Deuteronomy 28 (BOICB)

1 Ọ bụrụ na i debezuo ma gbasookwa iwu ndị a niile ONYENWE ANYỊ Chineke gị sitere nʼaka m na-enye gị taa, ONYENWE ANYỊ Chineke gị ga-eme ka ị ghọọ mba kachasị mba niile nʼụwa elu. 2 Ngọzị ndị a niile ga-abịakwasị gị, zuo gị ahụ, ma ọ bụrụ na i rubere ONYENWE ANYỊ Chineke gị isi. 3 Onye a gọziri agọzi ka ị ga-abụ nʼobodo, bụrụkwa onye a gọziri agọzi nʼala ubi. 4 Ihe a gọziri agọzi ka mkpụrụ nke afọ gị ga-abụ na mkpụrụ nke ala ubi gị na mkpụrụ nke anụ ụlọ gị, ụmụ ehi gị mụrụ na ụmụ igwe ewu na atụrụ gị. 5 Ihe a gọziri agọzi ka abọ gị na ihe i ji agwọ achịcha ga-abụ. 6 Onye a gọziri agọzi ka ị ga-abụ mgbe ị na-abata na mgbe ị na-apụ apụ. 7 ONYENWE ANYỊ ga-eme ka ndị iro ọbụla buliri onwe ha elu imegide gị bụrụ ndị e meriri nʼihu anya gị. Ha ga-esite nʼotu ụzọ buso gị agha, ma ha ga-esite nʼụzọ asaa si nʼihu gị gbalaga. 8 ONYENWE ANYỊ ga-ezipụ ngọzị ya ka ọ dịkwasị nʼelu ọba gị na nʼelu ihe ọbụla i tinyere aka gị. ONYENWE ANYỊ Chineke gị ga-agọzi gị nʼala ahụ ọ na-enye gị. 9 ONYENWE ANYỊ ga-eme ka i guzosie ike dịka ndị nsọ ya, dịka o sitere nʼịṅụ iyi kwee nkwa ime ma ọ bụrụ na i debe iwu ONYENWE ANYỊ Chineke gị, ma jee ije nʼụzọ ya niile. 10 Mgbe ahụ, ndị niile nọ nʼụwa ga-ahụta na ọ bụ aha ONYENWE ANYỊ ka a kpọkwasịrị gị. Ha ga-atụkwa gị egwu. 11 ONYENWE ANYỊ ga-eme ka ị babiga ụba oke na mkpụrụ nke afọ gị, na mkpụrụ nke anụ ụlọ gị, na mkpụrụ nke ihe ubi gị, nʼala ahụ ọ ṅụrụ nʼiyi nye nna nna gị na ọ ga-enye gị. 12 ONYENWE ANYỊ ga-emeghepụ eluigwe ebe ụlọakụ ya dị, zidata mmiri nʼala gị nʼoge ya, ma gọzie akaọrụ gị niile. Ị ga-agbazinye ọtụtụ mba ihe, ma gị onwe gị agaghị esite nʼaka onye ọbụla gbaziri ihe ọbụla. 13 ONYENWE ANYỊ ga-eme ka ị bụrụ isi, ọ bụghị ọdụdụ. Ọ bụrụ na ị ṅaa ntị nʼiwu ndị a ONYENWE ANYỊ Chineke gị na-enye gị taa, lezie anya ịgbaso ha, ị ga-anọgide nʼelu, ị gaghị anọ nʼokpuru. 14 Ewezugala onwe gị site nʼiwu niile ndị a m na-enye gị taa, maọbụ gaa nʼaka nri maọbụ nʼaka ekpe, ịgbaso chi ndị ọzọ na ife ha ofufe. 15 Ma otu ọ dị, ọ bụrụ na ị jụ irubere ONYENWE ANYỊ Chineke gị isi, jụkwa ilezi anya, gbasoo iwu ya na ụkpụrụ ya niile, nke m na-enye gị taa, ọbụbụ ọnụ ndị a ga-adakwasị gị. 16 Ị ga-abụ onye a bụrụ ọnụ nʼobodo, bụrụ onye a bụrụ ọnụ nʼala ubi, 17 Abọ gị na ihe ịgwọ achịcha gị ga-abụ ihe a bụrụ ọnụ. 18 Ihe a bụrụ ọnụ ka mkpụrụ nke afọ gị ga-abụ, ihe a bụrụ ọnụ ka mkpụrụ nke ala gị ga-abụ, ya na ụmụ nke igwe anụ ụlọ gị, na ụmụ ehi gị na nke igwe ewu na atụrụ gị mụrụ. 19 Onye a bụrụ ọnụ ka ị ga-abụ mgbe ị na-abata abata na mgbe ị na-apụ apụ. 20 ONYENWE ANYỊ ga-ezidata nʼisi gị ọbụbụ ọnụ, na ọgbaaghara, tinyere nkọcha nʼihe niile nke i tinyere aka gị, tutu ruo mgbe ị ghọrọ onye e bibiri ebibi bụrụ onye lara nʼiyi na mberede, nʼihi ihe ọjọọ niile i mere site nʼịhapụ m. 21 ONYENWE ANYỊ ga-ezite ajọ ọrịa nʼetiti gị tutu ruo mgbe a ga-ekpochapụ gị site nʼala ahụ ị gaje ịba nʼime ya inweta. 