Genesis 19 (BOICB)

1 Nʼoge anyasị, ndị mmụọ ozi abụọ ahụ bịarutere Sọdọm. Lọt nọ ala nʼọnụ ụzọ ama obodo ahụ. Mgbe ọ hụrụ ha, o biliri jekwuru ha, hulata ihu ya nʼala. 2 Ọ sịrị, “Ndị nwe m, batanụ nʼụlọ ohu unu. Unu nwere ike saa ụkwụ unu, nọọkwa ọnọdụ abalị. Chi bọọ, unu nwere ike ibilikwa bido ịga nʼihu nʼije unu.”Ha zara sị, “Ee, anyị ga-edina nʼama.” 3 Ma Lọt rịọsiri ha ike. Nʼikpeazụ ha sooro ya laa nʼụlọ ya. Ọ kwadooro ha ihe oriri, ya bụ achịcha na-ekoghị eko ka o ghere. Ha rikwara ya. 4 Tupu ha abanye ịrahụ ụra, ndị ikom obodo ahụ, ndị ikom Sọdọm, bịara gbaa ụlọ ahụ gburugburu, ma ụmụ okorobịa ma ndị agadi, ndị niile si nʼakụkụ obodo ahụ. 5 Ha kpọrọ Lọt oku sị ya, “Olee ebe ha nọ, bụ ndị ikom ahụ bịara nʼụlọ gị nʼabalị a? Kpọpụtara anyị ha ka anyị na ha dinakọọ.” 6 Lọt pụkwuru ha nʼezi, mechie ụzọ ụlọ ya, 7 sị ha, “Bikonu, ndị enyi m, unu emela ihe ọjọọ dị otu a. 8 Leenụ, enwere m ụmụ nke aka m, ụmụ agbọghọ abụọ na-amaghị nwoke. Ka m kpọpụtara unu ha, ka unu mee ha ihe masịrị unu. Ma hapụnụ ndị ikom ndị a, nʼihi na ha bụ ndị batara izere ndụ nʼụlọ m.” 9 Ha zara sị ya, “Pụọra anyị nʼụzọ. Mbịarambịa ka ị bụ! Leenụ mbịarambịa a! Ọ chọrọ ịbụ onye ikpe. Anyị mee gị ihe, ọ ga-ajọrọ gị njọ karịa ihe anyị ga-eme ha.” Ha nuru Lọt aka nughachi ya azụ, malite itiwa ọnụ ụzọ ụlọ ya. 10 Ma ndị ikom ahụ nọ nʼụlọ Lọt, setịpụrụ aka ha dọbata ya nʼụlọ, ma mechie ụzọ ahụ. 11 Ha tiri ndị ikom ndị ahụ nọ nʼọnụ ụzọ ihe otiti nke mere ka ha kpụọ ìsì, onye ukwu ha na onye nta ha. Nʼihi ya, ha enweghị ike ịchọta ọnụ ụzọ ụlọ ahụ. 12 Ndị ikom abụọ ahụ gwara Lọt sị, “O nwere onye ọbụla ọzọ i nwere nʼebe a? Ndị ọgọ nwoke, maọbụ ụmụ gị ndị ikom, maọbụ ụmụ gị ndị inyom, na ọ bụ onye ọbụla bụ nke gị nʼobodo a. Site nʼebe a kpọpụ ha! 13 Nʼihi na anyị na-aga imebi obodo a, mkpu akwa ruru ONYENWE ANYỊ ntị megide ndị bi nʼobodo a adịla ukwuu, nke mere o ji zite anyị ibibi ya.” 14 Ya mere, Lọt pụrụ gaa gwa ndị ọgọ ya nwoke, ndị na-akwado ịlụ ụmụ ya ndị inyom, sị ha, “Ọsọ, sinụ nʼobodo a pụọ. Nʼihi na ONYENWE ANYỊ na-akwado ibibi ya.” Ma ndị ọgọ ya nwoke ndị a chere na ọ na-egwu egwu. 15 Nʼụtụtụ, mgbe chi na-abọta, ndị mmụọ ozi a kwagidere Lọt sị ya, “Ọsọ, kpọrọ nwunye gị na ụmụ gị ndị inyom abụọ ndị a site nʼebe a gbapụ, ma ọ bụghị ya, a ga-ekpochapụ unu nʼihi ajọ omume ndị obodo a.” 16 Mgbe Lọt ka nọ na-eche ihe ọ ga-eme, ndị ikom ahụ jidere ya nʼaka, jidekwa nwunye ya, na ụmụ ya ndị inyom abụọ duru ha pụọ nʼobodo ahụ, nʼihi na ONYENWE ANYỊ nwere obi ebere nʼebe ha nọ. 17 Mgbe ha si nʼime obodo kpọpụta ha, otu onye nʼime ha gwara ha sị, “Gbalaganụ nʼihi ndụ unu. Unu elekwala anya nʼazụ. Unu akwụsịkwala ebe ọbụla na mbara ala. Gbaganụ nʼugwu, nʼihi na ọ bụrụ na