Deuteronomy 31 (BOICB)

1 Mgbe Mosis gwachara ụmụ Izrel okwu ndị a niile, 2 ọ gwakwara ha okwu ọzọ sị, “Ugbu a, agbaala m otu narị afọ na iri afọ abụọ! Enwekwaghị m ike idu unu, nʼihi na ONYENWE ANYỊ agwala m sị, Ị gaghị agafe osimiri Jọdan. 3 ONYENWE ANYỊ Chineke gị nʼonwe ya ga-ebu gị ụzọ gabiga osimiri a. Ọ ga-ebibi mba niile ndị a nʼihu gị. Ị ga-enwetakwa ala ha. Joshua ga-edu gị gabiga osimiri a, dịka ONYENWE ANYỊ kwuru. 4 ONYENWE ANYỊ ga-emekwa ha ihe o mere Saịhọn na Ọg, bụ eze ndị Amọrait, ndị o kpochapụrụ ha na ala ha. 5 ONYENWE ANYỊ ga-enyefe ndị bi nʼebe ahụ nʼaka unu, unu ga-ekpochapụkwa ha dịka m nyere unu nʼiwu. 6 Dịnụ ike! Nweenụ obi ike! Unu atụla ha egwu! Nʼihi na ONYENWE ANYỊ Chineke unu ga-anọnyere unu. Ọ gaghị agbakụta unu azụ, ọ gakwaghị ahapụ unu.” 7 Mgbe ahụ, Mosis kpọrọ Joshua, gwa ya okwu nʼihu ụmụ Izrel, sị ya, “Dị ike! Nwee obi ike! Nʼihi na ọ bụ gị ga-edu ndị a baa nʼala ahụ ONYENWE ANYỊ ṅụrụ iyi inye nna nna ha, ị ga-emekwa ka ha keta ala a dịka ihe nketa ha. 8 ONYENWE ANYỊ nʼonwe ya ga-eburu gị ụzọ, ọ ga-anọnyekwara gị, ọ gaghị ahapụ gị maọbụ gbakụta gị azụ. Atụla egwu, adala mba.” 9 Mgbe ahụ, Mosis depụtara iwu ndị ahụ niile nʼakwụkwọ, were ya nye ndị nchụaja, ụmụ Livayị, ndị na-ebu igbe ọgbụgba ndụ ONYENWE ANYỊ ahụ. Mosis nyekwara ndị okenye Izrel akwụkwọ a e dere iwu niile. 10 Mgbe ahụ, Mosis nyere ha iwu sị, “Na ngwụcha afọ asaa ọbụla, nʼafọ ahụ a na-akagbu ụgwọ niile, nʼoge a na-eme Mmemme ụlọ Ikwu, 11 mgbe Izrel niile ga-abịa nʼihu ONYENWE ANYỊ bụ Chineke unu, nʼebe ahụ ọ ga-ahọpụta, ị ga-agụpụta ihe a site nʼakwụkwọ iwu a nʼihu mmadụ niile ka ha nụrụ ya. 12 Kpọkọta mmadụ niile nʼotu ebe, ndị ikom, na ndị inyom na ụmụntakịrị, na ndị ọbịa bi nʼetiti obodo unu, ka ha nụrụ, ma mụta ịtụ egwu ONYENWE ANYỊ Chineke unu na ilezi anya ịgbaso okwu niile dị nʼiwu a. 13 Ụmụntakịrị ha, ndị na-amabeghị iwu ndị a, aghaghị ịnụ na ịmụta ịtụ egwu ONYENWE ANYỊ Chineke unu, ụbọchị ndụ unu niile nʼala ahụ unu na-agafe Jọdan inweta.” 14 ONYENWE ANYỊ gwara Mosis sị, “Lee, ụbọchị ọnwụ gị na-abịaru nso. Kpọrọ Joshua ka gị na ya soro bịa nʼụlọ nzute ebe m ga-anọ nye ya ọrụ ọ ga-arụ.” Mosis na Joshua sooro bịa guzo onwe ha nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute. 15 Mgbe ahụ, ONYENWE ANYỊ gosiri ha onwe ya nʼime ogidi igwe ojii nke guzochiri ọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ. 