2 Samuel 18 (BOICB)

1 Devid gụkọtara ndị ya na ha so ma họpụta ndịisi agha. Doo ụfọdụ ka ha chịa ọtụtụ puku ndị agha, ụfọdụ ka ha chịa ọtụtụ narị ndị agha. 2 Devid zipụrụ ndị agha ya, otu ụzọ nʼime ụzọ atọ nʼokpuru Joab, Ọ họpụtakwara Abishai, nwanne Joab, nwa Zeruaya, ka ọ chịa otu ụzọ. Ma otu ụzọ nke fọdụrụ ka o tinyere nʼaka Itai onye Gat. Eze gwara ndị agha ahụ sị, “Mụ onwe m ga-edu unu gaa agha.” 3 Ma ndị ikom ahụ sịrị, “Ị gaghị apụkwa ọzọ nʼihi na ọ bụrụ na anyị atụgharịa bido ịgba ọsọ, ọ bụrụkwa na otu ọkara nʼime anyị anwụọ, nke ahụ agaghị emetụ ha nʼobi. Naanị gị ka ha na-achọ. Ị dịkwa mkpa karịa puku ndị agha iri. Ọ ga-akara anyị mma ugbu a ka ị na-ezitere anyị inyeaka site nʼime obodo.” 4 Eze zara nʼikpeazụ sị, “Ihe ọbụla dị mma nʼanya unu ka m ga-eme.”Ya mere, eze guzoro nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama dịka ndị ikom ya niile na-apụ nʼusu nke ọtụtụ narị, nakwa nʼusu nke ọtụtụ puku. 5 Eze nyere ndịisi agha ya, bụ Joab, Abishai na Itai, iwu sị ha, “Bikonu, nʼihi m, werenụ nwayọọ nʼebe nwokorobịa ahụ bụ Absalọm nọ.” Ndị agha niile nụkwara mgbe eze nyere ndịisi niile iwu a banyere Absalọm. 6 Ndị agha Devid si nʼobodo pụọ izute ndị Izrel nʼagha. Alụrụ agha a nʼọhịa Ifrem. 7 Ndị agha Devid tigbukwara ndị agha Izrel. Ha gburu iri puku ndị agha abụọ nʼụbọchị ahụ. 8 Agha ahụ gbasara nʼelu ala ahụ niile. Ndị nwụrụ nʼọhịa nʼetiti ụmụ Izrel karịrị ndị e gburu egbu. 9 Absalọm zutere ndị agha Devid. Ọ na-anọkwasị nʼelu ịnyịnya ya nʼoge a, dịka ịnyịnya ahụ sitere nʼokpuru osisi ook ukwu dị nʼọhịa ahụ na-agbafee, agịrị isi ya konyere nʼalaka osisi ahụ, tụhịkọtaakwa, nke mere na ọ kwụrụ nʼetiti eluigwe na ala. Ma ịnyịnya ya gbaara na-aga. 10 Otu nʼime ndị ikom ahụ hụrụ ya, kọọrọ Joab, “Lee, ahụrụ m Absalọm ebe ọ kwụ nʼelu osisi ook.” 11 Joab sịrị nwoke ahụ onye gwara gị, “Gịnị, ị hụrụ ya? Gịnị mere i tigbughị ya ka o ruo nʼala nʼebe ahụ? Mgbe ahụ, agaara m enye gị shekel ọlaọcha iri, na belịt a na-enye onye bụ dike nʼagha.” 12 Ma nwoke ahụ zara sị, “A sịkwarị na e nyere m puku ọlaọcha nʼaka m a, agaraghị m egbu ya. Nʼihi na anyị niile nụrụ mgbe eze na-agwa gị na Abishai na Itai sị, ‘Lezienụ anya banyere nwokorobịa bụ Absalọm, nʼihi m.’ 13 A sị na m gburu ya, ọ ga-abụ imegide eze. Ọ ga-emesiekwa chọpụta onye mere ya. Ma gị onwe gị agaraghị apụta kwuchite ọnụ m.” 14 Joab sịrị, “Ọ bụghị otu a ka m ga na-eche nʼihu gị.” Ya mere, ọ chịịrị ùbe atọ nʼaka ya, dubaa ha nʼobi Absalọm, mgbe Absalọm ka dị ndụ makwụrụ nʼelu osisi ook. 15 Ụmụ okorobịa iri ndị na-ebu ihe agha Joab gbara Absalọm gburugburu, tigbuo ya. 16 Emesịa, Joab fụrụ opi ike nke mere ka ndị agha Devid na-achụ ndị Izrel kwụsị ịchụ ha ọsọ, nʼihi na Joab kwụsịrị ha. 17 Ha buuru ozu Absalọm tụba ya nʼolulu ukwu dị nʼoke ọhịa ahụ, werekwa