unu emeghị otu a, a ga-ekpochapụ unu.” 18 Ma Lọt sịrị ha, “Mba, ndị nwe m, bikonu, 19 ohu unu achọtala amara nʼihu unu, unu egosila m obi ebere dị ukwuu site nʼichebe ndụ m. Ma agaghị m enwe ike gbalaga nʼugwu ka mbibi a ghara ịdakwasị m, m nwụọ. 20 Lee obodo dị nso nke m nwere ike ịgbaga. Ọ bụ obodo dị nta. Kwere ka m gbaga nʼebe ahụ. Obodo nta ka ọ bụ, ọ bụghị ya? Aga m echebekwa ndụ m na ya.” 21 Ọ zara sị ya, “Ọ dị mma, aga m emere gị dịka arịrịọ gị si dị. Agaghị m emebi obodo nta ahụ. 22 Ma mee ngwangwa, nʼihi na o nweghị ihe ọbụla m ga-eme tutu ruo mgbe i ruru nʼebe ahụ.” (Ọ bụ nke a mere e ji akpọ aha obodo ahụ Zoa.) 23 Mgbe Lọt rutere obodo Zoa, anwụ awalitela nʼala ahụ. 24 Mgbe ahụ ONYENWE ANYỊ sitere nʼeluigwe zokwasị obodo Sọdọm na Gọmọra nkume ọkụ nke ONYENWE ANYỊ mere ka o si nʼeluigwe zoo. 25 Otu a ka o si kwatuo obodo ndị ahụ niile dị na mbara ala ahụ niile, na ndị niile bi nʼobodo ndị ahụ. O kwatukwara ihe niile na-epu nʼala. 26 Ma mgbe nwunye Lọt lere anya nʼazụ, otu mgbe ahụ, ọ ghọrọ ogidi nnu. 27 Nʼụtụtụ echi ya, Ebraham biliri jeruo ebe ahụ o guzoro nʼihu ONYENWE ANYỊ nʼụbọchị gara aga. 28 Ọ lepụrụ anya nʼebe obodo Sọdọm na Gọmọra dị, na nʼebe mbara ala ndị ahụ niile dị. Ọ hụrụ anwụrụ ọkụ dị ukwuu nke si nʼala ahụ na-alali elu. Anwụrụ ọkụ a dị ka anwụrụ ọkụ si nʼebe a kwanyere ọkụ na-enwusi ike. 29 Ya mere, mgbe Chineke bibiri obodo ndị ahụ dị na mbara ala, o chetara Ebraham, kpọpụta Lọt site nʼoke mbibi ahụ e bibiri obodo ndị ahụ Lọt bi nʼime ha. 30 Emesịa, Lọt na ụmụ ya ndị inyom abụọ hapụrụ obodo Zoa, nʼihi na ọ tụrụ egwu ibi nʼime Zoa. Ọ gara biri nʼime ọgba nkume ya na ụmụ ya ndị inyom abụọ. 31 Otu ụbọchị, ada ya sịrị nke nta, “Nna anyị emeela agadi, ọ nwekwaghị nwoke ọbụla nọ nʼụwa a, onye ga-enye anyị ụmụ, dịka omenaala si dị nʼụwa niile. 32 Ka anyị mee ka nna anyị ṅụọ mmanya, ka anyị na ya dinakọọ, ka anyị chebe agbụrụ anyị site na nna anyị.” 33 Nʼabalị ahụ, ha mere ka nna ha ṅụọ mmanya, nke ada banyere soro nna ya dina. Ha abụọ nwere mmekọ. Ma ọ amaghị mgbe ada ya dinara maọbụ mgbe o bilikwara. 34 Nʼechi ya, ada gwara nwanne ya nke nta, “Mụ na nna anyị dinara nʼabalị gara aga. Ka anyị mee ka ọ ṅụọkwa mmanya nʼabalị taa, ka ị gaakwa ka gị na ya dina. Ka anyị mee ka agbụrụ anyị dịgide site na nna anyị.” 35 Ha mere ka nna ha ṅụọ mmanya nʼabalị ahụ, ada ya nke nta banyere ya na nna ya dinaa. Dịka ọ dịkwa na mbụ, nna ha amataghị mgbe o dinara ala maọbụ mgbe o bilitere. 36 Ya mere, ụmụ ndị inyom Lọt abụọ ndị a tụrụ ime site nʼaka nna ha. 37 Nke ada mụtara nwa nwoke onye ọ gụrụ Moab. Ọ bụ ya bụ nna nna ndị Moab ruo taa. 38 Nwa ya nke nta mụtakwara nwa nwoke onye ọ gụrụ Ben-Ammi. Ọ bụ ya bụ nna nna ndị Amọn ruo taa.

