2 Samuel 24 (BOICB)

1 Ọzọkwa, ONYENWE ANYỊ were iwe dị ọkụ megide Izrel. Ọ kpaliri Devid imegide ha, sị, “Gaa gụọ Izrel na Juda ọnụ.” 2 Ya mere, eze gwara Joab na ndịisi ọchịagha ya ha so, “Jegharịa nʼebo niile nke Izrel, site na Dan ruo Bịasheba, gụkọtaa ndị tozuru ije agha nʼIzrel niile ka m nwee ike mata ole ọnụọgụgụ ha dị.” 3 Joab zaghachiri eze, “Ka ONYENWE ANYỊ bụ Chineke gị, mee ka ndị agha mụbaa, otu onye narị ụzọ, otu onye narị ụzọ karịa. Ka anya onyenwe m, bụ eze, hụkwa ya. Ma nʼihi gịnị ka onyenwe m bụ eze ji chọọ ime ihe dị otu a?” 4 Ma okwu eze dị ike karịa nke Joab na nke ndị ọchịagha ahụ. Ya mere, ha hapụrụ ihu eze pụọ ịgụ ndị agha Izrel ọnụ. 5 Mgbe ha gabigachara Jọdan, ha manyere ụlọ ikwu ha na nso Aroea, nʼaka nri obodo ahụ dị nʼetiti ndagwurugwu Gad na-eru Jeza, 6 ha gara Gilead ruokwa nʼala Taatim Hodshi, bịarukwaa Dan Jaan, jee gburugburu jeruo Saịdọn. 7 Ha jere ruokwa nʼebe e wusiri ike nke Taịa, na obodo niile nke ndị Hiv, na nke ndị Kenan. Nʼikpeazụ, ha gaara ruo Bịasheba nʼime ndịda Juda. 8 Mgbe ha jegharịchara nʼala ahụ niile; ha lọghachitere na Jerusalem na ngwụcha ọnwa nke itoolu na iri abalị abụọ ya. 9 Joab nyere eze ngụkọta ọnụọgụgụ nke ndị agha Izrel. NʼIzrel, ha dị narị puku asatọ, bụ ndị ikom ndị tozuru iji mma agha buo agha, na Juda ha dị narị puku ise. 10 Ma obi Devid bidoro ịta ya ụta mgbe ọ gụchara ndị ikom na-alụ agha ọnụ. Ọ sịrị ONYENWE ANYỊ, “Emehiela m nke ukwuu nʼihi ihe m mere. Ma ugbu a, ONYENWE ANYỊ biko, arịọ m gị, wezuga ikpe ọmụma nke dịịrị ohu gị; nʼihi na emeela m ihe nzuzu dị ukwuu.” 11 Nʼụtụtụ echi ya, tupu Devid na-eteta nʼụra, okwu ONYENWE ANYỊ eruola Gad onye amụma, bụ onye ọhụ ụzọ Devid, sị, 12 “Gaa gwa Devid, ‘Otu a ka ONYENWE ANYỊ na-ekwu: Ụzọ ihe atọ ka m na-eche gị nʼihu. Họrọ otu nʼime ha nke m ga-eme ka ọ bịakwasị gị.’ ” 13 Ya mere, Gad jekwuuru Devid sị ya, “Ọ bụ ka oke ụnwụ ịda nʼala gị afọ atọ? Ka ọ bụ na ị ga-agbalaga site nʼihu ndị iro gị ọnwa atọ, ka ha na-achụ gị ọsọ? Ka ọ bụ ka ajọ ọrịa na-efe efe daa nʼala gị mkpụrụ ụbọchị atọ? Ugbu a, chee echiche, kpebie ọsịsa ị chọrọ ka m weghachiri onye ahụ zitere m.” 14 Devid sịrị Gad, “Anọ m nʼoke nsogbu, ọ ka mma ka anyị daba nʼaka ONYENWE ANYỊ karịa ịdaba nʼaka mmadụ, nʼihi na obi ebere ya bara ụba.” 15 Nʼihi ya, ONYENWE ANYỊ zitere ajọ ọrịa na-efe efe nʼala Izrel, site nʼụtụtụ ahụ ruo oge akara aka. Ọ bụ iri puku mmadụ asaa nwụrụ site na Dan ruo Bịasheba. 