Exodus 16 (BOICB)

1 Ọgbakọ ụmụ Izrel niile hapụrụ obodo Elim, jere ije bịarute nʼọzara Sin nke dị nʼetiti Saịnaị na Elim. Ha bịaruru nʼebe ahụ nʼabalị iri na ise nke ọnwa abụọ, site na mgbe ha hapụrụ Ijipt. 2 Nʼọzara ahụ, nzukọ ahụ niile tamuru ntamu megide Mosis na Erọn. 3 Ụmụ Izrel gwara ha sị, “Ọ gaara adị anyị mma ma a sị na ONYENWE ANYỊ gburu anyị nʼala Ijipt. Nʼebe ahụ ite anụ dị iche iche na-adọ nʼihu anyị, anyị na-erikwa ụdị nri ọbụla anyị chọrọ. Ugbu a, i dubatala anyị nʼọzara ka anyị niile nwụọ nʼagụụ.” 4 ONYENWE ANYỊ gwara Mosis okwu sị, “Lee anya, aga m esi nʼeluigwe zitere unu achịcha. Onye ọbụla ga-aga tụtụkọtara onwe ya ihe oriri ụbọchị ọbụla dịka ọ chọrọ. Aga m eji nke a lee ha ule ịmata ma ha ga-eme ihe m nyere ha nʼiwu. 5 Gwa ha na nʼụbọchị nke isii, ha ga-ewere nri ha ga-ericha nʼụbọchị ahụ, ma nri ha ga-eri nʼụbọchị nke asaa, ka ha ga-achịkọta nʼụbọchị nke isii.” 6 Mosis na Erọn kpọkọtara ụmụ Izrel sị ha, “Nʼanyasị a ka unu ga-amata na ọ bụ ONYENWE ANYỊ dupụtara unu site nʼala Ijipt. 7 Unu ga-ahụkwa ebube ONYENWE ANYỊ nʼụtụtụ echi, nʼihi na ONYENWE ANYỊ anụla ntamu unu megide ya. Onye ka anyị bụ unu ga-eji na-atamu ntamu megide anyị?” 8 Mosis kwukwara sị, “Mgbe ONYENWE ANYỊ nyere unu anụ unu ga-eri nʼanyasị a, nyekwa unu achịcha ga-eju unu nʼụtụtụ, unu ga-amata na ọ bụ ONYENWE ANYỊ, nʼihi ọ nụla ntamu unu megide ya. Onye ka anyị bụ? Ọ bụghị anyị ka unu na-atamu megide kama ọ bụ ONYENWE ANYỊ ka unu na-atamu megide.” 9 Mgbe ahụ, Mosis gwara Erọn okwu sị ya, “Gwa nzukọ Izrel niile okwu sị ha, ‘Pụtanụ bịa nʼihu ONYENWE ANYỊ, nʼihi na ọ nụla ntamu unu.’ ” 10 Mgbe Erọn nọ na-agwa nzukọ Izrel okwu, ha lepụrụ anya nʼọzara hụ ebube ONYENWE ANYỊ ka ọ pụtara ihe nʼigwe ojii. 11 Mgbe ahụ, ONYENWE ANYỊ gwara Mosis okwu sị ya, 12 “Anụla m ntamu nke ụmụ Izrel na-atamu. Gwa ha sị, ‘Nʼanyasị taa, unu ga-ata anụ, nʼụtụtụ echi unu ga-eri achịcha. Mgbe ahụ, unu ga-amata na abụ m ONYENWE ANYỊ Chineke unu.’ ” 13 Nʼoge uhuruchi ụbọchị ahụ, nnụnụ kweel bịara kpuchie ọmụma ụlọ ikwu ahụ. Nʼisi ụtụtụ echi ya, igirigi dakwara gburugburu ọmụma ụlọ ikwu ahụ. 14 Mgbe ala kọrọ mmiri igirigi ahụ, ihe dịka achịcha mbadamba nta jupụtara nʼala ọzara ahụ niile. 15 Mgbe ụmụ Izrel hụrụ ya, ha jụrịtara onwe ha ajụjụ sị, “Gịnị bụ nke a?”Mosis zaghachiri ha sị, “Ọ bụ achịcha ONYENWE ANYỊ nyere unu ka unu rie. 16 Ihe ndị a bụ iwu ONYENWE ANYỊ nyere, ‘Ka onye ọbụla chịkọta naanị nke ọ ga-ericha. Ihe ọtụtụ ọmaa maka otu onye dịka ọnụọgụgụ ha si dị nʼezinaụlọ.’ ” 17 Ụmụ Izrel mere dịka a gwara ha, ụfọdụ chịkọtara nke hiri nne, ụfọdụ nke dị nta. 18 Mgbe ha ji ihe ọtụtụ ọmaa tụọ ya, ha chọpụtara na onye chịkọtara hie nne enweghị karịa nke zuru ya, onye chịkọtakwara nke nta, ọ dịghị ihe fọdụrụ ya inweta. Onye ọbụla chịkọtara dị ka ihe ga-ezuru ya si dị. 19 Mosis gwara ha sị, “Ka onye ọbụla hụ na o nweghị nke ga-afọdụ ruo ụtụtụ echi ya.” 20 Ma ụfọdụ nʼime ha egeghị Mosis ntị. Ha rifọrọ nri ahụ debe ya. Ma mgbe chi echi ya bọrọ, ha chọpụtara na ha ereela ure jupụta nʼikpuru, ma na-esikwa isi dị njọ. Mosis were iwe dị ukwuu megide ụmụ Izrel nʼihi ya. 21 Site nʼụbọchị ahụ, gaa nʼihu, ezinaụlọ ọbụla na-ewebata nri nʼụtụtụ ọbụla, dịka mkpa ha siri dị. Mgbe anwụ wara, nri ahụ niile fọdụrụ na-agbaze. 22 Nʼụbọchị nke isii, ha na-ewere nri okpukpu abụọ karịa ka ha na-ewe nʼụbọchị ndị ọzọ. Mgbe ndịisi nzukọ Izrel hụrụ mgbanwe dị otu a, ha bịara kọọrọ Mosis. 23 Mosis zara sị ha, “Nke a bụ iwu ONYENWE ANYỊ nyere: ‘Ụbọchị echi bụ ụbọchị izuike, ụbọchị nke asaa dị nsọ nye ONYENWE ANYỊ. Ya mere, sienụ ihe niile unu nwere isi taa, nʼihi na unu agaghị esi ihe ọbụla echi. Nri ọbụla unu rifọrọ, hapụnụ ya ka ọ bụrụ nri unu ga-eri echi.’ ” 24 Ha mere dịka Mosis gwara ha. Mgbe chi echi bọrọ, ha chọpụtara na nri ha dị mma dịkwa ụtọ, ikpuru adịghịkwa nʼime ya. 25 Mosis gwara ha sị, “Nke a ga-abụ ihe oriri unu taa, nʼihi na ọ bụ ụbọchị izuike nye ONYENWE ANYỊ. Ọ dịghị nri unu ga-ahụ nke unu ga-achịkọta taa. 26 Abalị isii ka unu ga-achịkọta nri unu ga-eri. Ma nʼabalị nke asaa bụ ụbọchị izuike, unu agaghị ahụ nri unu ga-achịkọta.” 27 Ụfọdụ lefuru ọkwa ahụ Mosis maara ha anya. Ha pụrụ nʼụbọchị izuike ahụ ịchọ nri, ma o nweghị nke ha nwetara. 28 Nʼihi nke a, ONYENWE ANYỊ jụrụ Mosis ajụjụ sị ya, “Ruo ole mgbe ka unu ga-anọgide na-enupu isi nʼiwu m na ịdọ aka na ntị m? 29 Lee, ONYENWE ANYỊ enyela unu ụbọchị izuike. Ya mere, nʼụbọchị nke isii ọ na-enye unu nri ga-ezuru unu abalị abụọ. Onye ọbụla nʼime unu kwesiri ịnọgide nʼụlọ unu. Unu ekwesighị ịpụ apụ.” 30 Nʼihi nke a, ndị Izrel niile zuru ike nʼụbọchị nke asaa. 31 Ndị Izrel kpọkwara aha nri ahụ ha na-achịkọta mánà. Ọ dị ọcha dịka mkpụrụ kọrianda. Ọ na-atọkwa ụtọ dịka achịcha e ji mmanụ aṅụ mee. 32 Emesịa, Mosis gara nʼihu gwa ha okwu sị, “ONYENWE ANYỊ enyela iwu sị, ‘Na unu ga-eji ihe ọtụtụ ọmaa tụpụta mánà nke unu ga-edebe. Ọ ga-abụ ihe ncheta ga-adịrị ọgbọ ndị Izrel niile na-abịa nʼihu. Nʼụzọ dị otu a, ụmụ unu ga-ahụ ụdị achịcha m jiri zụọ unu nʼime ọzara mgbe m gbapụtara unu site nʼala ndị Ijipt.’ ” 33 Nʼihi nke a, Mosis nyere Erọn iwu sị ya, “Tụrụ ọtụtụ ọmaa mánà tinye ya nʼime ite nta. Bute ya debe ya nʼihu ONYENWE ANYỊ, ka ọ bụrụ ihe ga-adịgide nye ọgbọ dị nʼihu.” 34 Emesịa, Erọn dọnyere mánà a nʼihu Ihe Ama e debere nʼime ụlọ ikwu, dịka ONYENWE ANYỊ nyere Mosis nʼiwu. 35 Ndị Izrel niile riri mánà ndị a iri afọ anọ tutu ruo mgbe ha batara nʼala ebe ndị mmadụ bi, tutu ruo mgbe ha bịarutere nʼoke ala Kenan. 36 (Ihe ọtụtụ ọmaa bụ otu ọtụtụ nʼime ọtụtụ iri nke ga-eju ihe ọtụtụ efaf.)