22 ONYENWE ANYỊ ga-eti unu ọrịa na-eripịa eripịa, ahụ ọkụ na ọrịa na-aza anụ ahụ, oke okpomọkụ na mma agha, ụkọ mmiri ozuzo na ọrịa na-eripịa ihe ubi, na ọmụma ebu ga-abịakwasị gị tutu ruo mgbe i lara nʼiyi. 23 Mbara eluigwe nke ị na-ahụ anya ga-aghọ bronz, ala ị na-azọkwasị ụkwụ gị ga-aghọ igwe. 24 ONYENWE ANYỊ ga-eme ka mmiri kwesiri izo nʼala gị ghọọ uzuzu na aja. Ha ga-esi na mbara eluigwe na-ezodata nʼala tutu ruo mgbe ị lara nʼiyi. 25 ONYENWE ANYỊ ga-eme ka ndị iro gị merie gị nʼagha. Ị ga-esi otu ụzọ pụta ibuso ha agha, ma ị ga-esi ụzọ asaa gbalaga. Ị ga-aghọrọ ndị ụwa ihe a na-asọ oyi mgbe ha hụrụ ihe dakwasịrị gị. 26 Ozu unu ga-aghọrọ ụmụ anụ ufe niile na anụ ọhịa niile ihe oriri. O nwekwaghị onye ga-anọ menye ha egwu chụpụ ha. 27 ONYENWE ANYỊ ga-ezite etuto ndị Ijipt ka ha bịakwasị gị, ya na ọnya, na agba, na ọkọ. Ọ dịkwaghị ihe a ga-eji gwọọ ha. 28 ONYENWE ANYỊ ga-ezitere gị isi mgbaka, na ikpu ìsì, na ọgbaaghara nke obi. 29 Ị ga-asọgharị isi nʼetiti ehihie dịka onye kpuru ìsì nʼasọgharị nʼọchịchịrị. Ọ dịghị ihe ọbụla ga-agara gị nke ọma. Site nʼụbọchị ruo nʼụbọchị, ị ga-abụ onye a na-emegbu emegbu, na onye a na-anapụ ihe ya nʼike oge niile, na-enweghị onye ga-anapụta gị. 30 Gị na nwanyị ga-enwe nkwekọrịta ịlụ di na nwunye, ma nwoke ọzọ ga-eduru ya dinaa ya nʼike. Ị ga-ewu ụlọ ma ị gaghị ebi nʼime ya. Ị ga-akụ ubi vaịnị ma ị gaghị eri mkpụrụ si na ya. 31 Nʼihu anya gị ka a ga-egbu ehi gị, ma ị gaghị ata iberibe anụ ya. A ga-anapụ gị ịnyịnya ibu gị nʼihu anya gị ma a gaghị eweghachiri gị ya. Atụrụ gị ka a ga-enye ndị iro gị. Ọ dịkwaghị onye ga-anapụta ha. 32 A ga-ewere ụmụ gị ndị ikom na ndị inyom nye ndị mba ọzọ. Ọ ga-agụ gị agụụ ogologo oge ka ị hụ ha anya, ma ị pụghị inyere ha aka. 33 Mba nke ị na-amaghị ga-eri mkpụrụ ubi ị tara ahụhụ kụọ nʼala gị. Ị ga-abụ naanị onye a na-emegbu emegbu na onye a na-akpagbu ụbọchị ndụ gị niile. 34 Ihe ndị a niile ị ga-eji anya gị hụ ga-eme ka i nwe isi mgbaka. 35 ONYENWE ANYỊ ga-eme ka etuto nke na-egbu oke mgbu a na-apụghị ịgwọta agwọta too gị nʼikpere na ogwe ụkwụ gị abụọ, ọ ga-agbasa site nʼọbọ ụkwụ gị abụọ ruo nʼopi isi gị. 36 ONYENWE ANYỊ ga-achụpụ gị na eze ahụ ị họpụtara nye onwe gị, chụpụ gị nye mba ọzọ, ebe gị na nna nna gị ha, na-amaghị. Nʼebe ahụ, ị ga-efe chi ndị ọzọ nke e ji osisi na nkume kpụọ. 37 Ị ga-abụ ihe iju anya, na ihe e ji atụ ilu, na ihe akụkọ, nʼetiti mba ahụ niile ONYENWE ANYỊ ga-achụga gị. 38 Ị ga-akụ ọtụtụ mkpụrụ nʼubi ma ị ga-aghọta ntakịrị mkpụrụ, nʼihi na igurube ga-ericha ihe ị kụrụ nʼubi. 