Exodus 23 (BOICB)

1 “Ị gaghị agbasa akụkọ ụgha ọbụla. Esokwala mmadụ ọjọọ nwekọọ ihe ọbụla site nʼịgba ama ị maara na ọ bụghị eziokwu. 2 “Ị gaghị eso igwe mmadụ mee ihe ọjọọ. Mgbe ị na-agba akaebe nʼụlọikpe, ị gaghị esonye igwe mmadụ ndị na-atụgharị ikpe ziri ezi. 3 Nʼebe nwa ogbenye nọ, ị gaghị ekpelara ya nʼoge ikpe nʼihi na ọ bụ nwa ogbenye. 4 “Ọ bụrụ na ị hụ ehi, maọbụ ịnyịnya ibu nke kpafuru akpafu, ọ bụrụkwa na ọ bụ nke onye iro gị, duru ya dulatara onye iro gị ahụ. 5 Ọ bụrụ na ị hụ onye kpọrọ gị asị ka ọ na-agbalị iwelite ịnyịnya ibu ya nke dara nʼihi ibu dị arọ o bu, elefula ya anya, kama gaa nyere ya aka bulite ịnyịnya ahụ. 6 “Ewezugala ikpe ziri ezi nʼebe ndị ogbenye nọ, nʼihi ọnọdụ ogbenye ha. 7 Ebola mmadụ ibe gị ebubo ụgha. Esonyekwala gbuo onye aka ya dị ọcha, maọbụ onye na-eme ihe ziri ezi. Nʼihi na mụ onwe m agaghị ahapụ onye na-emebi iwu na-ataghị ya ahụhụ kwesiri ya. 8 “Erikwala ngarị, nʼihi na iri ngarị na-eme ka ndị na-ahụ ụzọ kpuo ìsì, meekwa ka okwu onye aka ya dị ọcha gbagọọ agbagọ. 9 “Abụkwala onye na-emegbu ndị ọbịa, nʼihi na ị maara ihe banyere ọnọdụ ndị ọbịa nke ọma. Gị onwe gị bụrịị ọbịa nʼIjipt. 10 “Afọ isi ka ị ga-agha mkpụrụ nʼala ubi gị, ghọọkwa ihe omume ya. 11 Ma nʼafọ nke asaa, arụla ọrụ ọbụla nʼala ahụ ọzọ, hapụ ka ala ahụ zuru ike. Mgbe ahụ ndị ogbenye nʼetiti unu ga-aga nʼebe ahụ weta ihe oriri. Mkpụrụ ndị ọzọ fọdụrụ ga-adịrị ụmụ anụ ọhịa dị iche iche. Iwu ndị a ga-adịrị ubi vaịnị na ubi oliv unu niile. 12 “Ị ga-arụ ọrụ gị niile nʼime ụbọchị isii. Ị ga-ezukwa ike nʼụbọchị nke asaa. Izuike a ga-adịkwara ehi gị na ịnyịnya ibu gị, na ndị ohu gị nọ nʼezinaụlọ gị na ndị ọbịa niile bi nʼetiti unu. 13 “Kpachapụnụ anya hụ na unu mezuru ihe niile ndị a m gwara unu. Unu akpọkwala chi ndị ọzọ aha. Unu ekwupụtakwala ihe banyere ha nʼọnụ unu. 14 “Ugboro atọ nʼafọ ka unu ga-emere m mmemme a. 15 “Meenụ Mmemme Achịcha na-ekoghị eko, ụbọchị asaa ka unu ga-eri achịcha nke e jighị ihe na-eko achịcha mee. Unu ga-eri ya na mgbe a kara aka, nʼọnwa Abib. Nʼihi na ọ bụ nʼọnwa ahụ ka unu si nʼala Ijipt pụta.“Ọ dịghị onye ọbụla ga-agba aka efu bịa nʼihu m. 16 “Mee Mmemme Owuwe Ihe ubi, bụ nke ị ga-eji mkpụrụ mbụ nke ihe niile ị kụrụ nʼubi unu.“Meekwanụ Mmemme Nchịkọta Ihe, nʼọgwụgwụ afọ ọbụla. Mgbe unu si nʼubi na-achịbata mkpụrụ ubi unu niile. 