Exodus 17 (BOICB)
1 Ọgbakọ ụmụ Izrel niile sitere nʼọzara Sin bilie ije ha, na-aga site nʼotu ebe ruo nʼebe ọzọ dịka ONYENWE ANYỊ nyere nʼiwu. Ha mara ụlọ ikwu ha na Refidim, ma ọ dịghị mmiri dị nke ndị mmadụ ga-aṅụ. 2 Nʼihi nke a, ha sesịrị Mosis okwu, sị, “Nye anyị mmiri ka anyị ṅụọ.”Mosis zara, sị, “Gịnị mere unu ji esesị m okwu? Gịnị mere unu ji chọọ ịnwapụta ntachiobi ONYENWE ANYỊ?” 3 Ma akpịrị mmiri kpọrọ ndị a nkụ nʼebe ahụ, nke a mere ka ha tamuo ntamu megide Mosis. Ha sịrị, “Ọ bụkwa nʼihi gịnị ka i ji site nʼobodo Ijipt kpọpụta anyị, ime ka anyị, ụmụntakịrị anyị na anụ ụlọ anyị nwụọ nʼihi akpịrị ịkpọ nkụ?” 4 Nʼihi ya, Mosis tikuru ONYENWE ANYỊ mkpu akwa sị, “Gịnị ka m ga-eme banyere ndị a. Lee, ha chọrọ itugbu m na nkume.” 5 Ma ONYENWE ANYỊ zaghachiri Mosis, sị ya, “Gaa nʼihu ndị a, kpọrọ ụfọdụ nʼime ndị okenye Izrel. Jirikwa mkpanaka ahụ nʼaka gị, bụ nke i tiri nʼelu osimiri Naịl gaa. 6 Lee, Aga m eguzo nʼihu gị nʼakụkụ nkume dị na Horeb. Ị ga-akụ mkpara gị nʼelu nkume ahụ. Mmiri ga-asọpụtakwa site na ya, ka ndị mmadụ ṅụọ.” Ya mere, Mosis mere otu a nʼihu ndị okenye Izrel niile. 7 Nʼihi nke a, ọ kpọrọ aha ebe ahụ Masa na Meriba nʼihi esemokwu ụmụ Izrel na nʼihi nwale ha nwalere ONYENWE ANYỊ, na-asị, “ONYENWE ANYỊ ọ nọnyeere anyị, ka ọ bụ na ọ nọnyereghị anyị?” 8 Ndị Amalek bịara lụso ụmụ Izrel agha na Refidim. 9 Mosis gwara Joshua okwu sị ya, “Họpụta ụfọdụ ndị ikom ka ha gaa lụso ndị Amalek agha. Echi, mụ onwe m ga-eguzoro nʼelu ugwu, jidekwa mkpara Chineke nʼaka m.” 10 Ya mere, Joshua pụrụ gaa lụso ndị Amalek agha dịka Mosis gwara ya. Ma Mosis na Erọn na Hua, rigoro nʼelu ugwu ahụ. 11 Ndị Izrel na-enwe mmeri mgbe ọbụla Mosis weliri aka ya elu, ma ndị Amalek na-emeri mgbe ọbụla Mosis wedatara aka ya. 12 Mgbe ike gwụrụ aka Mosis, ha butere nkume tinye nʼokpuru ya mee ka ọ nọkwasị nʼelu ya. Erọn na Hua jidere aka Mosis abụọ welie ya elu, otu onye nʼakụkụ a, onye nke ọzọ nʼakụkụ nke ọzọ. Ime ka aka Mosis guzosie ike tutu ruo mgbe anwụ dara. 13 Nʼihi nke a, Joshua na ndị agha ya meriri ndị agha Amalek site nʼiji mma agha gbuo ha. 14 Emesịa, ONYENWE ANYỊ sịrị Mosis, “Dee ihe niile ndị a nʼakwụkwọ, ka ọ bụrụ ihe ncheta. Gụgharịakwa ya na ntị Joshua. Nʼihi na aga m ehichapụ ihe niile a ga-eji cheta Amalek nʼelu ụwa.” 15 Mosis wuru ebe ịchụ aja nye ONYENWE ANYỊ. Ọ kpọrọ ya ONYENWE ANYỊ Nisi, nke pụtara, ONYENWE ANYỊ bụ ọkọlọtọ m. 16 Mosis sịrị, “Nʼihi na-eweliri aka elu nʼebe ocheeze ONYENWE ANYỊ dị. ONYENWE ANYỊ ga na-ebuso ndị Amalek agha site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.”
