Ezekiel 46 (BOICB)

1 “ ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwuru, Ọnụ ụzọ ama nke ogige ime, nke na-eche ihu nʼọwụwa anyanwụ ga-abụ ihe e mechiri emechi nʼụbọchị isii niile unu na-arụ ọrụ. Ma a ga-emeghe ya nʼụbọchị izuike, na nʼụbọchị mmemme ọnwa ọhụrụ. 2 Nwa eze ga-esitekwa na mpụta ọnụ ụlọ nke ọnụ ụzọ ama bata, guzoro nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama. Ndị nchụaja ga-edozikwa aja nsure ọkụ ya, na aja udo ya. Ọ ga-anọkwa nʼụlọ mbata kpọọ isiala nke ofufe ya, sitekwa nʼebe ahụ pụọ. Ma a gaghị emechi ọnụ ụzọ ahụ tutu ruo anyasị. 3 Nʼihu ọnụ ụzọ ama ka ndị ala a ga-anọ fee ONYENWE ANYỊ ofufe nʼụbọchị izuike na nʼụbọchị mmemme ọnwa ọhụrụ. 4 Ihe nwa eze ahụ ga-eji chụọrọ ONYENWE ANYỊ aja nsure ọkụ nʼụbọchị izuike na nʼoge mmemme ọnwa ọhụrụ ga-abụ ụmụ ebule isii, na otu ebule, ndị na-enweghị ntụpọ. 5 Ọ ga-eweta ihe e ji achụ aja mkpụrụ ọka, nke bụ iri lita ụtụ ọka abụọ na abụọ, na otu ebule. Ọ ga-ewetakwa lita mmanụ oliv asaa maka iri lita ụtụ ọka abụọ na abụọ ahụ, tinyere onyinye ụmụ atụrụ dịka o si masị ya. 6 Nʼụbọchị mmemme ọnwa ọhụrụ, ọ ga-eweta otu nwa oke ehi, ụmụ atụrụ isii na otu ebule, ha niile ọ dịghị nke ga-enwe ntụpọ ọbụla. 7 Ọ ga-ewetakwa otu oke ehi na iri lita ụtụ ọka iri abụọ na abụọ, maka aja mkpụrụ ọka. Ọ ga-enye ebule ahụ na iri lita ụtụ ọka iri abụọ na abụọ. Ọ ga-enyekwa ụmụ atụrụ ndị ahụ na ụtụ ọka dịka o si masị ya inye ha, tinyere iri lita ọka abụọ na abụọ, nke ọ ga-eweta maka lita mmanụ oliv asaa. 8 Mgbe nwa eze ga-abata nʼụlọ ahụ, ọ ga-esite na mpụta ọnụ ụlọ nke ọnụ ụzọ ama, ebe ahụ kwa ka ọ ga-esikwa pụọ. 9 “ ‘Ma mgbe ndị ala ahụ ga-abata nʼihu ONYENWE ANYỊ nʼoge mmemme dị nsọ, onye ọbụla sitere nʼọnụ ụzọ dị nʼugwu bata aghaghị ịpụ site nʼọnụ ụzọ nke dị na ndịda. Ndị si na ndịda bata ga-esitekwa nʼụzọ nke ugwu pụọ. Ọ dịghị onye ga-esi nʼụzọ o si bata laghachi, kama ha ga-esi ụzọ nke chere ebe ha si bata ihu pụọ. 10 Nwa eze ga-anọ nʼetiti ha, ọ bụrụ na ha abanye, ọ ga-eso ha banye, ọ bụrụkwa na ha apụwa, ọ ga-esokwa ha pụọ. 11 Nʼoge mmemme ndị ahụ pụrụ iche, na mmemme ndị akara aka, ihe a ga-eji nye onyinye mkpụrụ ọka ga-abụ iri lita ụtụ ọka abụọ na abụọ, na otu oke ehi, na iri lita ụtụ ọka abụọ na abụọ na otu ebule, tinyere ụmụ atụrụ nke ọnụọgụgụ ya ga-abụ dịka o si masị ya, tinyere lita mmanụ asaa maka iri lita ụtụ ọka abụọ na abụọ ọbụla. 