Esther 3 (BOICB)
1 Mgbe ihe ndị a gasịrị, eze bụ Ahasuerọs mere Heman nwa Hamedata onye Agag ka ọ bụrụ onye ukwu, o nyere ya ugwu site nʼinye ya oche dị elu karịa nke ndị ọzọ niile a na-asọpụrụ. 2 Ndịisi ọchịchị eze niile na-egbu ikpere nʼala nye Heman nsọpụrụ mgbe ọbụla o si nʼọnụ ụzọ ama ụlọeze na-agafe, nʼihi na ọ bụ otu a ka eze nyere nʼiwu. Ma Mọdekai ekweghị egbu ikpere nye ya, ọ kwekwaghị enye ya nsọpụrụ. 3 Mgbe ahụ, ndị ozi eze ndị nọ nʼọnụ ụzọ ama eze jụrụ Mọdekai ajụjụ si ya, “Gịnị mere i ji na-enupu isi nʼiwu eze nyere?” 4 Ha na-agwa ya okwu kwa ụbọchị kwa ụbọchị, ma o geghị ha ntị. Nʼihi nke a, ha gwara Heman ihe banyere ya, ịhụ ma ọ ga-anabata omume Mọdekai, ebe ọ gwara ha na ya bụ onye Juu. 5 Ihe a were Heman iwe nke ukwuu mgbe ọ chọpụtara na Mọdekai jụrụ igbu ikpere nʼihu ya, maọbụ ịsọpụrụ ya. 6 Mgbe ọ matara ndị Mọdekai ha bụ, ọ dị ya ka ihe ileda anya ma o gbuo naanị Mọdekai. Kama Heman chọrọ ụzọ ọ ga-esi laa ndị Mọdekai niile, bụ ndị Juu nọ nʼalaeze niile nke Sekses nʼiyi. 7 Nʼọnwa mbụ, nke bụ ọnwa Nisan, nʼafọ nke iri na abụọ nke ọchịchị eze Ahasuerọs. Ha fere nza (nke bụ Pua) nʼihu Heman iji họpụta ụbọchị na ọnwa. Ma nza ahụ danyere nʼụbọchị nke iri na atọ nʼọnwa nke iri na abụọ, nke bụ ọnwa Aada. 8 Mgbe ahụ Heman sịrị eze Sekses, “O nwere otu ndị gbasara ebe niile, nʼetiti ndị bi nʼobodo dị iche iche niile nke alaeze gị, ha kepụrụ onwe ha iche. Iwu ha dị iche site nʼiwu nke ndị mba ọzọ. Ha adịghị edebekwa iwu eze, ọ gaghị abara eze uru i hapụ ha ka ha nọdụrụ onwe ha. 9 Ọ bụrụ na ọ masịrị eze, ya nye iwu ka a laa ha nʼiyi, aga m akwụnye puku talenti ọlaọcha iri nʼaka ndị nlekọta nʼihi ụlọakụ eze.” 10 Ya mere, eze gbapụtara ọlaaka ikike ya nye ya Heman nwa Hamedata onye Agag, onye iro ndị Juu 11 Eze gwara Heman, “Enyela m gị ọlaọcha ahụ, ya na ndị a. Mee ha dịka o si dị gị mma.” 12 Nʼabalị iri na atọ nke ọnwa mbụ, a kpọkọrọ ndị ode akwụkwọ eze niile. Ha depụtara nʼakwụkwọ isi obodo dị iche iche, nakwa nʼasụsụ ndị ọbụla, ihe niile Heman nyere nʼiwu nye ndị nnọchị anya eze niile, ndị ọchịchị nke ala niile ha na-achị, na ndịisi nke ndị ọbụla nọ nʼime alaeze a. E ji aha Ahasuerọs dee akwụkwọ ndị ahụ, werekwa mgbaaka eze nʼonwe ya kaa ya akara. 13 E zipụrụ ndị ọgba ọsọ ozi eze ka ha gaa nʼisi obodo ọbụla nʼalaeze ahụ, na-enye iwu a edere nʼakwụkwọ ka a laa nʼiyi, gbuo, ma kpochapụkwa ndị Juu niile, ma nwantakịrị ma okenye, ma nwanyị, ma ụmụntakịrị, nʼotu ụbọchị, nʼabalị iri na atọ nke ọnwa iri na abụọ, nke bụ ọnwa Aada, nakwa ịpụnara ha akụnụba ha nʼike. 14 Ihe ndepụta nke otu akwụkwọ ahụ bụ nke a ga-enye dịka iwu nʼobodo niile ọbụla site na nkwupụta, mee ka ndị mba niile mara maka ya, nọọkwa na njikere nʼihi ụbọchị ahụ. 15 Ọ bụ ndị ozi eze na-agba ọsọ nke ọma ka e nyere ozi ahụ, ka ha jiri ya jee nʼobodo niile. E mekwara ka iwu ahụ baa mmadụ niile bi na Susa ntị. Emesịa, eze na Heman nọdụrụ ala ịṅụ ihe ọṅụṅụ nʼoge ndị niile bi na Susa nọ nʼegwu nʼihi okwu ibibi ndị Juu ahụ.
