Exodus 3 (BOICB)

1 Nʼoge a, Mosis na-azụ igwe anụ ụlọ Jetro ọgọ ya nwoke, onye nchụaja na Midia. Otu ụbọchị, o duuru igwe anụ ụlọ ndị a gaa nʼakụkụ ọzara. Ọ batara Horeb, ugwu Chineke. 2 Nʼebe ahụ, mmụọ ozi nke ONYENWE ANYỊ mere ka ọ hụ ya nʼọkụ na-ere nʼetiti ọhịa. Mosis hụrụ na ọ bụ ezie na ọhịa ahụ na-enwu ọkụ ma ọ naghị ere ọkụ. 3 Nʼihi ya, Mosis chere nʼobi ya sị, “Aga m aga nso leruo ihe omimi a anya, otu ọkụ si enwu ma ọhịa anaghị ere ọkụ.” 4 Mgbe ONYENWE ANYỊ hụrụ na ọ tụgharịrị ka ọ hụ ihe na-eme, Chineke kpọrọ ya oku site nʼime ọhịa ahụ, “Mosis! Mosis!”Ọ sị, “Lekwa m nʼebe a.” 5 Mgbe ahụ, ọ sịrị ya, “Abịakwala nso. Yipụ akpụkpọụkwụ gị, nʼihi na ebe i guzo bụ ala dị nsọ.” 6 Ọ sịrị, “Abụ m Chineke nke nna gị. Chineke nke Ebraham, Chineke nke Aịzik na Chineke nke Jekọb.” Mosis zoro ihu ya, nʼihi na ọ tụrụ egwu ilegide Chineke anya. 7 Mgbe ahụ ONYENWE ANYỊ sịrị, “Nʼezie, ahụla m nhụju anya nke ndị m nọ nʼIjipt, anụkwala m mkpu akwa ha, nʼihi aka ike nke ndị na-achị ha dịka ndị ohu. Nʼihi na ama m ahụhụ ha na-agabiga. 8 Ya mere, agbadatala m ịnapụta ha site nʼaka ndị Ijipt na ịkpọpụta ha site nʼala ahụ, idubata ha nʼala ọma ahụ, nke sara mbara, ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya. Ala ebe ndị Kenan, na ndị Het, na ndị Amọrait, na ndị Periz, na ndị Hiv, na ndị Jebus bi. 9 Ugbu a, akwa ụmụ Izrel eruola m ntị, ahụkwala m otu ndị Ijipt si na-emegbu ha. 10 Ugbu a, aga m eziga gị ka i jekwuru Fero, ka i dupụta ndị m bụ ụmụ Izrel site nʼala Ijipt.” 11 Mosis sịrị Chineke, “Onye ka m bụ na m ga-ejekwuru Fero, meekwa ka ụmụ Izrel site nʼala Ijipt pụta?” 12 Chineke gwara ya sị, “Aga m anọnyere gị. Nke a ga-abụ ihe ama nye gị na ọ bụ m na-eziga gị. Mgbe i sitere nʼala Ijipt kpọpụta ụmụ Izrel, unu niile ga-efe m ofufe nʼelu ugwu a.” 13 Ma Mosis jụrụ Chineke sị, “Ọ bụrụ na m agwa ụmụ Izrel sị, ‘Chineke nna nna unu zitere m izi unu ozi,’ ha ga-ajụ m sị, ‘Gịnị bụ aha ya?’ Gịnị ka m ga-aza ha?” 14 Chineke sịrị Mosis, “ABỤ M ONYE M BỤ. Naanị gwa ụmụ Izrel na ‘ABỤ M zitere gị.’ ” 15 Chineke gakwara nʼihu gwa Mosis sị, Si otu a gwa ụmụ Izrel okwu. “ONYENWE ANYỊ, Chineke nna nna unu, Chineke Ebraham, Chineke Aịzik na Chineke Jekọb, zitere m ịbịakwute unu.”Nke a bụ aha m ruo mgbe ebighị ebi,aha nke e ji echeta msite nʼọgbọ ruo nʼọgbọ. 16 “Gaa, kpọkọta ndị okenye Izrel niile zie ha sị, ‘ONYENWE ANYỊ Chineke nna nna unu, Chineke Ebraham, Chineke Aịzik, na Chineke Jekọb, egosila m onwe ya, sị m, Eleruola m ọnọdụ unu anya hụ ihe a na-eme unu nʼala Ijipt. 17 Ekweela m nkwa ịkpọpụta unu site nʼahụhụ unu na-ahụ nʼala Ijipt duru unu baa nʼala nke ndị Kenan, na ndị Het, na ndị Amọrait, na ndị Periz, na ndị Hiv, na ndị Jebus bi nʼime ya. Ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya.’ 18 “Ndị okenye Izrel ga-anabata ozi gị. Mgbe ahụ gị na ha ga-eso gaa nʼihu eze Ijipt gwa ya sị, ‘ONYENWE ANYỊ, Chineke ndị Hibru ezutela anyị. Kwere ka anyị gaa njem nʼime ọzara abalị atọ gaa chụọrọ ONYENWE ANYỊ Chineke anyị aja.’ 19 Amaara m rịị na eze Ijipt agaghị ekwe ka unu gaa, tutu ruo mgbe e ji aka ike kwagide ya. 20 Ma aga m esetipụ aka m tie Ijipt ihe otiti, site nʼihe ịrịbama dị iche iche nke m ga-eme nʼetiti ya. Mgbe nke a gasịrị, ọ ga-ahapụ unu ka unu laa. 21 “Aga m emekwa ka unu nweta amara nʼihu ndị Ijipt, ka unu ghara ịgba aka mgbe unu na-ala. 22 Nwanyị ọbụla ga-arịọ site nʼaka nwanyị Ijipt onye agbataobi ya na nwanyị ọbịa bi nʼụlọ ya, ihe niile e ji ọlaọcha na ọlaedo kpụọ, na akwa dị iche iche. Unu ga-eyikwasị ha ụmụ unu ndị ikom na ụmụ unu ndị inyom, bịa si otu a kwakọrọ ngwongwo ndị Ijipt.”

