Esther 2 (BOICB)

1 Mgbe ihe ndị a gasịrị, ka iwe eze Ahasuerọs dajụrụ, ọ malitere iche echiche banyere Vashti. O chetara ihe Vashti mere, chetakwa ihe e kpebiri banyere ya. 2 Mgbe ahụ, ndị na-ejere eze ozi sịrị ya, “Ka anyị gaa chọtara eze ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke mara mma ile anya. 3 Ka eze họpụta ndị nchịkọta nʼisi obodo niile, ndị ga na-ahọpụta, ma na-akpọbatakwa ụmụ agbọghọ ndị a niile mara mma, nʼụlọeze dị na Susa. Ka Hegai, onozi eze bụrụkwa onye ga-elekọta ndị inyom ndị a. Ka e jirikwa ihe ịchọ mma niile chọọ ha mma dịka o si kwesi. 4 Emesịa, nwaagbọghọ ahụ ihe ya masịrị eze karịa ga-abụ nwunye eze nʼọnọdụ Vashti.” Ntụpụta a tọrọ eze ụtọ nke ukwuu. O nyere ha ike ka ha malite na-atụfughị mgbe. 5 Nʼoge a, enwere otu onye Juu nọ nʼobodo Susa nke ewusiri ike, a na-akpọ Mọdekai nwa Jaịa, nwa Shimei, nwa Kish, onye Benjamin. 6 Ọ bụ onye a dọtara nʼagha mgbe Nebukadneza bibiri Jerusalem. Nʼoge ahụ, e mere ka ọ hapụ obodo ya gaa biri na Babilọn bụkwa oge a dọtakwara Jekonaya eze ndị Juda na ọtụtụ ndị ọzọ nʼagha. 7 Mọdekai nwere nwa nwanne nna ya, aha ya bụ Hadasa, ma a na-akpọkwa ya Esta, onye mara mma nʼahụ dịkwa mma ile anya. Nne ya na nna ya anwụọla, ma Mọdekai kpọbatara ya nʼụlọ ya zụọ ya dịka nwa ya nwanyị. 8 Ya mere, nʼihi iwu ahụ eze nyere, e mere ka ọtụtụ ụmụ agbọghọbịa bịa na Susa, nʼime ụlọ ukwu eze. Ọ bụkwa Hegai na-elekọta ha niile. A kpọbatakwara Esta nʼụlọeze nyefee ya Hegai nʼaka, onye na-elekọta ebe obibi ndị iko nwanyị eze. 9 Ọ masịrị ya, ọ natakwara ihuọma nʼebe ọ nọ. Ngwangwa ọ malitere inye ya nri pụrụ iche, na ihe ndị ahụ niile e ji edozi ahụ na ịchọ mma. O sitere nʼetiti ụmụ agbọghọ nọ nʼụlọeze họpụta ụmụ agbọghọ asaa ndị na-ejere Esta ozi. O duuru ya na ndị na-ejere ya ozi dubaa nʼebe kachasị mma nʼogige ebe ndị inyom eze bi. 10 Ma Esta agwabeghị onye ọbụla obodo ya maọbụ ihe banyere ezinaụlọ ya, nʼihi na Mọdekai nyere ya iwu ka ọ ghara ịgwa onye ọbụla. 