16 Mgbe mmụọ ozi ahụ setịpụrụ aka ya ibibi Jerusalem, o wutere ONYENWE ANYỊ nʼihi oke mbibi ahụ. Ọ sịrị mmụọ ozi ahụ nke na-eweta nhụju anya nye ndị mmadụ, “O zuola. Seghachi aka gị.” Mgbe ahụ, mmụọ ozi ONYENWE ANYỊ nọ nʼebe ịzọcha ọka Arauna onye Jebus. 17 Mgbe Devid hụrụ mmụọ ozi ahụ na-etida ndị mmadụ, ọ sịrị ONYENWE ANYỊ, “Ọ bụ mụ onwe m mehiere; mụ bụ onye ọzụzụ atụrụ, mere ajọ omume. Ma ndị a bụ naanị ụmụ atụrụ, gịnị kwanụ ka ha mere? Ka aka gị dịgide naanị nʼahụ m, dịgidekwa nʼahụ ndị ụlọ m.” 18 Nʼụbọchị ahụ, Gad bịara nʼụlọ Devid gwa ya sị, “Gaa, wuore ONYENWE ANYỊ ebe ịchụ aja nʼebe ịzọcha ọka Arauna, onye Jebus.” 19 Ya mere, Devid rubere isi gaa mee dịka iwu ONYENWE ANYỊ nyere site nʼọnụ Gad. 20 Mgbe Arauna weliri anya hụ eze na ndị ọrụ ya ka ha na-abịa nʼebe ọ nọ, ọ pụtara kpọọ isiala nye eze. Kpudokwa ihu ya nʼala. 21 Arauna sịrị, “Gịnị mere onyenwe m, bụ eze ji bịakwute ohu ya?”Devid zaghachiri, “Abịara m ịzụrụ ebe ịzọcha ọka gị, ka m nwee ike wuore ONYENWE ANYỊ ebe ịchụ aja; ka akwụsị ọrịa a na-efe efe dakwasịrị ndị mmadụ.” 22 Arauna sịrị Devid, “Ka onyenwe m, bụ eze were ihe ọbụla ọ chọrọ, werekwa chụọ aja. Lee ehi maka iji chụọ aja nsure ọkụ, leekwa ihe igwe ịzọcha ọka niile, na osisi ndị ahụ niile a na-anyanye ehi nʼolu, ka ha bụrụ nkụ. 23 Eze, ihe ndị a niile ka mụ bụ Arauna na-enye eze, ka ONYENWE ANYỊ Chineke gị nabatakwa gị.” 24 Ma eze zaghachiri Arauna, “Ee, aghaghị m ịkwụzu gị ụgwụ ya, nʼihi na agaghị m achụrụ ONYENWE ANYỊ, bụ Chineke m aja nsure ọkụ nke na-agaghị efu m ihe ọbụla.”Ya mere, Devid zụrụ ebe ịzọcha ọka ahụ na ehi ahụ niile, kwụọ Arauna iri shekel ọlaọcha ise, nʼihi ha. 25 Devid wuru ebe ịchụrụ ONYENWE ANYỊ aja nʼebe ahụ. Chụọkwa aja nsure ọkụ na aja udo. Mgbe ahụ, ONYENWE ANYỊ zara ekpere o kpere nʼihi ala ahụ. Nrịa nrịa ahụ na-efe efe nke dakwasịrị Izrel kwụsịkwara.

