Genesis 31 (BOICB)

1 Jekọb nụrụ na ụmụ ndị ikom Leban na-asị, “Jekọb ewerechaala ihe niile nna anyị nwere. O sitere nʼihe nna anyị nwere kpata akụnụba ya niile.” 2 Jekọb hụkwara na omume Leban nʼebe ọ nọ adịghịkwa otu ọ dị na mbụ. 3 Mgbe ahụ, ONYENWE ANYỊ sịrị Jekọb, “Laghachi nʼala nna gị ha, lakwuru ụmụnna gị, aga m anọnyere gị.” 4 Ya mere, Jekọb ziri Rechel na Lịa ozi ka ha bịakwute ya nʼọhịa ebe ọ nọ na-elekọta igwe anụ ụlọ ya. 5 Ọ sịrị ha, “Ahụla m na omume nna unu nʼebe m nọ adịghịkwa otu ọ dị na mbụ. Ma Chineke nna m ha nọnyeere m. 6 Unu maara na eji m ike m niile rụọra nna unu ọrụ. 7 Ma nna unu ghọgburu m, gbanwee ụgwọ ọrụ m ugboro iri. Otu ọ dị, Chineke ekweghị ka nna unu merụọ m ahụ. 8 Ọ bụrụ na ọ sị, ‘Ndị tụrụ agwa agwa ga-abụ ụgwọ ọrụ gị,’ mgbe ahụ, igwe anụ ụlọ niile na-amụ ụmụ na-abụ ndị tụrụ agwa. Ma ọ bụrụ na ọ sị, ‘Ndị niile nwere ntụpọ ga-abụ ụgwọ ọrụ gị,’ mgbe ahụ, igwe anụ ụlọ niile na-amụ ụmụ na-enwe ntụpọ ọcha nʼahụ ha. 9 Chineke napụrụ nna unu anụ ụlọ ya ma nye m ha. 10 “Nʼoge ụmụ anụ ụlọ ji atụ ime, eweliri m anya hụ na nrọ na ụmụ mkpi niile na-agba igwe nne ewu bụ ụmụ mkpi ndị tụrụ agwa agwa, ndị nwere akara maọbụ ndị nwere ntụpọ ọcha nʼahụ ha. 11 Mgbe ahụ, mmụọ ozi Chineke sịrị m na nrọ, ‘Jekọb.’ Azara m sị, ‘Lee m nʼebe a.’ 12 Ọ sịrị m, ‘Lelie anya gị elu, lee ka ị hụ na mkpi niile na-agba igwe nne ewu ndị a bụ mkpi ndị ahụ tụrụ agwa agwa, ndị nwere akara maọbụ ndị nwere ntụpọ ọcha. Nʼihi na ahụla m ihe niile Leban na-eme gị. 13 Mụ onwe m bụ Chineke nke Betel, ebe ị wụkwasịrị mmanụ nʼogidi nkume ahụ, ebe ị kwekwara m nkwa. Ugbu a, kulie, hapụ obodo a, laghachi nʼala a nọ mụọ gị.’ ” 14 Rechel na Lịa zara sị ya, “Anyị ka nwere oke nʼihe nketa nʼụlọ nna anyị? 15 Ọ bụghị dịka ndị ọbịa ka ọ gụnyeziri anyị? Nʼihi na o reela anyị, ripịakwa ụgwọ isi anyị. 16 Nʼezie, akụ ndị ahụ Chineke napụrụ nna anyị bụ nke anyị na nke ụmụ anyị. Ya mere, mee ihe ọbụla Chineke sị gị mee.” 17 Jekọb biliri, kukwasị ụmụ ya na ndị nwunye ya nʼelu ịnyịnya kamel, 18 duru igwe anụ ụlọ ya niile, na ihe ọ kpatara na Padan Aram, lakwuru nna ya Aịzik nʼala Kenan. 19 Ka Leban gara ịkpachapụ ajị ụmụ atụrụ ya, Rechel zuuru arụsị ezinaụlọ nna ya. 20 Jekọb ghọkwara Leban onye Aram aghụghọ nʼihi na ọ gwaghị ya na ọ na-agbapụ ọsọ. 21 Ya mere, o buru ihe niile o nwere gbapụ ọsọ, gbafee iyi ukwu Yufretis, chee ihu nʼala ugwu ugwu Gilead. 22 Abalị atọ agafeelarị tupu a gwa Leban na Jekọb agbalaala. 