16 ONYENWE ANYỊ gwara Mosis okwu sị, “Ị ga-anwụ, jekwuru nna nna gị ha. Mgbe ị nwụrụ, ndị a ga-amalite ife chi ọzọ ofufe ndị dị nʼala ahụ ha na-abanye. Ha ga-agbakụta m azụ, mebie ọgbụgba ndụ mụ na ha gbara. 17 Nʼụbọchị ahụ, iwe m ga-adị ọkụ megide ha, aga m agbakụta ha azụ, zoo ihu m nʼebe ha nọ. A ga-alakwa ha nʼiyi. Ọdachi na ahụhụ dị iche iche ga-abịakwasị ha, nke ga-eme ka ha sị, ‘Chineke anyị anọkwaghị nʼetiti anyị, ọ bụ ya mere ọdachi ndị a ji bịakwasị anyị.’ 18 Aga m echepụ ihu m site nʼebe ha nọ nʼụbọchị ahụ, nʼihi ajọ omume ha nke ife chi ọzọ ofufe. 19 “Ugbu a, depụtaranụ onwe unu abụ a nʼakwụkwọ, kuziekwara ya ụmụ Izrel, ka ọ bụrụ ihe akaebe m megide ha. 20 Mgbe m mere ka ha bata nʼala ahụ m kwere nna nna ha na nkwa, ala ahụ mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-erugharị nʼime ya, mgbe ha rijukwara afọ, baakwa ụba, ha ga-ebido ife chi ọzọ ofufe, jụ m, ma mebikwaa ọgbụgba ndụ m. 21 Ma mgbe ọtụtụ ihe ọdachi na ahụhụ ga-abịakwasị ha, abụ a ga-eme ka ha cheta ihe mere nsogbu ha niile ji bịakwasị ha, nʼihi na abụ a ga-adịgide site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ. Amaara m nke ọma ugbu a, ọ bụladị tupu ha abanye nʼala ahụ m kwere nkwa inye ha site nʼịṅụ iyi, ụdị mmadụ ha bụ.” 22 Ya mere, nʼụbọchị ahụ, Mosis dere abụ ahụ, kuziekwara ya ụmụ Izrel. 23 Mgbe ahụ ONYENWE ANYỊ nyere Joshua nwa Nun iwu sị ya, “Dị ike, nwee obi ike, ị ghaghị ịkpọbata ụmụ Izrel nʼala ahụ m sitere nʼịṅụ iyi kwee ha na nkwa. Mụ onwe m ga-anọnyere gị.” 24 Mgbe Mosis dechara okwu niile nke iwu ndị a nʼakwụkwọ, site na mbido ruo nʼọgwụgwụ, 25 o nyere ndị Livayị na-ebu igbe ọgbụgba ndụ ONYENWE ANYỊ iwu sị ha, 26 “Werenụ Akwụkwọ Iwu a tinye ya nʼakụkụ igbe ọgbụgba ndụ ONYENWE ANYỊ Chineke unu, ka ọ bụrụ ihe ịgba ama megide unu. 27 Nʼihi na amaara m na unu bụ ndị nnupu isi, na ndị isiike. Lee, ọ bụladị taa m nọ ndụ nʼetiti unu, unu na-enupu isi nʼebe ONYENWE ANYỊ nọ, unu ga-esi aṅaa ghara inupu isi mgbe m nwụrụ? 28 Kpọkọtaanụ ndị okenye unu niile, na ndị ọchịchị agbụrụ unu niile, ka m kwupụta okwu ndị a mgbe ha na-anụ ya. Ka m kpọkuokwa eluigwe na ụwa ka ha gbaa ama megide ha. 29 Nʼihi na amaara m na mgbe m nwụrụ, unu ga-aghọ ndị rụrụ arụ nke ukwuu, unu ga-ewezuga onwe unu site nʼebe iwu ndị ahụ m nyere unu dị. Amakwaara m na nʼụbọchị ndị ahụ na-abịa, ihe ọjọọ ga-adakwasị unu, nʼihi ihe ọjọọ niile unu mere nʼihu ONYENWE ANYỊ nke unu ji kpasuo ya iwe site nʼihe ndị ahụ unu ji aka unu kpụọ.” 30 Ya mere, Mosis gụpụtara okwu niile dị nʼabụ a site na mbido ruo ọgwụgwụ na ntị nzukọ ndị Izrel niile.

