Ezekiel 4 (BOICB)

1 “Ugbu a, gị nwa nke mmadụ, were otu ọkpụrụkpụ aja, tọgbọ ya nʼihu gị. Sepụtakwa obodo Jerusalem nʼelu ya. 2 Seekwa ihe nnọchigide nʼagha megide ya, wuokwa ụlọ ndị agha gburugburu ya, wukọta ụlọ ikwu dị iche iche megide ya na ihe e ji akụdasị mgbidi ya niile. 3 Werekwa efere igwe debe nʼetiti gị na obodo ahụ dịka mgbidi e ji igwe wuo. Chee obodo ahụ ihu gị, ka ị chegide ya nke ọma nʼihi na ndị iro gbara ya gburugburu. Nke a ga-abụ ihe ama nye ndị Izrel. 4 “Ugbu a, dinara ala nʼakụkụ aka ekpe gị, aga m enye gị ntaramahụhụ mmehie ndị Izrel, ị ga-ata ahụhụ mmehie ha ụbọchị niile nke ị ga-edina nʼakụkụ gị. 5 Nʼihi na ana m enye gị narị ụbọchị atọ na iri ụbọchị itoolu, ọnụọgụgụ nke a na ọnụọgụgụ nke afọ ntaramahụhụ ha ga-abụ otu, ọ bụ oge ha. Otu a ka ị ga-esi buru mmehie Izrel. 6 “Mgbe i mesịrị nke a, ị ga-edina ala nke ugboro abụọ, ma ọ ga-abụ nʼakụkụ aka nri gị, ị ga-eburu ntaramahụhụ mmehie ndị Juda. Ọ bụ iri abalị anọ, otu ụbọchị ga-anọchi anya otu afọ. 7 Chee ihu gị nʼebe nnọchibido Jerusalem, gbara aka nkịtị buo amụma megide ya. 8 Aga m eke gị eriri ahụ gị niile, ka ị ghara inwe ike tụgharịa site nʼotu akụkụ gaa nʼakụkụ nke ọzọ tutu ụbọchị nnọchigide gị ahụ niile ezuo. 9 “Ma gị were ọka wiiti na ọka balị, werekwa akịdị na lentil, na ọka milet na spelti. Tinyekọta ha nʼotu ite were ha meere onwe gị achịcha. Nʼụbọchị ole ahụ niile nke ị ga-edina nʼakụkụ gị, narị ụbọchị atọ na iri ụbọchị itoolu, ọ bụ ya ka ị ga-eri. 10 A ga-atụ ihe oriri gị atụ, nri nke ị ga-eri otu mgbe ga-abụ narị gram abụọ na iri gram atọ; naanị otu mgbe ka ị ga-eri nri nʼụbọchị. 11 A ga-ekupụtakwa mmiri ị ga-aṅụ, ị ga-aṅụ mmiri naanị otu ugboro nʼụbọchị, otu udu mmiri e kere ụzọ isii. 12 Ị ga-eri ya dịka ogbe achịcha ọka balị, ị ga-eghe ya nʼelu nsị mmadụ kpọrọ nkụ mgbe ndị mmadụ nọ na-ele gị anya.” 13 ONYENWE ANYỊ kwuru, “Otu a ka ndị Izrel ga-esi rie nri rụrụ arụ, nʼetiti mba dị iche iche ebe m ga-achụga ha.” 14 Mgbe ahụ, asịrị m, “E e, Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ lee, emerụbeghị m onwe m site na nwantakịrị m ruo ugbu a, eribeghị ihe ọbụla nwụrụ nʼonwe ya, maọbụ nke anụ ọhịa dọgburu, anụ na-adịghị ọcha abatụbeghị m nʼọnụ.” 15 Ọ sịrị, “Ọ dị mma, aga m enye gị nsị ehi nʼọnọdụ nke mmadụ, nʼelu ya ka ị ga-akwado achịcha gị.” 16 Mgbe ahụ, ọ gwara m, “Nwa nke mmadụ, lee, aga m eme ka nri kọ na Jerusalem; ha ga-eji nchegbu rie nri a tụpụtara atụpụta, jirikwa egwu ṅụọ mmiri e kupụtara ekupụta. 17 Aga m eme ka ihe oriri na mmiri ọṅụṅụ kọọ ha. Ha ga na-elerịta onwe ha anya nʼoke egwu, ha ga-anwụkwa nʼihi mmehie ha.”