11 Ụbọchị niile, Mọdekai na-abịa nʼogige ụlọ ndị inyom na-ajụ ase otu Esta mere, nʼịchọpụta otu ihe si agara ya. 12 Tupu o ruoro nwaagbọghọ ọbụla ibakwuru eze Sekses, ọ ga-anọzu ọnwa iri na abụọ nʼebe a na-achọ ya mma dịka iwu e nyere banyere ịchọ mma ndị inyom si dị. A ga-eji mmanụ máá chọọ ya mma ọnwa isii, werekwa mmanụ isi ụtọ dị iche iche, na ihe ịchọ mma ndị ọzọ kwadoo ya nʼime ọnwa isii nke ọzọ. 13 Nʼụzọ dị otu a, ka nwaagbọghọ ọbụla ga-adị gakwuru eze, bụ Sekses. A na-enye ya ihe ọbụla ọ chọrọ site nʼebe obibi ha nke o ji aba nʼụlọeze. 14 A na-eme ka ọ banye nʼụlọeze nʼanyasị, ma nʼụtụtụ, ọ na-alọghachi nʼụlọ ọzọ nke dị nʼebe ụmụ nwanyị eze bi. Nʼebe ahụ ka Shashgaz, onozi eze nọ na-elekọta ndị iko nwanyị eze. Ọ gakwaghị alọghachi nʼebe eze ọzọ karịakwa ma ihe ya ọ masịrị eze, eze akpọọ ya ka ọ bịaghachi ọzọ. 15 Mgbe oge Esta (ada Abihail, onye bụ nwanne nna Mọdekai, onye kpọọrọ nwantakịrị nwaagbọghọ a ka ọ bụrụ nwa nke ya) ga-eji gaa nʼihu eze ruru, ọ nabatara ndụmọdụ Hegai, onozi ahụ na-elekọta ndị inyom. Ọ hụtara amara nʼihu mmadụ niile ndị hụrụ ya. 16 E mere ka Esta bakwuru eze nʼọnwa nke iri nʼafọ nke asaa nke ọchịchị eze Ahasuerọs. 17 Eze hụrụ Esta nʼanya karịa ụmụ agbọghọ ndị ọzọ niile. Ọ natara amara na mmasị eze karịa ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke ndị ọzọ. Ya mere, o weere okpueze kpukwasị ya nʼisi mee ya eze nwanyị nʼọnọdụ Vashti. 18 Eze kpọrọ oke oriri, nʼihi Esta, nye ndịisi ọchịchị ya niile na ndị ozi ya niile. Ọ kpọsara ezumike nye ndị ọrụ niile nʼalaeze ya, ma kesaakwa onyinye nye ọtụtụ ndị mmadụ dịka eze pụrụ ime. 19 Mgbe a chịkọtara ụmụ agbọghọ ndị a na-amaghị nwoke nke ugboro abụọ, Mọdekai nọ ala nʼọnụ ụzọ ama eze. 20 Ma Esta emebeghị ka onye ọbụla mara ihe banyere ezinaụlọ ya maọbụ obodo ya, dịka Mọdekai nyere ya nʼiwu, nke ọ na-emeri mgbe a na-azụlite ya. 21 Otu ụbọchị, mgbe Mọdekai nọ nʼọrụ nʼọnụ ụzọ ama ụlọ ukwu eze, ndị onozi abụọ eze nwere, aha ha bụ Bigtan na Teresh, ndị na-eche ọnụ ụzọ ụlọeze nche, were iwe megide eze. Ha gbara izu kpebie na ha ga-egbu eze Sekses. 22 Ma Mọdekai chọpụtara nzube ọjọọ a gwa ya Esta, nwunye eze, onye gwara eze, meekwa ka eze mata na ọ bụ Mọdekai gwara ya. 23 Mgbe e nyochara kwu a, chọpụta na ọ bụ eziokwu, e jidere mmadụ abụọ ahụ kwụgbuo ha nʼosisi. E dekwara ihe ndị a niile nʼihu eze nʼime akwụkwọ akụkọ ihe e mere.