39 Ị ga-akọ ubi vaịnị lekọtakwa ya anya, ma ị gaghị aracha mkpụrụ ya maọbụ ṅụọ mmanya si na ya, nʼihi na ikpuru ga-eri ha. 40 Osisi oliv ga na-eto ebe niile, ma mmanụ oliv agaghị adị nke ị ga-ete nʼahụ nʼihi na mkpụrụ oliv ga-adasịsị na-akaghị aka oge ha mara ifuru. 41 Ị ga-amụta ụmụ ndị ikom na ndị inyom ma ha agaghị adịgide nʼihi na a ga-adọta ha nʼagha. 42 Igwe igurube ga-erichasị osisi niile dị nʼubi gị, ya na ihe ị kụrụ nʼubi gị. 43 Onye ọbịa bi nʼetiti gị ga-aba ụba karịa gị. Ihe ga na-agara ya nke ọma, ma ihe ga na-ajọrọ gị njọ. 44 Ọ ga-ebinye gị ihe, ọ bụkwaghị gị ga-ebinye ya! Ọ ga-abụ isi ma ị ga-abụ ọdụdụ. 45 Ọbụbụ ọnụ ndị a niile ga-abịakwasị gị. Ha ga-achụso gị ọsọ, chụkwute gị tutu ruo mgbe a lara gị nʼiyi, naanị nʼihi na ị jụrụ irubere ONYENWE ANYỊ Chineke gị isi, na idebe iwu na ụkpụrụ ndị a o nyere gị. 46 Ha ga-abụ ihe ịrịbama na ihe ebube nye gị, na mkpụrụ gị niile, ruo mgbe ebighị ebi. 47 Nʼihi na ị jụrụ iji ọṅụ na obi ụtọ fee ONYENWE ANYỊ Chineke gị nʼoge ihe na-agara gị nke ọma. 48 Ya mere, nʼọnọdụ agụụ na akpịrị ịkpọ nkụ, nʼọnọdụ ịgba ọtọ na ụkọ ka ị ga-efe ndị iro ahụ ONYENWE ANYỊ na-ezite imegide gị. Ọ ga-anyakwasị yoku igwe nʼolu gị ruo mgbe ọ lara gị nʼiyi. 49 ONYENWE ANYỊ ga-eme ka mba si nʼebe dị anya na nsọtụ ụwa, bịakwasị gị, imegide gị. Mba a ga-adị gara gara dịka ugo, ọ ga-abụkwa mba ị na-amaghị asụsụ ha, 50 Mba na-enweghị ihu ọchị nke na-adịghị asọpụrụ okenye maọbụ were ihuọma leta ụmụntakịrị. 51 Ha ga-erichapụ mkpụrụ nke anụ ụlọ gị niile na mkpụrụ nke ihe ubi gị niile tutu ruo mgbe ị ghọrọ ihe e bibiri ebibi. O nwekwaghị ihe ga-afọdụrụ gị, maọbụ ọka, maọbụ mmanya ọhụrụ maọbụ mmanụ oliv, maọbụ ụmụ ehi maọbụ ewu na atụrụ gị mụrụ, ruo mgbe e mere ka ị laa nʼiyi. 52 Mba ahụ ga-anọchigide obodo ndị ahụ niile dị nʼala gị tutu ruo mgbe mgbidi ndị ahụ niile e wusiri ike, nke ị na-atụkwasị obi dara. Ọ ga-anọchigide ndị ahụ niile dị nʼala ahụ niile ONYENWE ANYỊ Chineke gị na-enye gị. 53 Ị ga-erikwa anụ ahụ ụmụ gị ndị ikom na ndị inyom ndị ONYENWE ANYỊ Chineke gị nyere gị nʼihi oke nnọchigide nke ndị agha nọchigidere gị na nʼihi oke mkpagbu nke ndị iro. 54 Ọ bụladị nwoke ahụ dịkasịrịrị nwayọọ na-enwekwa mmetụta mmadụ nʼetiti unu ga-aghọ onye afọ tara mmiri nke ukwuu megide nwanne ya nwoke, maọbụ nwunye nke ọ hụrụ nʼanya, maọbụ ụmụ ya, ndị ka dị ndụ. 55 Ọ gaghị enye onye ọbụla nʼime ha ụfọdụ nʼime anụ ahụ ụmụ ndị ọ na-eri, nʼihi na ọ bụ naanị ya bụ ihe oriri fọdụrụ ya, nʼihi ahụhụ nke nnọchi ndị iro nọchiri ọnụ ụzọ obodo gị niile butere. 