2 Samuel 12 (BOICB)

1 Ya mere, ONYENWE ANYỊ zigara Netan ka o jekwuru Devid. Mgbe Netan bịakwutere Devid, ọ kọọrọ ya akụkọ a, “E nwere ndị ikom abụọ bi nʼotu obodo, otu bụ ọgaranya ma nke ọzọ bụ ogbenye. 2 Onye ọgaranya a nwere ọtụtụ igwe atụrụ na igwe ehi. 3 Ma nwoke ogbenye ahụ enweghị ihe ọbụla karịa otu nwa nne atụrụ nta nke ọ zụtara. Ọ zụlitere ya, o tolite nʼetiti ya na ụmụ ya. Ọ na-eri nri site na ihe oriri ya, na-aṅụ mmiri site nʼiko mmiri ya, nʼobi ya ka ọ na-edinakwa. Ọ nọ ọnọdụ dịka nwa nwanyị nye ya. 4 “Otu ụbọchị, onye ọbịa bịara nʼụlọ onye ọgaranya ahụ. Ma kama ọgaranya ahụ ga-ewere otu atụrụ maọbụ ehi nke ya siere onye ọbịa ya nri, ọ gara were nne atụrụ ogbenye ahụ, gbuo ya, jiri ya siere ọbịa ya nri.” 5 Devid were oke iwe megide nwoke ahụ, ọ sịrị Netan, “Ana m aṅụ iyi nʼaha ONYENWE ANYỊ dị ndụ na onye mere ihe dị otu a aghaghị ịnwụ! 6 Ọ ga-ejikwa nwa atụrụ okpukpu anọ kwụghachi ogbenye ahụ ụgwọ otu atụrụ ahụ o weere, nʼihi na onye ọgaranya ahụ egosighị na o nwere obi ebere ọbụla.” 7 Mgbe ahụ, Netan sịrị Devid, “Ọ bụ gị bụ nwoke ahụ! Otu a ka ONYENWE ANYỊ, Chineke Izrel sịrị, ‘Mụ onwe m tere gị mmanụ ịbụ eze Izrel, mụ onwe m napụtakwara gị site nʼaka Sọl. 8 Enyere m gị ụlọ nna gị ukwu, nyefekwa ndị inyom nna gị ukwu nʼaka gị, na alaeze Izrel na Juda, ka ha bụrụ nke gị. Ma ọ bụrụ na nke a ezughị, agaara m atụkwasịrị gị ihe ndị a niile okpukpu okpukpu. 9 Gịnị mere i ji lelịa okwu ONYENWE ANYỊ anya, mee ihe a jọgburu onwe ya? Nʼihi na i jirila mma agha gbuo Ụraya onye Het, zurukwa nwunye ya nʼohi. Ọ bụkwa mma agha ndị Amọn ka i ji gbuo ya. 10 Ya mere, nʼihi ihe a i mere, mma agha agaghị esi nʼezinaụlọ gị pụọ, nʼihi na i ledara m anya kpọrọ nwunye Ụraya onye Het ka ọ bụrụ nwunye gị.’ 11 “Ihe a ka ONYENWE ANYỊ kwuru, ‘Aga m eme ka ihe ọjọọ si nʼezinaụlọ gị bilie megide gị. Nʼihu gị ka m ga-eduru ndị nwunye gị dunye otu onye dị gị nnọọ nso, ya na ha ga-edinakọ nʼehihie ọcha, nʼihu ndị Izrel niile. 12 I mere mmehie gị na nzuzo, ma aga m eme nke a na mbara, nʼihu Izrel niile.’ ” 13 Mgbe ahụ, Devid sịrị Netan, “Emehiela m megide ONYENWE ANYỊ.”Netan zara sị ya, “ONYENWE ANYỊ nʼonwe ya agbagharakwala gị mmehie gị, ị gaghị anwụ. 14 Ma nʼihi na i meela ka ndị iro ONYENWE ANYỊ nwe ohere ikwulu na ilelị ya anya, nwa nwoke ahụ amụụrụ gị ga-anwụ.” 15 Mgbe Netan lara, ONYENWE ANYỊ mere ka nwantakịrị ahụ nwunye Ụraya mụụrụ Devid daa ọrịa. 16 Devid rịọrọ Chineke arịrịọ banyere nwantakịrị ahụ. O buru ọnụ, dinaa nʼala efu abalị ahụ niile nʼihu ONYENWE ANYỊ. 17 Emesịa, ndị okenye ụlọ ya rịọrọ Devid ka o bilie rie nri, ma ọ jụrụ iri ihe ọbụla. 