23 O duuru ndị ikwu ya chụọ Jekọb ọsọ abalị asaa tupu ọ chụkwute ya nʼala ugwu ugwu Gilead. 24 Ma Chineke bịakwutere Leban onye Aram na nrọ nʼabalị sị ya, “Kpachapụ anya gị, hụ na o nweghị ihe ị gwara Jekọb, maọbụ okwu dị mma, maọbụ nke dị njọ.” 25 Jekọb amaala ụlọ ikwu ya nʼala ugwu Gilead mgbe Leban chụkwutere ya. Leban na ndị ikwu ya makwara ụlọ ikwu nke ha nʼebe ahụ. 26 Leban sịrị Jekọb, “Gịnị bụ ihe a i mere? Ị ghọgbuola m. I burula ụmụ m ndị inyom dịka ndị a dọtara nʼagha? 27 Gịnị mere i ji ghọgbuo m, zoro ezo gbapụ? Gịnị mere ị gwaghị m ka m jiri ọṅụ na ịbụ abụ nke ya na ịkpọ ụbọ akwara na iti ịgba so, zilaga gị? 28 Gịnị mere i nyeghị m ohere ka m sutu ụmụ ụmụ m na ụmụ m ndị inyom ọnụ sị ha laa nke ọma? Omume a i mere bụ omume nzuzu. 29 Enwere m ike merụọ gị ahụ ugbu a, ma Chineke nke nna gị mere ka m hụ ya anya na nrọ nʼabalị gara aga. Ọ dọrọ m aka na ntị sị m, ‘Kpachapụ anya gị hụ na o nweghị ihe ị gwara Jekọb, maọbụ okwu dị mma, maọbụ nke dị njọ.’ 30 Ugbu a, ị na-ala nʼihi na ọ gụrụ gị agụụ ịlaghachi nʼụlọ nna gị, ma gịnị mere i ji zuru chi m?” 31 Jekọb zara sị Leban, “Nʼihi na m tụrụ egwu, nʼihi na m chere sị na ị ga-eji ike napụ m ụmụ gị ndị inyom a. 32 Ma ọ bụrụ na ị chọta onye ọbụla ji chi gị ndị a, onye ahụ ga-anwụ. Nʼihu ndị ikwu gị ndị a, chọgharịa nʼonwe gị, lee ma ị ga-achọta ihe ọbụla bụ nke gị dị m nʼaka. Ọ bụrụ na ị chọta ya, were ya.” Ma Jekọb amaghị na Rechel zuuru chi ndị ahụ. 33 Ya mere, Leban bara nʼụlọ ikwu Jekọb, na nʼime ụlọ ikwu Lịa, na nʼime ụlọ ikwu ndị odibo nwanyị abụọ ya, ma o nweghị ihe ọ chọtara. O sitere nʼụlọ ikwu Lịa pụta baa nʼụlọ ikwu Rechel. 34 Nʼoge a, Rechel ewerela arụsị ezinaụlọ ndị ahụ tinye ha nʼime akwa e ji anọkwasị nʼelu ịnyịnya kamel nọdụ ọdụ nʼelu ya. Leban chọgharịrị ebe niile nʼime ụlọ ikwu ahụ ma ọ chọtaghị arụsị ezinaụlọ ndị ahụ. 35 Mgbe ahụ, Rechel gwara nna ya Leban sị, “Biko, ewela iwe nna m ukwu, nʼihi na enweghị m ike ibili ọtọ nʼihu gị. Anọ m nʼọnọdụ ndị inyom na-anọ kwa ọnwa.” Leban chọgharịrị ebe niile, ma ọ hụghị arụsị ezinaụlọ ndị ahụ. 36 Iwe were Jekọb megide Leban. O ji iwe jụọ Leban sị, “Gịnị bụ njehie m? Gịnị bụ mmehie m mere i ji si otu a na-achụsi m ike? 37 Ugbu a, ị chọgharịala nʼibu m niile, gịnị ka ị chọtara bụ nke gị? Wepụta ya nʼihu ndị ikwu gị na nʼihu ndị nke m, ka ha kpeere mụ na gị ikpe. 38 “Iri afọ abụọ ka mụ na gị nọrọ. O nweghị mgbe ime pụrụ ụmụ ewu na atụrụ gị; o nwekwaghị mgbe m riri ebule si nʼigwe anụ ụlọ gị. 39 O nweghị mgbe m welataara gị anụ ụlọ nke anụ ọhịa dọgburu, kama akwụrụ m ụgwọ ha. I mekwara ka m kwụghachi gị anụ ụlọ ọbụla e zuru nʼohi, maọbụ nʼehihie, maọbụ nʼabalị. 