Ezekiel 18 (BOICB)

1 Okwu ONYENWE ANYỊ ruru m ntị, sị, sị, 2 “Gịnị ka unu bụ mmadụ na-ekwu mgbe unu na-atụ ilu a banyere ala Izrel?“ ‘Ndị bụ nna eriela mkpụrụ vaịnị na-achaghị acha,eze ụmụntakịrị a na-eru ha izizi.’ 3 “Dịka m na-adị ndụ, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwubiri, unu agaghị atụkwa ilu a ọzọ nʼala Izrel. 4 Nʼihi na mkpụrụobi niile bụ nke m, ma nke nna ma nke nwa, ha niile bụ nke m. Mkpụrụobi ọbụla mehiere bụ nke ga-anwụ. 5 “Ọ bụrụ na-enwere otu onye ezi omumenke na-eme naanị ihe ziri ezi na ihe dị mma, 6 onye na-adịghị eje nʼugwu iri oririmaọbụ welie anya ya nʼebe arụsị niile nke Izrel dị,onye na-adịghị emerụ nwunye onye agbataobi ya,maọbụ dinakwuru nwanyị nọ nʼoge nsọ ya. 7 Onye na-adịghị emegbu ndị mmadụ,kama ọ na-akwụghachi ụgwọ o ji, maọbụ na-enyeghachi ihe ọ naara dịka ihe mbe,ọ dịghị apụnara mmadụ ihe o nwere nʼike,kama ọ na-enye ndị agụụ na-agụ nri,na-enyekwa ndị gbaa ọtọ akwa mkpuchi. 8 Ọ dịghị agbazinye mmadụ ego nara mụrụ nwa,ọ dịghị ana ụma site nʼaka ha.Ọ na-esite nʼihe ọjọọ sepụ aka ya,na-ekpekwa ikpe ziri ezi nʼetiti mmadụ na ibe ya. 9 Ọ na-edebezu iwu m niile,na-agbaso ụkpụrụ m niile nʼikwesị ntụkwasị obi.Onye ezi omume ka nwoke ahụ bụ;ọ ghaghị ịdịkwa ndụ,otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwubiri. 10 “Ọ bụrụ na o nwere nwa nwoke na-akpa ike, na-akwafu ọbara, na-emekwa ihe ndị ọzọ dị iche iche, 11 ọ bụ ezie na nna ya emeghị ihe ndị a:“Ma ọ na-eri nri nʼụlọ arụsị dị nʼugwu,na-emerụ nwunye onye agbataobi ya; 12 Ọ na-emegbu ndị ogbenye na ndị nọ na mkpa.Ọ na-apụnara mmadụ ihe nʼike.Ọ dịghị eweghachi ihe o naara na mbe.Ọ na-efe arụsị,na-emekwa ihe arụ ndị ọzọ dị iche iche. 13 Ọ na-anara ndị ọ gbazinyere ego ọmụrụnwa na ụma.O kwesiri ka onye dị otu a dị ndụ? Ọ gaghị adị ndụ. Nʼihi na o meela ihe ndị a niile rụrụ arụ. A ga-egbu ya. Ọbara ya ga-adịkwa nʼisi ya. 14 “Ọ bụrụkwa na nwoke a nwere nwa nwoke nke hụrụ ihe ọjọọ ndị a niile nna ya na-eme, ma kpebie na ọ gakwaghị ebi ụdị ndụ ahụ. 15 “Ọ dịghị eri nri nʼụlọ arụsị dị nʼelu ugwumaọbụ welie anya lee arụsị niile nke Izrel.Ọ dịghị emerụ nwunye onye agbataobi ya. 16 Ọ dịghị emegbu onye ọbụla,maọbụ anara ihe mbe nʼihi ego ọ gbazinyere mmadụ.Ọ dịghị apụnara mmadụ ihe o nwere nʼike,kama na ọ na-enye ndị agụ na-agụ ihe oriri ya,na-enyekwa ndị gbaa ọtọ akwa mkpuchi; 17 ọ bụrụ na ọ dịghị etinye aka na mmehie ọbụla,na ọ naghị anara ọmụrụnwa na ụma nʼaka ndị o binyere ego,na ọ na-erubekwara iwu m niile isi, na-agbaso ụkpụrụ m niile.Onye dị otu a agaghị anwụ nʼihi mmehie nke nna ya mere. Ọ ga-adị ndụ. 18 Ma nna ya ga-anwụ nʼihi mmehie niile o mere, nʼihi na ọ bụ onye na-ewe ihe na-abụghị nke ya, onye na-apụnara ndị ọzọ ihe ha nwere nʼike. Ọ bụkwa onye na-eme ihe ọjọọ dị iche iche nʼetiti ndị ya. 19 “Ma unu na-ajụ, ‘Gịnị mere nwa adịghị eketa oke nʼahụhụ nke ajọ omume nna ya?’ Ihe dị otu ahụ apụghị ime, ebe ọ bụ na nwa ya emeela ihe ziri ezi ma leziekwa anya debezuo ụkpụrụ m niile, ọ ghaghị ịdị ndụ. 20 Onye ahụ mere mmehie bụ onye ga-anwụ. Nwa agaghị ata ahụhụ nʼihi ihe nna ya metara, nna agakwaghị ata ahụhụ nʼihi ihe nwa ya metara. Onye ezi omume ga-anata ụgwọ ezi omume o mere, ma onye ajọ omume ga-anata ụgwọ nʼihi ajọ ihe o mere. 21 “Ma ọ bụrụ na onye ajọ omume esite na mmehie niile o mere chigharịa, malite idebe ụkpụrụ m niile, ma na-emekwa ihe ziri ezi na nke dị mma, onye ahụ aghaghị ịdị ndụ, ọ gaghị anwụ. 22 Ọ dịghị ajọ omume niile bụ nke ha mere a ga-echeta megide ha. Ha ga-adị ndụ nʼihi ihe ezi omume ha mere. 23 Ọ na-atọ m ụtọ bụ ọnwụ nke ndị ajọ omume? Ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwupụtara. Kama, ọ bụghị mgbe ha si nʼụzọ ha chigharịa, dịrị ndụ, ka obi na-atọ m ụtọ? 24 “Ma ọ bụrụ na onye ezi omume esite nʼezi omume ya chigharịa, mee mmehie na-emekwa ihe arụ nke ndị ajọ mmadụ na-eme, ha ọ ga-adị ndụ? Mba! Ọ dịghị ihe ezi omume nke onye dị otu a mere nke a ga-echetakwa. Nʼihi ekwesighị ntụkwasị obi ha, ha bụ ndị ikpe mara, nʼihi mmehie ndị ha mere, ha ga-anwụ. 25 “Ma unu na-asị, ‘Ụzọ Onyenwe anyị ezighị ezi!’ Geenụ ntị, unu ụlọ Izrel. Ọ bụ nʼụzọ m ezighị ezi? Ọ bụghị ụzọ unu niile bụ nke na-ezighị ezi? 26 Ọ bụrụ na onye ezi omume esite nʼezi omume ya chigharịa malite ime mmehie, ọ ga-anwụ maka ya; nʼihi mmehie ahụ o mere ka ọ ga-anwụ. 27 Ọ bụrụ na onye ajọ omume esite nʼajọ omume niile nke o mere chigharịa malite ime ihe ziri ezi na nke dị mma, ọ ga-azọpụta ndụ ya. 28 Nʼihi na ọ tuleela nʼobi ya, kpebiekwa ịhapụ mmehie ya niile, ma malite ibi ndụ ziri ezi. Ndụ ga-abụ nke ya. Ọ gaghị anwụ. 29 Ma ụlọ Izrel na-asị, ‘Ụzọ Onyenwe anyị ezighị ezi!’ Ọ bụ nʼụzọ m niile ezighị ezi, unu ụlọ Izrel? Ọ bụghị ụzọ unu niile bụ nke na-ezighị ezi? 30 “Ya mere, unu ụlọ Izrel, aga m ekpe onye ọbụla nʼime unu ikpe dịka ụzọ ya si dị, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwubiri ya. Chegharịanụ, sitenụ na njehie unu niile unu chigharịa, mgbe ahụ, mmehie agaghị a bụrụ unu ihe ịsọ ngọngọ. 31 Wezuganụ njehie niile unu jehiere nʼime ya, ka unu nweta obi ọhụrụ na mmụọ ọhụrụ. Ụlọ Izrel, gịnị mere unu ga-eji nwụọ? 32 Nʼihi na ọ dịghị atọ obi m ụtọ ịhụ na onye ọbụla na-anwụ, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwupụtara. Chegharịakwanụ, ka unu dịrị ndụ!