In Other Versions

Exodus 16 in the ANGEFD

Exodus 16 in the ANTPNG2D

Exodus 16 in the AS21

Exodus 16 in the BAGH

Exodus 16 in the BBPNG

Exodus 16 in the BBT1E

Exodus 16 in the BDS

Exodus 16 in the BEV

Exodus 16 in the BHAD

Exodus 16 in the BIB

Exodus 16 in the BLPT

Exodus 16 in the BNT

Exodus 16 in the BNTABOOT

Exodus 16 in the BNTLV

Exodus 16 in the BOATCB

Exodus 16 in the BOATCB2

Exodus 16 in the BOBCV

Exodus 16 in the BOCNT

Exodus 16 in the BOECS

Exodus 16 in the BOGWICC

Exodus 16 in the BOHCB

Exodus 16 in the BOHCV

Exodus 16 in the BOHLNT

Exodus 16 in the BOHNTLTAL

Exodus 16 in the BOILNTAP

Exodus 16 in the BOITCV

Exodus 16 in the BOKCV

Exodus 16 in the BOKCV2

Exodus 16 in the BOKHWOG

Exodus 16 in the BOKSSV

Exodus 16 in the BOLCB

Exodus 16 in the BOLCB2

Exodus 16 in the BOMCV

Exodus 16 in the BONAV

Exodus 16 in the BONCB

Exodus 16 in the BONLT

Exodus 16 in the BONUT2

Exodus 16 in the BOPLNT

Exodus 16 in the BOSCB

Exodus 16 in the BOSNC

Exodus 16 in the BOTLNT

Exodus 16 in the BOVCB

Exodus 16 in the BOYCB

Exodus 16 in the BPBB

Exodus 16 in the BPH

Exodus 16 in the BSB

Exodus 16 in the CCB

Exodus 16 in the CUV

Exodus 16 in the CUVS

Exodus 16 in the DBT

Exodus 16 in the DGDNT

Exodus 16 in the DHNT

Exodus 16 in the DNT

Exodus 16 in the ELBE

Exodus 16 in the EMTV

Exodus 16 in the ESV

Exodus 16 in the FBV

Exodus 16 in the FEB

Exodus 16 in the GGMNT

Exodus 16 in the GNT

Exodus 16 in the HARY

Exodus 16 in the HNT

Exodus 16 in the IRVA

Exodus 16 in the IRVB

Exodus 16 in the IRVG

Exodus 16 in the IRVH

Exodus 16 in the IRVK

Exodus 16 in the IRVM

Exodus 16 in the IRVM2

Exodus 16 in the IRVO

Exodus 16 in the IRVP

Exodus 16 in the IRVT

Exodus 16 in the IRVT2

Exodus 16 in the IRVU

Exodus 16 in the ISVN

Exodus 16 in the JSNT

Exodus 16 in the KAPI

Exodus 16 in the KBT1ETNIK

Exodus 16 in the KBV

Exodus 16 in the KJV

Exodus 16 in the KNFD

Exodus 16 in the LBA

Exodus 16 in the LBLA

Exodus 16 in the LNT

Exodus 16 in the LSV

Exodus 16 in the MAAL

Exodus 16 in the MBV

Exodus 16 in the MBV2

Exodus 16 in the MHNT

Exodus 16 in the MKNFD

Exodus 16 in the MNG

Exodus 16 in the MNT

Exodus 16 in the MNT2

Exodus 16 in the MRS1T

Exodus 16 in the NAA

Exodus 16 in the NASB

Exodus 16 in the NBLA

Exodus 16 in the NBS

Exodus 16 in the NBVTP

Exodus 16 in the NET2

Exodus 16 in the NIV11

Exodus 16 in the NNT

Exodus 16 in the NNT2

Exodus 16 in the NNT3

Exodus 16 in the PDDPT

Exodus 16 in the PFNT

Exodus 16 in the RMNT

Exodus 16 in the SBIAS

Exodus 16 in the SBIBS

Exodus 16 in the SBIBS2

Exodus 16 in the SBICS

Exodus 16 in the SBIDS

Exodus 16 in the SBIGS

Exodus 16 in the SBIHS

Exodus 16 in the SBIIS

Exodus 16 in the SBIIS2

Exodus 16 in the SBIIS3

Exodus 16 in the SBIKS

Exodus 16 in the SBIKS2

Exodus 16 in the SBIMS

Exodus 16 in the SBIOS

Exodus 16 in the SBIPS

Exodus 16 in the SBISS

Exodus 16 in the SBITS

Exodus 16 in the SBITS2

Exodus 16 in the SBITS3

Exodus 16 in the SBITS4

Exodus 16 in the SBIUS

Exodus 16 in the SBIVS

Exodus 16 in the SBT

Exodus 16 in the SBT1E

Exodus 16 in the SCHL

Exodus 16 in the SNT

Exodus 16 in the SUSU

Exodus 16 in the SUSU2

Exodus 16 in the SYNO

Exodus 16 in the TBIAOTANT

Exodus 16 in the TBT1E

Exodus 16 in the TBT1E2

Exodus 16 in the TFTIP

Exodus 16 in the TFTU

Exodus 16 in the TGNTATF3T

Exodus 16 in the THAI

Exodus 16 in the TNFD

Exodus 16 in the TNT

Exodus 16 in the TNTIK

Exodus 16 in the TNTIL

Exodus 16 in the TNTIN

Exodus 16 in the TNTIP

Exodus 16 in the TNTIZ

Exodus 16 in the TOMA

Exodus 16 in the TTENT

Exodus 16 in the UBG

Exodus 16 in the UGV

Exodus 16 in the UGV2

Exodus 16 in the UGV3

Exodus 16 in the VBL

Exodus 16 in the VDCC

Exodus 16 in the YALU

Exodus 16 in the YAPE

Exodus 16 in the YBVTP

Exodus 16 in the ZBP