In Other Versions

2 Samuel 24 in the ANGEFD

2 Samuel 24 in the ANTPNG2D

2 Samuel 24 in the AS21

2 Samuel 24 in the BAGH

2 Samuel 24 in the BBPNG

2 Samuel 24 in the BBT1E

2 Samuel 24 in the BDS

2 Samuel 24 in the BEV

2 Samuel 24 in the BHAD

2 Samuel 24 in the BIB

2 Samuel 24 in the BLPT

2 Samuel 24 in the BNT

2 Samuel 24 in the BNTABOOT

2 Samuel 24 in the BNTLV

2 Samuel 24 in the BOATCB

2 Samuel 24 in the BOATCB2

2 Samuel 24 in the BOBCV

2 Samuel 24 in the BOCNT

2 Samuel 24 in the BOECS

2 Samuel 24 in the BOGWICC

2 Samuel 24 in the BOHCB

2 Samuel 24 in the BOHCV

2 Samuel 24 in the BOHLNT

2 Samuel 24 in the BOHNTLTAL

2 Samuel 24 in the BOILNTAP

2 Samuel 24 in the BOITCV

2 Samuel 24 in the BOKCV

2 Samuel 24 in the BOKCV2

2 Samuel 24 in the BOKHWOG

2 Samuel 24 in the BOKSSV

2 Samuel 24 in the BOLCB

2 Samuel 24 in the BOLCB2

2 Samuel 24 in the BOMCV

2 Samuel 24 in the BONAV

2 Samuel 24 in the BONCB

2 Samuel 24 in the BONLT

2 Samuel 24 in the BONUT2

2 Samuel 24 in the BOPLNT

2 Samuel 24 in the BOSCB

2 Samuel 24 in the BOSNC

2 Samuel 24 in the BOTLNT

2 Samuel 24 in the BOVCB

2 Samuel 24 in the BOYCB

2 Samuel 24 in the BPBB

2 Samuel 24 in the BPH

2 Samuel 24 in the BSB

2 Samuel 24 in the CCB

2 Samuel 24 in the CUV

2 Samuel 24 in the CUVS

2 Samuel 24 in the DBT

2 Samuel 24 in the DGDNT

2 Samuel 24 in the DHNT

2 Samuel 24 in the DNT

2 Samuel 24 in the ELBE

2 Samuel 24 in the EMTV

2 Samuel 24 in the ESV

2 Samuel 24 in the FBV

2 Samuel 24 in the FEB

2 Samuel 24 in the GGMNT

2 Samuel 24 in the GNT

2 Samuel 24 in the HARY

2 Samuel 24 in the HNT

2 Samuel 24 in the IRVA

2 Samuel 24 in the IRVB

2 Samuel 24 in the IRVG

2 Samuel 24 in the IRVH

2 Samuel 24 in the IRVK

2 Samuel 24 in the IRVM

2 Samuel 24 in the IRVM2

2 Samuel 24 in the IRVO

2 Samuel 24 in the IRVP

2 Samuel 24 in the IRVT

2 Samuel 24 in the IRVT2

2 Samuel 24 in the IRVU

2 Samuel 24 in the ISVN

2 Samuel 24 in the JSNT

2 Samuel 24 in the KAPI

2 Samuel 24 in the KBT1ETNIK

2 Samuel 24 in the KBV

2 Samuel 24 in the KJV

2 Samuel 24 in the KNFD

2 Samuel 24 in the LBA

2 Samuel 24 in the LBLA

2 Samuel 24 in the LNT

2 Samuel 24 in the LSV

2 Samuel 24 in the MAAL

2 Samuel 24 in the MBV

2 Samuel 24 in the MBV2

2 Samuel 24 in the MHNT

2 Samuel 24 in the MKNFD

2 Samuel 24 in the MNG

2 Samuel 24 in the MNT

2 Samuel 24 in the MNT2

2 Samuel 24 in the MRS1T

2 Samuel 24 in the NAA

2 Samuel 24 in the NASB

2 Samuel 24 in the NBLA

2 Samuel 24 in the NBS

2 Samuel 24 in the NBVTP

2 Samuel 24 in the NET2

2 Samuel 24 in the NIV11

2 Samuel 24 in the NNT

2 Samuel 24 in the NNT2

2 Samuel 24 in the NNT3

2 Samuel 24 in the PDDPT

2 Samuel 24 in the PFNT

2 Samuel 24 in the RMNT

2 Samuel 24 in the SBIAS

2 Samuel 24 in the SBIBS

2 Samuel 24 in the SBIBS2

2 Samuel 24 in the SBICS

2 Samuel 24 in the SBIDS

2 Samuel 24 in the SBIGS

2 Samuel 24 in the SBIHS

2 Samuel 24 in the SBIIS

2 Samuel 24 in the SBIIS2

2 Samuel 24 in the SBIIS3

2 Samuel 24 in the SBIKS

2 Samuel 24 in the SBIKS2

2 Samuel 24 in the SBIMS

2 Samuel 24 in the SBIOS

2 Samuel 24 in the SBIPS

2 Samuel 24 in the SBISS

2 Samuel 24 in the SBITS

2 Samuel 24 in the SBITS2

2 Samuel 24 in the SBITS3

2 Samuel 24 in the SBITS4

2 Samuel 24 in the SBIUS

2 Samuel 24 in the SBIVS

2 Samuel 24 in the SBT

2 Samuel 24 in the SBT1E

2 Samuel 24 in the SCHL

2 Samuel 24 in the SNT

2 Samuel 24 in the SUSU

2 Samuel 24 in the SUSU2

2 Samuel 24 in the SYNO

2 Samuel 24 in the TBIAOTANT

2 Samuel 24 in the TBT1E

2 Samuel 24 in the TBT1E2

2 Samuel 24 in the TFTIP

2 Samuel 24 in the TFTU

2 Samuel 24 in the TGNTATF3T

2 Samuel 24 in the THAI

2 Samuel 24 in the TNFD

2 Samuel 24 in the TNT

2 Samuel 24 in the TNTIK

2 Samuel 24 in the TNTIL

2 Samuel 24 in the TNTIN

2 Samuel 24 in the TNTIP

2 Samuel 24 in the TNTIZ

2 Samuel 24 in the TOMA

2 Samuel 24 in the TTENT

2 Samuel 24 in the UBG

2 Samuel 24 in the UGV

2 Samuel 24 in the UGV2

2 Samuel 24 in the UGV3

2 Samuel 24 in the VBL

2 Samuel 24 in the VDCC

2 Samuel 24 in the YALU

2 Samuel 24 in the YAPE

2 Samuel 24 in the YBVTP

2 Samuel 24 in the ZBP