In Other Versions

Ezekiel 4 in the ANGEFD

Ezekiel 4 in the ANTPNG2D

Ezekiel 4 in the AS21

Ezekiel 4 in the BAGH

Ezekiel 4 in the BBPNG

Ezekiel 4 in the BBT1E

Ezekiel 4 in the BDS

Ezekiel 4 in the BEV

Ezekiel 4 in the BHAD

Ezekiel 4 in the BIB

Ezekiel 4 in the BLPT

Ezekiel 4 in the BNT

Ezekiel 4 in the BNTABOOT

Ezekiel 4 in the BNTLV

Ezekiel 4 in the BOATCB

Ezekiel 4 in the BOATCB2

Ezekiel 4 in the BOBCV

Ezekiel 4 in the BOCNT

Ezekiel 4 in the BOECS

Ezekiel 4 in the BOGWICC

Ezekiel 4 in the BOHCB

Ezekiel 4 in the BOHCV

Ezekiel 4 in the BOHLNT

Ezekiel 4 in the BOHNTLTAL

Ezekiel 4 in the BOILNTAP

Ezekiel 4 in the BOITCV

Ezekiel 4 in the BOKCV

Ezekiel 4 in the BOKCV2

Ezekiel 4 in the BOKHWOG

Ezekiel 4 in the BOKSSV

Ezekiel 4 in the BOLCB

Ezekiel 4 in the BOLCB2

Ezekiel 4 in the BOMCV

Ezekiel 4 in the BONAV

Ezekiel 4 in the BONCB

Ezekiel 4 in the BONLT

Ezekiel 4 in the BONUT2

Ezekiel 4 in the BOPLNT

Ezekiel 4 in the BOSCB

Ezekiel 4 in the BOSNC

Ezekiel 4 in the BOTLNT

Ezekiel 4 in the BOVCB

Ezekiel 4 in the BOYCB

Ezekiel 4 in the BPBB

Ezekiel 4 in the BPH

Ezekiel 4 in the BSB

Ezekiel 4 in the CCB

Ezekiel 4 in the CUV

Ezekiel 4 in the CUVS

Ezekiel 4 in the DBT

Ezekiel 4 in the DGDNT

Ezekiel 4 in the DHNT

Ezekiel 4 in the DNT

Ezekiel 4 in the ELBE

Ezekiel 4 in the EMTV

Ezekiel 4 in the ESV

Ezekiel 4 in the FBV

Ezekiel 4 in the FEB

Ezekiel 4 in the GGMNT

Ezekiel 4 in the GNT

Ezekiel 4 in the HARY

Ezekiel 4 in the HNT

Ezekiel 4 in the IRVA

Ezekiel 4 in the IRVB

Ezekiel 4 in the IRVG

Ezekiel 4 in the IRVH

Ezekiel 4 in the IRVK

Ezekiel 4 in the IRVM

Ezekiel 4 in the IRVM2

Ezekiel 4 in the IRVO

Ezekiel 4 in the IRVP

Ezekiel 4 in the IRVT

Ezekiel 4 in the IRVT2

Ezekiel 4 in the IRVU

Ezekiel 4 in the ISVN

Ezekiel 4 in the JSNT

Ezekiel 4 in the KAPI

Ezekiel 4 in the KBT1ETNIK

Ezekiel 4 in the KBV

Ezekiel 4 in the KJV

Ezekiel 4 in the KNFD

Ezekiel 4 in the LBA

Ezekiel 4 in the LBLA

Ezekiel 4 in the LNT

Ezekiel 4 in the LSV

Ezekiel 4 in the MAAL

Ezekiel 4 in the MBV

Ezekiel 4 in the MBV2

Ezekiel 4 in the MHNT

Ezekiel 4 in the MKNFD

Ezekiel 4 in the MNG

Ezekiel 4 in the MNT

Ezekiel 4 in the MNT2

Ezekiel 4 in the MRS1T

Ezekiel 4 in the NAA

Ezekiel 4 in the NASB

Ezekiel 4 in the NBLA

Ezekiel 4 in the NBS

Ezekiel 4 in the NBVTP

Ezekiel 4 in the NET2

Ezekiel 4 in the NIV11

Ezekiel 4 in the NNT

Ezekiel 4 in the NNT2

Ezekiel 4 in the NNT3

Ezekiel 4 in the PDDPT

Ezekiel 4 in the PFNT

Ezekiel 4 in the RMNT

Ezekiel 4 in the SBIAS

Ezekiel 4 in the SBIBS

Ezekiel 4 in the SBIBS2

Ezekiel 4 in the SBICS

Ezekiel 4 in the SBIDS

Ezekiel 4 in the SBIGS

Ezekiel 4 in the SBIHS

Ezekiel 4 in the SBIIS

Ezekiel 4 in the SBIIS2

Ezekiel 4 in the SBIIS3

Ezekiel 4 in the SBIKS

Ezekiel 4 in the SBIKS2

Ezekiel 4 in the SBIMS

Ezekiel 4 in the SBIOS

Ezekiel 4 in the SBIPS

Ezekiel 4 in the SBISS

Ezekiel 4 in the SBITS

Ezekiel 4 in the SBITS2

Ezekiel 4 in the SBITS3

Ezekiel 4 in the SBITS4

Ezekiel 4 in the SBIUS

Ezekiel 4 in the SBIVS

Ezekiel 4 in the SBT

Ezekiel 4 in the SBT1E

Ezekiel 4 in the SCHL

Ezekiel 4 in the SNT

Ezekiel 4 in the SUSU

Ezekiel 4 in the SUSU2

Ezekiel 4 in the SYNO

Ezekiel 4 in the TBIAOTANT

Ezekiel 4 in the TBT1E

Ezekiel 4 in the TBT1E2

Ezekiel 4 in the TFTIP

Ezekiel 4 in the TFTU

Ezekiel 4 in the TGNTATF3T

Ezekiel 4 in the THAI

Ezekiel 4 in the TNFD

Ezekiel 4 in the TNT

Ezekiel 4 in the TNTIK

Ezekiel 4 in the TNTIL

Ezekiel 4 in the TNTIN

Ezekiel 4 in the TNTIP

Ezekiel 4 in the TNTIZ

Ezekiel 4 in the TOMA

Ezekiel 4 in the TTENT

Ezekiel 4 in the UBG

Ezekiel 4 in the UGV

Ezekiel 4 in the UGV2

Ezekiel 4 in the UGV3

Ezekiel 4 in the VBL

Ezekiel 4 in the VDCC

Ezekiel 4 in the YALU

Ezekiel 4 in the YAPE

Ezekiel 4 in the YBVTP

Ezekiel 4 in the ZBP