In Other Versions
Esther 3 in the ANGEFD
Esther 3 in the ANTPNG2D
Esther 3 in the AS21
Esther 3 in the BAGH
Esther 3 in the BBPNG
Esther 3 in the BBT1E
Esther 3 in the BDS
Esther 3 in the BEV
Esther 3 in the BHAD
Esther 3 in the BIB
Esther 3 in the BLPT
Esther 3 in the BNT
Esther 3 in the BNTABOOT
Esther 3 in the BNTLV
Esther 3 in the BOATCB
Esther 3 in the BOATCB2
Esther 3 in the BOBCV
Esther 3 in the BOCNT
Esther 3 in the BOECS
Esther 3 in the BOGWICC
Esther 3 in the BOHCB
Esther 3 in the BOHCV
Esther 3 in the BOHLNT
Esther 3 in the BOHNTLTAL
Esther 3 in the BOILNTAP
Esther 3 in the BOITCV
Esther 3 in the BOKCV
Esther 3 in the BOKCV2
Esther 3 in the BOKHWOG
Esther 3 in the BOKSSV
Esther 3 in the BOLCB
Esther 3 in the BOLCB2
Esther 3 in the BOMCV
Esther 3 in the BONAV
Esther 3 in the BONCB
Esther 3 in the BONLT
Esther 3 in the BONUT2
Esther 3 in the BOPLNT
Esther 3 in the BOSCB
Esther 3 in the BOSNC
Esther 3 in the BOTLNT
Esther 3 in the BOVCB
Esther 3 in the BOYCB
Esther 3 in the BPBB
Esther 3 in the BPH
Esther 3 in the BSB
Esther 3 in the CCB
Esther 3 in the CUV
Esther 3 in the CUVS
Esther 3 in the DBT
Esther 3 in the DGDNT
Esther 3 in the DHNT
Esther 3 in the DNT
Esther 3 in the ELBE
Esther 3 in the EMTV
Esther 3 in the ESV
Esther 3 in the FBV
Esther 3 in the FEB
Esther 3 in the GGMNT
Esther 3 in the GNT
Esther 3 in the HARY
Esther 3 in the HNT
Esther 3 in the IRVA
Esther 3 in the IRVB
Esther 3 in the IRVG
Esther 3 in the IRVH
Esther 3 in the IRVK
Esther 3 in the IRVM
Esther 3 in the IRVM2
Esther 3 in the IRVO
Esther 3 in the IRVP
Esther 3 in the IRVT
Esther 3 in the IRVT2
Esther 3 in the IRVU
Esther 3 in the ISVN
Esther 3 in the JSNT
Esther 3 in the KAPI
Esther 3 in the KBT1ETNIK
Esther 3 in the KBV
Esther 3 in the KJV
Esther 3 in the KNFD
Esther 3 in the LBA
Esther 3 in the LBLA
Esther 3 in the LNT
Esther 3 in the LSV
Esther 3 in the MAAL
Esther 3 in the MBV
Esther 3 in the MBV2
Esther 3 in the MHNT
Esther 3 in the MKNFD
Esther 3 in the MNG
Esther 3 in the MNT
Esther 3 in the MNT2
Esther 3 in the MRS1T
Esther 3 in the NAA
Esther 3 in the NASB
Esther 3 in the NBLA
Esther 3 in the NBS
Esther 3 in the NBVTP
Esther 3 in the NET2
Esther 3 in the NIV11
Esther 3 in the NNT
Esther 3 in the NNT2
Esther 3 in the NNT3
Esther 3 in the PDDPT
Esther 3 in the PFNT
Esther 3 in the RMNT
Esther 3 in the SBIAS
Esther 3 in the SBIBS
Esther 3 in the SBIBS2
Esther 3 in the SBICS
Esther 3 in the SBIDS
Esther 3 in the SBIGS
Esther 3 in the SBIHS
Esther 3 in the SBIIS
Esther 3 in the SBIIS2
Esther 3 in the SBIIS3
Esther 3 in the SBIKS
Esther 3 in the SBIKS2
Esther 3 in the SBIMS
Esther 3 in the SBIOS
Esther 3 in the SBIPS
Esther 3 in the SBISS
Esther 3 in the SBITS
Esther 3 in the SBITS2
Esther 3 in the SBITS3
Esther 3 in the SBITS4
Esther 3 in the SBIUS
Esther 3 in the SBIVS
Esther 3 in the SBT
Esther 3 in the SBT1E
Esther 3 in the SCHL
Esther 3 in the SNT
Esther 3 in the SUSU
Esther 3 in the SUSU2
Esther 3 in the SYNO
Esther 3 in the TBIAOTANT
Esther 3 in the TBT1E
Esther 3 in the TBT1E2
Esther 3 in the TFTIP
Esther 3 in the TFTU
Esther 3 in the TGNTATF3T
Esther 3 in the THAI
Esther 3 in the TNFD
Esther 3 in the TNT
Esther 3 in the TNTIK
Esther 3 in the TNTIL
Esther 3 in the TNTIN
Esther 3 in the TNTIP
Esther 3 in the TNTIZ
Esther 3 in the TOMA
Esther 3 in the TTENT
Esther 3 in the UBG
Esther 3 in the UGV
Esther 3 in the UGV2
Esther 3 in the UGV3
Esther 3 in the VBL
Esther 3 in the VDCC
Esther 3 in the YALU
Esther 3 in the YAPE
Esther 3 in the YBVTP
Esther 3 in the ZBP