In Other Versions

Ezekiel 18 in the ANGEFD

Ezekiel 18 in the ANTPNG2D

Ezekiel 18 in the AS21

Ezekiel 18 in the BAGH

Ezekiel 18 in the BBPNG

Ezekiel 18 in the BBT1E

Ezekiel 18 in the BDS

Ezekiel 18 in the BEV

Ezekiel 18 in the BHAD

Ezekiel 18 in the BIB

Ezekiel 18 in the BLPT

Ezekiel 18 in the BNT

Ezekiel 18 in the BNTABOOT

Ezekiel 18 in the BNTLV

Ezekiel 18 in the BOATCB

Ezekiel 18 in the BOATCB2

Ezekiel 18 in the BOBCV

Ezekiel 18 in the BOCNT

Ezekiel 18 in the BOECS

Ezekiel 18 in the BOGWICC

Ezekiel 18 in the BOHCB

Ezekiel 18 in the BOHCV

Ezekiel 18 in the BOHLNT

Ezekiel 18 in the BOHNTLTAL

Ezekiel 18 in the BOILNTAP

Ezekiel 18 in the BOITCV

Ezekiel 18 in the BOKCV

Ezekiel 18 in the BOKCV2

Ezekiel 18 in the BOKHWOG

Ezekiel 18 in the BOKSSV

Ezekiel 18 in the BOLCB

Ezekiel 18 in the BOLCB2

Ezekiel 18 in the BOMCV

Ezekiel 18 in the BONAV

Ezekiel 18 in the BONCB

Ezekiel 18 in the BONLT

Ezekiel 18 in the BONUT2

Ezekiel 18 in the BOPLNT

Ezekiel 18 in the BOSCB

Ezekiel 18 in the BOSNC

Ezekiel 18 in the BOTLNT

Ezekiel 18 in the BOVCB

Ezekiel 18 in the BOYCB

Ezekiel 18 in the BPBB

Ezekiel 18 in the BPH

Ezekiel 18 in the BSB

Ezekiel 18 in the CCB

Ezekiel 18 in the CUV

Ezekiel 18 in the CUVS

Ezekiel 18 in the DBT

Ezekiel 18 in the DGDNT

Ezekiel 18 in the DHNT

Ezekiel 18 in the DNT

Ezekiel 18 in the ELBE

Ezekiel 18 in the EMTV

Ezekiel 18 in the ESV

Ezekiel 18 in the FBV

Ezekiel 18 in the FEB

Ezekiel 18 in the GGMNT

Ezekiel 18 in the GNT

Ezekiel 18 in the HARY

Ezekiel 18 in the HNT

Ezekiel 18 in the IRVA

Ezekiel 18 in the IRVB

Ezekiel 18 in the IRVG

Ezekiel 18 in the IRVH

Ezekiel 18 in the IRVK

Ezekiel 18 in the IRVM

Ezekiel 18 in the IRVM2

Ezekiel 18 in the IRVO

Ezekiel 18 in the IRVP

Ezekiel 18 in the IRVT

Ezekiel 18 in the IRVT2

Ezekiel 18 in the IRVU

Ezekiel 18 in the ISVN

Ezekiel 18 in the JSNT

Ezekiel 18 in the KAPI

Ezekiel 18 in the KBT1ETNIK

Ezekiel 18 in the KBV

Ezekiel 18 in the KJV