12 “ ‘Mgbe ọbụla onyeisi chọrọ inye onyinye afọ ofufu, maka ịchụrụ ONYENWE ANYỊ aja nsure ọkụ maọbụ aja udo, a ga-emeghere ya ọnụ ụzọ ime nke dị nʼọwụwa anyanwụ ka o si nʼebe ahụ bata. Ọ ga-enye onyinye ya dịka e si enye ya nʼụbọchị izuike. Emesịa, ọ ga-atụgharịa pụọ. A ga-emechikwa ụzọ ahụ mgbe ọ pụchara. 13 “ ‘Ọ bụ nwa atụrụ gbara otu afọ nke na-enweghị ntụpọ ka ị ga-eweta ụbọchị niile maka ịchụ aja nsure ọkụ nye ONYENWE ANYỊ, ọ bụ kwa ụtụtụ, kwa ụtụtụ ka ị ga-eweta ya. 14 Ị ga-ewetakwa onyinye mkpụrụ ọka kwa ụtụtụ kwa ụtụtụ tinyere ya, ihe niile ga-emejupụta ya bụ lita ụtụ ọka isii, na lita mmanụ abụọ e ji agwakọta ya. Iche onyinye mkpụrụ ọka a nʼihu ONYENWE ANYỊ bụ ụkpụrụ ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 15 Ya mere, ha ga-edozi nwa atụrụ na ụtụ ọka na mmanụ oliv ahụ, kwa ụtụtụ kwa ụtụtụ, maka aja nsure ọkụ a na-achụ kwa mgbe niile. 16 “ ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYỊ kwuru, ọ bụrụ na onyeisi enye onye ọbụla nʼime ụmụ ya ndị ikom onyinye site nʼihe nketa ya, ihe ahụ ga-abụ nke ya, bụrụkwa nke mkpụrụ ya, ọ ga-abụ oke ha site nʼihe nketa ruo ebighị ebi. 17 Ọ bụrụkwanụ na o kenye otu nʼime ndị ohu ya ala site nʼihe nketa ya, ala ahụ ga-abụ nke ohu ahụ tutu ruo nʼafọ inwere onwe, nke bụ afọ asaa ọbụla. Mgbe ahụ, ohu ahụ ga-enwere onwe ya, ma ala ahụ ga-aghọkwa nke nwa eze ahụ. Ihe nketa ya bụ nke dịịrị naanị ụmụ ya, nke ha ka ọ bụ. 18 Nwa eze ahụ agaghị ewere ala ọbụla site nʼihe nketa ndị mmadụ nʼaka ike, si otu a chụpụ ha site nʼala ha. Ala ọbụla ọ na-enye ụmụ ya ga-abụrịrị ihe nketa sitere nʼala nke aka ya. Ka a ghara ime ka ọ bụladị otu nʼime ndị m bụrụ onye e kewapụrụ site nʼihe nketa ha.’ ” 19 Mgbe nke a gasịrị, o duuru m site nʼọnụ ụzọ dị nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama kpọbata m nʼọnụụlọ ndị ahụ dị nsọ, nke chere ihu nʼugwu, nke bụ ihe nketa ndị nchụaja. O gosiri m otu ebe dị na nsọtụ akụkụ ọdịda anyanwụ. 20 Ọ sịrị m, “Ebe a ka ndị nchụaja ga-anọ sie anụ aja ikpe ọmụma na aja mmehie. Ebe a ka ha ga-anọkwa ghee onyinye mkpụrụ ọka, ka a ghara iwebata ha na mpụta ogige a nakwa ido ndị mmadụ nsọ.” 21 Mgbe ahụ, o mere ka m pụta ọzọ nʼogige ezi. O duuru m gaa nʼakụkụ anọ nke ogige ahụ. Ahụrụ m na e nwere ogige nke dị nʼakụkụ ọbụla. 22 Nʼakụkụ anọ nke ogige ndị a, ogige ndị ọzọ dị nʼime ha. Ha ruru mita iri abụọ na atọ nʼogologo, ebe obosara ha rukwara mita iri na asaa nʼọkara. Ogige anọ ndị a ha nʼotu. 23 Nʼime ụlọ ahụ, gburugburu ya, e nwere ahịrị e ji nkume doo, nke nwere ekwu dị nʼokpuru ahịrị nkume ahụ. 24 Ọ sịrị m, “Ndị a bụ ụlọ ebe ndị niile na-eje ozi nʼụlọnsọ ukwu ahụ ga-anọ na-esi ihe aja niile ndị mmadụ webatara.”

