Daniel 6 (BOICB)

1 Ọ dị Daraiọs mma ịhọpụta ndịisi dị otu narị na iri abụọ, ndị ga-anọ nʼalaeze ahụ niile dịka ndị nnọchite anya eze. 2 O họpụtakwara ndịisi atọ ọzọ dịka ndịisi ha, nke otu onye nʼime ha bụ Daniel. Ndị a bụ ndị ga na-agụkọrọ ha otu ihe si aga, ka ihe ọbụla ghara ifunarị eze. 3 Ọ dịghị anya, ọ pụtara ihe nye eze na Daniel kwesiri ntụkwasị obi karịa ndịisi na ndị nlekọta ahụ niile. Nʼihi na amamihe ya, na ike ọrụ ya dị ukwuu. Nke a mere ka eze chee echiche kpebie ime ya onyeisi nʼalaeze niile. 4 Nʼihi nke a, ndịisi ọkwa ha dị elu na ndịisi ndị ọzọ bidoro chọwa mkpesa ha ga-enye iji megide Daniel nʼihe gbasara ọchịchị. Ma ọ dịghị ihe ebubo ọbụla maọbụ omume ọjọọ ọbụla ha chọpụtara, nʼihi na ọ kwesiri ntụkwasị obi. Ọ dịghịkwa omume ọjọọ maọbụ nke aghụghọ ọbụla a chọpụtara nʼọrụ ya. 5 Nʼikpeazụ, ndị ikom a sịrị, “O nweghị otu anyị ga-esi chọta ihe a ga-eji boo nwoke a bụ Daniel ebubo, karịakwa nʼihe metụtara iwu ofufe Chineke ya.” 6 Ya mere, ndịisi ndị a na ndị ozi ndị ahụ kpebiri jekwuru eze ahụ sị ya, “Eze Daraiọs, dịrịkwa ndụ ruo mgbe niile! 7 Ndịisi alaeze gị niile, ndị ukwu na ndị nta, ndị na-anọchi anya eze na ndị ndụmọdụ na ndị ị tinyere ka ha na-achị zukọtara kpebie na eze kwesiri inye iwu nke ga-ekwu na a chọghị ka onye ọbụla rịọọ ihe ọbụla nʼaka chi maọbụ nʼaka mmadụ ọbụla karịa gị eze, site nʼoge i nyere iwu a tutu iri ụbọchị atọ agafee. Onye ọbụla nupuru isi nʼiwu a ka a ga-atụba nʼolulu ọdụm. 8 Anyị chọkwara ka gị bụ eze kwagide iwu a ma jirikwa aka gị dee aha gị nʼakwụkwọ iwu ahụ. Nʼihi na anyị chọrọ ka ọ bụrụ iwu nke na-agaghị enwe mgbanwe, nke a na-apụghị ịkagbukwa akagbu, dịka iwu ndị Midia na Peshịa si dị.” 9 Ya mere, Daraiọs jiri aka ya dee aha ya nʼakwụkwọ iwu ahụ. 10 Ma mgbe Daniel maara na iwu a adịla ire, ọ banyere nʼụlọ ya, nʼelu ụlọ elu nke ebe obibi ya, o meghere oghereikuku ya chere ihu na Jerusalem. Nʼebe ahụ ka ọ na-anọ ekpe ekpere na ekele Chineke ya, ugboro atọ nʼụbọchị dịka ọ na-eme na mbụ. 11 Ndị iro ya gbakọtara hụ na Daniel na-ekpe ekpere na-arịọkwa Chineke arịrịọ. 12 Ha jekwuru eze sị ya, “I chetakwara iwu ahụ i nyere, nke sị na onye ọbụla ekwesighị ịrịọ chi ọzọ maọbụ mmadụ arịrịọ ọbụla karịa gị, tutu iri ụbọchị atọ agafee, na onye ọbụla nupuru isi nʼiwu a ka a ga-atụba nʼolulu ọdụm?”Eze sịrị, “Ya bụ iwu ka dịkwa, dịka iwu ndị Midia na Peshịa nke e nweghị ike ịkagbu akagbu.” 13 Mgbe ahụ, ha gwara eze, “Daniel, onye bụ otu nʼime ndị si Juda a dọtara nʼagha adịghị aṅa gị ntị, gị onye a na-asọpụrụ, maọbụ nye iwu ahụ i nyere bụ nke e dere nʼakwụkwọ. Ọ nọkwa na-ekpe ekpere ya ugbo atọ nʼụbọchị.” 