40 Nʼime oke anwụ nke ehihie ka m rụụrụ gị ọrụ. Rụọkwara gị ọrụ nʼoge oyi na-atụ, nʼabalị ụra sikwa nʼanya m pụọ. 41 Otu a ka ọ dịrị m iri afọ abụọ m jeere gị ozi. Arụrụ m gị ọrụ afọ iri na anọ maka ụmụ gị ndị inyom abụọ ndị a, afọ isii ka m lekọtara igwe ewu na atụrụ gị. Ị nọkwa nʼime ihe ndị a gbanwee ụgwọ ọrụ m ugboro iri. 42 A sị na Chineke m, Chineke Ebraham, onye ahụ a na-atụ egwu nke Aịzik, anọnyereghị m, ị gaara ezilaga m nʼaka efu, agaara m agbara aka laa. Ma Chineke ahụla ịrụsị ọrụ ike m, na nhụju anya m niile, ọ bụ ya mere o ji baara gị mba nʼabalị gara aga.” 43 Mgbe ahụ Leban zaghachiri sị Jekọb, “Ndị inyom ndị a bụ ụmụ m. Ụmụaka ndị a bụ ụmụ m. Igwe anụ ụlọ ndị a bụ nke m. Ihe ndị a niile ị na-ahụ anya bụ nke m. Olee otu m ga-esi merụọ ụmụ m, na ụmụ ụmụ m ahụ? 44 Ugbu a, bịa ka anyị gbaa ndụ mụ na gị, ka ọ bụrụ ihe ama nʼetiti anyị.” 45 Ya mere, Jekọb weere otu nkume guzo ya ọtọ dịka ogidi. 46 Jekọb gwakwara ndị so ya sị ha, “Tụtụkọta nkume.” Ha tụtụkọtara nkume wụsa ha nʼotu ebe mee ka ọ laa elu. Emesịa, ha nọdụrụ nʼakụkụ nkume ndị ahụ rie nri. 47 Leban kpọrọ nkume ndị ahụ Jega-Sahaduta, nʼasụsụ nke ya. Jekọb kpọrọ ya Galeed, nʼasụsụ nke ya. 48 Emesịa, Leban sịrị, “Ka nkume ndị a bụrụ ihe ama nʼetiti mụ na gị taa.” Nke a mere e ji kpọọ ya Galeed. 49 A kpọkwara ya Mizpa, nʼihi na Leban sịrị, “Ka ONYENWE ANYỊ bụrụ onye ga-eche mụ na gị nche ịhụ na onye ọbụla nʼime anyị debere ọgbụgba ndụ a, mgbe anyị na-anọghị ibe anyị nso. 50 Ọ bụrụ na i mee ụmụ m ndị inyom ihe ọjọọ, maọbụ lụọ ndị inyom ndị ọzọ tinyere ha, o nweghị onye nʼime anyị ga-amata, ma cheta na Chineke ga-abụ onyeama nʼetiti mụ na gị.” 51 Leban gwakwara Jekọb sị, “Lee nkume ndị a a wụsara nʼebe a na ogidi m mere ka o guzo nʼetiti mụ na gị. 52 Nkume ndị a a wụsara bụ akaebe, ogidi a bụkwa ihe ama. Agaghị m agabiga nkume ndị a a wụsara gafeeta nʼakụkụ nke gị ime gị ihe ọjọọ. Gị onwe gị agaghị agabiga nkume ndị a a wụsara na ogidi a gafeeta nʼakụkụ nke m ime m ihe ọjọọ. 53 Ka Chineke Ebraham na Chineke Nahọ, Chineke nna ha, bụrụ onye ikpe nʼetiti mụ na gị.”Ya mere Jekọb ji onye ahụ a na-atụ egwu nke nna ya Aịzik ṅụọ iyi. 54 Ọ chụrụ aja nʼala ugwu ugwu ahụ, kpọọ ndị ikwu ya niile oriri. Mgbe ha richara nri, ha rahụrụ ụra nʼebe ahụ. 55 Nʼisi ụtụtụ echi ya, Leban biliri sutu ụmụ ya ndị inyom na ụmụ ụmụ ya ọnụ. Ọ gọziri ha, hapụ ha laghachi ụlọ ha.