In Other Versions

Exodus 3 in the ANGEFD

Exodus 3 in the ANTPNG2D

Exodus 3 in the AS21

Exodus 3 in the BAGH

Exodus 3 in the BBPNG

Exodus 3 in the BBT1E

Exodus 3 in the BDS

Exodus 3 in the BEV

Exodus 3 in the BHAD

Exodus 3 in the BIB

Exodus 3 in the BLPT

Exodus 3 in the BNT

Exodus 3 in the BNTABOOT

Exodus 3 in the BNTLV

Exodus 3 in the BOATCB

Exodus 3 in the BOATCB2

Exodus 3 in the BOBCV

Exodus 3 in the BOCNT

Exodus 3 in the BOECS

Exodus 3 in the BOGWICC

Exodus 3 in the BOHCB

Exodus 3 in the BOHCV

Exodus 3 in the BOHLNT

Exodus 3 in the BOHNTLTAL

Exodus 3 in the BOILNTAP

Exodus 3 in the BOITCV

Exodus 3 in the BOKCV

Exodus 3 in the BOKCV2

Exodus 3 in the BOKHWOG

Exodus 3 in the BOKSSV

Exodus 3 in the BOLCB

Exodus 3 in the BOLCB2

Exodus 3 in the BOMCV

Exodus 3 in the BONAV

Exodus 3 in the BONCB

Exodus 3 in the BONLT

Exodus 3 in the BONUT2

Exodus 3 in the BOPLNT

Exodus 3 in the BOSCB

Exodus 3 in the BOSNC

Exodus 3 in the BOTLNT

Exodus 3 in the BOVCB

Exodus 3 in the BOYCB

Exodus 3 in the BPBB

Exodus 3 in the BPH

Exodus 3 in the BSB

Exodus 3 in the CCB

Exodus 3 in the CUV

Exodus 3 in the CUVS

Exodus 3 in the DBT

Exodus 3 in the DGDNT

Exodus 3 in the DHNT

Exodus 3 in the DNT

Exodus 3 in the ELBE

Exodus 3 in the EMTV

Exodus 3 in the ESV

Exodus 3 in the FBV

Exodus 3 in the FEB

Exodus 3 in the GGMNT

Exodus 3 in the GNT

Exodus 3 in the HARY

Exodus 3 in the HNT

Exodus 3 in the IRVA

Exodus 3 in the IRVB

Exodus 3 in the IRVG

Exodus 3 in the IRVH

Exodus 3 in the IRVK

Exodus 3 in the IRVM

Exodus 3 in the IRVM2

Exodus 3 in the IRVO

Exodus 3 in the IRVP

Exodus 3 in the IRVT

Exodus 3 in the IRVT2

Exodus 3 in the IRVU

Exodus 3 in the ISVN

Exodus 3 in the JSNT

Exodus 3 in the KAPI

Exodus 3 in the KBT1ETNIK

Exodus 3 in the KBV

Exodus 3 in the KJV

Exodus 3 in the KNFD

Exodus 3 in the LBA

Exodus 3 in the LBLA

Exodus 3 in the LNT

Exodus 3 in the LSV

Exodus 3 in the MAAL

Exodus 3 in the MBV

Exodus 3 in the MBV2

Exodus 3 in the MHNT

Exodus 3 in the MKNFD

Exodus 3 in the MNG

Exodus 3 in the MNT

Exodus 3 in the MNT2

Exodus 3 in the MRS1T

Exodus 3 in the NAA

Exodus 3 in the NASB

Exodus 3 in the NBLA

Exodus 3 in the NBS

Exodus 3 in the NBVTP

Exodus 3 in the NET2

Exodus 3 in the NIV11

Exodus 3 in the NNT

Exodus 3 in the NNT2

Exodus 3 in the NNT3

Exodus 3 in the PDDPT

Exodus 3 in the PFNT

Exodus 3 in the RMNT

Exodus 3 in the SBIAS

Exodus 3 in the SBIBS

Exodus 3 in the SBIBS2

Exodus 3 in the SBICS

Exodus 3 in the SBIDS

Exodus 3 in the SBIGS

Exodus 3 in the SBIHS

Exodus 3 in the SBIIS

Exodus 3 in the SBIIS2

Exodus 3 in the SBIIS3

Exodus 3 in the SBIKS

Exodus 3 in the SBIKS2

Exodus 3 in the SBIMS

Exodus 3 in the SBIOS

Exodus 3 in the SBIPS

Exodus 3 in the SBISS

Exodus 3 in the SBITS

Exodus 3 in the SBITS2

Exodus 3 in the SBITS3

Exodus 3 in the SBITS4

Exodus 3 in the SBIUS

Exodus 3 in the SBIVS

Exodus 3 in the SBT

Exodus 3 in the SBT1E

Exodus 3 in the SCHL

Exodus 3 in the SNT

Exodus 3 in the SUSU

Exodus 3 in the SUSU2

Exodus 3 in the SYNO

Exodus 3 in the TBIAOTANT

Exodus 3 in the TBT1E

Exodus 3 in the TBT1E2

Exodus 3 in the TFTIP

Exodus 3 in the TFTU

Exodus 3 in the TGNTATF3T

Exodus 3 in the THAI

Exodus 3 in the TNFD

Exodus 3 in the TNT

Exodus 3 in the TNTIK

Exodus 3 in the TNTIL

Exodus 3 in the TNTIN

Exodus 3 in the TNTIP

Exodus 3 in the TNTIZ

Exodus 3 in the TOMA

Exodus 3 in the TTENT

Exodus 3 in the UBG

Exodus 3 in the UGV

Exodus 3 in the UGV2

Exodus 3 in the UGV3

Exodus 3 in the VBL

Exodus 3 in the VDCC

Exodus 3 in the YALU

Exodus 3 in the YAPE

Exodus 3 in the YBVTP

Exodus 3 in the ZBP