2 Samuel 23 (BOICB)

1 Ndị a bụ okwu ikpeazụ Devid kwuru:“Okwu pụrụ iche si nʼọnụ Devid, nwa Jesi,ihe si nʼọnụ nwoke ahụ Chineke Onye kachasị ihe niile elu buliri elu.Nwoke ahụ onye Chineke nke Jekọb tere mmanụ,onye bụ ọka nʼịbụ abụ nʼala Izrel. 2 “Mmụọ ONYENWE ANYỊ kwuru okwu site nʼọnụ m,okwu ya dịkwa m nʼire. 3 Chineke Izrel kwuru okwu,Oke nkume Izrel sịrị m,‘Mgbe mmadụ na-achị ndị ọzọ site nʼezi omume,mgbe ọ na-achị site nʼegwu Chineke. 4 Ọ dị ka ìhè nke ụtụtụ, mgbe anyanwụ na-achawapụtanʼụtụtụ nke igwe ojii na-adịghị.Dịka ìhè na-acha mgbe mmiri zocharanke na-eme ka ahịhịa ndụ na-epupụta nʼala.’ 5 “Ọ bụrụ na ihe banyere ụlọ m ezighị ezi nʼebe Chineke nọ.Nʼezie, ọ garaghị ekwe ka ọgbụgba ndụ ebighị ebi dịrị nʼetiti mụ na ya,Ọgbụgba ndụ e doro nʼusoro nke e mere ka o guzosie ike nʼụzọ niile.Nʼezie, ọ garaghị eme ka nzọpụta m zuo oke.Ma mezukwaara m ọchịchọ obi m niile. 6 Ma ndị ajọ mmadụ ka a ga-atụfu nʼakụkụ dịka ogwu,nke mmadụ anaghị eji aka ekpokọta. 7 Onye ọbụla metụrụ ogwu aka,bụ onye nwere ngwa ọrụ igwe maọbụ osisi ùbe.A na-esure ha ọkụ nʼebe ha tọgbọrọ.” 8 Ndị a bụ aha ndị dike nʼagha Devid nwere:Josheb-Bashebet, onye Takemon, bụ onyeisi nke mmadụ atọ. O weliri ùbe ya megide narị ndị ikom asatọ, bụ ndị o gburu nʼotu mgbe ibu agha. 9 Onye nke na-eso ya bụ Elieza, nwa Dodayi, onye Ahohi. Dịka otu nʼime ndị dike atọ ahụ, ya na Devid nọ mgbe ha na-akwa ndị Filistia emo, bụ ndị zukọrọ na Pas Damim ibu agha. Mgbe ahụ, ndị Izrel lara azụ, 10 ma Elieza guzoro na-alaghị azụ. O gbugidere ndị Filistia ruo mgbe ike gwuru aka ya. Aka ya rapakwaara na mma agha. ONYENWE ANYỊ nyekwara ha mmeri dị ukwuu nʼụbọchị ahụ. Ndị agha ahụ laghachikwutere Elieza, maọbụ naanị ka ha yipụsịa ndị ahụ e gburu egbu ihe ha yi nʼahụ. 11 Onye nke atọ bụ Shama, nwa Agee, onye Hara. Mgbe ndị Filistia chịkọtara onwe ha nʼotu ebe, nke e nwere otu ubi jupụtara na lentil, ma ndị agha Izrel niile sitere nʼebe ha nọ gbapụ. 12 Ma naanị Shama guzoro nʼetiti ubi lentil ahụ. Ọ napụtara ya, tigbuo ndị Filistia niile ahụ. ONYENWE ANYỊ nyere mmeri dị ukwuu. 13 Nʼoge owuwe ihe ubi, mmadụ atọ nʼime iri ndị dike atọ ahụ, jekwuru Devid nʼọgba nkume Adulam, mgbe otù ndị Filistia mara ụlọ ikwu ha na Ndagwurugwu Refaim. 14 Ma Devid nọ nʼebe ahụ ewusiri ike nʼoge ahụ, ma ọnọdụ ndị agha Filistia dị na Betlehem. 15 Agụụ mmiri gụrụ Devid nke ukwuu. Ọ sị, “Ọ ga-amasị m ma ọ bụrụ na o nwere onye ga-ekunye m mmiri ọṅụṅụ, site nʼolulu mmiri dị nso nʼọnụ ụzọ ama Betlehem!” 