Deuteronomy 5 (BOICB)

1 Mosis kpọkọtara Izrel niile gwa ha okwu sị,Geenụ ntị, unu Izrel, nʼụkpụrụ ndị a na iwu ndị a niile m na-agụpụta na ntị unu taa, mụtanụ ha, hụkwanụ na unu debere ha! 2 Anyị na ONYENWE ANYỊ Chineke anyị gbara ndụ nʼugwu Horeb. 3 Ọ bụghị ONYENWE ANYỊ na nna nna anyị ha gbara ndụ, kama ọ bụ anyị na ya, anyị niile ndị dị ndụ taa. 4 ONYENWE ANYỊ sitere nʼetiti ọkụ gwa unu okwu ihu na ihu nʼugwu ahụ. 5 E guzoro m nʼetiti unu na ONYENWE ANYỊ mgbe ahụ, ikwupụtara unu okwu ONYENWE ANYỊ, nʼihi na unu tụrụ egwu ọkụ ahụ, unu arịgoghịkwa nʼugwu ahụ.Ọ sịrị: 6 “Mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ Chineke unu, onye kpọpụtara unu site nʼIjipt, bụ ala nke ịbụ ohu. 7 “Gị enwela chi ọzọ tinyere m. 8 Gị emerela onwe gị arụsị a pịrị apị, nʼoyiyi nke ụdị ọbụla nke yiri ihe dị nʼeluigwe maọbụ nke yiri ihe dị nʼụwa, nʼokpuru ya maọbụ nʼime mmiri, nʼokpuru ụwa. 9 Gị akpọla isiala nye ha, efekwala ha ofufe, nʼihi na Mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ Chineke gị, abụ m Chineke ekworo. Onye na-ata ụmụ na ụmụ ụmụ ahụhụ, nʼihi ajọ omume nke ndị mụrụ ha, ọ bụladị ruo nʼọgbọ nke atọ na nke anọ, nke ndị ahụ kpọrọ m asị. 10 Ma na-egosi ịhụnanya nye puku ọgbọ niile nke ndị hụrụ m nʼanya, bụ ndị na-edebe ihe niile m nyere nʼiwu. 11 Gị ejikwala aha ONYENWE ANYỊ bụ Chineke gị eme ihe efu, nʼihi na ONYENWE ANYỊ agaghị agụ onye ji aha ya eme ihe efu dịka onye ikpe na-amaghị. 12 Debe ụbọchị izuike site nʼido ya nsọ, dịka ONYENWE ANYỊ Chineke gị nyere gị nʼiwu. 13 Nʼime ụbọchị isii ka ị ga-eje ozi gị niile. Ọ bụkwa nʼime ha ka ị ga-arụzu ọrụ gị niile, 14 ma ụbọchị nke asaa bụ ụbọchị izuike nke ONYENWE ANYỊ Chineke gị. Ị gaghị arụ ọrụ ọbụla nʼụbọchị ahụ, gị onwe gị, nwa gị nwoke na nwa gị nwanyị, onye ọrụ gị nwoke, onye ọrụ gị nwanyị, ehi gị, ịnyịnya ibu gị maọbụ anụ ụlọ gị ọbụla, ọ bụladị onye ọbịa bi nʼobodo gị, ka ohu gị nwoke na ohu gị nwanyị zuru ike dịka gị onwe gị si ezu ike. 15 Ị ga-echetakwa na ị bụ ohu nʼala Ijipt, ma ONYENWE ANYỊ Chineke mere ka i si nʼohu pụta. Ọ bụ ike ya dị ukwuu ka o ji napụta gị. Ọ bụ ya mere ONYENWE ANYỊ Chineke gị ji nye iwu na ị ga-edebe ụbọchị izuike nsọ. 16 Sọpụrụ nne gị na nna gị, dịka ONYENWE ANYỊ Chineke gị nyere gị nʼiwu, ka ụbọchị ndụ gị dị ogologo, ka ihe dịkwara gị mma nʼala ahụ nke ONYENWE ANYỊ Chineke gị na-enye gị. 17 Gị egbula mmadụ. 