18 Nʼụbọchị nke asaa, nwantakịrị ahụ nwụrụ. Mgbe ahụ, ndị na-ejere Devid ozi tụrụ egwu otu ha ga-esi gwa ya na nwantakịrị ahụ anwụọla. Nʼihi na ha kwuru nʼime onwe ha sị, “Mgbe nwantakịrị ahụ ka dị ndụ, anyị gwara ya okwu ma o geghị anyị ntị. Anyị ga-esi aṅaa gwa ya na nwantakịrị ahụ anwụọla? O nwere ike imerụ onwe ya ahụ.” 19 Mgbe Devid hụrụ na ha na-ekwurịta okwu nʼetiti onwe ha na nzuzo; ọ matara na nwa ahụ anwụọla. Ọ jụrụ ha sị, “Nwata ahụ ọ nwụọla?”Ha zara sị ya, “E, ọ nwụọla!” 20 Mgbe ahụ, Devid sitere nʼala ebe o dina, bilie, saa ahụ, gbanwee uwe ya, baa nʼụlọ ONYENWE ANYỊ, kpọọrọ ya isiala. Ọ lọghachiri nʼụlọ ya nye iwu ka e wetara ya ihe oriri. O rikwara nri. 21 O juru ndị na-ejere ya ozi anya, nʼihi ya ha jụrụ ya ajụjụ si, “Gịnị mere i ji eme omume dị otu a? Mgbe nwantakịrị ahụ nọ ndụ, i buru ọnụ, kwaakwa akwa, ma ugbu a, nwa ahụ anwụọla, ị kwụsịla iru ụjụ. Ugbu a, ị biliela na-erikwa nri.” 22 Devid zara ha sị, “Eburu m ọnụ, kwaakwa akwa mgbe nwa ahụ nọ ndụ, nʼihi na ekwuru m sị, ‘ma eleghị anya, ONYENWE ANYỊ ga-enwe ọmịiko nʼebe m nọ mee ka nwa ahụ dị ndụ.’ 23 Ma ugbu a ọ nwụrụ, gịnịkwa ka m nwere dịka uru ibu ọnụ ọzọ? M pụrụ ime ka ọ dị ndụ ọzọ? Aga m alakwuru ya, ma ọ gaghị alaghachikwutekwa m.” 24 Devid kasiri Batsheba nwunye ya obi, emesịa, mgbe ya na ya dinakọrọ, ọ tụụrụ ime ọzọ mụọ nwa nwoke onye ha kpọrọ aha ya Solomọn. Ma ONYENWE ANYỊ hụrụ nwantakịrị ahụ nʼanya. 25 O zigara ozi site nʼaka Netan, onye amụma, ka a gụọ ya Jedidaya nʼihi ONYENWE ANYỊ. 26 Nʼoge a, Joab busoro Raba obodo ndị Amọn agha dọta isi obodo eze ha nʼagha. 27 Joab zigara Devid ozi sị ya, “Ebuola m agha megide Raba dọta isi mmiri ọṅụṅụ ya nʼagha. 28 Ugbu a chịkọtaa ndị agha fọdụrụ bịa lụpụchaa agha a, ka ị dọta obodo a nʼagha. Ọ bụrụ na i meghị otu a, aga m adọta obodo a nʼagha, a ga-akpọkwasịkwa ya aha m.” 29 Nʼihi nke a, Devid duuru ndị agha Izrel jeruo Raba, buso ya agha, meriekwa ya. 30 Devid kpupuru okpueze nke dị nʼisi eze ha, e kpunye ya nʼisi nke ya onwe ya. Ịdị arọ nke okpueze ahụ ruru kilogram ọlaedo iri atọ na anọ, nke e ji nkume ndị dị oke ọnụahịa chọọ mma. Devid sitekwara nʼobodo ahụ kwakọrọ ọtụtụ ihe nkwata nʼagha. 31 Ọ kpọpụtara ndị nọ nʼebe ahụ, manye ha nʼịrụ ọrụ nke e ji mma nkwọ e ji awa osisi, na igwe e ji egwu ala na anyụike nʼarụ. O mere ka ha rụọ ọrụ nʼebe a na-akpụ blọk brik. Devid mekwara otu ihe a nʼobodo niile nke ụmụ Amọn. Emesịa, ya na ndị agha ya niile laghachiri na Jerusalem.