In Other Versions

Ezekiel 46 in the ANGEFD

Ezekiel 46 in the ANTPNG2D

Ezekiel 46 in the AS21

Ezekiel 46 in the BAGH

Ezekiel 46 in the BBPNG

Ezekiel 46 in the BBT1E

Ezekiel 46 in the BDS

Ezekiel 46 in the BEV

Ezekiel 46 in the BHAD

Ezekiel 46 in the BIB

Ezekiel 46 in the BLPT

Ezekiel 46 in the BNT

Ezekiel 46 in the BNTABOOT

Ezekiel 46 in the BNTLV

Ezekiel 46 in the BOATCB

Ezekiel 46 in the BOATCB2

Ezekiel 46 in the BOBCV

Ezekiel 46 in the BOCNT

Ezekiel 46 in the BOECS

Ezekiel 46 in the BOGWICC

Ezekiel 46 in the BOHCB

Ezekiel 46 in the BOHCV

Ezekiel 46 in the BOHLNT

Ezekiel 46 in the BOHNTLTAL

Ezekiel 46 in the BOILNTAP

Ezekiel 46 in the BOITCV

Ezekiel 46 in the BOKCV

Ezekiel 46 in the BOKCV2

Ezekiel 46 in the BOKHWOG

Ezekiel 46 in the BOKSSV

Ezekiel 46 in the BOLCB

Ezekiel 46 in the BOLCB2

Ezekiel 46 in the BOMCV

Ezekiel 46 in the BONAV

Ezekiel 46 in the BONCB

Ezekiel 46 in the BONLT

Ezekiel 46 in the BONUT2

Ezekiel 46 in the BOPLNT

Ezekiel 46 in the BOSCB

Ezekiel 46 in the BOSNC

Ezekiel 46 in the BOTLNT

Ezekiel 46 in the BOVCB

Ezekiel 46 in the BOYCB

Ezekiel 46 in the BPBB

Ezekiel 46 in the BPH

Ezekiel 46 in the BSB

Ezekiel 46 in the CCB

Ezekiel 46 in the CUV

Ezekiel 46 in the CUVS

Ezekiel 46 in the DBT

Ezekiel 46 in the DGDNT

Ezekiel 46 in the DHNT

Ezekiel 46 in the DNT

Ezekiel 46 in the ELBE

Ezekiel 46 in the EMTV

Ezekiel 46 in the ESV

Ezekiel 46 in the FBV

Ezekiel 46 in the FEB

Ezekiel 46 in the GGMNT

Ezekiel 46 in the GNT

Ezekiel 46 in the HARY

Ezekiel 46 in the HNT

Ezekiel 46 in the IRVA

Ezekiel 46 in the IRVB

Ezekiel 46 in the IRVG

Ezekiel 46 in the IRVH

Ezekiel 46 in the IRVK

Ezekiel 46 in the IRVM

Ezekiel 46 in the IRVM2

Ezekiel 46 in the IRVO

Ezekiel 46 in the IRVP

Ezekiel 46 in the IRVT

Ezekiel 46 in the IRVT2

Ezekiel 46 in the IRVU

Ezekiel 46 in the ISVN

Ezekiel 46 in the JSNT

Ezekiel 46 in the KAPI

Ezekiel 46 in the KBT1ETNIK

Ezekiel 46 in the KBV

Ezekiel 46 in the KJV

Ezekiel 46 in the KNFD

Ezekiel 46 in the LBA

Ezekiel 46 in the LBLA

Ezekiel 46 in the LNT

Ezekiel 46 in the LSV

Ezekiel 46 in the MAAL

Ezekiel 46 in the MBV

Ezekiel 46 in the MBV2

Ezekiel 46 in the MHNT

Ezekiel 46 in the MKNFD

Ezekiel 46 in the MNG

Ezekiel 46 in the MNT

Ezekiel 46 in the MNT2

Ezekiel 46 in the MRS1T

Ezekiel 46 in the NAA

Ezekiel 46 in the NASB

Ezekiel 46 in the NBLA

Ezekiel 46 in the NBS

Ezekiel 46 in the NBVTP

Ezekiel 46 in the NET2

Ezekiel 46 in the NIV11

Ezekiel 46 in the NNT

Ezekiel 46 in the NNT2

Ezekiel 46 in the NNT3

Ezekiel 46 in the PDDPT

Ezekiel 46 in the PFNT

Ezekiel 46 in the RMNT

Ezekiel 46 in the SBIAS

Ezekiel 46 in the SBIBS

Ezekiel 46 in the SBIBS2

Ezekiel 46 in the SBICS

Ezekiel 46 in the SBIDS

Ezekiel 46 in the SBIGS

Ezekiel 46 in the SBIHS

Ezekiel 46 in the SBIIS

Ezekiel 46 in the SBIIS2

Ezekiel 46 in the SBIIS3

Ezekiel 46 in the SBIKS

Ezekiel 46 in the SBIKS2

Ezekiel 46 in the SBIMS

Ezekiel 46 in the SBIOS

Ezekiel 46 in the SBIPS

Ezekiel 46 in the SBISS

Ezekiel 46 in the SBITS

Ezekiel 46 in the SBITS2

Ezekiel 46 in the SBITS3

Ezekiel 46 in the SBITS4

Ezekiel 46 in the SBIUS

Ezekiel 46 in the SBIVS

Ezekiel 46 in the SBT

Ezekiel 46 in the SBT1E

Ezekiel 46 in the SCHL

Ezekiel 46 in the SNT

Ezekiel 46 in the SUSU

Ezekiel 46 in the SUSU2

Ezekiel 46 in the SYNO

Ezekiel 46 in the TBIAOTANT

Ezekiel 46 in the TBT1E

Ezekiel 46 in the TBT1E2

Ezekiel 46 in the TFTIP

Ezekiel 46 in the TFTU

Ezekiel 46 in the TGNTATF3T

Ezekiel 46 in the THAI

Ezekiel 46 in the TNFD

Ezekiel 46 in the TNT

Ezekiel 46 in the TNTIK

Ezekiel 46 in the TNTIL

Ezekiel 46 in the TNTIN

Ezekiel 46 in the TNTIP

Ezekiel 46 in the TNTIZ

Ezekiel 46 in the TOMA

Ezekiel 46 in the TTENT

Ezekiel 46 in the UBG

Ezekiel 46 in the UGV

Ezekiel 46 in the UGV2

Ezekiel 46 in the UGV3

Ezekiel 46 in the VBL

Ezekiel 46 in the VDCC

Ezekiel 46 in the YALU

Ezekiel 46 in the YAPE

Ezekiel 46 in the YBVTP

Ezekiel 46 in the ZBP