18 Gị akwala iko. 19 Gị ezula ohi. 20 Gị agbala ama ụgha megide onye agbataobi gị. 21 Gị enwela anya ukwu nʼebe nwunye onye agbataobi gị dị. Gị enwekwala agụụ inwetara onwe gị ụlọ onye agbataobi gị, maọbụ nʼebe ala ya, maọbụ ohu ya nwoke, maọbụ ohu ya nwanyị, maọbụ ehi ya, maọbụ ịnyịnya ibu ya, ma ọ bụkwanụ nʼihe ọbụla nke onye agbataobi nwere dị.” 22 Iwu ndị a ka ONYENWE ANYỊ sitere nʼolu ike kwupụta nye ọgbakọ unu niile nʼelu ugwu ahụ, site nʼọkụ ahụ na igwe ojii ahụ na oke ọchịchịrị ahụ. O nweghị okwu ọzọ o tụkwasịrị nʼelu ya. O mechara dee ha na mbadamba nkume abụọ, nye m ha. 23 Ma mgbe unu nụrụ oke olu ahụ kwuru okwu site nʼoke ọchịchịrị ahụ, hụkwa ire ọkụ ahụ dị egwu na-enwu nʼelu ugwu, ndịisi unu, ndị ndu ebo ọbụla na ndị okenye unu bịakwutere m. 24 Unu sịrị, “ONYENWE ANYỊ bụ Chineke anyị egosila anyị ebube ya, na ịdị ukwu ya, anyị anụkwala olu ya site nʼime ọkụ ahụ. Taa anyị ahụla na mmadụ pụrụ ịdị ndụ ọbụladị ma Chineke kpanyere ha ụka. 25 Ma ugbu a nʼihi gịnị ka anyị ga-eji nwụọ? Ọkụ a, nke na-enwusi ike ga-erechapụ anyị. Anyị ga-anwụ ma ọ bụrụ na anyị anụ olu ONYENWE ANYỊ Chineke anyị gaa nʼihu. 26 Nʼihi na onye dị nʼetiti mmadụ, nke nụrụ olu Chineke dị ndụ ka ọ na-ekwu okwu site nʼetiti ọkụ, dịka anyị nụrụ ma dịrị ndụ. 27 Gaa nso nụtara anyị ihe ONYENWE ANYỊ Chineke anyị na-ekwu, mgbe ahụ, gwa anyị ihe ọbụla bụ nke ọ gwara gị, anyị ga-anụ, mekwa ya.” 28 ONYENWE ANYỊ nụrụ olu okwu mgbe unu gwara m okwu, ONYENWE ANYỊ sịrị m, “Anụla m ihe ndị a gwara gị. Ihe niile ha kwuru ziri ezi. 29 Lee, ọ ga-adị nnọọ mma ma mkpụrụobi ha dị otu a, ịtụ egwu m, na idebe ihe niile m nyere ha nʼiwu, ka ihe gaara ha na ụmụ ha nke ọma mgbe niile ebighị ebi. 30 “Gaa, gwa ha ka ha laghachi nʼụlọ ikwu ha. 31 Ma gị onwe gị, guzo nʼebe a nʼakụkụ m, ka m nye gị iwu m na ụkpụrụ m niile, ị ga-akụziri ha idebe iwu m, ha aghakwaghị idebe ha nʼala ahụ m gaje inye ha ka ha nweta.” 32 Lezienụ anya ime ihe ndị ahụ niile ONYENWE ANYỊ bụ Chineke unu nyere unu nʼiwu. Unu esitela na ha wezuga onwe unu gaa nʼaka nri maọbụ nʼaka ekpe. 33 Jegharịanụ ije nʼụzọ niile ONYENWE ANYỊ Chineke unu nyere unu nʼiwu, ka unu dịrị ndụ, baa ụba, ma meekwa ka ndụ unu dị ogologo nʼala ahụ unu na-aga inweta.

