Genesis 26 (BOICB)

1 Nʼoge a, ụnwụ dara nʼala ahụ. Ụnwụ a dị iche nʼụnwụ mbụ nke dara nʼoge Ebraham dị ndụ. Aịzik jekwuru Abimelek eze ndị Filistia nʼobodo Gera. 2 ONYENWE ANYỊ gosiri Aịzik onwe ya, sị, “Agakwala Ijipt; biri nʼala ahụ m sị gị biri nʼime ya. 3 Nọrọ nʼala a nwa oge nta, aga m anọnyere gị ma gọziekwa gị, nʼihi na gị na ụmụ ụmụ gị ka m ga-enye ala ndị a niile. Aga m emezukwa iyi ahụ m ṅụrụ nye Ebraham nna gị. 4 Aga m eme ka ụmụ ụmụ gị mụbaa, mee ka ha hie nne nʼọnụọgụgụ dịka kpakpando dị na mbara eluigwe. Ha ka m ga-enye ala ndị a niile. Aga m esite na mkpụrụ gị gọzie mba niile nke ụwa. 5 Ihe ndị a niile ka m ga-eme nʼihi na Ebraham rubere isi ime ihe m gwara ya, na idebe iwu m na ụkpụrụ m, na ịdọ aka na ntị m.” 6 Ya mere, Aịzik nọgidere nʼobodo Gera. 7 Mgbe ndị obodo ahụ jụrụ ya banyere nwunye ya, ọ gwara ha sị, “Ọ bụ nwanne m nwanyị.” Ọ tụrụ ụjọ ị sị ha, “Nwunye m ka ọ bụ,” O chere nʼobi ya sị, “Ndị ikom obodo a nwere ike gbuo m nʼihi Ribeka. Nʼihi na Ribeka nʼonwe ya mara mma ile anya.” 8 Mgbe Aịzik nọrọ ebe ahụ ogologo oge, Abimelek eze ndị Filistia, sitere na oghereikuku ya lepụ anya hụ Aịzik ka ọ nọ na-egwusa Ribeka nwunye ya egwu. 9 Ya mere, Abimelek kpọrọ Aịzik sị, “Nwunye gị ka ọ bụ nʼezie. Gịnị mere i ji gwa anyị na ọ bụ nwanne gị nwanyị?”Aịzik zara ya, “Ọ bụ nʼihi na m chere na-enwere ike igbu m nʼihi ya.” 10 Abimelek sịrị, “Gịnị bụ ihe a i mere anyị? Otu nwoke nʼetiti anyị gaara akpọrọ nwunye gị dinaa ya. Ị gaara esi otu a wetara anyị ikpe ọmụma.” 11 Ya mere, Abimelek nyere ndị niile ya iwu, sị ha, “Onye ọbụla metụrụ nwoke a maọbụ nwunye ya aka, aghaghị ime ka ọ nwụọ.” 12 Aịzik kụrụ mkpụrụ ubi nʼala ahụ. Nʼotu afọ ahụ kwa, o si nʼala ahụ webata ihe ubi narị okpukpu karịa nke ọ kụrụ, nʼihi na ONYENWE ANYỊ gọziri ya. 13 Nwoke a bara ụba, ghọọ ọgaranya. Akụnụba ya gara nʼihu na-amụba, tutu ruo mgbe ọ ghọrọ nnọọ onye ọgaranya a ma ama. 14 O nwere ọtụtụ igwe anụ ụlọ, na igwe ehi, na ndị ikom na-ejere ya ozi. Nʼihi ihe ndị a, ndị Filistia bidoro inwe anya ukwu megide ya. 15 Ndị Filistia wụjuru aja nʼolulu mmiri ndị ahụ niile ndị na-ejere nna ya ozi gwuru nʼoge nna ya Ebraham dị ndụ. 16 Abimelek kpọrọ Aịzik sị ya, “Si nʼala a kwapụ gaa nʼebe ọzọ, nʼihi na ịba ụba gị na ịdị ike gị adịla ukwuu karịa nke anyị.” 17 Ya mere Aịzik si nʼebe ahụ kwapụ, gaa maa ụlọ ikwu ya na Ndagwurugwu Gera, biri nʼebe ahụ. 18 O gwugharịkwara olulu mmiri ndị ahụ e gwuru nʼoge nna ya Ebraham, nke ndị Filistia kpojuru aja mgbe Ebraham nwụrụ, kpọọ olulu mmiri ndị a otu aha ahụ nna ya kpọrọ ha na mbụ. 19 Ọzọ, ndị na-ejere Aịzik ozi gwuru olulu mmiri ọhụrụ na ndagwurugwu Gera ahụ, gwute mmiri nke si nʼala na-asọpụta. 