14 Obi jọrọ eze njọ nke ukwuu mgbe ọ nụrụ ihe ndị a. O kpebiri nʼobi ya ime ihe niile ịhụ na Daniel ataghị ahụhụ. Ya mere, ụbọchị ahụ niile, site nʼụtụtụ ruo nʼanyasị, ọ nọ na-eche otu ọ ga-esi mee nke a. 15 Mgbe ahụ, ndị ikom ndị a bịakwutere eze sị ya, “Chetakwa, gị eze, na dịka iwu ndị Midia na Peshịa si dị, ọ dịghị iwu ọbụla eze nyere maọbụ ụkpụrụ nke e mere ka o guzosie ike ga-agbanwe.” 16 Nʼikpeazụ, eze nyere iwu, ha kpụpụtara Daniel tụba ya nʼolulu ọdụm. Eze gwara Daniel, “Ka Chineke gị, onye ahụ ị na-efe mgbe niile, zọpụta gị.” 17 E wetara nkume dị ukwuu jiri mechie ọnụ olulu ọdụm ahụ. Eze jikwa mgbaaka akara ya na mgbaaka ndịisi ọzọ kaa akara e ji nyachie ọnụ olulu ahụ. E mere nke a ka ọnọdụ Daniel hapụ ịgbanwe. 18 Mgbe eze lọbatara nʼụlọeze ya, o dinara nʼihe ndina ya buo ọnụ, onweghịkwa nri ebutere ya. Nʼabalị ahụ, o nweghị ike rahụ ụra. 19 Nʼìhè mbụ nke ụtụtụ, mgbe chị na-abọ, eze biliri mee ngwangwa, gaa nʼolulu ọdụm ahụ. 20 Mgbe ọ bịaruru nso olulu ahụ, ọ kpọrọ Daniel oku nʼolu obi ntiwa sị, “Daniel, ohu Chineke dị ndụ, Chineke gị ahụ ị na-efe mgbe niile, o nwekwara ike ịzọpụta gị nʼaka ọdụm?” 21 Ya mere, Daniel sịrị eze, “Eze, dịrị ndụ ruo mgbe niile! 22 Chineke m zitere mmụọ ozi ka o mechie ọnụ ọdụm ndị a, ka ha si otu a hapụ inwe ike ịmetụ m aka, nʼihi na Chineke maara na aka m dị ọcha. Ọ makwaara na o nweghị ihe ọbụla m mere mejọọ gị.” 23 Ọṅụ juru eze ahụ obi! O nyere iwu ka e si nʼime olulu ahụ dọpụta Daniel. Mgbe a kpọpụtara Daniel, o nweghị ihe ọbụla a hụrụ mere ya nʼahụ, nʼihi na ọ tụkwasịrị Chineke ya obi. 24 Mgbe ahụ, eze nyere iwu ka e jide ndị ahụ boro Daniel ebubo. O nyere iwu ka a tụnye ha nʼolulu ọdụm ahụ, ha na ndị nwunye ha na ụmụ ha. Ọdụm ndị ahụ dị nʼime olulu ahụ jidere ndị ahụ dọrie ma ọkpụkpụ ha tupu ha adaruo ala. 25 Emesịa, eze Daraiọs depụtara ozi a nʼakwụkwọ nye iwu ka a gụọra ya mmadụ niile, mba niile na asụsụ niile dị iche iche nʼelu ụwa.“Ka ọ dịrị unu na mma. 26 “Ana m enye iwu na mmadụ niile nọ nʼalaeze m kwesiri ịtụ egwu na ịma jijiji nʼihu Chineke nke Daniel.“Nʼihi na ọ bụ Chineke dị ndụ,nke na-adịgide ebighị ebi.E nweghị ike ịla alaeze ya nʼiyi,ọ bụkwa onye ọchịchị ya na-enweghị ọgwụgwụ. 27 Ọ na-agbapụta ndị ya, na-azọpụtakwa.Ọ na-eme ihe ịrịbama na-arụkwa ọrụ ebubenʼeluigwe na nʼụwa.Nʼihi na ọ gbapụtara Danielsite nʼike ọdụm.” 28 Ya mere, ihe gaara Daniel nke ọma nʼoge niile Daraiọs bụ eze, na nʼoge Sairọs onye Peshịa chịkwara dịka eze.