In Other Versions

Genesis 31 in the ANGEFD

Genesis 31 in the ANTPNG2D

Genesis 31 in the AS21

Genesis 31 in the BAGH

Genesis 31 in the BBPNG

Genesis 31 in the BBT1E

Genesis 31 in the BDS

Genesis 31 in the BEV

Genesis 31 in the BHAD

Genesis 31 in the BIB

Genesis 31 in the BLPT

Genesis 31 in the BNT

Genesis 31 in the BNTABOOT

Genesis 31 in the BNTLV

Genesis 31 in the BOATCB

Genesis 31 in the BOATCB2

Genesis 31 in the BOBCV

Genesis 31 in the BOCNT

Genesis 31 in the BOECS

Genesis 31 in the BOGWICC

Genesis 31 in the BOHCB

Genesis 31 in the BOHCV

Genesis 31 in the BOHLNT

Genesis 31 in the BOHNTLTAL

Genesis 31 in the BOILNTAP

Genesis 31 in the BOITCV

Genesis 31 in the BOKCV

Genesis 31 in the BOKCV2

Genesis 31 in the BOKHWOG

Genesis 31 in the BOKSSV

Genesis 31 in the BOLCB

Genesis 31 in the BOLCB2

Genesis 31 in the BOMCV

Genesis 31 in the BONAV

Genesis 31 in the BONCB

Genesis 31 in the BONLT

Genesis 31 in the BONUT2

Genesis 31 in the BOPLNT

Genesis 31 in the BOSCB

Genesis 31 in the BOSNC

Genesis 31 in the BOTLNT

Genesis 31 in the BOVCB

Genesis 31 in the BOYCB

Genesis 31 in the BPBB

Genesis 31 in the BPH

Genesis 31 in the BSB

Genesis 31 in the CCB

Genesis 31 in the CUV

Genesis 31 in the CUVS

Genesis 31 in the DBT

Genesis 31 in the DGDNT

Genesis 31 in the DHNT

Genesis 31 in the DNT

Genesis 31 in the ELBE

Genesis 31 in the EMTV

Genesis 31 in the ESV

Genesis 31 in the FBV

Genesis 31 in the FEB

Genesis 31 in the GGMNT

Genesis 31 in the GNT

Genesis 31 in the HARY

Genesis 31 in the HNT

Genesis 31 in the IRVA

Genesis 31 in the IRVB

Genesis 31 in the IRVG

Genesis 31 in the IRVH

Genesis 31 in the IRVK

Genesis 31 in the IRVM

Genesis 31 in the IRVM2

Genesis 31 in the IRVO

Genesis 31 in the IRVP

Genesis 31 in the IRVT

Genesis 31 in the IRVT2

Genesis 31 in the IRVU

Genesis 31 in the ISVN

Genesis 31 in the JSNT

Genesis 31 in the KAPI

Genesis 31 in the KBT1ETNIK

Genesis 31 in the KBV

Genesis 31 in the KJV

Genesis 31 in the KNFD

Genesis 31 in the LBA

Genesis 31 in the LBLA

Genesis 31 in the LNT

Genesis 31 in the LSV

Genesis 31 in the MAAL

Genesis 31 in the MBV

Genesis 31 in the MBV2

Genesis 31 in the MHNT

Genesis 31 in the MKNFD

Genesis 31 in the MNG

Genesis 31 in the MNT

Genesis 31 in the MNT2

Genesis 31 in the MRS1T

Genesis 31 in the NAA

Genesis 31 in the NASB

Genesis 31 in the NBLA

Genesis 31 in the NBS

Genesis 31 in the NBVTP

Genesis 31 in the NET2

Genesis 31 in the NIV11

Genesis 31 in the NNT

Genesis 31 in the NNT2

Genesis 31 in the NNT3

Genesis 31 in the PDDPT

Genesis 31 in the PFNT

Genesis 31 in the RMNT

Genesis 31 in the SBIAS

Genesis 31 in the SBIBS

Genesis 31 in the SBIBS2

Genesis 31 in the SBICS

Genesis 31 in the SBIDS

Genesis 31 in the SBIGS

Genesis 31 in the SBIHS

Genesis 31 in the SBIIS

Genesis 31 in the SBIIS2

Genesis 31 in the SBIIS3

Genesis 31 in the SBIKS

Genesis 31 in the SBIKS2

Genesis 31 in the SBIMS

Genesis 31 in the SBIOS

Genesis 31 in the SBIPS

Genesis 31 in the SBISS

Genesis 31 in the SBITS

Genesis 31 in the SBITS2

Genesis 31 in the SBITS3

Genesis 31 in the SBITS4

Genesis 31 in the SBIUS

Genesis 31 in the SBIVS

Genesis 31 in the SBT

Genesis 31 in the SBT1E

Genesis 31 in the SCHL

Genesis 31 in the SNT

Genesis 31 in the SUSU

Genesis 31 in the SUSU2

Genesis 31 in the SYNO

Genesis 31 in the TBIAOTANT

Genesis 31 in the TBT1E

Genesis 31 in the TBT1E2

Genesis 31 in the TFTIP

Genesis 31 in the TFTU

Genesis 31 in the TGNTATF3T

Genesis 31 in the THAI

Genesis 31 in the TNFD

Genesis 31 in the TNT

Genesis 31 in the TNTIK

Genesis 31 in the TNTIL

Genesis 31 in the TNTIN

Genesis 31 in the TNTIP

Genesis 31 in the TNTIZ

Genesis 31 in the TOMA

Genesis 31 in the TTENT

Genesis 31 in the UBG

Genesis 31 in the UGV

Genesis 31 in the UGV2

Genesis 31 in the UGV3

Genesis 31 in the VBL

Genesis 31 in the VDCC

Genesis 31 in the YALU

Genesis 31 in the YAPE

Genesis 31 in the YBVTP

Genesis 31 in the ZBP