2 Samuel 20 (BOICB)

1 Mgbe ahụ, otu onye okwu na ụka, aha ya bụ Sheba, nwa Bikri, onye Benjamin nọ nʼebe ahụ nʼoge a. Ọ fụrụ opi ike ya tie mkpu sị,“Anyị enweghị oke nʼime Devid,anyị enwekwaghị ihe nketa nʼime nwa Jesi.Ndị Izrel, onye ọbụla laa nʼụlọ ikwu ya!” 2 Ya mere, ndị ikom Izrel niile tụgharịrị hapụ Devid, soro Sheba nwa Bikri. Ma ndị ikom Juda nọgidere soro eze ha site na Jọdan ruo Jerusalem. 3 Mgbe Devid lọghachitere nʼụlọ ya na Jerusalem. O nyere iwu ka ndị iko ya nwanyị iri ndị ahụ ọ hapụrụ ilekọta ụlọ, ndị ahụ ha na Absalọm dinara, nọrọ nʼụlọ dị iche, ebe a nọ na-eche ha nche. Eze abakwurughị ha ọzọ. Ha bụ ndị emechibidoro ụzọ, ha na-ebi ndụ dịka ndị di ha nwụrụ anwụ tutu ruo ụbọchị ọnwụ ha. 4 Mgbe ahụ, eze gwara Amasa okwu sị, “Kpokọta ndị agha Juda ka ha bịakwute m nʼime abalị atọ. Gị onwe gị kwa ga-eso ha bịa nʼoge ahụ.” 5 Amasa pụrụ jee ịkpọkọta ndị Juda; ma o were ya ọtụtụ oge karịa abalị atọ. 6 Devid sịrị Abishai, “Lee nwoke a bụ Sheba nwa Bikri na-aga ime ihe ọjọọ ga-adị njọ karịa nke Absalọm mere. Chịrị ndị agha nna gị ukwu chụso ya, ma ọ bụghị ya, ọ ga-achọta obodo e wusiri ike gbaba, ebe anyị na-apụghị inweta ya.” 7 Ya mere ndị agha Joab, na ndị Keret na Pelet, na ndị niile bụ dike na dimkpa nʼagha pụrụ nʼikike ọchịchị Abishai. Ha si Jerusalem pụọ ịchụso Sheba nwa Bikri. 8 Mgbe ha rutere nʼoke nkume ahụ dị na Gibiọn, Amasa pụtara izute ha. Joab yi uwe agha ya nʼoge a; ọ fanyekwara mma agha ya nʼọbọ nʼukwu ya. Mgbe ọ gara nʼihu, mma ahụ si nʼọbọ ya dapụta. 9 Joab kelere Amasa sị ya, “Kedụ ka ị dị nwanna m.” Mgbe ahụ, Joab ji aka nri ya jide Amasa nʼahụọnụ isutu ya ọnụ, 10 Amasa elezighị anya hụ na mma agha nta dị nʼaka Joab. Joab mabanyere ya nʼime afọ Amasa, mee ka mgbịrị afọ ya sọsikwaa nʼala. Ọ maghị ya mma ahụ ugboro abụọ, nʼihi na otu ugboro ahụ mere ka Amasa nwụọ. Mgbe ahụ, Joab na nwanne ya Abishai chụsoro Sheba nwa Bikri nʼazụ. 11 Mgbe ahụ, otu nʼime ndị agha Joab guzo nʼakụkụ Amasa sị, “Onye ọbụla dịnyeere Joab na Devid ya bịa soro Joab nʼazụ.” 