In Other Versions

Daniel 6 in the ANGEFD

Daniel 6 in the ANTPNG2D

Daniel 6 in the AS21

Daniel 6 in the BAGH

Daniel 6 in the BBPNG

Daniel 6 in the BBT1E

Daniel 6 in the BDS

Daniel 6 in the BEV

Daniel 6 in the BHAD

Daniel 6 in the BIB

Daniel 6 in the BLPT

Daniel 6 in the BNT

Daniel 6 in the BNTABOOT

Daniel 6 in the BNTLV

Daniel 6 in the BOATCB

Daniel 6 in the BOATCB2

Daniel 6 in the BOBCV

Daniel 6 in the BOCNT

Daniel 6 in the BOECS

Daniel 6 in the BOGWICC

Daniel 6 in the BOHCB

Daniel 6 in the BOHCV

Daniel 6 in the BOHLNT

Daniel 6 in the BOHNTLTAL

Daniel 6 in the BOILNTAP

Daniel 6 in the BOITCV

Daniel 6 in the BOKCV

Daniel 6 in the BOKCV2

Daniel 6 in the BOKHWOG

Daniel 6 in the BOKSSV

Daniel 6 in the BOLCB

Daniel 6 in the BOLCB2

Daniel 6 in the BOMCV

Daniel 6 in the BONAV

Daniel 6 in the BONCB

Daniel 6 in the BONLT

Daniel 6 in the BONUT2

Daniel 6 in the BOPLNT

Daniel 6 in the BOSCB

Daniel 6 in the BOSNC

Daniel 6 in the BOTLNT

Daniel 6 in the BOVCB

Daniel 6 in the BOYCB

Daniel 6 in the BPBB

Daniel 6 in the BPH

Daniel 6 in the BSB

Daniel 6 in the CCB

Daniel 6 in the CUV

Daniel 6 in the CUVS

Daniel 6 in the DBT

Daniel 6 in the DGDNT

Daniel 6 in the DHNT

Daniel 6 in the DNT

Daniel 6 in the ELBE

Daniel 6 in the EMTV

Daniel 6 in the ESV

Daniel 6 in the FBV

Daniel 6 in the FEB

Daniel 6 in the GGMNT

Daniel 6 in the GNT

Daniel 6 in the HARY

Daniel 6 in the HNT

Daniel 6 in the IRVA

Daniel 6 in the IRVB

Daniel 6 in the IRVG

Daniel 6 in the IRVH

Daniel 6 in the IRVK

Daniel 6 in the IRVM

Daniel 6 in the IRVM2

Daniel 6 in the IRVO

Daniel 6 in the IRVP

Daniel 6 in the IRVT

Daniel 6 in the IRVT2

Daniel 6 in the IRVU

Daniel 6 in the ISVN

Daniel 6 in the JSNT

Daniel 6 in the KAPI

Daniel 6 in the KBT1ETNIK

Daniel 6 in the KBV

Daniel 6 in the KJV

Daniel 6 in the KNFD

Daniel 6 in the LBA

Daniel 6 in the LBLA

Daniel 6 in the LNT

Daniel 6 in the LSV

Daniel 6 in the MAAL

Daniel 6 in the MBV

Daniel 6 in the MBV2

Daniel 6 in the MHNT

Daniel 6 in the MKNFD

Daniel 6 in the MNG

Daniel 6 in the MNT

Daniel 6 in the MNT2

Daniel 6 in the MRS1T

Daniel 6 in the NAA

Daniel 6 in the NASB

Daniel 6 in the NBLA

Daniel 6 in the NBS

Daniel 6 in the NBVTP

Daniel 6 in the NET2

Daniel 6 in the NIV11

Daniel 6 in the NNT

Daniel 6 in the NNT2

Daniel 6 in the NNT3

Daniel 6 in the PDDPT

Daniel 6 in the PFNT

Daniel 6 in the RMNT

Daniel 6 in the SBIAS

Daniel 6 in the SBIBS

Daniel 6 in the SBIBS2

Daniel 6 in the SBICS

Daniel 6 in the SBIDS

Daniel 6 in the SBIGS

Daniel 6 in the SBIHS

Daniel 6 in the SBIIS

Daniel 6 in the SBIIS2

Daniel 6 in the SBIIS3

Daniel 6 in the SBIKS

Daniel 6 in the SBIKS2

Daniel 6 in the SBIMS

Daniel 6 in the SBIOS

Daniel 6 in the SBIPS

Daniel 6 in the SBISS

Daniel 6 in the SBITS

Daniel 6 in the SBITS2

Daniel 6 in the SBITS3

Daniel 6 in the SBITS4

Daniel 6 in the SBIUS

Daniel 6 in the SBIVS

Daniel 6 in the SBT

Daniel 6 in the SBT1E

Daniel 6 in the SCHL

Daniel 6 in the SNT

Daniel 6 in the SUSU

Daniel 6 in the SUSU2

Daniel 6 in the SYNO

Daniel 6 in the TBIAOTANT

Daniel 6 in the TBT1E

Daniel 6 in the TBT1E2

Daniel 6 in the TFTIP

Daniel 6 in the TFTU

Daniel 6 in the TGNTATF3T

Daniel 6 in the THAI

Daniel 6 in the TNFD

Daniel 6 in the TNT

Daniel 6 in the TNTIK

Daniel 6 in the TNTIL

Daniel 6 in the TNTIN

Daniel 6 in the TNTIP

Daniel 6 in the TNTIZ

Daniel 6 in the TOMA

Daniel 6 in the TTENT

Daniel 6 in the UBG

Daniel 6 in the UGV

Daniel 6 in the UGV2

Daniel 6 in the UGV3

Daniel 6 in the VBL

Daniel 6 in the VDCC

Daniel 6 in the YALU

Daniel 6 in the YAPE

Daniel 6 in the YBVTP

Daniel 6 in the ZBP