In Other Versions

2 Samuel 12 in the ANGEFD

2 Samuel 12 in the ANTPNG2D

2 Samuel 12 in the AS21

2 Samuel 12 in the BAGH

2 Samuel 12 in the BBPNG

2 Samuel 12 in the BBT1E

2 Samuel 12 in the BDS

2 Samuel 12 in the BEV

2 Samuel 12 in the BHAD

2 Samuel 12 in the BIB

2 Samuel 12 in the BLPT

2 Samuel 12 in the BNT

2 Samuel 12 in the BNTABOOT

2 Samuel 12 in the BNTLV

2 Samuel 12 in the BOATCB

2 Samuel 12 in the BOATCB2

2 Samuel 12 in the BOBCV

2 Samuel 12 in the BOCNT

2 Samuel 12 in the BOECS

2 Samuel 12 in the BOGWICC

2 Samuel 12 in the BOHCB

2 Samuel 12 in the BOHCV

2 Samuel 12 in the BOHLNT

2 Samuel 12 in the BOHNTLTAL

2 Samuel 12 in the BOILNTAP

2 Samuel 12 in the BOITCV

2 Samuel 12 in the BOKCV

2 Samuel 12 in the BOKCV2

2 Samuel 12 in the BOKHWOG

2 Samuel 12 in the BOKSSV

2 Samuel 12 in the BOLCB

2 Samuel 12 in the BOLCB2

2 Samuel 12 in the BOMCV

2 Samuel 12 in the BONAV

2 Samuel 12 in the BONCB

2 Samuel 12 in the BONLT

2 Samuel 12 in the BONUT2

2 Samuel 12 in the BOPLNT

2 Samuel 12 in the BOSCB

2 Samuel 12 in the BOSNC

2 Samuel 12 in the BOTLNT

2 Samuel 12 in the BOVCB

2 Samuel 12 in the BOYCB

2 Samuel 12 in the BPBB

2 Samuel 12 in the BPH

2 Samuel 12 in the BSB

2 Samuel 12 in the CCB

2 Samuel 12 in the CUV

2 Samuel 12 in the CUVS

2 Samuel 12 in the DBT

2 Samuel 12 in the DGDNT

2 Samuel 12 in the DHNT

2 Samuel 12 in the DNT

2 Samuel 12 in the ELBE

2 Samuel 12 in the EMTV

2 Samuel 12 in the ESV

2 Samuel 12 in the FBV

2 Samuel 12 in the FEB

2 Samuel 12 in the GGMNT

2 Samuel 12 in the GNT

2 Samuel 12 in the HARY

2 Samuel 12 in the HNT

2 Samuel 12 in the IRVA

2 Samuel 12 in the IRVB

2 Samuel 12 in the IRVG

2 Samuel 12 in the IRVH

2 Samuel 12 in the IRVK

2 Samuel 12 in the IRVM

2 Samuel 12 in the IRVM2

2 Samuel 12 in the IRVO

2 Samuel 12 in the IRVP

2 Samuel 12 in the IRVT

2 Samuel 12 in the IRVT2

2 Samuel 12 in the IRVU

2 Samuel 12 in the ISVN

2 Samuel 12 in the JSNT

2 Samuel 12 in the KAPI

2 Samuel 12 in the KBT1ETNIK

2 Samuel 12 in the KBV

2 Samuel 12 in the KJV

