 in the KNFD

2 Samuel 11 in the LBA

2 Samuel 11 in the LBLA

2 Samuel 11 in the LNT

2 Samuel 11 in the LSV

2 Samuel 11 in the MAAL

2 Samuel 11 in the MBV

2 Samuel 11 in the MBV2

2 Samuel 11 in the MHNT

2 Samuel 11 in the MKNFD

2 Samuel 11 in the MNG

2 Samuel 11 in the MNT

2 Samuel 11 in the MNT2

2 Samuel 11 in the MRS1T

2 Samuel 11 in the NAA

2 Samuel 11 in the NASB

2 Samuel 11 in the NBLA

2 Samuel 11 in the NBS

2 Samuel 11 in the NBVTP

2 Samuel 11 in the NET2

2 Samuel 11 in the NIV11

2 Samuel 11 in the NNT

2 Samuel 11 in the NNT2

2 Samuel 11 in the NNT3

2 Samuel 11 in the PDDPT

2 Samuel 11 in the PFNT

2 Samuel 11 in the RMNT

2 Samuel 11 in the SBIAS

2 Samuel 11 in the SBIBS

2 Samuel 11 in the SBIBS2

2 Samuel 11 in the SBICS

2 Samuel 11 in the SBIDS

2 Samuel 11 in the SBIGS

2 Samuel 11 in the SBIHS

2 Samuel 11 in the SBIIS

2 Samuel 11 in the SBIIS2

2 Samuel 11 in the SBIIS3

2 Samuel 11 in the SBIKS

2 Samuel 11 in the SBIKS2

2 Samuel 11 in the SBIMS

2 Samuel 11 in the SBIOS

2 Samuel 11 in the SBIPS

2 Samuel 11 in the SBISS

2 Samuel 11 in the SBITS

2 Samuel 11 in the SBITS2

2 Samuel 11 in the SBITS3

2 Samuel 11 in the SBITS4

2 Samuel 11 in the SBIUS

2 Samuel 11 in the SBIVS

2 Samuel 11 in the SBT

2 Samuel 11 in the SBT1E

2 Samuel 11 in the SCHL

2 Samuel 11 in the SNT

2 Samuel 11 in the SUSU

2 Samuel 11 in the SUSU2

2 Samuel 11 in the SYNO

2 Samuel 11 in the TBIAOTANT

2 Samuel 11 in the TBT1E

2 Samuel 11 in the TBT1E2

2 Samuel 11 in the TFTIP

2 Samuel 11 in the TFTU

2 Samuel 11 in the TGNTATF3T

2 Samuel 11 in the THAI

2 Samuel 11 in the TNFD

2 Samuel 11 in the TNT

2 Samuel 11 in the TNTIK

2 Samuel 11 in the TNTIL

2 Samuel 11 in the TNTIN

2 Samuel 11 in the TNTIP

2 Samuel 11 in the TNTIZ

2 Samuel 11 in the TOMA

2 Samuel 11 in the TTENT

2 Samuel 11 in the UBG

2 Samuel 11 in the UGV

2 Samuel 11 in the UGV2

2 Samuel 11 in the UGV3

2 Samuel 11 in the VBL

2 Samuel 11 in the VDCC

2 Samuel 11 in the YALU

2 Samuel 11 in the YAPE

2 Samuel 11 in the YBVTP

2 Samuel 11 in the ZBP