16 Ya mere, ndị dike nʼagha atọ ahụ wakpuru ọmụma ụlọ ikwu ndị Filistia, seta mmiri site nʼolulu mmiri ahụ dị nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama Betlehem, bulatara ya Devid. Ma Devid jụrụ ịṅụ ya, kama ọ wufuru ya nʼala nʼihu ONYENWE ANYỊ. 17 Ọ sịrị, “Ya bụrụ m ihe arụ, ONYENWE ANYỊ, na m ga-eme nke a. Nke a ọ bụghị ọbara ndị ikom a, ndị ji ndụ ha chụọ aja nʼihi ikute mmiri a?” Devid ekweghị aṅụ ya.Nke a bụ ụdị ike dike atọ ahụ kpara. 18 Abishai, nwanne Joab, nwa Zeruaya, bụ onyeisi ndị ikom atọ ahụ. O weliri ùbe ya megide narị ndị ikom atọ, tigbukwaa ha niile. Nʼihi nke a ọ ghọrọ onye a ma ama dịka mmadụ atọ ndị a. 19 Ma anaghị asọpụrụ ya nʼebe ọ dị ukwuu karịa iri ndị ikom atọ ahụ? Ọ ghọrọ onyeisi ha. Ọ bụ ezie a na-agụnyeghị ya dịka otu onye nʼime ha. 20 Benaya, nwa Jehoiada, onye si Kabzeel, bụ dike nʼagha nke kpara ike dị ukwuu. O tigburu dimkpa abụọ ndị Moab, ndị bụ ọkaka nʼagha. O rịdakwukwara ọdụm nʼime olulu na-amị amị nʼụbọchị mkpụrụ mmiri na-ezo, gbuo ya. 21 O tigburu otu nwoke onye Ijipt, gbara dimkpa. Ọ bụ ezie na onye Ijipt ahụ ji ùbe nʼaka ya, ma Benaya ji naanị mkpọ jekwuru ya. Pụnara onye Ijipt ahụ ùbe dị nʼaka ya. Jiri ya magbuo ya 22 Nke a bụ ụdị ike Benaya nwa Jehoiada kpara. Ya onwe ya nwekwara aha dịka ndị dike atọ mbụ. 23 A na-asọpụrụ ya nʼebe ọ dị ukwuu karịa onye ọbụla nʼetiti iri dike atọ ndị ahụ, ma o rughị ogugo ndị dike atọ mbụ ahụ. Devid mere ya onyeisi ndị na-eche ya nche. 24 Nʼetiti iri ndị ikom atọ ahụ bụ: Asahel, nwanne Joab,Elhanan nwa Dodo, onye Betlehem 25 Shama, onye Harod,Elika, onye Harod, 26 Helez onye Palti,Ira, nwa Ikesh, onye Tekoa, 27 Abieza, onye Anatot,Mebunai, onye Husha, 28 Zalmon, onye Ahohi,Maharai, onye Netofa, 29 Heled, nwa Baana, onye Netofa,Itai, nwa Ribai, nke Gibea ụmụ Benjamin, 30 Benaya, onye Piraton,Hidaị, nke si nʼakụkụ iyi dị na Gaash, 31 Abi-Albon, onye Arba,Azmavet, onye Bahurim 32 Eliaba, onye Shaalbon,Ụmụ Jashen,Jonatan 33 nwa Shama, onye HaraAhiam, nwa Shara nke Hara, 34 Elifelet, nwa Ahasbaị, onye Maaka,Eliam, nwa Ahitofel, onye Gailo, 35 Hezro, onye Kamel,Paraị, onye Aaba, 36 Igal nwa Netan, onye Zoba,nwa Hagri, 37 Zelek, onye Amọn,Naharai, onye Beerọt, onye na-ebu ihe agha Joab nwa Zeruaya, 38 Ira, onye Itra,Gareb, onye Itra 39 na Ụraya, onye Het. Ha niile dị iri ndị ikom atọ na asaa.

