Exodus 27 (BOICB)
1 “Ị ga-eji osisi akashia wuo ebe ịchụ aja. Ịdị elu ya ga-abụ otu mita na iri sentimita anọ. Ogologo ya na obosara ya ga-aha nʼotu, mita abụọ na iri sentimita atọ, mita abụọ na iri sentimita atọ. 2 Rụnye mpi nʼakụkụ anọ nke ebe ịchụ aja ahụ nʼotu nʼotu. Mee ka mpi ndị a na ebe ịchụ aja ahụ bụrụ ihe e jikọtara nʼotu. Jiri bronz machie ebe ịchụ aja a. 3 Jiri bronz kpụọ ngwongwo niile dị iche iche, ya bụ efere ikpofu ntụ, shọvel ya niile, efere ịkwọsa mmiri niile, ngaji eze ịdụta anụ na efere ndị e ji agụ ọkụ. 4 Ị ga-eme ngịga mbadamba, ihe ọkpụkpa bronz, meekwa mgbaaka bronz nke ga-adị nʼakụkụ anọ nke ngịga ahụ. 5 Tinye ya nʼokpuru oghere dị nʼebe ịchụ aja ahụ. Tinye ya ka ọ dịrị nʼetiti ebe ịchụ aja ahụ. 6 Jiri osisi akashia mee mkpara osisi maka ebe ịchụ aja ahụ, were bronz machie ha. 7 A ga-eme ka mkpara ahụ baa nʼime mgbaaka ndị ahụ, ka ha dị nʼakụkụ abụọ nke ebe ịchụ aja ahụ mgbe ọbụla a na-ebu ya. 8 Jiri obodobo osisi rụọ ebe ịchụ aja ahụ, ka o nwee oghere nʼime, dịka igbe. Ị ga-arụ ya dịka e gosiri gị nʼelu ugwu ahụ. 9 “Ị ga-arụkwa ogige maka ụlọ nzute ahụ. Nʼakụkụ ndịda ya ga-adị iri mita anọ na ise nʼogologo. Ọ ga-enwekwa akwa mgbochi nke e ji ezi akwa ọcha a kpara nke ọma mee. 10 Iri ogidi abụọ ga-adị na iri ebe ndọkwasị abụọ nke e ji bronz kpụọ. Anya nko ogidi ndị ahụ ha na ihe ikegide ha ga-abụ ọlaọcha. 11 Otu a kwa, akụkụ ugwu ga-adịkwa iri mita anọ na ise. Ọ ga-enwe akwa mgbochi, nwekwa iri ogidi abụọ na iri ebe ndọkwasị abụọ nke e ji bronz kpụọ, ya na anya nko nke ọlaọcha na ihe e ji ekegide ha nʼogidi ahụ. 12 “Akụkụ ọdịda anyanwụ nke ogige ahụ ga-adị iri mita abụọ na atọ nʼobosara. Ọ ga-enwe akwa mgbochi, na ogidi iri na ebe ndọkwasị iri. 13 Nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, ebe anwụ na-awalite, akwa mgbochi ahụ ga-adịkwa iri mita abụọ na atọ nʼobosara. 14 Akwa mgbochi nke ogologo ya dị mita isii na sentimita iri asatọ ga-adị nʼotu akụkụ nke ọnụ ụzọ mbata ahụ. O nwere ogidi atọ na ebe ndọkwasị atọ. 15 Otu a kwa, akwa mgbochi nke ịdị ogologo ya dị mita asaa ga-adị nʼakụkụ nke ọzọ. Ọ ga-enwekwa ogidi atọ na ebe ndọkwasị atọ. 16 “Banyere ọnụ ụzọ mbata nke ogige ahụ, mee akwa mgbochi ga-adị mita itoolu nke e ji ogho na-acha anụnụ anụnụ, ngwakọta anụnụ na uhie, uhie uhie na ezi akwa ọcha a kpara nke ọma, akaọrụ nke onye na-akpa ihe ịchọ mma. Ọ ga-enwe ogidi anọ na ihe ndọkwasị anọ. 17 Ogidi niile dị gburugburu ogige ahụ ga-enwe ihe njikọta ọlaọcha na nko, tinyere ebe ndọkwasị bronz. 18 Ogologo ogige ahụ ga-abụ iri mita anọ na ise. Ebe obosara ya ga-adị iri mita abụọ na atọ. Ọ ga-enwe akwa mgbochi nke ịdị elu ya dị iri mita abụọ na atọ, nke e ji ezi akwa ọcha a kpara nke ọma mee, nwekwa ebe ndọkwasị bronz. 19 Ngwongwo niile nke e ji eje ozi nʼụlọ nzute ahụ, ihe ọbụla bụ ọrụ ha, tinyere ǹtu ya niile na nke ogige ahụ, ga-abụ ihe e ji bronz rụọ. 20 “Nye ndị Izrel niile iwu ka ha wetara gị mmanụ oliv asụrụ asụ nke a na-agwaghị ihe maka itinye nʼiheọkụ ime ka ọkụ oriọna na-enwu mgbe niile. 21 Nʼime ụlọ nzute ahụ, na mpụta nke akwa mgbochi nke kpuchiri igbe Ihe Ama ahụ, Erọn na ụmụ ya ndị ikom ga-eme ka oriọna ndị ahụ dị nʼihu ONYENWE ANYỊ, na-enwu ọkụ, site nʼuhuruchi ruo nʼụtụtụ. Nke a bụ ụkpụrụ ga-adịgide nʼetiti ndị Izrel nye ọgbọ niile dị nʼihu.
