Exodus 39 (BOICB)

1 Ha sitekwara nʼogho akwa na-acha anụnụ anụnụ na nke na-acha ngwakọta anụnụ na uhie (odo odo), nke na-acha uhie uhie, meere ndị nchụaja uwe akpara akpa nke ọma iyi jee ozi nʼebe nsọ ahụ. Ha meekwara Erọn uwe nsọ, nʼusoro iwu ONYENWE ANYỊ nyere Mosis. 2 Ha ji ogho ọlaedo, na nke na-acha anụnụ anụnụ, nke na-acha ngwakọta anụnụ na uhie, na nke na-acha uhie uhie, nakwa nke ezi akwa ọcha a kpara nke ọma mee efọọd ahụ. 3 Ha tipịara mpempe ọlaedo ndị ahụ mee ka ọ dị mbadamba. Bipụtasịa ha ntakịrị ntakịrị dịka eriri maka i ji ha kpanye nʼetiti ogho ndị a na-acha anụnụ anụnụ; ngwakọta anụnụ na uhie, nke uhie uhie nakwa nke ezi akwa ọcha ahụ, nke bụ akaọrụ onye ǹka. 4 Ha dụrụ akwa na-adị nʼubu maka efọọd ahụ, nke e jikọtara na nkuku ya abụọ, maka i ji na-ekechisi ya ike. 5 Ihe okike nke ukwu ahụ, nke onye ǹka kpaziri nke ọma yiri ya, ya na efọọd ahụ bụ otu, nke e ji ogho na-acha edo edo, anụnụ anụnụ, ngwakọta anụnụ na uhie na uhie uhie nakwa nke ezi akwa ọcha a kpara nke ọma mee, dịka ONYENWE ANYỊ nyere Mosis nʼiwu. 6 Ha doziri nkume ọniks ndị ahụ nʼime ihe ọlaedo a kpara akpa; ma gbunye aha ụmụ ndị ikom Izrel niile nʼelu ya dịka onye ọka si egbunye aha mmadụ nʼelu mgbaaka akara. 7 Ha jikọtara ha nʼelu akwa ubu nke efọọd ahụ, ka ọ bụrụ nkume ncheta mgbe ebighị ebi nye ụmụ Izrel, dịka ONYENWE ANYỊ nyere Mosis nʼiwu. 8 Ha mekwara ihe mgbochi obi, nke bụ ọrụ aka onye ǹka. Ha mere ya dịka e si mee efọọd ahụ. Ọ bụ ogho edo edo, nke na-acha anụnụ anụnụ, nke ngwakọta anụnụ na uhie, nke uhie uhie na ezi akwa ọcha a kpara nke ọma ka e ji mee ya. 9 Ọ ha nʼotu, iri sentimita abụọ na atọ nʼogologo, iri sentimita abụọ na atọ nʼobosara; nke apịajiri ụzọ abụọ. 10 Mgbe ahụ, ha hịọnyere ahịrị nkume anọ ndị dị oke ọnụahịa nʼime ya. Ụdị dị nʼahịrị nke mbụ bụ: nkume kanelian, krisolaịt na beril, 11 nʼahịrị nke abụọ bụ: nkume tọkwọisi, safaia na emeralụdụ. 12 Nʼahịrị nke atọ bụ: nkume jasint, ageeti na ametisiti. 