Exodus 30 (BOICB)

1 “Jiri osisi akashia rụọ ebe ịchụ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ. 2 Akụkụ anọ ya ga-aha nʼotu. Ogologo ya na obosara ya ga-adị iri sentimita anọ na ise. Ịdị elu ya ga-adị iri sentimita itoolu. Mpi ya niile ga-esi na ya pụta. 3 Jiri ọlaedo a nụchara anụcha machie elu ya, akụkụ ya niile nakwa mpi ya niile. Ị ga-ejikwa ọlaedo kpụlite ọnụ ọnụ ya gburugburu. 4 Kpụnye mgbaaka ọlaedo abụọ nʼokpuru ihe ahụ akpụlitere akpụlite, abụọ na ncherita ihu akụkụ ọbụla, ebe ga na-ejide mkpara e ji ebu ya. 5 Ị ga-eji osisi akashia mee mkpara, jiri ọlaedo machie ha. 6 Ị ga-adọba ebe ịchụ aja ahụ nʼihu akwa mgbochi nke kpuchiri igbe iwu ọgbụgba ndụ ahụ, nʼihu oche ebere ahụ dị nʼelu igbe iwu ọgbụgba ndụ, nʼebe m ga-ezute gị. 7 “Ụtụtụ niile, mgbe Erọn doziri oriọna, ọ ga-esure ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼelu ebe ịchụ aja ahụ. 8 Nʼanyasị kwa, mgbe ọ na-amụnye ọkụ nʼoriọna ahụ, ọ ga-esurekwa ihe nsure ọkụ. Ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nke ga-adị nʼihu ONYENWE ANYỊ site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ. 9 Unu echekwala ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ na-adịghị nsọ nʼelu ya, maọbụ aja nsure ọkụ, maọbụ aja ihe oriri, unu awụpụla onyinye ihe ọṅụṅụ nʼelu ya. 10 Otu ugbo nʼafọ Erọn ga-ekpuchi mmehie nʼelu mpi ya. Mmemme mkpuchi mmehie a nke a na-eme otu ugbo nʼafọ, aghaghị ịbụ nke e ji ọbara nke si nʼaja a chụrụ nʼihi mkpuchi mmehie, nʼihi ọgbọ niile nke na-abịa. A ga na-edo ebe ịchụ aja nsọ otu a. Nke a bụ ebe dịkarịsịrị nsọ nye ONYENWE ANYỊ.” 11 Mgbe nke a gasịrị, ONYENWE ANYỊ gwara Mosis okwu sị ya, 12 “Mgbe ọbụla a gụrụ mmadụ ọnụ, onye Izrel ọbụla ga-akwụ ONYENWE ANYỊ ụgwọ o ji gbara mkpụrụobi ya. Nke a dị mkpa, ka ihe otiti ọbụla ghara ịbịakwasị ha mgbe ị ga-agụ ha ọnụ. 13 Ihe onye a gụrụ ọnụ ga-akwụ bụ ọkara shekel, dịka shekel nke ebe nsọ si dị. Ọkara shekel bụ iri gera abụọ. Ọkara shekel a bụ onyinye nye ONYENWE ANYỊ. 14 Ndị kwesiri inye onyinye a bụ ndị niile gbara iri afọ abụọ gbagoo. Ọ bụ ndị a kwesiri inye ONYENWE ANYỊ onyinye a. 15 Ndị ọgaranya agaghị enye karịa ọkara shekel. Otu a kwa ndị ogbenye agaghị enye ihe dị ntakịrị karịa ọkara shekel. Nʼihi na onyinye a bụ onyinye unu na-enye ONYENWE ANYỊ maka ikpuchiri mkpụrụobi unu mmehie. 