In Other Versions

Esther 2 in the ANGEFD

Esther 2 in the ANTPNG2D

Esther 2 in the AS21

Esther 2 in the BAGH

Esther 2 in the BBPNG

Esther 2 in the BBT1E

Esther 2 in the BDS

Esther 2 in the BEV

Esther 2 in the BHAD

Esther 2 in the BIB

Esther 2 in the BLPT

Esther 2 in the BNT

Esther 2 in the BNTABOOT

Esther 2 in the BNTLV

Esther 2 in the BOATCB

Esther 2 in the BOATCB2

Esther 2 in the BOBCV

Esther 2 in the BOCNT

Esther 2 in the BOECS

Esther 2 in the BOGWICC

Esther 2 in the BOHCB

Esther 2 in the BOHCV

Esther 2 in the BOHLNT

Esther 2 in the BOHNTLTAL

Esther 2 in the BOILNTAP

Esther 2 in the BOITCV

Esther 2 in the BOKCV

Esther 2 in the BOKCV2

Esther 2 in the BOKHWOG

Esther 2 in the BOKSSV

Esther 2 in the BOLCB

Esther 2 in the BOLCB2

Esther 2 in the BOMCV

Esther 2 in the BONAV

Esther 2 in the BONCB

Esther 2 in the BONLT

Esther 2 in the BONUT2

Esther 2 in the BOPLNT

Esther 2 in the BOSCB

Esther 2 in the BOSNC

Esther 2 in the BOTLNT

Esther 2 in the BOVCB

Esther 2 in the BOYCB

Esther 2 in the BPBB

Esther 2 in the BPH

Esther 2 in the BSB

Esther 2 in the CCB

Esther 2 in the CUV

Esther 2 in the CUVS

Esther 2 in the DBT

Esther 2 in the DGDNT

Esther 2 in the DHNT

Esther 2 in the DNT

Esther 2 in the ELBE

Esther 2 in the EMTV

Esther 2 in the ESV

Esther 2 in the FBV

Esther 2 in the FEB

Esther 2 in the GGMNT

Esther 2 in the GNT

Esther 2 in the HARY

Esther 2 in the HNT

Esther 2 in the IRVA

Esther 2 in the IRVB

Esther 2 in the IRVG

Esther 2 in the IRVH

Esther 2 in the IRVK

Esther 2 in the IRVM

Esther 2 in the IRVM2

Esther 2 in the IRVO

Esther 2 in the IRVP

Esther 2 in the IRVT

Esther 2 in the IRVT2

Esther 2 in the IRVU

Esther 2 in the ISVN

Esther 2 in the JSNT

Esther 2 in the KAPI

Esther 2 in the KBT1ETNIK

Esther 2 in the KBV

Esther 2 in the KJV

Esther 2 in the KNFD

Esther 2 in the LBA

Esther 2 in the LBLA

Esther 2 in the LNT

Esther 2 in the LSV

Esther 2 in the MAAL

Esther 2 in the MBV

Esther 2 in the MBV2

Esther 2 in the MHNT

Esther 2 in the MKNFD

Esther 2 in the MNG

Esther 2 in the MNT

Esther 2 in the MNT2

Esther 2 in the MRS1T

Esther 2 in the NAA

Esther 2 in the NASB

Esther 2 in the NBLA

Esther 2 in the NBS

Esther 2 in the NBVTP

Esther 2 in the NET2

Esther 2 in the NIV11

Esther 2 in the NNT

Esther 2 in the NNT2

Esther 2 in the NNT3

Esther 2 in the PDDPT

Esther 2 in the PFNT

Esther 2 in the RMNT

Esther 2 in the SBIAS

Esther 2 in the SBIBS

Esther 2 in the SBIBS2

Esther 2 in the SBICS

Esther 2 in the SBIDS

Esther 2 in the SBIGS

Esther 2 in the SBIHS

Esther 2 in the SBIIS

Esther 2 in the SBIIS2

Esther 2 in the SBIIS3

Esther 2 in the SBIKS

Esther 2 in the SBIKS2

Esther 2 in the SBIMS

Esther 2 in the SBIOS

Esther 2 in the SBIPS

Esther 2 in the SBISS

Esther 2 in the SBITS

Esther 2 in the SBITS2

Esther 2 in the SBITS3

Esther 2 in the SBITS4

Esther 2 in the SBIUS

Esther 2 in the SBIVS

Esther 2 in the SBT

Esther 2 in the SBT1E

Esther 2 in the SCHL

Esther 2 in the SNT

Esther 2 in the SUSU

Esther 2 in the SUSU2

Esther 2 in the SYNO

Esther 2 in the TBIAOTANT

Esther 2 in the TBT1E

Esther 2 in the TBT1E2

Esther 2 in the TFTIP

Esther 2 in the TFTU

Esther 2 in the TGNTATF3T

Esther 2 in the THAI

Esther 2 in the TNFD

Esther 2 in the TNT

Esther 2 in the TNTIK

Esther 2 in the TNTIL

Esther 2 in the TNTIN

Esther 2 in the TNTIP

Esther 2 in the TNTIZ

Esther 2 in the TOMA

Esther 2 in the TTENT

Esther 2 in the UBG

Esther 2 in the UGV

Esther 2 in the UGV2

Esther 2 in the UGV3

Esther 2 in the VBL

Esther 2 in the VDCC

Esther 2 in the YALU

Esther 2 in the YAPE

Esther 2 in the YBVTP

Esther 2 in the ZBP