17 “Ugbo atọ nʼafọ ka ndị ikom niile ga-abịa chee onwe ha nʼihu Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ. 18 “Unu etinyekwala ihe ọbụla nke nwere ihe na-eko achịcha nʼime ya, mgbe unu na-achụ ọbara nke aja nʼihu m.“Maọbụ hapụ abụba nke aja mmemme m ka ọ dịgide ruo ụtụtụ. 19 “Wetanụ mkpụrụ mbụ niile nke ala ubi unu, bụ ndị kachasị mma, nʼụlọ ONYENWE ANYỊ bụ Chineke unu.“Unu esikwala nwa ewu nʼime mmiri ara nne ya. 20 “Lee, ana m eziga mmụọ ozi nʼihu unu, ichebe unu nʼije unu nakwa ịkpọbatakwa unu nʼebe ahụ M doziri nye unu. 21 Geenụ ya ntị, nụrụkwa olu ya. Unu enupukwarala ya isi, nʼihi na ọ gaghị agbaghara njehie unu niile, nʼihi na Aha m dị nʼime ya. 22 Ọ bụrụ na unu elezie anya nke ọma, gee ya ntị, mee ihe niile m nyere unu nʼiwu, mgbe ahụ, mụ onwe m ga-abụkwara ndị iro unu onye iro, megidekwa ndị na-emegide unu. 23 Mmụọ ozi m ga-ejekwa nʼihu unu, ịkpọbatakwa unu nʼala ndị Amọrait, na ndị Het, na ndị Periz, na ndị Kenan, na ndị Hiv, na ndị Jebus. Aga m ehichapụ obodo ndị a niile. 24 Unu agaghị akpọ isiala nye chi ha niile. Unu efekwala ha, maọbụ gbasoro omenaala ha. Kama, kwatuonụ ha. Tipịasịakwanụ ebe nkume nsọ niile nke chi ha. 25 Ma unu ga-efe ONYENWE ANYỊ bụ Chineke unu. Mgbe ahụ, ngọzị ya ga-adịkwasị nri unu na mmiri ọṅụṅụ unu. Aga m ewezugakwa ọrịa nʼetiti unu. 26 Nwanyị aga na nwanyị ime ya na-apụ agaghị adị nʼala unu. Aga m emekwa ka unu nwee ogologo ndụ. 27 “Aga m ezipu oke ụjọ m ka ọ nọrọ unu nʼihu tinye ọgbaaghara nʼime mba niile unu ga-ezute. Aga m eme ka ndị iro unu tụgharịa gbaa ọsọ. 28 Ọzọkwa, aga m eziga ebu ka ọ chụpụ ndị Hiv na ndị Kenan na ndị Het site nʼụzọ unu. 29 Ma agaghị m achụpụ ha nʼotu afọ, nʼihi na nke a ga-eme ka ala ahụ niile tọgbọrọ nʼefu, ụmụ anụ ọhịa a baa ụba karịa unu. 30 Ma aga m achụpụ ha nwantịntị nwantịntị, tutu ruo oge unu ga-adị ọtụtụ, mgbe ọnụọgụgụ unu ga-akarị nke ha ukwuu, mgbe unu ga-ejupụta ala ahụ niile. 31 “Aga m etinye oke ala unu site nʼOsimiri Uhie ruo nʼosimiri Mediterenịa, sitekwa nʼọzara ruo nʼosimiri Yufretis. Aga m enyefe ndị niile bi nʼala ahụ nʼaka unu. Unu ga-achụpụkwa ha. 32 Unu na ha agbala ndụ ọbụla. Unu na chi ha enwekwala mmekọ ọbụla. 33 Unu ekwela ka ha biri nʼala unu, ma ọ bụghị ya, ha ga-eme ka unu mehie megide m, nʼihi nʼife chi ha dị iche iche aghaghị ịbụrụ unu ihe ịma nʼọnya.”