2 Samuel 12 in the KNFD

2 Samuel 12 in the LBA

2 Samuel 12 in the LBLA

2 Samuel 12 in the LNT

2 Samuel 12 in the LSV

2 Samuel 12 in the MAAL

2 Samuel 12 in the MBV

2 Samuel 12 in the MBV2

2 Samuel 12 in the MHNT

2 Samuel 12 in the MKNFD

2 Samuel 12 in the MNG

2 Samuel 12 in the MNT

2 Samuel 12 in the MNT2

2 Samuel 12 in the MRS1T

2 Samuel 12 in the NAA

2 Samuel 12 in the NASB

2 Samuel 12 in the NBLA

2 Samuel 12 in the NBS

2 Samuel 12 in the NBVTP

2 Samuel 12 in the NET2

2 Samuel 12 in the NIV11

2 Samuel 12 in the NNT

2 Samuel 12 in the NNT2

2 Samuel 12 in the NNT3

2 Samuel 12 in the PDDPT

2 Samuel 12 in the PFNT

2 Samuel 12 in the RMNT

2 Samuel 12 in the SBIAS

2 Samuel 12 in the SBIBS

2 Samuel 12 in the SBIBS2

2 Samuel 12 in the SBICS

2 Samuel 12 in the SBIDS

2 Samuel 12 in the SBIGS

2 Samuel 12 in the SBIHS

2 Samuel 12 in the SBIIS

2 Samuel 12 in the SBIIS2

2 Samuel 12 in the SBIIS3

2 Samuel 12 in the SBIKS

2 Samuel 12 in the SBIKS2

2 Samuel 12 in the SBIMS

2 Samuel 12 in the SBIOS

2 Samuel 12 in the SBIPS

2 Samuel 12 in the SBISS

2 Samuel 12 in the SBITS

2 Samuel 12 in the SBITS2

2 Samuel 12 in the SBITS3

2 Samuel 12 in the SBITS4

2 Samuel 12 in the SBIUS

2 Samuel 12 in the SBIVS

2 Samuel 12 in the SBT

2 Samuel 12 in the SBT1E

2 Samuel 12 in the SCHL

2 Samuel 12 in the SNT

2 Samuel 12 in the SUSU

2 Samuel 12 in the SUSU2

2 Samuel 12 in the SYNO

2 Samuel 12 in the TBIAOTANT

2 Samuel 12 in the TBT1E

2 Samuel 12 in the TBT1E2

2 Samuel 12 in the TFTIP

2 Samuel 12 in the TFTU

2 Samuel 12 in the TGNTATF3T

2 Samuel 12 in the THAI

2 Samuel 12 in the TNFD

2 Samuel 12 in the TNT

2 Samuel 12 in the TNTIK

2 Samuel 12 in the TNTIL

2 Samuel 12 in the TNTIN

2 Samuel 12 in the TNTIP

2 Samuel 12 in the TNTIZ

2 Samuel 12 in the TOMA

2 Samuel 12 in the TTENT

2 Samuel 12 in the UBG

2 Samuel 12 in the UGV

2 Samuel 12 in the UGV2

2 Samuel 12 in the UGV3

2 Samuel 12 in the VBL

2 Samuel 12 in the VDCC

2 Samuel 12 in the YALU

2 Samuel 12 in the YAPE

2 Samuel 12 in the YBVTP

2 Samuel 12 in the ZBP