56 Nwanyị nke dịkarịsịrị nwayọọ na-enwekwa mmetụta mmadụ nʼetiti unu, nke dị oke nwayọọ, nke ihe na-emetụta na ọ dịghị amasị ya ịzọgịdesị ọbụ ụkwụ ya ike nʼala, ga-ajụ ikenye di ya ọ hụrụ nʼanya, nwa ya nwoke maọbụ nwa ya nwanyị, 57 ọ bụladị akpanwa si nʼetiti ụkwụ ya pụta na ụmụ ọhụrụ ọ mụrụ. Nʼọnọdụ ọjọọ nʼoke ụkọ ya, ọ chọrọ iri ha na nzuzo, nʼihi ahụhụ nke ndị iro gị mere ka ọ bịakwasị gị nʼoge nnọchigide nke obodo gị niile. 58 Ọ bụrụ na i lezighị anya gbasoo okwu iwu niile e dere nʼime akwụkwọ a, ọ bụrụ na ị sọpụrụghị aha a dị ebube na nke dị egwu, bụ ONYENWE ANYỊ Chineke gị, 59 ONYENWE ANYỊ ga-ezitere gị na ụmụ ụmụ gị ihe otiti dị oke egwu, oke mbibi nke ga-adị ogologo oge, na ọrịa dị oke njọ nke na-adịghị ala ala. 60 Ọ ga-ezitere gị ọrịa ndị ahụ niile dị nʼIjipt, nke ị na-atụ ụjọ ha, ha ga-arapara gị nʼahụ. 61 Ọ bụghị naanị nke a! ONYENWE ANYỊ ga-eme ka ụdị ọrịa ọbụla, na ụdị ihe otiti ọbụla, ọ bụladị ndị na-adịghị nʼime Akwụkwọ Iwu a, bịakwasị gị, tutu ruo mgbe a ga-ekpochapụ gị. 62 Ọ bụ ezie na ị dị ukwuu nʼọnụọgụgụ dịka kpakpando nke eluigwe, maọbụ naanị mmadụ ole na ole nʼime gị ga-afọdụ. Ihe ndị a niile ga-emezu nʼihi na i geghị ntị nʼolu ONYENWE ANYỊ bụ Chineke gị. 63 Dịka mmụba ị mụbara nʼọnụọgụgụ, na ịdị ukwuu nke akụnụba gị si bụrụ ihe nyere ONYENWE ANYỊ obi ụtọ, otu a ka ọ ga-esi tọkwaa ya ụtọ ibibi gị, na ime ka ị daa ụkpa. Ọ ga-esi nʼala ahụ ị na-aga inweta hopu gị. 64 Nʼihi na ONYENWE ANYỊ ga-eme ka ị gbasasịa nʼetiti mba niile, site nʼotu nsọtụ ụwa ruo na nsọtụ nke ọzọ. Nʼebe ahụ, ị ga-efekwa chi ndị ọzọ, nke gị, maọbụ nna nna gị ha, na-amaghị, chi e ji osisi na nkume kpụọ. 65 Nʼetiti mba ndị a, obi agaghị eru gị ala, ọbụ ụkwụ gị agaghị enwe ebe izuike. Nʼebe ahụ, ONYENWE ANYỊ ga-enye gị mkpụrụobi na-ama jijiji, anya nke ike gwụrụ nʼihi enweghị olileanya, na obi na-ada mba. 66 Ndụ gị ga-ekonye nʼelu nʼihi oke egwu. Ị ga-anọ nʼegwu, ehihie na abalị, ị gaghị ejikwa ndụ gị nʼaka. 67 Nʼụtụtụ, ị ga-asị, “Ewoo, a sịkwa na ugbu a bụ uhuruchi!” Nʼuhuruchi ị ga-asịkwa, “Ewoo, a sịkwarị na ugbu a bụ ụtụtụ!” Ị ga-ekwu ihe ndị a nʼihi ihe egwu juru gị obi, na nʼihi ihe ndị ahụ niile anya gị na-ahụ. 68 ONYENWE ANYỊ ga-eme ka i soro ụgbọ mmiri lọghachi nʼIjipt, nʼije ahụ m kwuru na ị gaghị ejekwa ọzọ. Nʼebe ahụ ị ga-ewere onwe gị resi ndị iro gị dịka ohu ndị ikom maọbụ ndị inyom, ma ọ dịghị onye ga-achọ ịzụ gị.