In Other Versions

Genesis 19 in the ANGEFD

Genesis 19 in the ANTPNG2D

Genesis 19 in the AS21

Genesis 19 in the BAGH

Genesis 19 in the BBPNG

Genesis 19 in the BBT1E

Genesis 19 in the BDS

Genesis 19 in the BEV

Genesis 19 in the BHAD

Genesis 19 in the BIB

Genesis 19 in the BLPT

Genesis 19 in the BNT

Genesis 19 in the BNTABOOT

Genesis 19 in the BNTLV

Genesis 19 in the BOATCB

Genesis 19 in the BOATCB2

Genesis 19 in the BOBCV

Genesis 19 in the BOCNT

Genesis 19 in the BOECS

Genesis 19 in the BOGWICC

Genesis 19 in the BOHCB

Genesis 19 in the BOHCV

Genesis 19 in the BOHLNT

Genesis 19 in the BOHNTLTAL

Genesis 19 in the BOILNTAP

Genesis 19 in the BOITCV

Genesis 19 in the BOKCV

Genesis 19 in the BOKCV2

Genesis 19 in the BOKHWOG

Genesis 19 in the BOKSSV

Genesis 19 in the BOLCB

Genesis 19 in the BOLCB2

Genesis 19 in the BOMCV

Genesis 19 in the BONAV

Genesis 19 in the BONCB

Genesis 19 in the BONLT

Genesis 19 in the BONUT2

Genesis 19 in the BOPLNT

Genesis 19 in the BOSCB

Genesis 19 in the BOSNC

Genesis 19 in the BOTLNT

Genesis 19 in the BOVCB

Genesis 19 in the BOYCB

Genesis 19 in the BPBB

Genesis 19 in the BPH

Genesis 19 in the BSB

Genesis 19 in the CCB

Genesis 19 in the CUV

Genesis 19 in the CUVS

Genesis 19 in the DBT

Genesis 19 in the DGDNT

Genesis 19 in the DHNT

Genesis 19 in the DNT

Genesis 19 in the ELBE

Genesis 19 in the EMTV

Genesis 19 in the ESV

Genesis 19 in the FBV

Genesis 19 in the FEB

Genesis 19 in the GGMNT

Genesis 19 in the GNT

Genesis 19 in the HARY

Genesis 19 in the HNT

Genesis 19 in the IRVA

Genesis 19 in the IRVB

Genesis 19 in the IRVG

Genesis 19 in the IRVH

Genesis 19 in the IRVK

Genesis 19 in the IRVM

Genesis 19 in the IRVM2

Genesis 19 in the IRVO

Genesis 19 in the IRVP

Genesis 19 in the IRVT

Genesis 19 in the IRVT2

Genesis 19 in the IRVU

Genesis 19 in the ISVN

Genesis 19 in the JSNT

Genesis 19 in the KAPI

Genesis 19 in the KBT1ETNIK

Genesis 19 in the KBV

Genesis 19 in the KJV