12 Ma Amasa tọgbọ nʼala nʼetiti ụzọ. Ọbara sikwa ya nʼahụ na-asọpụta. Mgbe nwoke ahụ hụrụ na ọtụtụ ndị agha na-agbakọ ile Amasa, o bupụrụ ozu ya nʼụzọ, were uwe kpuchie ya nʼọhịa. 13 Mgbe e bupụsịrị ozu Amasa nʼụzọ, ndị agha niile sooro Joab gaa ijide Sheba, nwa Bikri. 14 Sheba gabigara ebo niile nke Izrel ruo Ebel-Bet-Maaka, gabigakwa oke ala ndị Bikri, bụ ndị zukọtara soro ya. 15 Ndị agha Joab bịara gbochie ya na Ebel-Bet-Maaka. Ha wuru ihe mgbochi ruo obodo ahụ, nọbichie mgbidi dị ya gburugburu. Ebe ha nọ na-akụ mgbidi ahụ ihe, ka ha kwatuo ya. 16 Otu nwanyị maara ihe si nʼobodo ahụ kpọọ oku sị, “Geenụ m ntị, geenụ m ntị, gwanụ Joab ka ọ bịa nʼebe a. Achọrọ m ịgwa ya okwu.” 17 Joab pụtara gaa ya nso. Nwanyị ahụ jụrụ sị, “Ọ bụ gị bụ Joab?”Ọ zara sị, “E, ọ bụ m.”Mgbe ahụ, ọ gwara ya, “Gee ntị, ka i nụ ihe ohu gị nwere ikwu.”Joab sịrị ya, “Ana m ege ntị.” 18 Ọ gara nʼihu sị, “Nʼoge ochie a na-ekwu sị, ‘Gaa jụta ase nʼEbel,’ nʼụzọ dị otu a ka ha si ekwubi okwu. 19 Anyị bụ ndị udo na ndị kwesiri ntụkwasị obi nʼIzrel. I na-achọ ibibi obodo bụ nne nʼIzrel. Gịnị mere i ji chọọ iloda ihe nketa nke ONYENWE ANYỊ?” 20 Joab zara sị, “Mba! Ọ bụghị uche m ịla obodo a nʼiyi. 21 Ọ bụghị otu a ka okwu ahụ dị. Otu nwoke a na-akpọ Sheba nwa Bikri, nke si nʼobodo ugwu Ifrem e weliela aka ya imegide eze, bụ Devid. Nyefee nwoke a ọsịịsọ nʼaka m, aga m esi nʼobodo a pụọ.”Nwanyị ahụ sịrị Joab, “A ga-atụpụtara gị isi ya site na mgbidi.” 22 Nwanyị ahụ ji ndụmọdụ nke amamihe ya gakwuru ndị obodo. Ha bipụrụ Sheba nwa Bikri isi, tụpụtara ya Joab. Ya mere na ọ fụrụ opi ike ya, ndị ikom ya sitere nʼobodo ahụ lasaa, onye ọbụla lara nʼụlọ nke ya. Joab laghachikwuru eze na Jerusalem. 23 Ọ bụ Joab ka e mere onyeisi agha na-achị ndị agha niile nke Izrel.Benaya nwa Jehoiada bụ onye na-achịkọta ndị Keret na ndị Pelet na-eche eze nche. 24 Adoniram na-ahụ maka ihe banyere ndị ọrụ mmanye.Jehoshafat nwa Ahilud bụ onye na-edekọta ihe niile na-eme nʼobodo. 25 Sheva bụ ode akwụkwọ eze,Zadọk na Abịata bụ ndị nchụaja. 26 Ira, onye si nʼobodo Jaịa, bụ onye nchụaja eze Devid.