In Other Versions

Deuteronomy 31 in the ANGEFD

Deuteronomy 31 in the ANTPNG2D

Deuteronomy 31 in the AS21

Deuteronomy 31 in the BAGH

Deuteronomy 31 in the BBPNG

Deuteronomy 31 in the BBT1E

Deuteronomy 31 in the BDS

Deuteronomy 31 in the BEV

Deuteronomy 31 in the BHAD

Deuteronomy 31 in the BIB

Deuteronomy 31 in the BLPT

Deuteronomy 31 in the BNT

Deuteronomy 31 in the BNTABOOT

Deuteronomy 31 in the BNTLV

Deuteronomy 31 in the BOATCB

Deuteronomy 31 in the BOATCB2

Deuteronomy 31 in the BOBCV

Deuteronomy 31 in the BOCNT

Deuteronomy 31 in the BOECS

Deuteronomy 31 in the BOGWICC

Deuteronomy 31 in the BOHCB

Deuteronomy 31 in the BOHCV

Deuteronomy 31 in the BOHLNT

Deuteronomy 31 in the BOHNTLTAL

Deuteronomy 31 in the BOILNTAP

Deuteronomy 31 in the BOITCV

Deuteronomy 31 in the BOKCV

Deuteronomy 31 in the BOKCV2

Deuteronomy 31 in the BOKHWOG

Deuteronomy 31 in the BOKSSV

Deuteronomy 31 in the BOLCB

Deuteronomy 31 in the BOLCB2

Deuteronomy 31 in the BOMCV

Deuteronomy 31 in the BONAV

Deuteronomy 31 in the BONCB

Deuteronomy 31 in the BONLT

Deuteronomy 31 in the BONUT2

Deuteronomy 31 in the BOPLNT

Deuteronomy 31 in the BOSCB

Deuteronomy 31 in the BOSNC

Deuteronomy 31 in the BOTLNT

Deuteronomy 31 in the BOVCB

Deuteronomy 31 in the BOYCB

Deuteronomy 31 in the BPBB

Deuteronomy 31 in the BPH

Deuteronomy 31 in the BSB

Deuteronomy 31 in the CCB

Deuteronomy 31 in the CUV

Deuteronomy 31 in the CUVS

Deuteronomy 31 in the DBT

Deuteronomy 31 in the DGDNT

Deuteronomy 31 in the DHNT

Deuteronomy 31 in the DNT

Deuteronomy 31 in the ELBE

Deuteronomy 31 in the EMTV

Deuteronomy 31 in the ESV

Deuteronomy 31 in the FBV

Deuteronomy 31 in the FEB

Deuteronomy 31 in the GGMNT

Deuteronomy 31 in the GNT

Deuteronomy 31 in the HARY

Deuteronomy 31 in the HNT

Deuteronomy 31 in the IRVA

Deuteronomy 31 in the IRVB

Deuteronomy 31 in the IRVG

Deuteronomy 31 in the IRVH

Deuteronomy 31 in the IRVK

Deuteronomy 31 in the IRVM

Deuteronomy 31 in the IRVM2

Deuteronomy 31 in the IRVO

Deuteronomy 31 in the IRVP

Deuteronomy 31 in the IRVT

Deuteronomy 31 in the IRVT2

Deuteronomy 31 in the IRVU

Deuteronomy 31 in the ISVN

Deuteronomy 31 in the JSNT

Deuteronomy 31 in the KAPI

Deuteronomy 31 in the KBT1ETNIK

Deuteronomy 31 in the KBV

Deuteronomy 31 in the KJV