In Other Versions

2 Samuel 23 in the ANGEFD

2 Samuel 23 in the ANTPNG2D

2 Samuel 23 in the AS21

2 Samuel 23 in the BAGH

2 Samuel 23 in the BBPNG

2 Samuel 23 in the BBT1E

2 Samuel 23 in the BDS

2 Samuel 23 in the BEV

2 Samuel 23 in the BHAD

2 Samuel 23 in the BIB

2 Samuel 23 in the BLPT

2 Samuel 23 in the BNT

2 Samuel 23 in the BNTABOOT

2 Samuel 23 in the BNTLV

2 Samuel 23 in the BOATCB

2 Samuel 23 in the BOATCB2

2 Samuel 23 in the BOBCV

2 Samuel 23 in the BOCNT

2 Samuel 23 in the BOECS

2 Samuel 23 in the BOGWICC

2 Samuel 23 in the BOHCB

2 Samuel 23 in the BOHCV

2 Samuel 23 in the BOHLNT

2 Samuel 23 in the BOHNTLTAL

2 Samuel 23 in the BOILNTAP

2 Samuel 23 in the BOITCV

2 Samuel 23 in the BOKCV

2 Samuel 23 in the BOKCV2

2 Samuel 23 in the BOKHWOG

2 Samuel 23 in the BOKSSV

2 Samuel 23 in the BOLCB

2 Samuel 23 in the BOLCB2

2 Samuel 23 in the BOMCV

2 Samuel 23 in the BONAV

2 Samuel 23 in the BONCB

2 Samuel 23 in the BONLT

2 Samuel 23 in the BONUT2

2 Samuel 23 in the BOPLNT

2 Samuel 23 in the BOSCB

2 Samuel 23 in the BOSNC

2 Samuel 23 in the BOTLNT

2 Samuel 23 in the BOVCB

2 Samuel 23 in the BOYCB

2 Samuel 23 in the BPBB

2 Samuel 23 in the BPH

2 Samuel 23 in the BSB

2 Samuel 23 in the CCB

2 Samuel 23 in the CUV

2 Samuel 23 in the CUVS

2 Samuel 23 in the DBT

2 Samuel 23 in the DGDNT

2 Samuel 23 in the DHNT

2 Samuel 23 in the DNT

2 Samuel 23 in the ELBE

2 Samuel 23 in the EMTV

2 Samuel 23 in the ESV

2 Samuel 23 in the FBV

2 Samuel 23 in the FEB

2 Samuel 23 in the GGMNT

2 Samuel 23 in the GNT

2 Samuel 23 in the HARY

2 Samuel 23 in the HNT

2 Samuel 23 in the IRVA

2 Samuel 23 in the IRVB

2 Samuel 23 in the IRVG

2 Samuel 23 in the IRVH

2 Samuel 23 in the IRVK

2 Samuel 23 in the IRVM

2 Samuel 23 in the IRVM2

2 Samuel 23 in the IRVO

2 Samuel 23 in the IRVP

2 Samuel 23 in the IRVT

2 Samuel 23 in the IRVT2

2 Samuel 23 in the IRVU

2 Samuel 23 in the ISVN

2 Samuel 23 in the JSNT

2 Samuel 23 in the KAPI

2 Samuel 23 in the KBT1ETNIK

2 Samuel 23 in the KBV

2 Samuel 23 in the KJV

2 Samuel 23 in the KNFD

2 Samuel 23 in the LBA

2 Samuel 23 in the LBLA

2 Samuel 23 in the LNT

2 Samuel 23 in the LSV

2 Samuel 23 in the MAAL

2 Samuel 23 in the MBV

2 Samuel 23 in the MBV2

2 Samuel 23 in the MHNT

2 Samuel 23 in the MKNFD

2 Samuel 23 in the MNG

2 Samuel 23 in the MNT

2 Samuel 23 in the MNT2

2 Samuel 23 in the MRS1T

2 Samuel 23 in the NAA

2 Samuel 23 in the NASB

2 Samuel 23 in the NBLA

2 Samuel 23 in the NBS

2 Samuel 23 in the NBVTP

2 Samuel 23 in the NET2

2 Samuel 23 in the NIV11

2 Samuel 23 in the NNT

2 Samuel 23 in the NNT2

2 Samuel 23 in the NNT3

2 Samuel 23 in the PDDPT

2 Samuel 23 in the PFNT

2 Samuel 23 in the RMNT

2 Samuel 23 in the SBIAS

2 Samuel 23 in the SBIBS

2 Samuel 23 in the SBIBS2

2 Samuel 23 in the SBICS

2 Samuel 23 in the SBIDS

2 Samuel 23 in the SBIGS

2 Samuel 23 in the SBIHS

2 Samuel 23 in the SBIIS

2 Samuel 23 in the SBIIS2

2 Samuel 23 in the SBIIS3

2 Samuel 23 in the SBIKS

2 Samuel 23 in the SBIKS2

2 Samuel 23 in the SBIMS

2 Samuel 23 in the SBIOS

2 Samuel 23 in the SBIPS

2 Samuel 23 in the SBISS

2 Samuel 23 in the SBITS

2 Samuel 23 in the SBITS2

2 Samuel 23 in the SBITS3

2 Samuel 23 in the SBITS4

2 Samuel 23 in the SBIUS

2 Samuel 23 in the SBIVS

2 Samuel 23 in the SBT

2 Samuel 23 in the SBT1E

2 Samuel 23 in the SCHL

2 Samuel 23 in the SNT

2 Samuel 23 in the SUSU

2 Samuel 23 in the SUSU2

2 Samuel 23 in the SYNO

2 Samuel 23 in the TBIAOTANT

2 Samuel 23 in the TBT1E

2 Samuel 23 in the TBT1E2

2 Samuel 23 in the TFTIP

2 Samuel 23 in the TFTU

2 Samuel 23 in the TGNTATF3T

2 Samuel 23 in the THAI

2 Samuel 23 in the TNFD

2 Samuel 23 in the TNT

2 Samuel 23 in the TNTIK

2 Samuel 23 in the TNTIL

2 Samuel 23 in the TNTIN

2 Samuel 23 in the TNTIP

2 Samuel 23 in the TNTIZ

2 Samuel 23 in the TOMA

2 Samuel 23 in the TTENT

2 Samuel 23 in the UBG

2 Samuel 23 in the UGV

2 Samuel 23 in the UGV2

2 Samuel 23 in the UGV3

2 Samuel 23 in the VBL

2 Samuel 23 in the VDCC

2 Samuel 23 in the YALU

2 Samuel 23 in the YAPE

2 Samuel 23 in the YBVTP

2 Samuel 23 in the ZBP