In Other Versions

Deuteronomy 5 in the ANGEFD

Deuteronomy 5 in the ANTPNG2D

Deuteronomy 5 in the AS21

Deuteronomy 5 in the BAGH

Deuteronomy 5 in the BBPNG

Deuteronomy 5 in the BBT1E

Deuteronomy 5 in the BDS

Deuteronomy 5 in the BEV

Deuteronomy 5 in the BHAD

Deuteronomy 5 in the BIB

Deuteronomy 5 in the BLPT

Deuteronomy 5 in the BNT

Deuteronomy 5 in the BNTABOOT

Deuteronomy 5 in the BNTLV

Deuteronomy 5 in the BOATCB

Deuteronomy 5 in the BOATCB2

Deuteronomy 5 in the BOBCV

Deuteronomy 5 in the BOCNT

Deuteronomy 5 in the BOECS

Deuteronomy 5 in the BOGWICC

Deuteronomy 5 in the BOHCB

Deuteronomy 5 in the BOHCV

Deuteronomy 5 in the BOHLNT

Deuteronomy 5 in the BOHNTLTAL

Deuteronomy 5 in the BOILNTAP

Deuteronomy 5 in the BOITCV

Deuteronomy 5 in the BOKCV

Deuteronomy 5 in the BOKCV2

Deuteronomy 5 in the BOKHWOG

Deuteronomy 5 in the BOKSSV

Deuteronomy 5 in the BOLCB

Deuteronomy 5 in the BOLCB2

Deuteronomy 5 in the BOMCV

Deuteronomy 5 in the BONAV

Deuteronomy 5 in the BONCB

Deuteronomy 5 in the BONLT

Deuteronomy 5 in the BONUT2

Deuteronomy 5 in the BOPLNT

Deuteronomy 5 in the BOSCB

Deuteronomy 5 in the BOSNC

Deuteronomy 5 in the BOTLNT

Deuteronomy 5 in the BOVCB

Deuteronomy 5 in the BOYCB

Deuteronomy 5 in the BPBB

Deuteronomy 5 in the BPH

Deuteronomy 5 in the BSB

Deuteronomy 5 in the CCB

Deuteronomy 5 in the CUV

Deuteronomy 5 in the CUVS

Deuteronomy 5 in the DBT

Deuteronomy 5 in the DGDNT

Deuteronomy 5 in the DHNT

Deuteronomy 5 in the DNT

Deuteronomy 5 in the ELBE

Deuteronomy 5 in the EMTV

Deuteronomy 5 in the ESV

Deuteronomy 5 in the FBV

Deuteronomy 5 in the FEB

Deuteronomy 5 in the GGMNT

Deuteronomy 5 in the GNT

Deuteronomy 5 in the HARY

Deuteronomy 5 in the HNT

Deuteronomy 5 in the IRVA

Deuteronomy 5 in the IRVB

Deuteronomy 5 in the IRVG

Deuteronomy 5 in the IRVH

Deuteronomy 5 in the IRVK

Deuteronomy 5 in the IRVM

Deuteronomy 5 in the IRVM2

Deuteronomy 5 in the IRVO

Deuteronomy 5 in the IRVP

Deuteronomy 5 in the IRVT

Deuteronomy 5 in the IRVT2

Deuteronomy 5 in the IRVU

Deuteronomy 5 in the ISVN

Deuteronomy 5 in the JSNT

Deuteronomy 5 in the KAPI

Deuteronomy 5 in the KBT1ETNIK

Deuteronomy 5 in the KBV

Deuteronomy 5 in the KJV

Deuteronomy 5 in the KNFD

Deuteronomy 5 in the LBA

Deuteronomy 5 in the LBLA

Deuteronomy 5 in the LNT

Deuteronomy 5 in the LSV

Deuteronomy 5 in the MAAL

Deuteronomy 5 in the MBV

Deuteronomy 5 in the MBV2

Deuteronomy 5 in the MHNT

Deuteronomy 5 in the MKNFD

Deuteronomy 5 in the MNG

Deuteronomy 5 in the MNT

Deuteronomy 5 in the MNT2

Deuteronomy 5 in the MRS1T

Deuteronomy 5 in the NAA

Deuteronomy 5 in the NASB

Deuteronomy 5 in the NBLA

Deuteronomy 5 in the NBS

Deuteronomy 5 in the NBVTP

Deuteronomy 5 in the NET2

Deuteronomy 5 in the NIV11

Deuteronomy 5 in the NNT

Deuteronomy 5 in the NNT2

Deuteronomy 5 in the NNT3

Deuteronomy 5 in the PDDPT

Deuteronomy 5 in the PFNT

Deuteronomy 5 in the RMNT

Deuteronomy 5 in the SBIAS

Deuteronomy 5 in the SBIBS

Deuteronomy 5 in the SBIBS2

Deuteronomy 5 in the SBICS

Deuteronomy 5 in the SBIDS

Deuteronomy 5 in the SBIGS

Deuteronomy 5 in the SBIHS

Deuteronomy 5 in the SBIIS

Deuteronomy 5 in the SBIIS2

Deuteronomy 5 in the SBIIS3

Deuteronomy 5 in the SBIKS

Deuteronomy 5 in the SBIKS2

Deuteronomy 5 in the SBIMS

Deuteronomy 5 in the SBIOS

Deuteronomy 5 in the SBIPS

Deuteronomy 5 in the SBISS

Deuteronomy 5 in the SBITS

Deuteronomy 5 in the SBITS2

Deuteronomy 5 in the SBITS3

Deuteronomy 5 in the SBITS4

Deuteronomy 5 in the SBIUS

Deuteronomy 5 in the SBIVS

Deuteronomy 5 in the SBT

Deuteronomy 5 in the SBT1E

Deuteronomy 5 in the SCHL

Deuteronomy 5 in the SNT

Deuteronomy 5 in the SUSU

Deuteronomy 5 in the SUSU2

Deuteronomy 5 in the SYNO

Deuteronomy 5 in the TBIAOTANT

Deuteronomy 5 in the TBT1E

Deuteronomy 5 in the TBT1E2

Deuteronomy 5 in the TFTIP

Deuteronomy 5 in the TFTU

Deuteronomy 5 in the TGNTATF3T

Deuteronomy 5 in the THAI

Deuteronomy 5 in the TNFD

Deuteronomy 5 in the TNT

Deuteronomy 5 in the TNTIK

Deuteronomy 5 in the TNTIL

Deuteronomy 5 in the TNTIN

Deuteronomy 5 in the TNTIP

Deuteronomy 5 in the TNTIZ

Deuteronomy 5 in the TOMA

Deuteronomy 5 in the TTENT

Deuteronomy 5 in the UBG

Deuteronomy 5 in the UGV

Deuteronomy 5 in the UGV2

Deuteronomy 5 in the UGV3

Deuteronomy 5 in the VBL

Deuteronomy 5 in the VDCC

Deuteronomy 5 in the YALU

Deuteronomy 5 in the YAPE

Deuteronomy 5 in the YBVTP

Deuteronomy 5 in the ZBP