16 Nabata ego niile ndị a site nʼaka ụmụ Izrel, ma jiri ya jee ozi dị nʼụlọ nzute. Ihe onyinye a ga-eme bụ ịkpọtụ uche ONYENWE ANYỊ nʼebe unu nọ nʼihi mkpuchi mmehie maka ndụ unu.” 17 Ọzọkwa, ONYENWE ANYỊ gwara Mosis okwu sị, 18 “Jiri bronz kpụọ efere ukwu na ihe ndọkwasị ya, maka ịsa ihe. Wụnye mmiri nʼime ya, dọsa ya nʼetiti ụlọ nzute na ebe ịchụ aja. 19 Erọn na ụmụ ya ndị ikom ga na-asa ụkwụ na aka ha site na ya. 20 Mgbe ọbụla ha na-aba nʼụlọ nzute ahụ, ha ga-eji mmiri saa onwe ka ha ghara ịnwụ. Ọzọkwa, mgbe ha na-abịaru nso nʼebe ịchụ aja, maka ije ozi iche onyinye nʼihu ONYENWE ANYỊ site nʼọkụ, 21 ha ga-asa aka ha na ụkwụ ha, ka ha ghara ịnwụ. Nke a ga-abụ ụkpụrụ dịrị Erọn na ụmụ ya ndị ikom site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.” 22 Ọzọkwa, ONYENWE ANYỊ gwara Mosis okwu sị ya, 23 “Were eso osisi na-esi isi ụtọ ndị a dị iche iche: máá, nke ọtụtụ ya ruru kilo isii, na ihe ruru kilo sinamọn abụọ na ụma itoolu, na kilo kalamus atọ, 24 na kilo kashia isii, na lita anọ na ụma asatọ nke mmanụ oliv, dịka ọtụtụ shekel ebe nsọ ahụ si dị. 25 Ị ga-eji ya mepụta mmanụ nsọ, nke dị nsọ, nke a gwakọtara nke ọma dịka nke onye na-eme mmanụ na-esi isi ụtọ mere. Ọ ga-abụ mmanụ otite dị nsọ. 26 Ị ga-ewere mmanụ ahụ tee ụlọ nzute ahụ niile na igbe iwu ọgbụgba ndụ ahụ, 27 na tebul ahụ, na ngwongwo ya niile, na nʼihe ịdọsa oriọna, na nʼihe niile dị ya nʼahụ, na nʼebe ịdọsa ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, 28 na nʼebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ, na ngwongwo ya niile, na nʼite ịsa ụkwụ na aka, na nʼebe a na-adọba ya. 29 Ị ga-edo ha nsọ, ka ha bụrụ ihe dịkarịrị nsọ. Ihe ọbụla metụrụ ha ahụ ga-adịkwa nsọ. 30 “Ị ga-eji mmanụ otite a tee Erọn na ụmụ ya ndị ikom. Ha niile ga-adịkwa nsọ, bụrụ ndị na-ejere m ozi dịka ndị nchụaja. 31 Gwa ụmụ Izrel okwu sị ha, ‘Nke a bụ mmanụ nsọ m, nke dị nsọ site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ. 32 Agaghị awụsa ya nʼahụ mmadụ. O nwekwaghị onye kwesiri imepụta mmanụ otite dị otu a. Ọ dị nsọ, unu kwesikwara ido ya nsọ. 33 A ga-esite nʼetiti ndị m wezuga onye ọbụla mere ụdị mmanụ isi ọma a, maọbụ tee ya onye na-abụghị onye nchụaja m.’ ” 34 Mgbe ahụ ONYENWE ANYỊ gwara Mosis okwu sị, “Were ụda na-esi isi ụtọ, dịka eso osisi stakit, na ọnyịcha, na galbanọm, na ezigbo frankisens a na-agwaghị ihe, nke ọtụtụ ha niile ga-abụ otu ihe. 35 Mee ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, nke a gwakọtara nke ọma, bụ ọrụ onye na-eme mmanụ isi ụtọ. Tinyekwa ya nnu, ka ọ bụrụ ihe nsure ọkụ a nụchara anụcha, nke dịkwa nsọ. 36 Gwerie ụfọdụ nʼime ya ka ọ dịka uzuzu. Wụsa ya nʼihu igbe iwu ọgbụgba ndụ ahụ nʼime ụlọ nzute, ebe m ga-ezute gị. Ọ ga-abụ ihe dịkarịsịrị nsọ nye unu. 37 Unu emerela onwe unu nke dịka ọtụtụ ụdị ihe nsure ọkụ a. Hụta ya ka ihe dị nsọ nʼebe ONYENWE ANYỊ nọ. 38 Onye ọbụla meere onwe ya ụdị ihe nsure ọkụ a, ịnụ isisi ya, a ga-ekewapụ onye ahụ site nʼetiti ụmụnna ya.”

