Ezekiel 28 (BOICB)

1 Okwu ONYENWE ANYỊ ruru m ntị, sị, 2 “Nwa nke mmadụ, gwa eze Taịa, ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ sịrị:“ ‘Nʼihi nganga nke juru gị obi,ị na-ekwu sị, “Mụ onwe m bụ chi,mụ onwe m na-anọkwasị nʼocheeze nke otu chi,nke dị nʼetiti oke osimiri niile.”Ma gị onwe gị bụ mmadụ efu, ị bụghị chi,ọ bụ ezie na ị na-eche na ị mara ihe dịka chi. 3 Ị maara ihe karịa Daniel?Ọ bụ na o nweghị ihe e zoro ezo nʼebe ị nọ? 4 I werela amamihe gị na nghọta gịnwetara onwe gị akụ,tụkọba ọlaedo na ọlaọcha,nʼime ụlọakụ gị dị iche iche. 5 E, mmụta nʼịzụ ahịa gịemeela ka ị ghọọ ọgaranya,nʼihi akụnụba inwereị bụrụla onye na-akpa nganga. 6 “ ‘Ya mere, nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ na-ekwu;“ ‘ebe ọ bụ na ị gụrụ onwe gị dịka onye maara iheonye maara ihe dịka chi, 7 ana m aga ịkpọbata ndị mba ọzọ megide gị,bụ mba kachasị mba niile dị iche iche njọ na-enweghị obi ebere.Ha ga-amịpụta mma agha ha megide ịma mma gị na amamihe gị,ha ga-adụwakwa ebube nke mma gị. 8 Ha ga-eme ka ị rịdaruo nʼolulu nke ala mmụọ.Ị ga-anwụ ọnwụ ikenʼetiti oke osimiri niile. 9 Mgbe nke a mere, ị ga-asị, “Mụ onwe m bụ chi,”nʼihu ndị ahụ na-egbu gị?Ma gị onwe gị bụ mmadụ efu, ị bụghị chi,nʼaka ndị ahụ na-egbu gị. 10 Ị ga-anwụ ọnwụ dịka ndị a na-ebighị ugwu,site nʼaka ndị ọbịa.Mụ onwe m ekwuola, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwubiri.’ ” 11 Okwu nke ONYENWE ANYỊ rutere m ntị, sị, 12 “Nwa nke mmadụ, bulie abụ akwa banyere eze Taịa ma gwa ya, ‘Ihe a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwuru,“ ‘Gị onwe gị bụ akara izuoke,ị jupụtara na amamihe na ịma mma. 13 Ị nọ nʼIden,nʼubi Chineke a gbara ogige.Nʼebe ahụ ka e ji nkume dị oke ọnụahịa ndị a chọọ gị mma,rubi, na topaazi, na emeralụdụ,na krisolaịt, na ọniks, na jaspa,na safaia, na tọkwọisi, na beril.A rụnyere nkume ndị a niile nʼime ọlaedo.Ọ bụkwa nʼụbọchị ahụ e kere gị ka e doziri ha. 14 Ahọpụtara m gị mee gị ka ị bụrụ cherub,ọrụ ahụ e doro gị iche ịrụ.Ọ bụ nʼugwu nsọ Chineke ka ị na-anọ,na-ejegharịkwa nʼetiti nkume ndị ahụ na-acha ọkụ. 15 Ị bụ onye na-enweghị ịta ụtanʼụzọ gị niile site nʼụbọchị e kere gị,tutu ruo mgbe a hụrụ ajọ omume nʼime gị. 16 Site nʼịba ụba nke ọzụzụ ahịa gịị ghọrọ onye na-eme ihe ike,si otu a mehiekwa.Nʼihi ya, esi m nʼugwu Chineke chụpụ gị, nʼihi adịghị nsọ gị.Esitekwara m nʼetiti nkume ọkụ ndị ahụ chụpụ gị,gị cherub na-ekpuchi ekpuchi. 17 Obi gị jupụtara na nganganʼihi ịma mma gị,i mere ka amamihe gịbụrụ ihe rụrụ arụ nʼihi ebube nke ịma mma gị.Nʼihi ya, achụdara m gị, tụọ gị nʼala,mee ka ị bụrụ ihe nlere anya nye ndị eze niile. 18 Nʼihi ọtụtụ mmehie gị, na ịzụ ahịa aghụghọ gị,i meela ka ụlọnsọ gị niile ghọọ ihe rụrụ arụ.Nʼihi ya, emere m ka ọkụ si nʼetiti gị pụta,repịa gị.Ka ị ghọọ ntụ nʼelu ala,nʼihu ndị ahụ niile na-ele gị anya. 19 Ndị niile maara gịka ihe ndị a juru anya,nʼihi na ị ghọọla ihe oke egwu.Ị laala nʼiyi ruo ebighị ebi.’ ” 20 Okwu ONYENWE ANYỊ ruru m ntị, sị, 21 “Nwa nke mmadụ, chee ihu nʼebe Saịdọn dị buo amụma megide ya, 22 ma kwuo, ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwuru,“ ‘Mụ onwe m na-emegide gị, gị Saịdọn,nʼetiti unu ka m ga-egosipụta otuto m.Unu ga-amata na mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊmgbe m mere ka ahụhụ dakwasị unu,nʼime unu, a ga-anwapụta na m bụ onye dị nsọ. 23 Aga m ezite ajọ ọrịa na-efe efe, nke ga-emegide ya,meekwa ka ọbara jupụta nʼokporoụzọ ya niile.Ndị e gburu egbu ga-ada nʼime ya,site na mma agha nke ga-abịakwasị ya nʼakụkụ niile.Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ. 24 “ ‘Ụlọ Izrel agaghị enwekwa mba kpọrọ ha asị gbara ha gburugburu ndị dịka uke, nke na-adụ adụ, na ogwu nke na-egbu mgbu. Ha ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ. 25 “ ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwuru: Ndị Izrel ga-alọghachi biri nʼala nke aka ha ọzọ, ala nke m nyere nna ha Jekọb ohu m. Nʼihi na aga m esite na mba niile ha gbasasịrị chịkọtaa ha, si otu a gosi mba niile nke ụwa ịdị nsọ m. 26 Ha ga-ebi nʼala a na ntụkwasị obi. Ha ga-ewu ụlọ, kụọ ubi vaịnị, birikwa na-atụghị egwu ọbụla. Mgbe m pịachara mba niile dị ha gburugburu ụtarị, bụ mba ndị ahụ mekpara ha ahụ, mgbe ahụ, ha ga-amata nʼezie na mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ Chineke ha.’ ”

