Ezra 4 (BOICB)

1 Mgbe ndị iro Juda na Benjamin nụrụ na ndị ahụ a dọtara nʼagha alọtala, nụkwa na ha na-ewugharị ụlọnsọ ukwu ONYENWE ANYỊ, Chineke Izrel, 2 ha bịakwutere Zerubabel na ndịisi ezinaụlọ sị ha, “Kwerenụ ka anyị nyere unu aka nʼọrụ iwu ụlọ a, nʼihi na anyị hụrụ Chineke unu nʼanya dịka unu onwe unu si hụ ya nʼanya. Lee na kemgbe Isahadon eze Asịrịa butere anyị nʼebe a, anyị alabeghị azụ ịchụrụ ya aja.” 3 Ma Zerubabel, na Jeshua na ndịisi ọzọ zara sị ha, “Unu enweghị oke ọbụla nʼọrụ iwuru Chineke anyị ụlọnsọ. Naanị ndị anyị ga-ewuru ONYENWE ANYỊ, Chineke Izrel ụlọ ukwu a dịka Sairọs eze Peshịa nyere nʼiwu.” 4 Ya mere ndị niile nọ ha gburugburu malitere ime ihe ga-ewetara ndị Juda ịda mba nʼobi, na ihe ga-eme ka ụjọ tụọ ha ịga nʼihu nʼọrụ iwu ụlọ ahụ. 5 Ha ji ngarị gota ụfọdụ ndịisi ka ha megide ha, mebikwaa atụmatụ ha niile nʼoge niile Sairọs bụ eze Peshịa, ruokwa nʼoge Daraiọs ghọrọ eze ọhụrụ Peshịa. 6 Na mmalite ọchịchị Sekses, ha deere ya akwụkwọ ebubo megide ndị Juda na Jerusalem. 7 Nʼụbọchị niile ahụ Ataksekses bụ eze ndị Peshịa, ka Bishlam, na Mitredat, na Tabeel, na ndị otu ya fọdụrụ degaara Ataksekses akwụkwọ. E dere akwụkwọ ozi ahụ nʼodide akwụkwọ ndị Aramaik, a sụgharịkwara ya nʼasụsụ Aramaik. 8 Ndị ọzọ soro ha gbaa ajọ izu a bụ Rehum onyeisi ọchịchị, na Shimshai ode akwụkwọ. Ha deere Ataksekses akwụkwọ megide ndị Jerusalem sị ya: 9 “Akwụkwọ ozi a si nʼaka Rehum, onyeisi agha na Shimshai ode akwụkwọ, na ndị otu anyị ndị ọzọ, na ndị ikpe, na ndịisi obodo na-elekọta ndị ahụ niile si Tripolis, na Peshịa, na Erek, na Babilọn, na Susa nke dị nʼElam, 10 na ọtụtụ ndị ọzọ ahụ onye ukwu ahụ na onye a na-asọpụrụ bụ Ashobanipal si nʼala ha bupụ bute na Sameria, na obodo ndị ọzọ dị nʼọdịda anyanwụ Yufretis.” 11 Nke a bụ ihe ha dere nʼakwụkwọ ha zigaaraEze Ataksekses.