In Other Versions
Exodus 27 in the ANGEFD
Exodus 27 in the ANTPNG2D
Exodus 27 in the AS21
Exodus 27 in the BAGH
Exodus 27 in the BBPNG
Exodus 27 in the BBT1E
Exodus 27 in the BDS
Exodus 27 in the BEV
Exodus 27 in the BHAD
Exodus 27 in the BIB
Exodus 27 in the BLPT
Exodus 27 in the BNT
Exodus 27 in the BNTABOOT
Exodus 27 in the BNTLV
Exodus 27 in the BOATCB
Exodus 27 in the BOATCB2
Exodus 27 in the BOBCV
Exodus 27 in the BOCNT
Exodus 27 in the BOECS
Exodus 27 in the BOGWICC
Exodus 27 in the BOHCB
Exodus 27 in the BOHCV
Exodus 27 in the BOHLNT
Exodus 27 in the BOHNTLTAL
Exodus 27 in the BOILNTAP
Exodus 27 in the BOITCV
Exodus 27 in the BOKCV
Exodus 27 in the BOKCV2
Exodus 27 in the BOKHWOG
Exodus 27 in the BOKSSV
Exodus 27 in the BOLCB
Exodus 27 in the BOLCB2
Exodus 27 in the BOMCV
Exodus 27 in the BONAV
Exodus 27 in the BONCB
Exodus 27 in the BONLT
Exodus 27 in the BONUT2
Exodus 27 in the BOPLNT
Exodus 27 in the BOSCB
Exodus 27 in the BOSNC
Exodus 27 in the BOTLNT
Exodus 27 in the BOVCB
Exodus 27 in the BOYCB
Exodus 27 in the BPBB
Exodus 27 in the BPH
Exodus 27 in the BSB
Exodus 27 in the CCB
Exodus 27 in the CUV
Exodus 27 in the CUVS
Exodus 27 in the DBT
Exodus 27 in the DGDNT
Exodus 27 in the DHNT
Exodus 27 in the DNT
Exodus 27 in the ELBE
Exodus 27 in the EMTV
Exodus 27 in the ESV
Exodus 27 in the FBV
Exodus 27 in the FEB
Exodus 27 in the GGMNT
Exodus 27 in the GNT
Exodus 27 in the HARY
Exodus 27 in the HNT
Exodus 27 in the IRVA
Exodus 27 in the IRVB
Exodus 27 in the IRVG
Exodus 27 in the IRVH
Exodus 27 in the IRVK
Exodus 27 in the IRVM
Exodus 27 in the IRVM2
Exodus 27 in the IRVO
Exodus 27 in the IRVP
Exodus 27 in the IRVT
Exodus 27 in the IRVT2
Exodus 27 in the IRVU
Exodus 27 in the ISVN
Exodus 27 in the JSNT
Exodus 27 in the KAPI
Exodus 27 in the KBT1ETNIK
Exodus 27 in the KBV
Exodus 27 in the KJV
Exodus 27 in the KNFD
Exodus 27 in the LBA
Exodus 27 in the LBLA
Exodus 27 in the LNT
Exodus 27 in the LSV
Exodus 27 in the MAAL
Exodus 27 in the MBV
Exodus 27 in the MBV2
Exodus 27 in the MHNT
Exodus 27 in the MKNFD
Exodus 27 in the MNG
Exodus 27 in the MNT
Exodus 27 in the MNT2
Exodus 27 in the MRS1T
Exodus 27 in the NAA
Exodus 27 in the NASB
Exodus 27 in the NBLA
Exodus 27 in the NBS
Exodus 27 in the NBVTP
Exodus 27 in the NET2
Exodus 27 in the NIV11
Exodus 27 in the NNT
Exodus 27 in the NNT2
Exodus 27 in the NNT3
Exodus 27 in the PDDPT
Exodus 27 in the PFNT
Exodus 27 in the RMNT
Exodus 27 in the SBIAS
Exodus 27 in the SBIBS
Exodus 27 in the SBIBS2
Exodus 27 in the SBICS
Exodus 27 in the SBIDS
Exodus 27 in the SBIGS
Exodus 27 in the SBIHS
Exodus 27 in the SBIIS
Exodus 27 in the SBIIS2
Exodus 27 in the SBIIS3
Exodus 27 in the SBIKS
Exodus 27 in the SBIKS2
Exodus 27 in the SBIMS
Exodus 27 in the SBIOS
Exodus 27 in the SBIPS
Exodus 27 in the SBISS
Exodus 27 in the SBITS
Exodus 27 in the SBITS2
Exodus 27 in the SBITS3
Exodus 27 in the SBITS4
Exodus 27 in the SBIUS
Exodus 27 in the SBIVS
Exodus 27 in the SBT
Exodus 27 in the SBT1E
Exodus 27 in the SCHL
Exodus 27 in the SNT
Exodus 27 in the SUSU
Exodus 27 in the SUSU2
Exodus 27 in the SYNO
Exodus 27 in the TBIAOTANT
Exodus 27 in the TBT1E
Exodus 27 in the TBT1E2
Exodus 27 in the TFTIP
Exodus 27 in the TFTU
Exodus 27 in the TGNTATF3T
Exodus 27 in the THAI
Exodus 27 in the TNFD
Exodus 27 in the TNT
Exodus 27 in the TNTIK
Exodus 27 in the TNTIL
Exodus 27 in the TNTIN
Exodus 27 in the TNTIP
Exodus 27 in the TNTIZ
Exodus 27 in the TOMA
Exodus 27 in the TTENT
Exodus 27 in the UBG
Exodus 27 in the UGV
Exodus 27 in the UGV2
Exodus 27 in the UGV3
Exodus 27 in the VBL
Exodus 27 in the VDCC
Exodus 27 in the YALU
Exodus 27 in the YAPE
Exodus 27 in the YBVTP
Exodus 27 in the ZBP