In Other Versions

Deuteronomy 28 in the ANGEFD

Deuteronomy 28 in the ANTPNG2D

Deuteronomy 28 in the AS21

Deuteronomy 28 in the BAGH

Deuteronomy 28 in the BBPNG

Deuteronomy 28 in the BBT1E

Deuteronomy 28 in the BDS

Deuteronomy 28 in the BEV

Deuteronomy 28 in the BHAD

Deuteronomy 28 in the BIB

Deuteronomy 28 in the BLPT

Deuteronomy 28 in the BNT

Deuteronomy 28 in the BNTABOOT

Deuteronomy 28 in the BNTLV

Deuteronomy 28 in the BOATCB

Deuteronomy 28 in the BOATCB2

Deuteronomy 28 in the BOBCV

Deuteronomy 28 in the BOCNT

Deuteronomy 28 in the BOECS

Deuteronomy 28 in the BOGWICC

Deuteronomy 28 in the BOHCB

Deuteronomy 28 in the BOHCV

Deuteronomy 28 in the BOHLNT

Deuteronomy 28 in the BOHNTLTAL

Deuteronomy 28 in the BOILNTAP

Deuteronomy 28 in the BOITCV

Deuteronomy 28 in the BOKCV

Deuteronomy 28 in the BOKCV2

Deuteronomy 28 in the BOKHWOG

Deuteronomy 28 in the BOKSSV

Deuteronomy 28 in the BOLCB

Deuteronomy 28 in the BOLCB2

Deuteronomy 28 in the BOMCV

Deuteronomy 28 in the BONAV

Deuteronomy 28 in the BONCB

Deuteronomy 28 in the BONLT

Deuteronomy 28 in the BONUT2

Deuteronomy 28 in the BOPLNT

Deuteronomy 28 in the BOSCB

Deuteronomy 28 in the BOSNC

Deuteronomy 28 in the BOTLNT

Deuteronomy 28 in the BOVCB

Deuteronomy 28 in the BOYCB

Deuteronomy 28 in the BPBB

Deuteronomy 28 in the BPH

Deuteronomy 28 in the BSB

Deuteronomy 28 in the CCB

Deuteronomy 28 in the CUV

Deuteronomy 28 in the CUVS

Deuteronomy 28 in the DBT

Deuteronomy 28 in the DGDNT

Deuteronomy 28 in the DHNT

Deuteronomy 28 in the DNT

Deuteronomy 28 in the ELBE

Deuteronomy 28 in the EMTV

Deuteronomy 28 in the ESV

Deuteronomy 28 in the FBV

Deuteronomy 28 in the FEB

Deuteronomy 28 in the GGMNT

Deuteronomy 28 in the GNT

Deuteronomy 28 in the HARY

Deuteronomy 28 in the HNT

Deuteronomy 28 in the IRVA

Deuteronomy 28 in the IRVB

Deuteronomy 28 in the IRVG

Deuteronomy 28 in the IRVH

Deuteronomy 28 in the IRVK

Deuteronomy 28 in the IRVM

Deuteronomy 28 in the IRVM2

Deuteronomy 28 in the IRVO

Deuteronomy 28 in the IRVP

Deuteronomy 28 in the IRVT

Deuteronomy 28 in the IRVT2

Deuteronomy 28 in the IRVU

Deuteronomy 28 in the ISVN

Deuteronomy 28 in the JSNT

Deuteronomy 28 in the KAPI

Deuteronomy 28 in the KBT1ETNIK

Deuteronomy 28 in the KBV

Deuteronomy 28 in the KJV