20 Ma ndị ọzụzụ anụ ụlọ obodo Gera sesịrị ndị ọzụzụ anụ ụlọ Aịzik okwu. Ha kwuru sị, “Mmiri a bụ nke anyị!” Nke a mere Aịzik ji kpọọ olulu mmiri ahụ Esek, nʼihi ise okwu nke ha sesịrị ya. 21 Ha gwuru olulu mmiri ọzọ, ma ndị ahụ bịakwara ọzọ bido ịzọ ya. Nʼihi ya Aịzik kpọrọ olulu mmiri ahụ Sitna. 22 O si nʼebe ahụ pụọ gaa nʼebe ọzọ gwuo olulu mmiri ọzọ. Ma o nweghị ndị bịara zọọ ya. Nʼihi ya ọ kpọrọ olulu mmiri ahụ Rehobọt. O kwuru sị, “Ugbu a, ONYENWE ANYỊ enyela anyị ebe sara mbara, ebe ihe ga-anọ gaara anyị nke ọma.” 23 O sitere nʼebe ahụ kwapụ gaa Bịasheba. 24 Nʼabalị ahụ, ONYENWE ANYỊ mere ka ọ hụ ya anya, sị ya, “Abụ m Chineke nna gị Ebraham. Atụla egwu, nʼihi na anọnyere m gị, aga m agọzi gị, mụbaa ọnụọgụgụ ụmụ ụmụ gị nʼihi ohu m Ebraham.” 25 Ya mere, o wuru ebe ịchụ aja nʼebe ahụ kpọkuo aha ONYENWE ANYỊ. Ọ makwara ụlọ ikwu ya nʼebe ahụ. Ndị na-ejere ya ozi gwukwara olulu mmiri. 26 Abimelek na Ahuzat, onye ndụmọdụ ya, na Fikọl onyeisi ndị agha ya sitere Gera jekwuru Aịzik. 27 Aịzik jụrụ ha sị, “Gịnị mere unu ji bịakwute m, ebe ọ bụ na unu kpọrọ m asị, chụpụkwa m site nʼetiti unu?” 28 Ha sị, “Anyị hụrụ nke ọma na ONYENWE ANYỊ nọnyeere gị, ya mere anyị ji sị, ‘O kwesiri ka ịṅụ iyi dị nʼetiti anyị na gị,’ ka anyị na gị gbaakwa ndụ 29 na ị gaghị eme anyị ihe ọjọọ dịka anyị na-esighị mee gị ihe ọjọọ. I lezie anya nke ọma, ị ga-ahụ na anyị meere gị ihe ọma mgbe anyị hapụrụ gị ka ị laa nʼudo. Ugbu a, anyị maara na ị bụ onye ONYENWE ANYỊ gọziri agọzi.” 30 Aịzik meere ha mmemme nri dị ukwuu; ha riri, ṅụọkwa. 31 Nʼisi ụtụtụ echi ya, ndị ikom ahụ niile ṅụrịtaara onwe ha iyi ịgba ndụ. Aịzik zilagara ha, ha hapụrụ ya laa nʼudo. 32 Nʼotu ụbọchị ahụ kwa, ndị ohu Aịzik bịakwutere ya gwa ya banyere olulu mmiri ha na-egwu, sị ya, “Anyị achọtala mmiri nʼolulu ahụ anyị na-egwu.” 33 Ọ kpọrọ ya Shiba. Ọ bụkwa nke a mere e ji akpọ obodo ahụ Bịasheba ruo taa. 34 Mgbe Ịsọ gbara iri afọ anọ, ọ lụrụ Judit nwa Beiri, onye Het. Ọ lụkwara Basemat nwa Elọn, onye Het. 35 Ha ghọrọ Aịzik na Ribeka ihe ọnọdụ obi ilu.