In Other Versions

2 Samuel 20 in the ANGEFD

2 Samuel 20 in the ANTPNG2D

2 Samuel 20 in the AS21

2 Samuel 20 in the BAGH

2 Samuel 20 in the BBPNG

2 Samuel 20 in the BBT1E

2 Samuel 20 in the BDS

2 Samuel 20 in the BEV

2 Samuel 20 in the BHAD

2 Samuel 20 in the BIB

2 Samuel 20 in the BLPT

2 Samuel 20 in the BNT

2 Samuel 20 in the BNTABOOT

2 Samuel 20 in the BNTLV

2 Samuel 20 in the BOATCB

2 Samuel 20 in the BOATCB2

2 Samuel 20 in the BOBCV

2 Samuel 20 in the BOCNT

2 Samuel 20 in the BOECS

2 Samuel 20 in the BOGWICC

2 Samuel 20 in the BOHCB

2 Samuel 20 in the BOHCV

2 Samuel 20 in the BOHLNT

2 Samuel 20 in the BOHNTLTAL

2 Samuel 20 in the BOILNTAP

2 Samuel 20 in the BOITCV

2 Samuel 20 in the BOKCV

2 Samuel 20 in the BOKCV2

2 Samuel 20 in the BOKHWOG

2 Samuel 20 in the BOKSSV

2 Samuel 20 in the BOLCB

2 Samuel 20 in the BOLCB2

2 Samuel 20 in the BOMCV

2 Samuel 20 in the BONAV

2 Samuel 20 in the BONCB

2 Samuel 20 in the BONLT

2 Samuel 20 in the BONUT2

2 Samuel 20 in the BOPLNT

2 Samuel 20 in the BOSCB

2 Samuel 20 in the BOSNC

2 Samuel 20 in the BOTLNT

2 Samuel 20 in the BOVCB

2 Samuel 20 in the BOYCB

2 Samuel 20 in the BPBB

2 Samuel 20 in the BPH

2 Samuel 20 in the BSB

2 Samuel 20 in the CCB

2 Samuel 20 in the CUV

2 Samuel 20 in the CUVS

2 Samuel 20 in the DBT

2 Samuel 20 in the DGDNT

2 Samuel 20 in the DHNT

2 Samuel 20 in the DNT

2 Samuel 20 in the ELBE

2 Samuel 20 in the EMTV

2 Samuel 20 in the ESV

2 Samuel 20 in the FBV

2 Samuel 20 in the FEB

2 Samuel 20 in the GGMNT

2 Samuel 20 in the GNT

2 Samuel 20 in the HARY

2 Samuel 20 in the HNT

2 Samuel 20 in the IRVA

2 Samuel 20 in the IRVB

2 Samuel 20 in the IRVG

2 Samuel 20 in the IRVH

2 Samuel 20 in the IRVK

2 Samuel 20 in the IRVM

2 Samuel 20 in the IRVM2

2 Samuel 20 in the IRVO

2 Samuel 20 in the IRVP

2 Samuel 20 in the IRVT

2 Samuel 20 in the IRVT2

2 Samuel 20 in the IRVU

2 Samuel 20 in the ISVN

2 Samuel 20 in the JSNT

2 Samuel 20 in the KAPI

2 Samuel 20 in the KBT1ETNIK

2 Samuel 20 in the KBV

2 Samuel 20 in the KJV

2 Samuel 20 in the KNFD

2 Samuel 20 in the LBA

2 Samuel 20 in the LBLA

2 Samuel 20 in the LNT

2 Samuel 20 in the LSV

2 Samuel 20 in the MAAL

2 Samuel 20 in the MBV

2 Samuel 20 in the MBV2

2 Samuel 20 in the MHNT

2 Samuel 20 in the MKNFD

2 Samuel 20 in the MNG

2 Samuel 20 in the MNT

2 Samuel 20 in the MNT2

2 Samuel 20 in the MRS1T

2 Samuel 20 in the NAA

2 Samuel 20 in the NASB

2 Samuel 20 in the NBLA

2 Samuel 20 in the NBS

2 Samuel 20 in the NBVTP

2 Samuel 20 in the NET2

2 Samuel 20 in the NIV11

2 Samuel 20 in the NNT

2 Samuel 20 in the NNT2

2 Samuel 20 in the NNT3

2 Samuel 20 in the PDDPT

2 Samuel 20 in the PFNT

2 Samuel 20 in the RMNT

2 Samuel 20 in the SBIAS

2 Samuel 20 in the SBIBS

2 Samuel 20 in the SBIBS2

2 Samuel 20 in the SBICS

2 Samuel 20 in the SBIDS

2 Samuel 20 in the SBIGS

2 Samuel 20 in the SBIHS

2 Samuel 20 in the SBIIS

2 Samuel 20 in the SBIIS2

2 Samuel 20 in the SBIIS3

2 Samuel 20 in the SBIKS

2 Samuel 20 in the SBIKS2

2 Samuel 20 in the SBIMS

2 Samuel 20 in the SBIOS

2 Samuel 20 in the SBIPS

2 Samuel 20 in the SBISS

2 Samuel 20 in the SBITS

2 Samuel 20 in the SBITS2

2 Samuel 20 in the SBITS3

2 Samuel 20 in the SBITS4

2 Samuel 20 in the SBIUS

2 Samuel 20 in the SBIVS

2 Samuel 20 in the SBT

2 Samuel 20 in the SBT1E

2 Samuel 20 in the SCHL

2 Samuel 20 in the SNT

2 Samuel 20 in the SUSU

2 Samuel 20 in the SUSU2

2 Samuel 20 in the SYNO

2 Samuel 20 in the TBIAOTANT

2 Samuel 20 in the TBT1E

2 Samuel 20 in the TBT1E2

2 Samuel 20 in the TFTIP

2 Samuel 20 in the TFTU

2 Samuel 20 in the TGNTATF3T

2 Samuel 20 in the THAI

2 Samuel 20 in the TNFD

2 Samuel 20 in the TNT

2 Samuel 20 in the TNTIK

2 Samuel 20 in the TNTIL

2 Samuel 20 in the TNTIN

2 Samuel 20 in the TNTIP

2 Samuel 20 in the TNTIZ

2 Samuel 20 in the TOMA

2 Samuel 20 in the TTENT

2 Samuel 20 in the UBG

2 Samuel 20 in the UGV

2 Samuel 20 in the UGV2

2 Samuel 20 in the UGV3

2 Samuel 20 in the VBL

2 Samuel 20 in the VDCC

2 Samuel 20 in the YALU

2 Samuel 20 in the YAPE

2 Samuel 20 in the YBVTP

2 Samuel 20 in the ZBP