nkume tụọ ya nʼelu. Ndị agha Izrel niile gbalara nʼụlọ ha. 18 Nʼoge Absalọm dị ndụ, o wuuru onwe ya ogidi ncheta. O wuru ogidi a na Ndagwurugwu Eze, nʼihi na o chere nʼime onwe ya sị, “Enweghị m nwa nwoke ga-aza aha m.” Ya mere, ọ gụrụ ogidi ahụ aha nke ya onwe ya. Ọ bụkwa Ogidi Absalọm ka a na-akpọ ya ruo taa. 19 Mgbe ahụ, Ahimaaz, nwa Zadọk, bịakwutere Joab sị ya, “Biko, ka m gbara ọsọ gaa zie eze oziọma a, na ONYENWE ANYỊ azọpụtala ya site nʼaka ndị iro ya.” 20 Ma Joab zara sị ya, “Ọ bụghị gị ga-ezi eze ozi taa. I nwere ike ime ya mgbe ọzọ, ma ọ bụghị taa, nʼihi na nwa eze nwụrụ.” 21 Joab gwara otu nwoke onye Kush sị ya, “Gaa gwa eze ihe ị hụrụ.” Nwoke ahụ kpọrọ isiala, gbapụ ọsọ. 22 Ahimaaz nwa Zadọk rịọkwara Joab ọzọ sị ya, “Otu ọbụla o si dị, biko kwere ka m gbaso onye Kush a.”Ma Joab zara sị, “Nwa m nwoke, gịnị mere i ji chọọ ị ga? I nweghị ozi ọbụla ị ga-ezi nke ga-ewetara gị ụgwọ ọrụ.” 23 Ọ rịọrọ sị, “Otu ọbụla o si dị, hapụ m ka m gaa.”Nʼikpeazụ Joab kwenyere sị ya, “Ọ dị mma, gbara ọsọ gaa.” Ahimaaz sitere nʼụzọ dị mkpụmkpụ nke gafere obosara ala Jọdan buru nwoke Kush ahụ ụzọ gbaruo. 24 Devid nọ nʼọnụ ụzọ ama nʼoge a. Mgbe onye nche rigoruru nʼelu mgbidi ebe ọ na-anọ, ọ hụrụ otu nwoke ka ọ na-agba ọsọ naanị ya. 25 Onye nche ahụ kpọrọ Devid oku gwa ya na o nwere onye na-abịa.Ma eze zara ya sị, “Ọ bụrụ naanị ya, o nwere oziọma.” Mgbe onyeozi ahụ na-abịaru nso, 26 onye nche ahụ lepụkwara anya hụ otu nwoke ọzọ ka o ji ọsọ na-abịa naanị ya. Ọ kpọkwara oku ọzọ sị, “Onye ọzọ na-abịakwa.”Eze zara sị, “Onye ahụ ga-enwekwa oziọma.” 27 Onye nche ahụ zara sị, “Onye nke mbụ na-abịa dị ka Ahimaaz, nwa Zadọk,”Eze zara sị, “Ọ bụ ezi mmadụ, ọ bụkwa oziọma ka o ji na-abịa.” 28 Mgbe ahụ, Ahimaaz kpọrọ eze oku sị, “Udo!” Ọ kpọrọ isiala nye eze. Kpuokwa ihu ya nʼala sị, “Ngọzị na-adịrị ONYENWE ANYỊ Chineke gị. Onye nke mebiri nzube ndị ahụ niile weliri aka imegide onyenwe m bụ eze.” 29 Eze jụrụ ya sị, “Oleekwanụ maka nwokorobịa ahụ bụ Absalọm? Ọ nọkwa nʼudo?”Ahimaaz zara sị, “Mgbe Joab zipụrụ ohu eze, na mụ onwe m, oke ụzụ dị, ma amaghị m ihe kpatara ya.” 30 Eze gwara ya sị, “Chere nʼebe a.” Ahimaaz chigharịrị chere. 31 Mgbe ahụ, onye Kush ahụ bịarutere sị, “Onyenwe m bụ eze, nụrụ oziọma a. Taa ONYENWE ANYỊ ekpepụtala gị site nʼịnapụta gị nʼaka ndị niile biliri imegide gị.” 32 Eze jụrụ onye Kush ahụ, “Nwokorobịa ahụ bụ Absalọm, ọ nọkwa nʼudo?”Onye Kush ahụ zaghachiri, “Ka ndị iro onyenwe m bụ eze na ndị niile na-ebili imejọ gị dị ka nwokorobịa ahụ!” 33 Okwu a metụrụ eze nʼahụ nke ukwuu, o biliri rigoo nʼụlọ nke dị nʼọnụ ụzọ ama, nọdụ nʼebe ahụ kwaa akwa. Ọ nọ na-akwa akwa mgbe ọ na-aga, na-eti mkpu akwa na-asị, “O, nwa m, Absalọm! O nwa m, nwa m, Absalọm. A sịkwarị na m nwụrụ nʼọnọdụ gị! O, Absalọm nwa m, nwa m oo!”