Genesis 19 in the KNFD

Genesis 19 in the LBA

Genesis 19 in the LBLA

Genesis 19 in the LNT

Genesis 19 in the LSV

Genesis 19 in the MAAL

Genesis 19 in the MBV

Genesis 19 in the MBV2

Genesis 19 in the MHNT

Genesis 19 in the MKNFD

Genesis 19 in the MNG

Genesis 19 in the MNT

Genesis 19 in the MNT2

Genesis 19 in the MRS1T

Genesis 19 in the NAA

Genesis 19 in the NASB

Genesis 19 in the NBLA

Genesis 19 in the NBS

Genesis 19 in the NBVTP

Genesis 19 in the NET2

Genesis 19 in the NIV11

Genesis 19 in the NNT

Genesis 19 in the NNT2

Genesis 19 in the NNT3

Genesis 19 in the PDDPT

Genesis 19 in the PFNT

Genesis 19 in the RMNT

Genesis 19 in the SBIAS

Genesis 19 in the SBIBS

Genesis 19 in the SBIBS2

Genesis 19 in the SBICS

Genesis 19 in the SBIDS

Genesis 19 in the SBIGS

Genesis 19 in the SBIHS

Genesis 19 in the SBIIS

Genesis 19 in the SBIIS2

Genesis 19 in the SBIIS3

Genesis 19 in the SBIKS

Genesis 19 in the SBIKS2

Genesis 19 in the SBIMS

Genesis 19 in the SBIOS

Genesis 19 in the SBIPS

Genesis 19 in the SBISS

Genesis 19 in the SBITS

Genesis 19 in the SBITS2

Genesis 19 in the SBITS3

Genesis 19 in the SBITS4

Genesis 19 in the SBIUS

Genesis 19 in the SBIVS

Genesis 19 in the SBT

Genesis 19 in the SBT1E

Genesis 19 in the SCHL

Genesis 19 in the SNT

Genesis 19 in the SUSU

Genesis 19 in the SUSU2

Genesis 19 in the SYNO

Genesis 19 in the TBIAOTANT

Genesis 19 in the TBT1E

Genesis 19 in the TBT1E2

Genesis 19 in the TFTIP

Genesis 19 in the TFTU

Genesis 19 in the TGNTATF3T

Genesis 19 in the THAI

Genesis 19 in the TNFD

Genesis 19 in the TNT

Genesis 19 in the TNTIK

Genesis 19 in the TNTIL

Genesis 19 in the TNTIN

Genesis 19 in the TNTIP

Genesis 19 in the TNTIZ

Genesis 19 in the TOMA

Genesis 19 in the TTENT

Genesis 19 in the UBG

Genesis 19 in the UGV

Genesis 19 in the UGV2

Genesis 19 in the UGV3

Genesis 19 in the VBL

Genesis 19 in the VDCC

Genesis 19 in the YALU

Genesis 19 in the YAPE

Genesis 19 in the YBVTP

Genesis 19 in the ZBP