Ọ bụ gị, eze ukwu Ataksekses, ka ndị ohu gị bi nʼakụkụ ọdịda anyanwụ Yufretis na-edetara akwụkwọ a. 12 Nke a bụ ime ka ị mata na ndị Juu si Babilọn lọta Jerusalem ọhụrụ a ebidola iwughachi obodo ọjọọ nke nnupu isi ahụ. Ha ewuolarị mgbidi ya, tọkwaa ntọala ya. 13 Anyị chọrọ ka o doo gị anya na ọ bụrụ na ha ewuchaa ya, ọ ga-abụ nsogbu nye alaeze gị, nʼihi na ndị Juu agaghị ekwekwa ịtụrụ gị ụtụ isi ha. 14 Ebe anyị na-asọpụrụ gị dịka nna anyị ukwu, anyị achọghị ka ihe ọjọọ mee nʼalaeze gị, ya mere anyị ji kpebie idere gị akwụkwọ a. 15 Anyị chọrọ ka i leba anya nʼakwụkwọ akụkọ nke mgbe ochie, ka ị chọpụta na ọ dịghị mgbe Jerusalem na-ejighị bụrụ obodo nnupu isi. Nʼezie, ọ bụ nʼihi nnupu isi a na nkwulu nke ha na-ekwulu ndị eze dị iche iche, ka e ji bibie ya na mbụ. 16 Anyị chọrọ ka ị mata na ọ bụrụ na e wuchaa mgbidi obodo a, ọ ga-esi ike ka akụkụ alaeze gị a, nke dị ruo nʼosimiri Yufretis, bụrụkwa nke gị ọzọ. 17 Eze ahụ si otu a saa akwụkwọ ahụ,Ọ sịrị ha, Rehum onyeisi ọchịchị, na Shimshai ode akwụkwọ, na ndị otu ha bi na Sameria ruo nʼọdịda anyanwụ nke osimiri Yufretis.Ndeewonụ. 18 Akwụkwọ ozi ahụ unu zitere anyị, agụọla ma tapịakwaa ya nʼihu m. 19 Enyere m iwu ka e nyochaa chọpụta, e mere nyochaa, a chọpụtakwara ya nʼakwụkwọ na obodo a siterị nʼoge gara aga bụ obodo na-ebuli onwe ya megide ọtụtụ ndị eze, bụrụkwa ebe na-akpali nnupu isi na okwu na-eweta ọgbaaghara. 20 Jerusalem e nweela ụfọdụ ndị eze nke chịrị nʼIzrel, ndị dị ike a maara aha ha, ndị alaeze ha gbasara rute nʼosimiri Yufretis, ndị a na-atụkwara ụtụ dị iche iche. 21 Ugbu a, nye iwu ka ndị ikom ndị ahụ kwụsị ọrụ, ka a ghara iwuzi obodo a tutu ruo mgbe m ga-enye iwu. 22 Lezienụ anya ka unu ghara i lepụrụ okwu a anya. Gịnị ga-eme ka a hapụ ihe iyi egwu a ka ọ gaa nʼihu, ime ka ihe jọrọ alaeze a njọ karịa? 23 Ngwangwa a gụrụ akwụkwọ ozi si nʼaka eze Ataksekses, nye Rehum na Shimshai bụ ode akwụkwọ, na ndị otu ha, ha mere ọsịịsọ gakwuru ndị Juu na Jerusalem jiri ike kwagide ha ka ha kwụsị ịrụ ọrụ ahụ. 24 Ya mere, ha kwụsịrị ịrụ ọrụ nʼụlọnsọ ukwu Chineke na Jerusalem tutu ruo nʼafọ abụọ nke ọchịchị Daraiọs eze Peshịa.