In Other Versions

2 Samuel 18 in the ANGEFD

2 Samuel 18 in the ANTPNG2D

2 Samuel 18 in the AS21

2 Samuel 18 in the BAGH

2 Samuel 18 in the BBPNG

2 Samuel 18 in the BBT1E

2 Samuel 18 in the BDS

2 Samuel 18 in the BEV

2 Samuel 18 in the BHAD

2 Samuel 18 in the BIB

2 Samuel 18 in the BLPT

2 Samuel 18 in the BNT

2 Samuel 18 in the BNTABOOT

2 Samuel 18 in the BNTLV

2 Samuel 18 in the BOATCB

2 Samuel 18 in the BOATCB2

2 Samuel 18 in the BOBCV

2 Samuel 18 in the BOCNT

2 Samuel 18 in the BOECS

2 Samuel 18 in the BOGWICC

2 Samuel 18 in the BOHCB

2 Samuel 18 in the BOHCV

2 Samuel 18 in the BOHLNT

2 Samuel 18 in the BOHNTLTAL

2 Samuel 18 in the BOILNTAP

2 Samuel 18 in the BOITCV

2 Samuel 18 in the BOKCV

2 Samuel 18 in the BOKCV2

2 Samuel 18 in the BOKHWOG

2 Samuel 18 in the BOKSSV

2 Samuel 18 in the BOLCB

2 Samuel 18 in the BOLCB2

2 Samuel 18 in the BOMCV

2 Samuel 18 in the BONAV

2 Samuel 18 in the BONCB

2 Samuel 18 in the BONLT

2 Samuel 18 in the BONUT2

2 Samuel 18 in the BOPLNT

2 Samuel 18 in the BOSCB

2 Samuel 18 in the BOSNC

2 Samuel 18 in the BOTLNT

2 Samuel 18 in the BOVCB

2 Samuel 18 in the BOYCB

2 Samuel 18 in the BPBB

2 Samuel 18 in the BPH

2 Samuel 18 in the BSB

2 Samuel 18 in the CCB

2 Samuel 18 in the CUV

2 Samuel 18 in the CUVS

2 Samuel 18 in the DBT

2 Samuel 18 in the DGDNT

2 Samuel 18 in the DHNT

2 Samuel 18 in the DNT

2 Samuel 18 in the ELBE

2 Samuel 18 in the EMTV

2 Samuel 18 in the ESV

2 Samuel 18 in the FBV

2 Samuel 18 in the FEB

2 Samuel 18 in the GGMNT

2 Samuel 18 in the GNT

2 Samuel 18 in the HARY

2 Samuel 18 in the HNT

2 Samuel 18 in the IRVA

2 Samuel 18 in the IRVB

2 Samuel 18 in the IRVG

2 Samuel 18 in the IRVH

2 Samuel 18 in the IRVK

2 Samuel 18 in the IRVM

2 Samuel 18 in the IRVM2

2 Samuel 18 in the IRVO

2 Samuel 18 in the IRVP

2 Samuel 18 in the IRVT

2 Samuel 18 in the IRVT2

2 Samuel 18 in the IRVU

2 Samuel 18 in the ISVN

2 Samuel 18 in the JSNT

2 Samuel 18 in the KAPI

2 Samuel 18 in the KBT1ETNIK

2 Samuel 18 in the KBV

2 Samuel 18 in the KJV