13 Nʼahịrị nke anọ bụ: nkume topaazi, ọniks na jaspa. Ahịọnyere ha nʼime ihe ọlaedo a kpara akpa. 14 Ha dị nkume iri na abụọ, nke ọbụla na-anọchi anya aha ụmụ ndị ikom Izrel. Egbunyere aha ebo iri na abụọ ahụ, otu nʼotu, nke ọbụla dịka aha ya si dị. 15 Ha ji ọlaedo a nụchara anụcha mee eriri a kpara akpa dịka ụdọ, maka ihe mgbochi obi. 16 Ha mere ihe ọlaedo abụọ nke a kpara akpa, ya na mgbaaka ọlaedo abụọ. Dụnyekwa mgbaaka ndị ahụ na nkuku abụọ nke ihe mgbochi obi ahụ. 17 Ha dụnyere ụdọ ọlaedo abụọ ndị ahụ nʼelu mgbaaka ndị ahụ dị na nkuku ihe mgbochi obi ahụ. 18 Were isi ndị ọzọ nke ụdọ ahụ dụnye nʼihe ahụ a kpara akpa. Konye ha nʼelu ubu efọọd ahụ, nʼebe ihu ya. 19 Ha mere mgbaaka ọlaedo. Konyekwa ha na nkuku abụọ nke ihe mgbochi obi ahụ, nʼime ọnụ ọnụ ya ebe dị nso efọọd ahụ. 20 Mgbe ahụ, ha kpụrụ mgbaaka ọlaedo abụọ ọzọ, konyekwa ha nʼelu ubu abụọ nke efọọd ahụ, nʼokpuru nʼebe ihu ya, na nso nso ebe a dụkọtara, nʼelu ihe okike ukwu nke efọọd ahụ. 21 Ha jikwa eriri na-acha anụnụ kekọta mgbaaka ihe mgbochi obi ahụ na mgbaaka efọọd ahụ, jikọta ya na ihe okike ukwu ahụ, ime ka ihe mgbochi obi ahụ hapụ ịtọghapụ site nʼefọọd ahụ, dịka iwu ONYENWE ANYỊ nyere Mosis si dị. 22 Ọ bụ akwa nke na-acha anụnụ anụnụ, ka ha ji dụọ uwe mwụda efọọd ahụ, ọrụ onye okwe akwa. 23 A ga-enwe oghere nʼetiti uwe mwụda ahụ, dịka oghere olu uwe agha, nwekwa akwa nta a dụnyere nʼokpuru oghere a, ime ka o sie ike gharakwa ịdọka. 24 Ha ji ogho na-acha anụnụ anụnụ, ngwakọta anụnụ na uhie, nke na-acha uhie uhie na ezi akwa ọcha a kpara nke ọma kpanye oyiyi mkpụrụ pomegranet, gburugburu nʼọnụ ala ala uwe mwụda ahụ. 25 Ha dụnyekwara ataṅụ e ji ọlaedo a nụchara anụcha kpụọ, gburugburu nʼọnụ ọnụ ala ya nʼetiti pomegranet ndị ahụ. 26 Otu ataṅụ, otu oyiyi mkpụrụ pomegranet, otu a ka a dụnyere ya gburugburu ọnụ ọnụ ala uwe mwụda ahụ, nke a ga-eyi mgbe a na-eje ozi, dịka iwu ONYENWE ANYỊ nyere Mosis si dị. 27 Ha ji ezi akwa ọcha metara Erọn na ụmụ ya ndị ikom, uwe ime ahụ, akaọrụ nke onye ọkpa akwa, 28 jirikwa ezi akwa ọcha mee akwa ike nʼisi, okpu akwa ọcha, na uwe ukwu nke ezi akwa ọcha a kpara nke ọma. 29 Ihe ike nʼukwu bụ nke e ji ogho na-acha anụnụ anụnụ, ngwakọta anụnụ na uhie uhie, na uhie uhie, nke ezi akwa ọcha a kpara nke ọma, ọrụ aka onye ǹka na-akpanye ihe ịchọ mma, dịka ONYENWE ANYỊ si nye Mosis nʼiwu. 