Deuteronomy 31 in the KNFD

Deuteronomy 31 in the LBA

Deuteronomy 31 in the LBLA

Deuteronomy 31 in the LNT

Deuteronomy 31 in the LSV

Deuteronomy 31 in the MAAL

Deuteronomy 31 in the MBV

Deuteronomy 31 in the MBV2

Deuteronomy 31 in the MHNT

Deuteronomy 31 in the MKNFD

Deuteronomy 31 in the MNG

Deuteronomy 31 in the MNT

Deuteronomy 31 in the MNT2

Deuteronomy 31 in the MRS1T

Deuteronomy 31 in the NAA

Deuteronomy 31 in the NASB

Deuteronomy 31 in the NBLA

Deuteronomy 31 in the NBS

Deuteronomy 31 in the NBVTP

Deuteronomy 31 in the NET2

Deuteronomy 31 in the NIV11

Deuteronomy 31 in the NNT

Deuteronomy 31 in the NNT2

Deuteronomy 31 in the NNT3

Deuteronomy 31 in the PDDPT

Deuteronomy 31 in the PFNT

Deuteronomy 31 in the RMNT

Deuteronomy 31 in the SBIAS

Deuteronomy 31 in the SBIBS

Deuteronomy 31 in the SBIBS2

Deuteronomy 31 in the SBICS

Deuteronomy 31 in the SBIDS

Deuteronomy 31 in the SBIGS

Deuteronomy 31 in the SBIHS

Deuteronomy 31 in the SBIIS

Deuteronomy 31 in the SBIIS2

Deuteronomy 31 in the SBIIS3

Deuteronomy 31 in the SBIKS

Deuteronomy 31 in the SBIKS2

Deuteronomy 31 in the SBIMS

Deuteronomy 31 in the SBIOS

Deuteronomy 31 in the SBIPS

Deuteronomy 31 in the SBISS

Deuteronomy 31 in the SBITS

Deuteronomy 31 in the SBITS2

Deuteronomy 31 in the SBITS3

Deuteronomy 31 in the SBITS4

Deuteronomy 31 in the SBIUS

Deuteronomy 31 in the SBIVS

Deuteronomy 31 in the SBT

Deuteronomy 31 in the SBT1E

Deuteronomy 31 in the SCHL

Deuteronomy 31 in the SNT

Deuteronomy 31 in the SUSU

Deuteronomy 31 in the SUSU2

Deuteronomy 31 in the SYNO

Deuteronomy 31 in the TBIAOTANT

Deuteronomy 31 in the TBT1E

Deuteronomy 31 in the TBT1E2

Deuteronomy 31 in the TFTIP

Deuteronomy 31 in the TFTU

Deuteronomy 31 in the TGNTATF3T

Deuteronomy 31 in the THAI

Deuteronomy 31 in the TNFD

Deuteronomy 31 in the TNT

Deuteronomy 31 in the TNTIK

Deuteronomy 31 in the TNTIL

Deuteronomy 31 in the TNTIN

Deuteronomy 31 in the TNTIP

Deuteronomy 31 in the TNTIZ

Deuteronomy 31 in the TOMA

Deuteronomy 31 in the TTENT

Deuteronomy 31 in the UBG

Deuteronomy 31 in the UGV

Deuteronomy 31 in the UGV2

Deuteronomy 31 in the UGV3

Deuteronomy 31 in the VBL

Deuteronomy 31 in the VDCC

Deuteronomy 31 in the YALU

Deuteronomy 31 in the YAPE

Deuteronomy 31 in the YBVTP

Deuteronomy 31 in the ZBP