2 Samuel 18 in the KNFD

2 Samuel 18 in the LBA

2 Samuel 18 in the LBLA

2 Samuel 18 in the LNT

2 Samuel 18 in the LSV

2 Samuel 18 in the MAAL

2 Samuel 18 in the MBV

2 Samuel 18 in the MBV2

2 Samuel 18 in the MHNT

2 Samuel 18 in the MKNFD

2 Samuel 18 in the MNG

2 Samuel 18 in the MNT

2 Samuel 18 in the MNT2

2 Samuel 18 in the MRS1T

2 Samuel 18 in the NAA

2 Samuel 18 in the NASB

2 Samuel 18 in the NBLA

2 Samuel 18 in the NBS

2 Samuel 18 in the NBVTP

2 Samuel 18 in the NET2

2 Samuel 18 in the NIV11

2 Samuel 18 in the NNT

2 Samuel 18 in the NNT2

2 Samuel 18 in the NNT3

2 Samuel 18 in the PDDPT

2 Samuel 18 in the PFNT

2 Samuel 18 in the RMNT

2 Samuel 18 in the SBIAS

2 Samuel 18 in the SBIBS

2 Samuel 18 in the SBIBS2

2 Samuel 18 in the SBICS

2 Samuel 18 in the SBIDS

2 Samuel 18 in the SBIGS

2 Samuel 18 in the SBIHS

2 Samuel 18 in the SBIIS

2 Samuel 18 in the SBIIS2

2 Samuel 18 in the SBIIS3

2 Samuel 18 in the SBIKS

2 Samuel 18 in the SBIKS2

2 Samuel 18 in the SBIMS

2 Samuel 18 in the SBIOS

2 Samuel 18 in the SBIPS

2 Samuel 18 in the SBISS

2 Samuel 18 in the SBITS

2 Samuel 18 in the SBITS2

2 Samuel 18 in the SBITS3

2 Samuel 18 in the SBITS4

2 Samuel 18 in the SBIUS

2 Samuel 18 in the SBIVS

2 Samuel 18 in the SBT

2 Samuel 18 in the SBT1E

2 Samuel 18 in the SCHL

2 Samuel 18 in the SNT

2 Samuel 18 in the SUSU

2 Samuel 18 in the SUSU2

2 Samuel 18 in the SYNO

2 Samuel 18 in the TBIAOTANT

2 Samuel 18 in the TBT1E

2 Samuel 18 in the TBT1E2

2 Samuel 18 in the TFTIP

2 Samuel 18 in the TFTU

2 Samuel 18 in the TGNTATF3T

2 Samuel 18 in the THAI

2 Samuel 18 in the TNFD

2 Samuel 18 in the TNT

2 Samuel 18 in the TNTIK

2 Samuel 18 in the TNTIL

2 Samuel 18 in the TNTIN

2 Samuel 18 in the TNTIP

2 Samuel 18 in the TNTIZ

2 Samuel 18 in the TOMA

2 Samuel 18 in the TTENT

2 Samuel 18 in the UBG

2 Samuel 18 in the UGV

2 Samuel 18 in the UGV2

2 Samuel 18 in the UGV3

2 Samuel 18 in the VBL

2 Samuel 18 in the VDCC

2 Samuel 18 in the YALU

2 Samuel 18 in the YAPE

2 Samuel 18 in the YBVTP

2 Samuel 18 in the ZBP