Deuteronomy 28 in the KNFD

Deuteronomy 28 in the LBA

Deuteronomy 28 in the LBLA

Deuteronomy 28 in the LNT

Deuteronomy 28 in the LSV

Deuteronomy 28 in the MAAL

Deuteronomy 28 in the MBV

Deuteronomy 28 in the MBV2

Deuteronomy 28 in the MHNT

Deuteronomy 28 in the MKNFD

Deuteronomy 28 in the MNG

Deuteronomy 28 in the MNT

Deuteronomy 28 in the MNT2

Deuteronomy 28 in the MRS1T

Deuteronomy 28 in the NAA

Deuteronomy 28 in the NASB

Deuteronomy 28 in the NBLA

Deuteronomy 28 in the NBS

Deuteronomy 28 in the NBVTP

Deuteronomy 28 in the NET2

Deuteronomy 28 in the NIV11

Deuteronomy 28 in the NNT

Deuteronomy 28 in the NNT2

Deuteronomy 28 in the NNT3

Deuteronomy 28 in the PDDPT

Deuteronomy 28 in the PFNT

Deuteronomy 28 in the RMNT

Deuteronomy 28 in the SBIAS

Deuteronomy 28 in the SBIBS

Deuteronomy 28 in the SBIBS2

Deuteronomy 28 in the SBICS

Deuteronomy 28 in the SBIDS

Deuteronomy 28 in the SBIGS

Deuteronomy 28 in the SBIHS

Deuteronomy 28 in the SBIIS

Deuteronomy 28 in the SBIIS2

Deuteronomy 28 in the SBIIS3

Deuteronomy 28 in the SBIKS

Deuteronomy 28 in the SBIKS2

Deuteronomy 28 in the SBIMS

Deuteronomy 28 in the SBIOS

Deuteronomy 28 in the SBIPS

Deuteronomy 28 in the SBISS

Deuteronomy 28 in the SBITS

Deuteronomy 28 in the SBITS2

Deuteronomy 28 in the SBITS3

Deuteronomy 28 in the SBITS4

Deuteronomy 28 in the SBIUS

Deuteronomy 28 in the SBIVS

Deuteronomy 28 in the SBT

Deuteronomy 28 in the SBT1E

Deuteronomy 28 in the SCHL

Deuteronomy 28 in the SNT

Deuteronomy 28 in the SUSU

Deuteronomy 28 in the SUSU2

Deuteronomy 28 in the SYNO

Deuteronomy 28 in the TBIAOTANT

Deuteronomy 28 in the TBT1E

Deuteronomy 28 in the TBT1E2

Deuteronomy 28 in the TFTIP

Deuteronomy 28 in the TFTU

Deuteronomy 28 in the TGNTATF3T

Deuteronomy 28 in the THAI

Deuteronomy 28 in the TNFD

Deuteronomy 28 in the TNT

Deuteronomy 28 in the TNTIK

Deuteronomy 28 in the TNTIL

Deuteronomy 28 in the TNTIN

Deuteronomy 28 in the TNTIP

Deuteronomy 28 in the TNTIZ

Deuteronomy 28 in the TOMA

Deuteronomy 28 in the TTENT

Deuteronomy 28 in the UBG

Deuteronomy 28 in the UGV

Deuteronomy 28 in the UGV2

Deuteronomy 28 in the UGV3

Deuteronomy 28 in the VBL

Deuteronomy 28 in the VDCC

Deuteronomy 28 in the YALU

Deuteronomy 28 in the YAPE

Deuteronomy 28 in the YBVTP

Deuteronomy 28 in the ZBP