In Other Versions
Exodus 17 in the ANGEFD
Exodus 17 in the ANTPNG2D
Exodus 17 in the AS21
Exodus 17 in the BAGH
Exodus 17 in the BBPNG
Exodus 17 in the BBT1E
Exodus 17 in the BDS
Exodus 17 in the BEV
Exodus 17 in the BHAD
Exodus 17 in the BIB
Exodus 17 in the BLPT
Exodus 17 in the BNT
Exodus 17 in the BNTABOOT
Exodus 17 in the BNTLV
Exodus 17 in the BOATCB
Exodus 17 in the BOATCB2
Exodus 17 in the BOBCV
Exodus 17 in the BOCNT
Exodus 17 in the BOECS
Exodus 17 in the BOGWICC
Exodus 17 in the BOHCB
Exodus 17 in the BOHCV
Exodus 17 in the BOHLNT
Exodus 17 in the BOHNTLTAL
Exodus 17 in the BOILNTAP
Exodus 17 in the BOITCV
Exodus 17 in the BOKCV
Exodus 17 in the BOKCV2
Exodus 17 in the BOKHWOG
Exodus 17 in the BOKSSV
Exodus 17 in the BOLCB
Exodus 17 in the BOLCB2
Exodus 17 in the BOMCV
Exodus 17 in the BONAV
Exodus 17 in the BONCB
Exodus 17 in the BONLT
Exodus 17 in the BONUT2
Exodus 17 in the BOPLNT
Exodus 17 in the BOSCB
Exodus 17 in the BOSNC
Exodus 17 in the BOTLNT
Exodus 17 in the BOVCB
Exodus 17 in the BOYCB
Exodus 17 in the BPBB
Exodus 17 in the BPH
Exodus 17 in the BSB
Exodus 17 in the CCB
Exodus 17 in the CUV
Exodus 17 in the CUVS
Exodus 17 in the DBT
Exodus 17 in the DGDNT
Exodus 17 in the DHNT
Exodus 17 in the DNT
Exodus 17 in the ELBE
Exodus 17 in the EMTV
Exodus 17 in the ESV
Exodus 17 in the FBV
Exodus 17 in the FEB
Exodus 17 in the GGMNT
Exodus 17 in the GNT
Exodus 17 in the HARY
Exodus 17 in the HNT
Exodus 17 in the IRVA
Exodus 17 in the IRVB
Exodus 17 in the IRVG
Exodus 17 in the IRVH
Exodus 17 in the IRVK
Exodus 17 in the IRVM
Exodus 17 in the IRVM2
Exodus 17 in the IRVO
Exodus 17 in the IRVP
Exodus 17 in the IRVT
Exodus 17 in the IRVT2
Exodus 17 in the IRVU
Exodus 17 in the ISVN
Exodus 17 in the JSNT
Exodus 17 in the KAPI
Exodus 17 in the KBT1ETNIK
Exodus 17 in the KBV
Exodus 17 in the KJV
Exodus 17 in the KNFD
Exodus 17 in the LBA
Exodus 17 in the LBLA
Exodus 17 in the LNT
Exodus 17 in the LSV
Exodus 17 in the MAAL
Exodus 17 in the MBV
Exodus 17 in the MBV2
Exodus 17 in the MHNT
Exodus 17 in the MKNFD
Exodus 17 in the MNG
Exodus 17 in the MNT
Exodus 17 in the MNT2
Exodus 17 in the MRS1T
Exodus 17 in the NAA
Exodus 17 in the NASB
Exodus 17 in the NBLA
Exodus 17 in the NBS
Exodus 17 in the NBVTP
Exodus 17 in the NET2
Exodus 17 in the NIV11
Exodus 17 in the NNT
Exodus 17 in the NNT2
Exodus 17 in the NNT3
Exodus 17 in the PDDPT
Exodus 17 in the PFNT
Exodus 17 in the RMNT
Exodus 17 in the SBIAS
Exodus 17 in the SBIBS
Exodus 17 in the SBIBS2
Exodus 17 in the SBICS
Exodus 17 in the SBIDS
Exodus 17 in the SBIGS
Exodus 17 in the SBIHS
Exodus 17 in the SBIIS
Exodus 17 in the SBIIS2
Exodus 17 in the SBIIS3
Exodus 17 in the SBIKS
Exodus 17 in the SBIKS2
Exodus 17 in the SBIMS
Exodus 17 in the SBIOS
Exodus 17 in the SBIPS
Exodus 17 in the SBISS
Exodus 17 in the SBITS
Exodus 17 in the SBITS2
Exodus 17 in the SBITS3
Exodus 17 in the SBITS4
Exodus 17 in the SBIUS
Exodus 17 in the SBIVS
Exodus 17 in the SBT
Exodus 17 in the SBT1E
Exodus 17 in the SCHL
Exodus 17 in the SNT
Exodus 17 in the SUSU
Exodus 17 in the SUSU2
Exodus 17 in the SYNO
Exodus 17 in the TBIAOTANT
Exodus 17 in the TBT1E
Exodus 17 in the TBT1E2
Exodus 17 in the TFTIP
Exodus 17 in the TFTU
Exodus 17 in the TGNTATF3T
Exodus 17 in the THAI
Exodus 17 in the TNFD
Exodus 17 in the TNT
Exodus 17 in the TNTIK
Exodus 17 in the TNTIL
Exodus 17 in the TNTIN
Exodus 17 in the TNTIP
Exodus 17 in the TNTIZ
Exodus 17 in the TOMA
Exodus 17 in the TTENT
Exodus 17 in the UBG
Exodus 17 in the UGV
Exodus 17 in the UGV2
Exodus 17 in the UGV3
Exodus 17 in the VBL
Exodus 17 in the VDCC
Exodus 17 in the YALU
Exodus 17 in the YAPE
Exodus 17 in the YBVTP
Exodus 17 in the ZBP