In Other Versions

Ezra 4 in the ANGEFD

Ezra 4 in the ANTPNG2D

Ezra 4 in the AS21

Ezra 4 in the BAGH

Ezra 4 in the BBPNG

Ezra 4 in the BBT1E

Ezra 4 in the BDS

Ezra 4 in the BEV

Ezra 4 in the BHAD

Ezra 4 in the BIB

Ezra 4 in the BLPT

Ezra 4 in the BNT

Ezra 4 in the BNTABOOT

Ezra 4 in the BNTLV

Ezra 4 in the BOATCB

Ezra 4 in the BOATCB2

Ezra 4 in the BOBCV

Ezra 4 in the BOCNT

Ezra 4 in the BOECS

Ezra 4 in the BOGWICC

Ezra 4 in the BOHCB

Ezra 4 in the BOHCV

Ezra 4 in the BOHLNT

Ezra 4 in the BOHNTLTAL

Ezra 4 in the BOILNTAP

Ezra 4 in the BOITCV

Ezra 4 in the BOKCV

Ezra 4 in the BOKCV2

Ezra 4 in the BOKHWOG

Ezra 4 in the BOKSSV

Ezra 4 in the BOLCB

Ezra 4 in the BOLCB2

Ezra 4 in the BOMCV

Ezra 4 in the BONAV

Ezra 4 in the BONCB

Ezra 4 in the BONLT

Ezra 4 in the BONUT2

Ezra 4 in the BOPLNT

Ezra 4 in the BOSCB

Ezra 4 in the BOSNC

Ezra 4 in the BOTLNT

Ezra 4 in the BOVCB

Ezra 4 in the BOYCB

Ezra 4 in the BPBB

Ezra 4 in the BPH

Ezra 4 in the BSB

Ezra 4 in the CCB

Ezra 4 in the CUV

Ezra 4 in the CUVS

Ezra 4 in the DBT

Ezra 4 in the DGDNT

Ezra 4 in the DHNT

Ezra 4 in the DNT

Ezra 4 in the ELBE

Ezra 4 in the EMTV

Ezra 4 in the ESV

Ezra 4 in the FBV

Ezra 4 in the FEB

Ezra 4 in the GGMNT

Ezra 4 in the GNT

Ezra 4 in the HARY

Ezra 4 in the HNT

Ezra 4 in the IRVA

Ezra 4 in the IRVB

Ezra 4 in the IRVG

Ezra 4 in the IRVH

Ezra 4 in the IRVK

Ezra 4 in the IRVM

Ezra 4 in the IRVM2

Ezra 4 in the IRVO

Ezra 4 in the IRVP

Ezra 4 in the IRVT

Ezra 4 in the IRVT2

Ezra 4 in the IRVU

Ezra 4 in the ISVN

Ezra 4 in the JSNT

Ezra 4 in the KAPI

Ezra 4 in the KBT1ETNIK

Ezra 4 in the KBV

Ezra 4 in the KJV

Ezra 4 in the KNFD

Ezra 4 in the LBA

Ezra 4 in the LBLA

Ezra 4 in the LNT

Ezra 4 in the LSV

Ezra 4 in the MAAL

Ezra 4 in the MBV

Ezra 4 in the MBV2

Ezra 4 in the MHNT

Ezra 4 in the MKNFD

Ezra 4 in the MNG

Ezra 4 in the MNT

Ezra 4 in the MNT2

Ezra 4 in the MRS1T

Ezra 4 in the NAA

Ezra 4 in the NASB

Ezra 4 in the NBLA

Ezra 4 in the NBS

Ezra 4 in the NBVTP

Ezra 4 in the NET2

Ezra 4 in the NIV11

Ezra 4 in the NNT

Ezra 4 in the NNT2

Ezra 4 in the NNT3

Ezra 4 in the PDDPT

Ezra 4 in the PFNT

Ezra 4 in the RMNT

Ezra 4 in the SBIAS

Ezra 4 in the SBIBS

Ezra 4 in the SBIBS2

Ezra 4 in the SBICS

Ezra 4 in the SBIDS

Ezra 4 in the SBIGS

Ezra 4 in the SBIHS

Ezra 4 in the SBIIS

Ezra 4 in the SBIIS2

Ezra 4 in the SBIIS3

Ezra 4 in the SBIKS

Ezra 4 in the SBIKS2

Ezra 4 in the SBIMS

Ezra 4 in the SBIOS

Ezra 4 in the SBIPS

Ezra 4 in the SBISS

Ezra 4 in the SBITS

Ezra 4 in the SBITS2

Ezra 4 in the SBITS3

Ezra 4 in the SBITS4

Ezra 4 in the SBIUS

Ezra 4 in the SBIVS

Ezra 4 in the SBT

Ezra 4 in the SBT1E

Ezra 4 in the SCHL

Ezra 4 in the SNT

Ezra 4 in the SUSU

Ezra 4 in the SUSU2

Ezra 4 in the SYNO

Ezra 4 in the TBIAOTANT

Ezra 4 in the TBT1E

Ezra 4 in the TBT1E2

Ezra 4 in the TFTIP

Ezra 4 in the TFTU

Ezra 4 in the TGNTATF3T

Ezra 4 in the THAI

Ezra 4 in the TNFD

Ezra 4 in the TNT

Ezra 4 in the TNTIK

Ezra 4 in the TNTIL

Ezra 4 in the TNTIN

Ezra 4 in the TNTIP

Ezra 4 in the TNTIZ

Ezra 4 in the TOMA

Ezra 4 in the TTENT

Ezra 4 in the UBG

Ezra 4 in the UGV

Ezra 4 in the UGV2

Ezra 4 in the UGV3

Ezra 4 in the VBL

Ezra 4 in the VDCC

Ezra 4 in the YALU

Ezra 4 in the YAPE

Ezra 4 in the YBVTP

Ezra 4 in the ZBP