In Other Versions

Exodus 30 in the ANGEFD

Exodus 30 in the ANTPNG2D

Exodus 30 in the AS21

Exodus 30 in the BAGH

Exodus 30 in the BBPNG

Exodus 30 in the BBT1E

Exodus 30 in the BDS

Exodus 30 in the BEV

Exodus 30 in the BHAD

Exodus 30 in the BIB

Exodus 30 in the BLPT

Exodus 30 in the BNT

Exodus 30 in the BNTABOOT

Exodus 30 in the BNTLV

Exodus 30 in the BOATCB

Exodus 30 in the BOATCB2

Exodus 30 in the BOBCV

Exodus 30 in the BOCNT

Exodus 30 in the BOECS

Exodus 30 in the BOGWICC

Exodus 30 in the BOHCB

Exodus 30 in the BOHCV

Exodus 30 in the BOHLNT

Exodus 30 in the BOHNTLTAL

Exodus 30 in the BOILNTAP

Exodus 30 in the BOITCV

Exodus 30 in the BOKCV

Exodus 30 in the BOKCV2

Exodus 30 in the BOKHWOG

Exodus 30 in the BOKSSV

Exodus 30 in the BOLCB

Exodus 30 in the BOLCB2

Exodus 30 in the BOMCV

Exodus 30 in the BONAV

Exodus 30 in the BONCB

Exodus 30 in the BONLT

Exodus 30 in the BONUT2

Exodus 30 in the BOPLNT

Exodus 30 in the BOSCB

Exodus 30 in the BOSNC

Exodus 30 in the BOTLNT

Exodus 30 in the BOVCB

Exodus 30 in the BOYCB

Exodus 30 in the BPBB

Exodus 30 in the BPH

Exodus 30 in the BSB

Exodus 30 in the CCB

Exodus 30 in the CUV

Exodus 30 in the CUVS

Exodus 30 in the DBT

Exodus 30 in the DGDNT

Exodus 30 in the DHNT

Exodus 30 in the DNT

Exodus 30 in the ELBE

Exodus 30 in the EMTV

Exodus 30 in the ESV

Exodus 30 in the FBV

Exodus 30 in the FEB

Exodus 30 in the GGMNT

Exodus 30 in the GNT

Exodus 30 in the HARY

Exodus 30 in the HNT

Exodus 30 in the IRVA

Exodus 30 in the IRVB

Exodus 30 in the IRVG

Exodus 30 in the IRVH

Exodus 30 in the IRVK

Exodus 30 in the IRVM

Exodus 30 in the IRVM2

Exodus 30 in the IRVO

Exodus 30 in the IRVP

Exodus 30 in the IRVT

Exodus 30 in the IRVT2

Exodus 30 in the IRVU

Exodus 30 in the ISVN

Exodus 30 in the JSNT

Exodus 30 in the KAPI

Exodus 30 in the KBT1ETNIK

Exodus 30 in the KBV

Exodus 30 in the KJV

Exodus 30 in the KNFD

Exodus 30 in the LBA

Exodus 30 in the LBLA

Exodus 30 in the LNT

Exodus 30 in the LSV

Exodus 30 in the MAAL

Exodus 30 in the MBV

Exodus 30 in the MBV2

Exodus 30 in the MHNT

Exodus 30 in the MKNFD

Exodus 30 in the MNG

Exodus 30 in the MNT

Exodus 30 in the MNT2

Exodus 30 in the MRS1T

Exodus 30 in the NAA

Exodus 30 in the NASB

Exodus 30 in the NBLA

Exodus 30 in the NBS

Exodus 30 in the NBVTP

Exodus 30 in the NET2

Exodus 30 in the NIV11

Exodus 30 in the NNT

Exodus 30 in the NNT2

Exodus 30 in the NNT3

Exodus 30 in the PDDPT

Exodus 30 in the PFNT

Exodus 30 in the RMNT

Exodus 30 in the SBIAS

Exodus 30 in the SBIBS

Exodus 30 in the SBIBS2

Exodus 30 in the SBICS

Exodus 30 in the SBIDS

Exodus 30 in the SBIGS

Exodus 30 in the SBIHS

Exodus 30 in the SBIIS

Exodus 30 in the SBIIS2

Exodus 30 in the SBIIS3

Exodus 30 in the SBIKS

Exodus 30 in the SBIKS2

Exodus 30 in the SBIMS

Exodus 30 in the SBIOS

Exodus 30 in the SBIPS

Exodus 30 in the SBISS

Exodus 30 in the SBITS

Exodus 30 in the SBITS2

Exodus 30 in the SBITS3

Exodus 30 in the SBITS4

Exodus 30 in the SBIUS

Exodus 30 in the SBIVS

Exodus 30 in the SBT

Exodus 30 in the SBT1E

Exodus 30 in the SCHL

Exodus 30 in the SNT

Exodus 30 in the SUSU

Exodus 30 in the SUSU2

Exodus 30 in the SYNO

Exodus 30 in the TBIAOTANT

Exodus 30 in the TBT1E

Exodus 30 in the TBT1E2

Exodus 30 in the TFTIP

Exodus 30 in the TFTU

Exodus 30 in the TGNTATF3T

Exodus 30 in the THAI

Exodus 30 in the TNFD

Exodus 30 in the TNT

Exodus 30 in the TNTIK

Exodus 30 in the TNTIL

Exodus 30 in the TNTIN

Exodus 30 in the TNTIP

Exodus 30 in the TNTIZ

Exodus 30 in the TOMA

Exodus 30 in the TTENT

Exodus 30 in the UBG

Exodus 30 in the UGV

Exodus 30 in the UGV2

Exodus 30 in the UGV3

Exodus 30 in the VBL

Exodus 30 in the VDCC

Exodus 30 in the YALU

Exodus 30 in the YAPE

Exodus 30 in the YBVTP

Exodus 30 in the ZBP