In Other Versions

Exodus 23 in the ANGEFD

Exodus 23 in the ANTPNG2D

Exodus 23 in the AS21

Exodus 23 in the BAGH

Exodus 23 in the BBPNG

Exodus 23 in the BBT1E

Exodus 23 in the BDS

Exodus 23 in the BEV

Exodus 23 in the BHAD

Exodus 23 in the BIB

Exodus 23 in the BLPT

Exodus 23 in the BNT

Exodus 23 in the BNTABOOT

Exodus 23 in the BNTLV

Exodus 23 in the BOATCB

Exodus 23 in the BOATCB2

Exodus 23 in the BOBCV

Exodus 23 in the BOCNT

Exodus 23 in the BOECS

Exodus 23 in the BOGWICC

Exodus 23 in the BOHCB

Exodus 23 in the BOHCV

Exodus 23 in the BOHLNT

Exodus 23 in the BOHNTLTAL

Exodus 23 in the BOILNTAP

Exodus 23 in the BOITCV

Exodus 23 in the BOKCV

Exodus 23 in the BOKCV2

Exodus 23 in the BOKHWOG

Exodus 23 in the BOKSSV

Exodus 23 in the BOLCB

Exodus 23 in the BOLCB2

Exodus 23 in the BOMCV

Exodus 23 in the BONAV

Exodus 23 in the BONCB

Exodus 23 in the BONLT

Exodus 23 in the BONUT2

Exodus 23 in the BOPLNT

Exodus 23 in the BOSCB

Exodus 23 in the BOSNC

Exodus 23 in the BOTLNT

Exodus 23 in the BOVCB

Exodus 23 in the BOYCB

Exodus 23 in the BPBB

Exodus 23 in the BPH

Exodus 23 in the BSB

Exodus 23 in the CCB

Exodus 23 in the CUV

Exodus 23 in the CUVS

Exodus 23 in the DBT

Exodus 23 in the DGDNT

Exodus 23 in the DHNT

Exodus 23 in the DNT

Exodus 23 in the ELBE

Exodus 23 in the EMTV

Exodus 23 in the ESV

Exodus 23 in the FBV

Exodus 23 in the FEB

Exodus 23 in the GGMNT

Exodus 23 in the GNT

Exodus 23 in the HARY

Exodus 23 in the HNT

Exodus 23 in the IRVA

Exodus 23 in the IRVB

Exodus 23 in the IRVG

Exodus 23 in the IRVH

Exodus 23 in the IRVK

Exodus 23 in the IRVM

Exodus 23 in the IRVM2

Exodus 23 in the IRVO

Exodus 23 in the IRVP

Exodus 23 in the IRVT

Exodus 23 in the IRVT2

Exodus 23 in the IRVU

Exodus 23 in the ISVN

Exodus 23 in the JSNT

Exodus 23 in the KAPI

Exodus 23 in the KBT1ETNIK

Exodus 23 in the KBV

Exodus 23 in the KJV

Exodus 23 in the KNFD

Exodus 23 in the LBA

Exodus 23 in the LBLA

Exodus 23 in the LNT

Exodus 23 in the LSV

Exodus 23 in the MAAL

Exodus 23 in the MBV

Exodus 23 in the MBV2

Exodus 23 in the MHNT

Exodus 23 in the MKNFD

Exodus 23 in the MNG

Exodus 23 in the MNT

Exodus 23 in the MNT2

Exodus 23 in the MRS1T

Exodus 23 in the NAA

Exodus 23 in the NASB

Exodus 23 in the NBLA

Exodus 23 in the NBS

Exodus 23 in the NBVTP

Exodus 23 in the NET2

Exodus 23 in the NIV11

Exodus 23 in the NNT

Exodus 23 in the NNT2

Exodus 23 in the NNT3

Exodus 23 in the PDDPT

Exodus 23 in the PFNT

Exodus 23 in the RMNT

Exodus 23 in the SBIAS

Exodus 23 in the SBIBS

Exodus 23 in the SBIBS2

Exodus 23 in the SBICS

Exodus 23 in the SBIDS

Exodus 23 in the SBIGS

Exodus 23 in the SBIHS

Exodus 23 in the SBIIS

Exodus 23 in the SBIIS2

Exodus 23 in the SBIIS3

Exodus 23 in the SBIKS

Exodus 23 in the SBIKS2

Exodus 23 in the SBIMS

Exodus 23 in the SBIOS

Exodus 23 in the SBIPS

Exodus 23 in the SBISS

Exodus 23 in the SBITS

Exodus 23 in the SBITS2

Exodus 23 in the SBITS3

Exodus 23 in the SBITS4

Exodus 23 in the SBIUS

Exodus 23 in the SBIVS

Exodus 23 in the SBT

Exodus 23 in the SBT1E

Exodus 23 in the SCHL

Exodus 23 in the SNT

Exodus 23 in the SUSU

Exodus 23 in the SUSU2

Exodus 23 in the SYNO

Exodus 23 in the TBIAOTANT

Exodus 23 in the TBT1E

Exodus 23 in the TBT1E2

Exodus 23 in the TFTIP

Exodus 23 in the TFTU

Exodus 23 in the TGNTATF3T

Exodus 23 in the THAI

Exodus 23 in the TNFD

Exodus 23 in the TNT

Exodus 23 in the TNTIK

Exodus 23 in the TNTIL

Exodus 23 in the TNTIN

Exodus 23 in the TNTIP

Exodus 23 in the TNTIZ

Exodus 23 in the TOMA

Exodus 23 in the TTENT

Exodus 23 in the UBG

Exodus 23 in the UGV

Exodus 23 in the UGV2

Exodus 23 in the UGV3

Exodus 23 in the VBL

Exodus 23 in the VDCC

Exodus 23 in the YALU

Exodus 23 in the YAPE

Exodus 23 in the YBVTP

Exodus 23 in the ZBP