30 Ha mere efere, bụ okpu nsọ ahụ, site nʼọlaedo a nụchara anụcha, gbunyekwa akara nʼelu ya, dịka ihe e dere nʼelu mgbaaka akara:Ihe nsọ dịrị Onyenwe anyị. 31 Mgbe ahụ, ha kenyere ya eriri na-acha anụnụ anụnụ i ji jikọta ya na ihe ike nʼisi ahụ, dịka ONYENWE ANYỊ nyere ya Mosis nʼiwu. 32 Otu a ka ha si rụchaa ọrụ iwu ụlọ nzute ahụ. Ndị Izrel mere ihe niile dịka ONYENWE ANYỊ si nye Mosis nʼiwu. 33 Mgbe ahụ, ha buteere Mosis ụlọ nzute ahụ: ụlọ ikwu ahụ ya na ngwongwo ya niile, ya bụ nko ya niile, mbudo ibo ya niile, mkpọrọ osisi ya niile, ogidi ya niile na ụkwụ ya niile, 34 na akpụkpọ ebule e sijiri uhie uhie, akpụkpọ ehi mmiri e ji emechi elu ụlọ nzute ahụ, na akwa mgbochi, 35 na igbe iwu ọgbụgba ndụ ahụ, ya na mkpara e ji ebu ya, na oche ebere ya, 36 na tebul ahụ, ya na ngwongwo ya niile na achịcha nke iche nʼIhu Onyenwe anyị, 37 na ihe ịdọkwasị oriọna e ji ọlaedo a nụchara anụcha kpụọ, na iheọkụ ya niile na ngwongwo ya niile, na mmanụ oliv maka ịmụ ọkụ, 38 na ebe ịchụ aja ọlaedo, mmanụ nsọ na ụda na-esi isi ụtọ na akwa mgbochi nke ọnụ ụzọ ụlọ nzute, 39 na ebe ịchụ aja bronz ahụ, na ihe ọkpụkpa bronz ya, mkpara ya niile na ngwongwo ya niile,efere ukwu ahụ ya na ihe ndọkwasị ya, 40 akwa mgbochi nke ogige ụlọ ahụ, na ogidi ya na ihe ndọkwasị ya nakwa akwa mgbochi nke ọnụ ụzọ e si abanye nʼogige ahụ;ụdọ na ǹtu ịkpọgide ogige ahụ;ngwongwo niile nke ụlọ nzute ahụ, ụlọ ikwu nzute ahụ 41 na uwe niile a kpara akpa, nke a na-eyi eje ozi nʼebe nsọ ahụ, ma uwe nsọ nke Erọn, onye nchụaja, na uwe nke ụmụ ya ndị ikom na-eyi mgbe ha na-eje ozi ha dịka ndị nchụaja. 42 Ndị Izrel niile rụzuru ọrụ ndị a niile dịka ONYENWE ANYỊ si nye ya Mosis nʼiwu. 43 Mosis nʼonwe ya hụkwara ọrụ ndị a niile, nabata ya ka nke e jere dịka iwu ONYENWE ANYỊ nyere si dị. Nʼihi ya, Mosis gọziri ha.