In Other Versions

Genesis 26 in the ANGEFD

Genesis 26 in the ANTPNG2D

Genesis 26 in the AS21

Genesis 26 in the BAGH

Genesis 26 in the BBPNG

Genesis 26 in the BBT1E

Genesis 26 in the BDS

Genesis 26 in the BEV

Genesis 26 in the BHAD

Genesis 26 in the BIB

Genesis 26 in the BLPT

Genesis 26 in the BNT

Genesis 26 in the BNTABOOT

Genesis 26 in the BNTLV

Genesis 26 in the BOATCB

Genesis 26 in the BOATCB2

Genesis 26 in the BOBCV

Genesis 26 in the BOCNT

Genesis 26 in the BOECS

Genesis 26 in the BOGWICC

Genesis 26 in the BOHCB

Genesis 26 in the BOHCV

Genesis 26 in the BOHLNT

Genesis 26 in the BOHNTLTAL

Genesis 26 in the BOILNTAP

Genesis 26 in the BOITCV

Genesis 26 in the BOKCV

Genesis 26 in the BOKCV2

Genesis 26 in the BOKHWOG

Genesis 26 in the BOKSSV

Genesis 26 in the BOLCB

Genesis 26 in the BOLCB2

Genesis 26 in the BOMCV

Genesis 26 in the BONAV

Genesis 26 in the BONCB

Genesis 26 in the BONLT

Genesis 26 in the BONUT2

Genesis 26 in the BOPLNT

Genesis 26 in the BOSCB

Genesis 26 in the BOSNC

Genesis 26 in the BOTLNT

Genesis 26 in the BOVCB

Genesis 26 in the BOYCB

Genesis 26 in the BPBB

Genesis 26 in the BPH

Genesis 26 in the BSB

Genesis 26 in the CCB

Genesis 26 in the CUV

Genesis 26 in the CUVS

Genesis 26 in the DBT

Genesis 26 in the DGDNT

Genesis 26 in the DHNT

Genesis 26 in the DNT

Genesis 26 in the ELBE

Genesis 26 in the EMTV

Genesis 26 in the ESV

Genesis 26 in the FBV

Genesis 26 in the FEB

Genesis 26 in the GGMNT

Genesis 26 in the GNT

Genesis 26 in the HARY

Genesis 26 in the HNT

Genesis 26 in the IRVA

Genesis 26 in the IRVB

Genesis 26 in the IRVG

Genesis 26 in the IRVH

Genesis 26 in the IRVK

Genesis 26 in the IRVM

Genesis 26 in the IRVM2

Genesis 26 in the IRVO

Genesis 26 in the IRVP

Genesis 26 in the IRVT

Genesis 26 in the IRVT2

Genesis 26 in the IRVU

Genesis 26 in the ISVN

Genesis 26 in the JSNT

Genesis 26 in the KAPI

Genesis 26 in the KBT1ETNIK

Genesis 26 in the KBV

Genesis 26 in the KJV

Genesis 26 in the KNFD

Genesis 26 in the LBA

Genesis 26 in the LBLA

Genesis 26 in the LNT

Genesis 26 in the LSV

Genesis 26 in the MAAL

Genesis 26 in the MBV

Genesis 26 in the MBV2

Genesis 26 in the MHNT

Genesis 26 in the MKNFD

Genesis 26 in the MNG

Genesis 26 in the MNT

Genesis 26 in the MNT2

Genesis 26 in the MRS1T

Genesis 26 in the NAA

Genesis 26 in the NASB

Genesis 26 in the NBLA

Genesis 26 in the NBS

Genesis 26 in the NBVTP

Genesis 26 in the NET2

Genesis 26 in the NIV11

Genesis 26 in the NNT

Genesis 26 in the NNT2

Genesis 26 in the NNT3

Genesis 26 in the PDDPT

Genesis 26 in the PFNT

Genesis 26 in the RMNT

Genesis 26 in the SBIAS

Genesis 26 in the SBIBS

Genesis 26 in the SBIBS2

Genesis 26 in the SBICS

Genesis 26 in the SBIDS

Genesis 26 in the SBIGS

Genesis 26 in the SBIHS

Genesis 26 in the SBIIS

Genesis 26 in the SBIIS2

Genesis 26 in the SBIIS3

Genesis 26 in the SBIKS

Genesis 26 in the SBIKS2

Genesis 26 in the SBIMS

Genesis 26 in the SBIOS

Genesis 26 in the SBIPS

Genesis 26 in the SBISS

Genesis 26 in the SBITS

Genesis 26 in the SBITS2

Genesis 26 in the SBITS3

Genesis 26 in the SBITS4

Genesis 26 in the SBIUS

Genesis 26 in the SBIVS

Genesis 26 in the SBT

Genesis 26 in the SBT1E

Genesis 26 in the SCHL

Genesis 26 in the SNT

Genesis 26 in the SUSU

Genesis 26 in the SUSU2

Genesis 26 in the SYNO

Genesis 26 in the TBIAOTANT

Genesis 26 in the TBT1E

Genesis 26 in the TBT1E2

Genesis 26 in the TFTIP

Genesis 26 in the TFTU

Genesis 26 in the TGNTATF3T

Genesis 26 in the THAI

Genesis 26 in the TNFD

Genesis 26 in the TNT

Genesis 26 in the TNTIK

Genesis 26 in the TNTIL

Genesis 26 in the TNTIN

Genesis 26 in the TNTIP

Genesis 26 in the TNTIZ

Genesis 26 in the TOMA

Genesis 26 in the TTENT

Genesis 26 in the UBG

Genesis 26 in the UGV

Genesis 26 in the UGV2

Genesis 26 in the UGV3

Genesis 26 in the VBL

Genesis 26 in the VDCC

Genesis 26 in the YALU

Genesis 26 in the YAPE

Genesis 26 in the YBVTP

Genesis 26 in the ZBP