In Other Versions

Ezekiel 28 in the ANGEFD

Ezekiel 28 in the ANTPNG2D

Ezekiel 28 in the AS21

Ezekiel 28 in the BAGH

Ezekiel 28 in the BBPNG

Ezekiel 28 in the BBT1E

Ezekiel 28 in the BDS

Ezekiel 28 in the BEV

Ezekiel 28 in the BHAD

Ezekiel 28 in the BIB

Ezekiel 28 in the BLPT

Ezekiel 28 in the BNT

Ezekiel 28 in the BNTABOOT

Ezekiel 28 in the BNTLV

Ezekiel 28 in the BOATCB

Ezekiel 28 in the BOATCB2

Ezekiel 28 in the BOBCV

Ezekiel 28 in the BOCNT

Ezekiel 28 in the BOECS

Ezekiel 28 in the BOGWICC

Ezekiel 28 in the BOHCB

Ezekiel 28 in the BOHCV

Ezekiel 28 in the BOHLNT

Ezekiel 28 in the BOHNTLTAL

Ezekiel 28 in the BOILNTAP

Ezekiel 28 in the BOITCV

Ezekiel 28 in the BOKCV

Ezekiel 28 in the BOKCV2

Ezekiel 28 in the BOKHWOG

Ezekiel 28 in the BOKSSV

Ezekiel 28 in the BOLCB

Ezekiel 28 in the BOLCB2

Ezekiel 28 in the BOMCV

Ezekiel 28 in the BONAV

Ezekiel 28 in the BONCB

Ezekiel 28 in the BONLT

Ezekiel 28 in the BONUT2

Ezekiel 28 in the BOPLNT

Ezekiel 28 in the BOSCB

Ezekiel 28 in the BOSNC

Ezekiel 28 in the BOTLNT

Ezekiel 28 in the BOVCB

Ezekiel 28 in the BOYCB

Ezekiel 28 in the BPBB

Ezekiel 28 in the BPH

Ezekiel 28 in the BSB

Ezekiel 28 in the CCB

Ezekiel 28 in the CUV

Ezekiel 28 in the CUVS

Ezekiel 28 in the DBT

Ezekiel 28 in the DGDNT

Ezekiel 28 in the DHNT

Ezekiel 28 in the DNT

Ezekiel 28 in the ELBE

Ezekiel 28 in the EMTV

Ezekiel 28 in the ESV

Ezekiel 28 in the FBV

Ezekiel 28 in the FEB

Ezekiel 28 in the GGMNT

Ezekiel 28 in the GNT

Ezekiel 28 in the HARY

Ezekiel 28 in the HNT

Ezekiel 28 in the IRVA

Ezekiel 28 in the IRVB

Ezekiel 28 in the IRVG

Ezekiel 28 in the IRVH

Ezekiel 28 in the IRVK

Ezekiel 28 in the IRVM

Ezekiel 28 in the IRVM2

Ezekiel 28 in the IRVO

Ezekiel 28 in the IRVP

Ezekiel 28 in the IRVT

Ezekiel 28 in the IRVT2

Ezekiel 28 in the IRVU

Ezekiel 28 in the ISVN

Ezekiel 28 in the JSNT

Ezekiel 28 in the KAPI

Ezekiel 28 in the KBT1ETNIK

Ezekiel 28 in the KBV

Ezekiel 28 in the KJV