In Other Versions

Exodus 39 in the ANGEFD

Exodus 39 in the ANTPNG2D

Exodus 39 in the AS21

Exodus 39 in the BAGH

Exodus 39 in the BBPNG

Exodus 39 in the BBT1E

Exodus 39 in the BDS

Exodus 39 in the BEV

Exodus 39 in the BHAD

Exodus 39 in the BIB

Exodus 39 in the BLPT

Exodus 39 in the BNT

Exodus 39 in the BNTABOOT

Exodus 39 in the BNTLV

Exodus 39 in the BOATCB

Exodus 39 in the BOATCB2

Exodus 39 in the BOBCV

Exodus 39 in the BOCNT

Exodus 39 in the BOECS

Exodus 39 in the BOGWICC

Exodus 39 in the BOHCB

Exodus 39 in the BOHCV

Exodus 39 in the BOHLNT

Exodus 39 in the BOHNTLTAL

Exodus 39 in the BOILNTAP

Exodus 39 in the BOITCV

Exodus 39 in the BOKCV

Exodus 39 in the BOKCV2

Exodus 39 in the BOKHWOG

Exodus 39 in the BOKSSV

Exodus 39 in the BOLCB

Exodus 39 in the BOLCB2

Exodus 39 in the BOMCV

Exodus 39 in the BONAV

Exodus 39 in the BONCB

Exodus 39 in the BONLT

Exodus 39 in the BONUT2

Exodus 39 in the BOPLNT

Exodus 39 in the BOSCB

Exodus 39 in the BOSNC

Exodus 39 in the BOTLNT

Exodus 39 in the BOVCB

Exodus 39 in the BOYCB

Exodus 39 in the BPBB

Exodus 39 in the BPH

Exodus 39 in the BSB

Exodus 39 in the CCB

Exodus 39 in the CUV

Exodus 39 in the CUVS

Exodus 39 in the DBT

Exodus 39 in the DGDNT

Exodus 39 in the DHNT

Exodus 39 in the DNT

Exodus 39 in the ELBE

Exodus 39 in the EMTV

Exodus 39 in the ESV

Exodus 39 in the FBV

Exodus 39 in the FEB

Exodus 39 in the GGMNT

Exodus 39 in the GNT

Exodus 39 in the HARY

Exodus 39 in the HNT

Exodus 39 in the IRVA

Exodus 39 in the IRVB

Exodus 39 in the IRVG

Exodus 39 in the IRVH

Exodus 39 in the IRVK

Exodus 39 in the IRVM

Exodus 39 in the IRVM2

Exodus 39 in the IRVO

Exodus 39 in the IRVP

Exodus 39 in the IRVT

Exodus 39 in the IRVT2

Exodus 39 in the IRVU

Exodus 39 in the ISVN

Exodus 39 in the JSNT

Exodus 39 in the KAPI

Exodus 39 in the KBT1ETNIK

Exodus 39 in the KBV

Exodus 39 in the KJV

Exodus 39 in the KNFD

Exodus 39 in the LBA

Exodus 39 in the LBLA

Exodus 39 in the LNT

Exodus 39 in the LSV

Exodus 39 in the MAAL

Exodus 39 in the MBV

Exodus 39 in the MBV2

Exodus 39 in the MHNT

Exodus 39 in the MKNFD

Exodus 39 in the MNG

Exodus 39 in the MNT

Exodus 39 in the MNT2

Exodus 39 in the MRS1T

Exodus 39 in the NAA

Exodus 39 in the NASB

Exodus 39 in the NBLA

Exodus 39 in the NBS

Exodus 39 in the NBVTP

Exodus 39 in the NET2

Exodus 39 in the NIV11

Exodus 39 in the NNT

Exodus 39 in the NNT2

Exodus 39 in the NNT3

Exodus 39 in the PDDPT

Exodus 39 in the PFNT

Exodus 39 in the RMNT

Exodus 39 in the SBIAS

Exodus 39 in the SBIBS

Exodus 39 in the SBIBS2

Exodus 39 in the SBICS

Exodus 39 in the SBIDS

Exodus 39 in the SBIGS

Exodus 39 in the SBIHS

Exodus 39 in the SBIIS

Exodus 39 in the SBIIS2

Exodus 39 in the SBIIS3

Exodus 39 in the SBIKS

Exodus 39 in the SBIKS2

Exodus 39 in the SBIMS

Exodus 39 in the SBIOS

Exodus 39 in the SBIPS

Exodus 39 in the SBISS

Exodus 39 in the SBITS

Exodus 39 in the SBITS2

Exodus 39 in the SBITS3

Exodus 39 in the SBITS4

Exodus 39 in the SBIUS

Exodus 39 in the SBIVS

Exodus 39 in the SBT

Exodus 39 in the SBT1E

Exodus 39 in the SCHL

Exodus 39 in the SNT

Exodus 39 in the SUSU

Exodus 39 in the SUSU2

Exodus 39 in the SYNO

Exodus 39 in the TBIAOTANT

Exodus 39 in the TBT1E

Exodus 39 in the TBT1E2

Exodus 39 in the TFTIP

Exodus 39 in the TFTU

Exodus 39 in the TGNTATF3T

Exodus 39 in the THAI

Exodus 39 in the TNFD

Exodus 39 in the TNT

Exodus 39 in the TNTIK

Exodus 39 in the TNTIL

Exodus 39 in the TNTIN

Exodus 39 in the TNTIP

Exodus 39 in the TNTIZ

Exodus 39 in the TOMA

Exodus 39 in the TTENT

Exodus 39 in the UBG

Exodus 39 in the UGV

Exodus 39 in the UGV2

Exodus 39 in the UGV3

Exodus 39 in the VBL

Exodus 39 in the VDCC

Exodus 39 in the YALU

Exodus 39 in the YAPE

Exodus 39 in the YBVTP

Exodus 39 in the ZBP