Ezekiel 18 in the KNFD

Ezekiel 18 in the LBA

Ezekiel 18 in the LBLA

Ezekiel 18 in the LNT

Ezekiel 18 in the LSV

Ezekiel 18 in the MAAL

Ezekiel 18 in the MBV

Ezekiel 18 in the MBV2

Ezekiel 18 in the MHNT

Ezekiel 18 in the MKNFD

Ezekiel 18 in the MNG

Ezekiel 18 in the MNT

Ezekiel 18 in the MNT2

Ezekiel 18 in the MRS1T

Ezekiel 18 in the NAA

Ezekiel 18 in the NASB

Ezekiel 18 in the NBLA

Ezekiel 18 in the NBS

Ezekiel 18 in the NBVTP

Ezekiel 18 in the NET2

Ezekiel 18 in the NIV11

Ezekiel 18 in the NNT

Ezekiel 18 in the NNT2

Ezekiel 18 in the NNT3

Ezekiel 18 in the PDDPT

Ezekiel 18 in the PFNT

Ezekiel 18 in the RMNT

Ezekiel 18 in the SBIAS

Ezekiel 18 in the SBIBS

Ezekiel 18 in the SBIBS2

Ezekiel 18 in the SBICS

Ezekiel 18 in the SBIDS

Ezekiel 18 in the SBIGS

Ezekiel 18 in the SBIHS

Ezekiel 18 in the SBIIS

Ezekiel 18 in the SBIIS2

Ezekiel 18 in the SBIIS3

Ezekiel 18 in the SBIKS

Ezekiel 18 in the SBIKS2

Ezekiel 18 in the SBIMS

Ezekiel 18 in the SBIOS

Ezekiel 18 in the SBIPS

Ezekiel 18 in the SBISS

Ezekiel 18 in the SBITS

Ezekiel 18 in the SBITS2

Ezekiel 18 in the SBITS3

Ezekiel 18 in the SBITS4

Ezekiel 18 in the SBIUS

Ezekiel 18 in the SBIVS

Ezekiel 18 in the SBT

Ezekiel 18 in the SBT1E

Ezekiel 18 in the SCHL

Ezekiel 18 in the SNT

Ezekiel 18 in the SUSU

Ezekiel 18 in the SUSU2

Ezekiel 18 in the SYNO

Ezekiel 18 in the TBIAOTANT

Ezekiel 18 in the TBT1E

Ezekiel 18 in the TBT1E2

Ezekiel 18 in the TFTIP

Ezekiel 18 in the TFTU

Ezekiel 18 in the TGNTATF3T

Ezekiel 18 in the THAI

Ezekiel 18 in the TNFD

Ezekiel 18 in the TNT

Ezekiel 18 in the TNTIK

Ezekiel 18 in the TNTIL

Ezekiel 18 in the TNTIN

Ezekiel 18 in the TNTIP

Ezekiel 18 in the TNTIZ

Ezekiel 18 in the TOMA

Ezekiel 18 in the TTENT

Ezekiel 18 in the UBG

Ezekiel 18 in the UGV

Ezekiel 18 in the UGV2

Ezekiel 18 in the UGV3

Ezekiel 18 in the VBL

Ezekiel 18 in the VDCC

Ezekiel 18 in the YALU

Ezekiel 18 in the YAPE

Ezekiel 18 in the YBVTP

Ezekiel 18 in the ZBP