Ezekiel 28 in the KNFD

Ezekiel 28 in the LBA

Ezekiel 28 in the LBLA

Ezekiel 28 in the LNT

Ezekiel 28 in the LSV

Ezekiel 28 in the MAAL

Ezekiel 28 in the MBV

Ezekiel 28 in the MBV2

Ezekiel 28 in the MHNT

Ezekiel 28 in the MKNFD

Ezekiel 28 in the MNG

Ezekiel 28 in the MNT

Ezekiel 28 in the MNT2

Ezekiel 28 in the MRS1T

Ezekiel 28 in the NAA

Ezekiel 28 in the NASB

Ezekiel 28 in the NBLA

Ezekiel 28 in the NBS

Ezekiel 28 in the NBVTP

Ezekiel 28 in the NET2

Ezekiel 28 in the NIV11

Ezekiel 28 in the NNT

Ezekiel 28 in the NNT2

Ezekiel 28 in the NNT3

Ezekiel 28 in the PDDPT

Ezekiel 28 in the PFNT

Ezekiel 28 in the RMNT

Ezekiel 28 in the SBIAS

Ezekiel 28 in the SBIBS

Ezekiel 28 in the SBIBS2

Ezekiel 28 in the SBICS

Ezekiel 28 in the SBIDS

Ezekiel 28 in the SBIGS

Ezekiel 28 in the SBIHS

Ezekiel 28 in the SBIIS

Ezekiel 28 in the SBIIS2

Ezekiel 28 in the SBIIS3

Ezekiel 28 in the SBIKS

Ezekiel 28 in the SBIKS2

Ezekiel 28 in the SBIMS

Ezekiel 28 in the SBIOS

Ezekiel 28 in the SBIPS

Ezekiel 28 in the SBISS

Ezekiel 28 in the SBITS

Ezekiel 28 in the SBITS2

Ezekiel 28 in the SBITS3

Ezekiel 28 in the SBITS4

Ezekiel 28 in the SBIUS

Ezekiel 28 in the SBIVS

Ezekiel 28 in the SBT

Ezekiel 28 in the SBT1E

Ezekiel 28 in the SCHL

Ezekiel 28 in the SNT

Ezekiel 28 in the SUSU

Ezekiel 28 in the SUSU2

Ezekiel 28 in the SYNO

Ezekiel 28 in the TBIAOTANT

Ezekiel 28 in the TBT1E

Ezekiel 28 in the TBT1E2

Ezekiel 28 in the TFTIP

Ezekiel 28 in the TFTU

Ezekiel 28 in the TGNTATF3T

Ezekiel 28 in the THAI

Ezekiel 28 in the TNFD

Ezekiel 28 in the TNT

Ezekiel 28 in the TNTIK

Ezekiel 28 in the TNTIL

Ezekiel 28 in the TNTIN

Ezekiel 28 in the TNTIP

Ezekiel 28 in the TNTIZ

Ezekiel 28 in the TOMA

Ezekiel 28 in the TTENT

Ezekiel 28 in the UBG

Ezekiel 28 in the UGV

Ezekiel 28 in the UGV2

Ezekiel 28 in the UGV3

Ezekiel 28 in the VBL

Ezekiel 28 in the VDCC

Ezekiel 28 in the YALU

Ezekiel 28 in the YAPE

Ezekiel 28 in the YBVTP

Ezekiel 28 in the ZBP